Na-eṅomi Kraịst n’Otú I Si Eji Ike Eme Ihe
Na-eṅomi Kraịst n’Otú I Si Eji Ike Eme Ihe
AFỌ ụfọdụ gara aga, a chọpụtara ihe na-akpali akpali ná nnyocha e mere banyere otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà. E kere ndị e ji mee nnyocha ahụ ụzọ abụọ. A gwara otu ìgwè ka ha bụrụ ndị nche ma lekọtawa ìgwè nke ọzọ, bụ́ ndị e weere dị ka ndị mkpọrọ. Gịnị meziri?
A kọrọ na “mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ụfọdụ n’ime ndị ahụ e mere ndị nche malitere gwawa ndị ha na-eche nche okwu ọjọọ ma na-amaja ha. Ha malitekwara inye ha ntaramahụhụ mgbe ọ bụla ọ masịrị ha. Ndị nke ahụ e weere dị ka ndị mkpọrọ ghọrọ ndị ezigbo ụjọ jidere na ndị a na-emegbu emegbu.” Ihe ndị mere nnyocha ahụ chọpụtara n’ikpeazụ bụ nke a: Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla ga-adaba n’ọnyà nke iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.
Ụzọ E Kwesịrị Isi Jiri Ike Na-eme Ihe na Ụzọ A Na-ekwesịghị Isi Jiri Ya Na-eme Ihe
Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ike ya na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, onye ahụ pụrụ ịkpali ndị ọzọ ime ezi ihe. Ọ pụrụ inye ndị ọzọ nduzi kwesịrị ekwesị, nweekwa ike ime ka ha nwee ezi ahụ́ ike, ahụ́ iru ala, ma kwụsie ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 1:5; Aịsaịa 48:17, 18) Otú ọ dị, dị ka nnyocha ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite gosiri, ọ dị nnọọ mfe mmadụ iji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Bible mere ka nke a pụta ìhè mgbe o kwuru, sị: “Mgbe onye na-emebi iwu na-achị achị, ndị ala ya na-eze ume.”—Ilu 29:2; Eklisiastis 8:9.
Iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-akpatara ndị ọzọ mmerụ ahụ́, ọbụna ma a sị na e bu ezi ihe n’obi na-eme ya. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, otu òtù ndị nkụzi okpukpe dị na Ireland rịọrọ mgbaghara n’ihu ọha maka otú ụfọdụ ndị nkụzi ha siworo mesoo ụmụaka, bụ́ ndị a sịrị ha lekọtawa, ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ n’ime ndị nkụzi a a na-ekwu okwu ha bu ezi ihe n’obi mee ihe ha mere, ma otú ụfọdụ n’ime ha si mesoo ụmụ akwụkwọ ha ihe gabigara ókè. Otu akwụkwọ akụkọ kọrọ na “otú ọtụtụ ndị nkụzi si emeso nnọọ ụmụaka ihe n’ike na n’ụzọ obi ọjọọ na-eme ka ụmụaka nwetụ nkụda mmụọ.” (The Irish Times) Oleezi otú ị pụrụ isi jiri ike gị na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi ka i wee nwee ike ime ka ndị ọzọ na-eme nnọọ nke ọma kama ime ka ha nwee obi ilu ma ọ bụ mee ka ha nwee oké nkụda mmụọ n’ihi ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere?—Ilu 12:18.
E Nyewo Jizọs Kraịst “Ikike Nile”
Tụlee ihe nlereanya nke Jizọs Kraịst. Obere oge tupu ya arịgoo eluigwe, ọ gwara ndị na-eso Matiu 28:18) Ọ̀ dị otú nke ahụ si menye ha egwu? Hà chere na Jizọs ga-eji ike ya eme ihe dị ka ụfọdụ n’ime ndị Siza chịrị Rom mere, bụ́ ndị a maara dị ka ndị ji obi ọjọọ ekpochapụ ndị nupụụrụ ha isi?
ụzọ ya, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Bible na-egosi na ha echetụdịghị otú ahụ! Jizọs Kraịst ji ike ya mee ihe n’otu ụzọ ahụ Nna ya si jiri nke ya na-eme ihe. N’agbanyeghị na ọ bụ Jehova bụ n’ezie onye kachasị ihe nile elu n’Eluigwe na Ala, ọ na-achọ ka ndị ọ na-achị jiri obi ha dum na-ejere ya ozi. Ọ chọghị ka ha na-eme ya iji mezuo iwu ma ọ bụ jiri ụjọ na-eme ya. Ọ chọghịkwa ka ha na-erubere ya isi dị ka ndị a na-amanye amanye ime otú ahụ. (Matiu 22:37) Ọ dịbeghị mgbe Jehova jiri ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọhụụ dị ịrịba ama nke Izikiel onye amụma hụrụ gosiri na nke a bụ eziokwu.
