Ekpebisiri M Ike Ịnọgide Na-ejere Onye Okike M Ozi
Akụkọ Ndụ
Ekpebisiri M Ike Ịnọgide Na-ejere Onye Okike M Ozi
DỊ KA CONSTANCE BENANTI SI KỌỌ
Ihe nile mere nnọọ ngwa ngwa! N’ime ụbọchị isii, Camille, bụ́ nwa anyị nwanyị dị ọnwa 22, malitere ịrịa oké ahụ́ ọkụ ma nwụọ. Obi gbawara m. Achọrọ m ịnwụ. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwe ka ụdị ihe ahụ mee? Ọ gbagwojuru m anya.
NDỊ MỤRỤ M si n’otu obodo dị na Sicily, Ịtali, nke a na-akpọ Castellammare del Golfo, kwabata. Ha kwatara New York City, bụ́ ebe ha nọ mụọ m na December 8, 1908. Ndị nọ n’ezinụlọ anyị bụ papa m na mama m na ụmụ ha asatọ, ụmụ nwoke ise na ụmụ nwanyị atọ. *
N’afọ 1927, papa m, bụ́ Santo Catanzaro, malitere ịga nzukọ nke obere ìgwè Ndị Mmụta Bible, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Giovanni De Cecca, bụ́ nwanna nwoke onye Ịtali nke na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, New York (nke a na-akpọ Betel), na-eduzi nzukọ n’ebe anyị bi, n’obodo New Jersey nke dịdebere New York. Ka oge na-aga, papa m malitere ikwusa ozi ọma ma banye n’ozi oge nile, ọ nọgidekwara n’ọrụ ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1953.
Mgbe mama m ka na-eto eto, ọ chọrọ
ịbụ onye nọn, ma ndị mụrụ ya ekweghị. Na mbụ, mama m mere ka m ghara iso papa m na-amụ Bible. Ma n’oge na-adịghị anya, ahụrụ m na àgwà papa m agbanweela. Ọ naghịzi ekwu ọtụtụ okwu, ọ dịwanyere nwayọọ, udo dịwanyekwara n’ezinụlọ anyị. Nke ahụ masịrị m.Ka ọ dịgodị, ezutere m Charles, bụ́ nwoke mụ na ya bụ ọgbọ nke a mụrụ na Brooklyn. Ezinụlọ ya si Sicily, dị ka ezinụlọ m si. N’oge na-adịghị anya, anyị kwere ibe anyị nkwa ọlụlụ, mgbe papa m sikwa mgbakọ Ndịàmà Jehova e mere na Columbus, Ohio, n’afọ 1931 lọta, anyị lụrụ. N’ime otu afọ, anyị mụrụ nwa anyị nwanyị bụ́ Camille. Mgbe ọ nwụrụ, obi gbawara m. Otu ụbọchị, ka Charles nọ na-ebe ákwá, ọ sịrị m: “Camille bụ nwa m otú o si bụrụ nke gị. Olee ihe ga-egbochi anyị ịdịrị ndụ anyị gaa n’ihu, na-akasi ibe anyị obi?”
Anyị Anabata Eziokwu Bible
Charles chetaara m na papa m kwuru banyere olileanya mbilite n’ọnwụ mgbe ọ na-ekwu okwu olili Camille. Ajụrụ m ya, sị: “Ì kweere n’ezie na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ?”
Ọ zara m, sị: “Ekweere m! Gịnị ma anyị chọpụtakwuo ihe Bible kwuru banyere ya?”
Ehighị m ụra n’abalị ahụ. N’elekere isii nke ụtụtụ echi ya, tupu papa m agawa ọrụ, agakwuuru m ya ma gwa ya na mụ na Charles chọrọ ịmụ Bible. Obi tọrọ ya ụtọ, ọ makụkwara m. Mama m, bụ́ onye ka na-ehi ụra, nụpeere ihe mụ na ya na-ekwu. Ọ jụrụ m ihe merenụ. Azara m ya, sị: “O nweghị ihe merenụ. Ọ bụ nanị na mụ na Charles ekpebiela ịmụ Bible.”
Ọ zara m, sị: “Ọ dị anyị nile mkpa ịmụ Bible.” Ya mere, anyị nile, gụnyere ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị—anyị mmadụ 11—malitere ịmụkọ ihe ọnụ dị ka ezinụlọ.
Ọmụmụ Bible ahụ kasiri m obi, mgbagwoju anya m na-enwe na újú m na-eru jikwa nke nta nke nta kwụsị, amalitekwara m inwe olileanya. Otu afọ ka nke ahụ gasịrị, n’afọ 1935, mụ na Charles malitere ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Na February 1937, mgbe anyị nụsịrị otu okwu nke e kwuru n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Brooklyn nke kọwara ihe baptizim ime mmiri pụtara n’Akwụkwọ Nsọ, e mere anyị na ọtụtụ ndị ọzọ baptizim n’otu họtel dịdebere ebe ahụ. Ihe mere m ji kwe ka e mee m baptizim abụghị nanị n’ihi na m nwere olileanya na otu ụbọchị m ga-ahụ nwa m nwanyị ọzọ, kamakwa n’ihi na achọrọ m ijere Onye Okike m, bụ́ onye m matarala ma hụ n’anya, ozi.
Ịbanye n’Ozi Oge Nile
Ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị m na-amụta na-atọ m ụtọ ma na-abara m uru, karịsịa, n’ihi na ọtụtụ ndị nabatara ozi Alaeze n’oge ahụ ma soro na-akpọsa ya. (Matiu 9:37) Na 1941, mụ na Charles ghọrọ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị ozi oge nile ha. N’oge na-adịghị anya, anyị zụrụ ụlọ e ji ụgbọala adọkpụ, Charles hapụkwaara nwanne m nwoke bụ́ Frank ụlọ ọrụ ezinụlọ anyị, bụ́ ebe a na-akwa traụza. Ka oge na-aga, obi tọrọ anyị ụtọ inweta akwụkwọ ozi na-agwa anyị na e meela anyị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị bu ụzọ jee ozi na New Jersey, e mesịziri ziga anyị New York State.
