Ọnwụ—Ihe Ọjọọ Na-echere Mmadụ Nile!
Ọnwụ—Ihe Ọjọọ Na-echere Mmadụ Nile!
ARNOLD TOYNBEE, bụ́ onye Britain na-akọ akụkọ ihe mere eme, dere, sị: “Malite nnọọ mgbe a mụrụ mmadụ, onye ahụ pụrụ ịnwụ mgbe ọ bụla.” O kwukwara, sị: “Onye ahụ ga-emesịkwa nwụọ.” Lee nnọọ mwute anyị na-enwe mgbe ọnwụ gburu onye ezinụlọ anyị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ ezi enyi anyị!
Ọnwụ anọwo na-emesi ụmụ mmadụ ike kemgbe ọtụtụ puku afọ. Anyị na-eyi ndị a kụjisịrị ụkwụ na aka mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ dịghị onye ọnwụ sọ. Ọ dịghị onye pụrụ ịgbanahụ ya. Otu onye edemede nke narị afọ nke 19 dere, sị: “Anyị na-adị ka ụmụaka mgbe anyị na-eru újú—n’enweghị ike ịgbanwe ọnọdụ ahụ n’agbanyeghị ókè anyị gụruru akwụkwọ. Ọ na-eme ka ndị kasị mara ihe yie ndị na-amaghị ihe.” Anyị na-adị ka ụmụaka—yie ndị a kụjisịrị ụkwụ na aka, n’enweghị ihe anyị ga-emeli banyere ya. Akụ̀ na ụba ma ọ bụ ikike apụghị ịkpọlite onye nwụrụ anwụ. Ndị maara ihe enweghị ike ịkwụsị ya. Ndị dike na-akwa ákwá otú ndị na-adịghị ike si akwa.
Eze Devid nke Izrel oge ochie kwakwara ụdị ákwá ahụ mgbe nwa ya nwoke bụ́ Absalọm nwụrụ. Mgbe eze ahụ nụrụ na nwa ya anwụọla, ọ kwara ákwá ma kwuo, sị: “Nwa m Absalọm, nwa m, nwa m Absalọm! ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mụ onwe m anwụwo n’ọnọdụ gị, Absalọm, nwa m, nwa m!” (2 Samuel 18:33) Eze dị ike nke meririla ọtụtụ ndị iro siri ike amaghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ịsị na ọ gaara akara ya mma ma a sị na “ọnwụ, [bụ́] onye iro ikpeazụ,” gburu ya ma hapụ nwa ya nwoke.—1 Ndị Kọrint 15:26.
Ọ̀ dị ihe pụrụ imeri ọnwụ? Ọ bụrụ na ọ dị, olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụrụ anwụ? Ọ̀ dị mgbe anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ? A ga-eji Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.