N’ọhụụ ahụ, Izikiel hụrụ ndị mmụọ ozi anọ bụ́ ndị na-akwado ọbụbụeze Chineke. Nke ọ bụla n’ime ha nwere ihu anọ. Izikiel dere, sị: “Ma oyiyi ihu nile ha, ihu mmadụ ka ha nwere; ihu ọdụm ka ha anọ nwekwara n’aka nri; ihu ehi ka ha anọ nwekwara n’aka ekpe; ihu ugo ka ha anọ nwekwara.” (Ezikiel 1:10) Ihu anọ ndị a na-anọchi anya àgwà Chineke anọ ndị zuru okè, bụ́ ndị ọ na-egosipụta n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị. E depụtara àgwà anọ ndị a n’Okwu Chineke. Ha bụ: ịhụnanya, bụ́ nke ihu mmadụ na-anọchi anya ya; ikpe ziri ezi, nke ihu ọdụm na-anọchi anya ya; na amamihe, bụ́ nke e ji ihu ugo nọchie anya ya. Àgwà atọ ndị a na nke anọ na-agakọ—ike, bụ́ nke ihu ehi na-anọchi anya ya. Gịnị ka ihe a nile na-apụta? Ọhụụ ahụ na-egosi na ọ dịbeghị mgbe Jehova ji ike, na ikike ya na-enweghị njedebe mee ihe n’ụzọ megidere àgwà ya ndị ọzọ.
N’iṅomi Nna ya, Jizọs Kraịst ji ike ya mee ihe mgbe nile n’ụzọ na-egosi nnọọ na o nwere ịhụnanya, Matiu 11:28-30) Àgwà a kasị jiri mara Jehova Chineke na Jizọs Kraịst bụ ịhụnanya, ọ bụghị ike ma ọ bụ ikike!—1 Ndị Kọrint 13:13; 1 Jọn 4:8.
amamihe, ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Otú Jizọs si jiri ike ya mee ihe mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee nnọọ ume ọhụrụ. (Olee Otú I Si Eji Ike Gị Eme Ihe?
Olee otú i si eji ike gị eme ihe? Dị ka ihe atụ, ị̀ na-eji ike gị eme ihe n’ezinụlọ gị dị ka eze onye agwala m? Ọ̀ bụ ụjọ ka ndị ezinụlọ gị ji erubere gị isi ka hà na-eme ya n’ihi na ha hụrụ gị n’anya? Hà na-erubere gị isi n’ihi na ị ka ha ike? Ihe ndị a bụ ajụjụ ndị isi ezinụlọ ga-echebara echiche. Ajụjụ ndị a ga-enyere ha aka ime ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ha dị ka Chineke si chọọ.—1 Ndị Kọrint 11:3.
Gịnị ma ọ bụrụ na i nwetụrụ ikike n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Iji chọpụta ma ì ji ike gị na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, tụlee ma ị̀ na-agbaso ụkpụrụ ndị a Jehova Chineke setịpụrụ n’Okwu ya, bụ́kwa ụkpụrụ ndị Jizọs Kraịst gbasoro.
“Ọ dị mkpa ka [ohu Onyenwe anyị] na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, . . . na-achịkwa onwe ya n’ọnọdụ ọjọọ, jiri ịdị nwayọọ na-ezi ndị na-adịghị ekwenye ekwenye ihe.”—2 Timoti 2:24, 25.
Ụfọdụ ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ nwere ikike dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, Timoti nwedịrị ikike ‘inye ụfọdụ ndị iwu ka ha ghara izi ozizi dị iche.’ (1 Timoti 1:3) Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Timoti ṅomiri Chineke n’ihe nile o mere, n’ihi na o doro anya na o mere ihe kwekọrọ ná ndụmọdụ Pọl nyere ya ka ‘o jiri ịdị nwayọọ na-ezi ihe’ nakwa ka ‘ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro’ ka ọ na-arụ ọrụ ya dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ. Ebe ọ bụ na ọ ka bụ onye na-eto eto, ọ ga-eme omume dị ka nwa na-akwanyere ndị tọrọ ya ùgwù, mesookwa ndị ọ tọrọ ihe dị ka nwanna nwoke na-ahụ n’anya. (1 Timoti 5:1, 2) Ọ bụrụ na e jiri ịhụnanya dị otú ahụ na-elekọta ọgbakọ, ọgbakọ ga-adị ka ezinụlọ ebe obi ụtọ na ịhụnanya jupụtara, ọ bụghị dị ka ụlọ ọrụ ebe ọ na-adịghị onye na-eche banyere ibe ya na ebe e nwere ndị obi ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 4:14; 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.
“Ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka hà bụ ndị nwe ha, ndị ukwu na-achịkwa ha n’aka ike. Ọ gaghị adị otú a n’etiti unu; kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi.”—Matiu 20:25, 26.
