“Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ” nke Baara Anyị Uru
“Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ” nke Baara Anyị Uru
Ọ GAARA esi nnọọ ike ịghọta ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ pụtara nke ọma ma a sị na akụkụ Bible ndị ọzọ akọwaghị ha! A pụrụ ịgụ akụkọ ndị mere eme ndị dị n’Okwu Chineke dị ka nanị akụkọ nkịtị. Ma akụkọ ụfọdụ dị na ya nwere eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị na-apụtachaghị ìhè. Otu n’ime ha bụ ihe e dekọrọ banyere ndị inyom abụọ bi n’ezinụlọ nna ochie bụ́ Ebreham. Pọl onyeozi kpọrọ ya “ihe ngosi bụ́ ihe atụ.”—Ndị Galeshia 4:24.
Anyị kwesịrị ịtụle ihe ngosi a n’ihi na ihe ndị ọ na-anọchi anya ha dị ndị nile chọrọ inweta ngọzi Jehova Chineke ezigbo mkpa. Tupu anyị atụlee ihe mere nke a ji dị otú ahụ, ka anyị tụlee ọnọdụ ndị kpaliri Pọl ịkọwa ihe ihe ngosi a pụtara.
E nwere nsogbu n’etiti Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi n’obodo Galeshia. Ụfọdụ n’ime ha “na-edebesi ụbọchị na ọnwa na oge a kara aka na afọ ike”—bụ́ ihe ndị Iwu Mozis kwuru ka a na-eme. Ha kwuru na ọ dị ndị kwere ekwe mkpa irube isi n’Iwu ahụ iji nweta ngọzi Chineke. (Ndị Galeshia 4:10; 5:2, 3) Otú ọ dị, Pọl maara na iwu ejighị Ndị Kraịst ime ememe ndị ahụ. Iji kwado nke a, o kwuru banyere otu ihe ndekọ onye ọ bụla bụ́ onye Juu maara nke ọma.
Pọl chetaara ndị Galeshia na Ebreham, bụ́ nna ndị Juu, mụrụ Ishmael na Aịzik. Ọ bụ ohu ya nwanyị bụ́ Hega mụrụ Ishmael, nwanyị ahụ nweere onwe ya bụ́ Sera amụọkwanụ Aịzik. O doro anya na ndị Galeshia ahụ bụ́ ndị na-achọ ka e rube isi n’Iwu Mozis maara akụkọ banyere Sera, na ọ bụ nwanyị aga na mbụ, na o nyekwara Ebreham ohu ya bụ́ Hega ka ọ mụtara ya nwa. Ha ga-amakwa na Hega malitere ileda nne ya ukwu, bụ́ Sera, anya mgbe ọ tụụrụ ime Ishmael. Ma, dị ka nkwa Chineke si dị, Jenesis 16:1-4; 17:15-17; 21:1-14; Ndị Galeshia 4:22, 23.
Sera mesịrị mụọ Aịzik n’agadi ya. Mgbe e mesịrị, Ebreham chụpụrụ Hega na Ishmael n’ihi na Ishmael kpagburu Aịzik.—Ndị Inyom Abụọ, Ọgbụgba Ndụ Abụọ
Pọl kọwara ndị a kpọrọ aha ‘n’ihe ngosi a bụ́ ihe atụ.’ O dere, sị: “Ndị inyom a pụtara ọgbụgba ndụ abụọ, nke ahụ sitere n’Ugwu Saịnaị, bụ́ nke na-amụ ụmụ nye ịnọ n’ohu, nke bụkwa Hega. . . . o kwekọkwara na Jeruselem nke oge a, n’ihi na ya na ụmụ ya nọ n’ohu.” (Ndị Galeshia 4:24, 25) Hega nọchiri anya Izrel anụ ahụ́, nke Jeruselem bụ isi obodo ya. Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ a gbara n’Ugwu Saịnaị mere ka mba ndị Juu nọrọ n’okpuru Jehova. N’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, e chetaara ndị Izrel mgbe nile na ha bụ ohu nke mmehie, nakwa na mgbapụta dị ha mkpa.—Jeremaịa 31:31, 32; Ndị Rom 7:14-24.
Oleekwanụ ndị “nwanyị ahụ nweere onwe ya” bụ́ Sera na nwa ya nwoke, bụ́ Aịzik, nọchiri anya ha? Pọl gosiri na Sera, bụ́ “nwanyị aga,” nọchiri anya nwunye Chineke, bụ́ akụkụ nzukọ ya nke dị n’eluigwe. Nwanyị eluigwe a bụbu nwanyị aga n’echiche bụ́ na tupu Jizọs abịa, o nweghị “ụmụ” e ji mmụọ nsọ tee mmanụ n’ụwa. (Ndị Galeshia 4:27; Aịsaịa 54:1-6) Otú ọ dị, na Pentikọst afọ 33 O.A., a wụsara otu ìgwè ndị ikom na ndị inyom mmụọ nsọ, e sikwa otú ahụ mụọ ha ọzọ dị ka ụmụ nke nwanyị eluigwe a. Ụmụ nke nzukọ a ghọrọ ụmụ Chineke, ha ghọkwara ndị ha na Jizọs Kraịst ga-eso chịa n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Ndị Rom 8:15-17) Pọl onyeozi, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị a, dere, sị: “Jeruselem nke dị n’elu nweere onwe ya, ọ bụkwa nne anyị.”—Ndị Galeshia 4:26.