Ndị ọchịchị nchịgbu e nwere n’ụwa ‘na-eme ka hà bụ ndị nwe’ ndị ọzọ site n’ịmanye ha ime ihe ha onwe ha chọrọ ma ọ bụ sie ọnwụ ka ha mee ihe otú ha onwe ha si chọọ. Ha na-eyi ndị ha na-achị egwu na ha ga-emesi ha ike ma ọ bụrụ na ha enupụ isi. Otú ọ dị, ihe Jizọs Kraịst kwusiri okwu ike banyere ya bụ ijere ndị ọzọ Matiu 20:27, 28) O ji ịhụnanya mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe nile. Ọ bụrụ na ị gbasoo ihe nlereanya Jizọs, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe karị ikwenyere gị. (Ndị Hibru 13:7, 17) Nke ahụ ga-emekwa ka ọ dịkwuoro ha mfe ime ihe ị chọrọ ka ha mee, ọbụna mee karịa ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha omume. Ha ga-ejikwa obi ha na-eme nke a ọ bụghị ná mmanye.—Matiu 5:41.
ozi ọ bụghị ịmanye ha ime ihe. (“Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị . . . ime ndị bụ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha, kama na-aghọnụ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ.”—1 Pita 5:2, 3.
Ndị nlekọta maara na ha ga-aza ajụjụ maka ọnọdụ ime mmụọ nke ndị nile nọ n’ọgbakọ. Ha ejighị ibu ọrụ a egwuri egwu. Ha na-agbalịsi ike iji obi ha dum na ịhụnanya elekọta atụrụ Chineke. Dị ka Pọl onyeozi, ha na-agbalịsi ike iwusi okwukwe nke ndị a gwara ha ka ha na-elekọta ike, ọ bụghị ime ka hà bụ ndị nwe okwukwe ụmụnna ha.—2 Ndị Kọrint 1:24.
Mgbe ọ dị mkpa ka e nye ndụmọdụ kwesịrị ekwesị, ndị okenye na-eji mmụọ dị nwayọọ eme nke ahụ iji gbazie onye ahụ na-adịghị agazi agazi ma ọ bụ iji nyere Ndị Kraịst ibe ha aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-eburu ihe Pọl onyeozi chetaara ha n’uche: “Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-elekwasị onwe ya anya, a dịghị ama ama a nwaakwa gị.”—Ndị Galeshia 6:1; Ndị Hibru 6:1, 9-12.
“Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam . . . yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:13, 14.
Olee otú i si emeso ndị na-adịghị emezucha nnọọ ihe a chọrọ n’aka Ndị Kraịst? Ị̀ na-aghọta na ha ezughị okè, dị ka Jehova na Jizọs Kraịst ghọtara? (Aịsaịa 42:2-4) Ka ị̀ na-esi ọnwụ ịhụ na e mezuru ihe nile e dere n’iwu n’ihe nile? (Abụ Ọma 130:3) Cheta, o kwesịrị ekwesị igosipụta ịdị nwayọọ mgbe o kwere omume ma kwụsie ike nanị mgbe ọ dị mkpa. Iji ịhụnanya eme ihe ga-enye aka mee ka gị na ndị ị na-elekọta nwee nkekọ chiri anya, bụ́ nke ga-eme ka onye ọ bụla na-atụkwasị ibe ya obi.
Ọ bụrụ na i nwere ikike ụfọdụ, gbalịsie ike iṅomi Jehova Chineke na Jizọs Kraịst n’otú i si eji ikike ahụ eme ihe. Cheta ọmarịcha ụzọ ọbụ abụ ahụ si kọwaa otú Jehova si eji ike ya eme ihe n’ebe ndị ya nọ. Devid bụrụ, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m. N’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ ka Ọ na-eme ka m makpuru: n’akụkụ mmiri nke izu ike ka Ọ na-edu m nwayọọ. Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m: Ọ na-edu m n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya.” Anyị na-agụkwa ihe yiri nke ahụ banyere Jizọs, sị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ, amakwaara m atụrụ m, atụrụ m makwaara m, dị nnọọ ka Nna m maara m, m marakwa Nna m; m na-atọgbọkwa mkpụrụ obi m n’ihi atụrụ ahụ.” N’ezie, olee ndị ga-aka Jehova Chineke na Jizọs Kraịst bụrụ ezi ihe nlereanya nke iji ịhụnanya eji ike eme ihe?—Abụ Ọma 23:1-3; Jọn 10:14, 15.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]
Otú Jehova si eji ike ya eme ihe mgbe nile na-ekwekọ nnọọ n’ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya ya
[Foto dị na peeji nke 18]
Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị nnọọ mkpa ka ndị okenye nye ndị na-adịghị agazi agazi ndụmọdụ ịhụnanya
[Foto dị na peeji nke 19]
Pọl nyere Timoti ndụmọdụ ime ihe ka nwa na-akwanyere ndị tọrọ ya ùgwù na nwanna nwoke na-ahụ n’anya
[Foto dị na peeji nke 20]
Jizọs Kraịst ji ikike ya mee ihe n’ụzọ na-egosi na o nwere amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, ma na-ahụ n’anya