Ụmụ nke Ndị Inyom Ahụ
Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, Ishmael kpagburu Aịzik. N’otu aka ahụ, na narị afọ mbụ O.A., ụmụ Jeruselem ahụ nọ n’ohu kwara ụmụ Jeruselem ahụ dị n’elu emo ma kpagbuo ha. Pọl kọwara, sị: “Dị nnọọ ka ọ dị mgbe ahụ, nke ahụ a mụrụ n’ụzọ anụ ahụ́ [Ishmael] malitere ịkpagbu nke ahụ a mụrụ n’ụzọ mmụọ nsọ [Aịzik], otú ahụ ka ọ dịkwa ugbu a.” (Ndị Galeshia 4:29) Mgbe Jizọs Kraịst bịara n’ụwa ma malite ikwusa banyere Alaeze ahụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu kpasoro ya àgwà otú ahụ nwa Hega bụ́ Ishmael si kpasoo Aịzik bụ́ ezi nwa Ebreham. Ha kwara Jizọs Kraịst emo ma kpagbuo ya, ikekwe na-ele onwe ha anya na ha bụ ezi ụmụ Ebreham ma na-ele Jizọs anya dị ka onye na-azọrọ ya azọrọ.
Obere oge tupu ndị ọchịchị nke mba Izrel anụ ahụ́ egbuo Jizọs, o kwuru, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e zigaara ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya. Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.”—Matiu 23:37, 38.
Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke ihe ndị mere na narị afọ mbụ na-egosi na nanị mba Izrel anụ ahụ́ bụ́ nke Hega nọchiri anya ya amụtazughị ụmụ ndị ha na Jizọs ga-eso chịa. Jehova chụpụrụ, ma ọ bụ jụ, ndị Juu dị mpako bụ́ ndị chere na o ruuru ha iso Kraịst chịa n’ihi na ha bụ ndị Juu. Ma, ụfọdụ ndị Izrel anụ ahụ́ ghọrọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa. Otú ọ dị, ohere a ha nwetara abụghị n’ihi na ha bụ ndị Juu, kama ọ bụ n’ihi okwukwe ha nwere na Jizọs.
A matara ụfọdụ n’ime ndị a ha na Kraịst ga-eso chịa n’afọ Pentikọst 33 O.A. Ka oge na-aga, Jehova tere ndị ọzọ mmanụ dị ka ụmụ nke Jeruselem a dị n’elu.
Ihe mere Pọl ji kọwaa ‘ihe ngosi a bụ́ ihe atụ’ bụ iji gosi na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ karịrị ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke Mozis bụ onye ogbugbo ya. Ọ dịghị onye pụrụ inweta ngọzi Chineke site n’idebe Iwu Mozis, n’ihi na mmadụ nile bụ ndị na-ezughị okè, Iwu ahụ mekwara ka o doo anya na ha bụ ohu nke mmehie. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl kọwara na Jizọs bịara ka “o wee tọhapụ ndị nọ n’okpuru iwu site n’ịzụrụ ha.” (Ndị Galeshia 4:4, 5) N’ihi ya, okwukwe anyị nwere n’uru nke àjà Kraịst chụrụ tọhapụrụ anyị n’ọmụma ikpe nke Iwu ahụ.—Ndị Galeshia 5:1-6.
Uru Ọ Baara Anyị
Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị ná nkọwa sitere n’ike mmụọ nsọ Pọl nyere banyere ihe ngosi a? Otu ihe mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị na ya bụ na ọ na-eme ka anyị ghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị na-agaraghị aghọta. Nkọwa ahụ na-emesi anyị obi ike na akụkụ nile nke Bible na-ekwu otu ihe nakwa na ha kwekọrịtara.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Ọzọkwa, ihe ndị ihe ngosi ihe atụ a na-anọchi anya ha dị anyị mkpa iji nweta obi ụtọ n’ọdịnihu. A sị na a mụghị ụmụ Jeruselem nke dị n’elu, anyị gaara anọgide n’ohu nke mmehie na ọnwụ. Otú ọ dị, n’okpuru ọchịchị Kraịst na ndị ya na ha ga-eso keta nkwa ahụ Chineke kwere Ebreham, “mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:18) Nke a ga-eme mgbe e wepụsịịrị ha mmehie, ezughị okè, iru újú na ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 25:8, 9) Lee oge magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ!
[Foto dị na peeji nke 11]
A gbara ọgbụgba ndụ iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 12]
Gịnị ka “ihe ngosi bụ́ ihe atụ” ahụ Pọl onyeozi kwuru banyere ya pụtara?