Na 1946, mgbe anyị gara otu mgbakọ na Baltimore, Maryland, a gwara anyị ka anyị bịa otu nzukọ pụrụ iche nke anyị na ndị nnọchiteanya nke Ndịàmà Jehova ga-enwe. Anyị hụrụ Nathan H. Knorr na Milton G. Henschel n’ebe ahụ. Ha gwara anyị banyere ije ozi ala ọzọ, nakwa karịsịa banyere ịrụ ọrụ nkwusa n’Ịtali. Ha gwara anyị ka anyị tụlee ma ànyị ga-enwe ike ịga Watchtower Bible School of Gilead.
A gwara anyị, sị: “Chebaranụ ya echiche ma gwa anyị ihe unu kpebiri.” Mgbe anyị si n’ọfịs ahụ pụọ, mụ na Charles lere ibe anyị anya, tụgharịa ma banyeghachi n’ọfịs ahụ ozugbo. Anyị gwara ha, sị: “Anyị echebarala ya echiche. Anyị dị njikere ịga Gilead.” Ụbọchị iri ka nke ahụ gasịrị, anyị nọ na klas nke asaa nke Gilead.
Anyị anaghị echefu ọnwa ndị anyị ji nara ọzụzụ n’ebe ahụ echefu. Ihe kasị masị anyị bụ ndidi na ịhụnanya nke ndị nkụzi anyị, bụ́ nke kwadebere anyị maka ihe isi ike ndị anyị ga-ezute n’ozi ala ọzọ. Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na July 1946, e kenyere anyị ikwusa ozi ọma na New York City ruo oge ụfọdụ, bụ́ ebe e nwere ọtụtụ ndị Ịtali. Ụbọchị a kara aka mesịziri ruo! Na June 25, 1947, anyị gawara Ịtali, bụ́ ebe e kenyere anyị ozi ala ọzọ.
Ime Ka Ebe E Kenyere Anyị Ọrụ Mara Anyị Ahụ́
Anyị ji ụgbọ mmiri ndị agha jibu mee ihe gaa. Mgbe anyị nọsịrị abalị 14 n’oké osimiri, ụgbọ anyị kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị Ịtali dị na Genoa. Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ nke biri afọ abụọ tupu mgbe ahụ, mebiri ọtụtụ ihe n’obodo ahụ. Dị ka ihe atụ, windo ọdụ ụgbọ okporo ígwè ha enwekwaghị ugegbe n’ihi bọmbụ ndị a tụrụ ebe ahụ. Anyị banyere ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ibu na Genoa ma gawa Milan, bụ́ ebe alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị.
Ọnọdụ obibi ndụ n’Ịtali mgbe agha ahụ gasịrị dị nnọọ njọ. A nọ na-arụzigharị ebe dị iche iche, ma ọtụtụ ndị dara ogbenye. N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịrịa oké ọrịa. Otu dọkịta kwuru na obi m emebiela ruo n’ókè nke na o chere na ihe kasị mma m ga-eme bụ ịlaghachi United States. Obi dị m ụtọ na ihe ahụ o kwuru abụghị eziokwu. Ka afọ 58 gasịrịla, aka m nọ n’ebe e kenyere m ọrụ n’Ịtali.
Anyị ka nọrọ afọ ole na ole n’ebe e kenyere anyị ọrụ mgbe ụmụnne m ndị nwoke nọ na United States chọrọ inye anyị ụgbọala. Ma Charles jụrụ, mkpebi ahụ o mere masịkwara m. O nweghị Onyeàmà anyị maara mgbe ahụ nwere ụgbọala n’Ịtali, Charles chekwara na ọ ga-akasị mma ka anyị bie ụdị ndụ ụmụnna anyị Ndị Kraịst na-ebi. Anyị nọgidere ruo afọ 1961 tupu anyị azụọ otu obere ụgbọala.
Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ anyị nwere na Milan bụ otu ọnụ ụlọ a na-eteghị ala ya ete nke dị n’okpuru ala ụlọ. Anyị enweghị ebe ịsa ahụ́ nke anyị ji enwe mmiri pọmpụ, mmiri na-adọkwa n’ala ụlọ anyị ma mmiri zoo. Ụmụ òké sokwa anyị biri ebe ahụ, na-amagharị n’ebe nile. Ọ bụ bọlb ọkụ eletrik abụọ ka anyị ji ahụ ụzọ ná nzukọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ, ọ bụ ihe na-agba ume ịhụ ka ndị nwere obi eziokwu na-abịa nzukọ anyị ma mesịa sonyere anyị n’ozi.
Ahụmahụ Ndị Anyị Nwere n’Ozi Ala Ọzọ
Otu mgbe, anyị nyere otu nwoke akwụkwọ nta bụ́ Peace—Can It Last? Ka anyị na-ala, nwunye ya, bụ́ Santina, bu ọtụtụ akpa ihe ofe lọta. Ahụ́ nọ na-agbakasịtụ ya, ọ gwakwara anyị na ya nwere ụmụaka nwanyị asatọ ilekọta, na ya enweghịkwa ohere. Mgbe m gara ileta Santina ọzọ, di ya anọghị n’ụlọ, ọ nọkwa na-akpa ihe. O kwuru, sị: “Enweghị m ohere ige unu ntị. Ọzọ bụ na amaghị m otú e si agụ ihe.”
Ekpegaara m Jehova ekpere n’ime obi m ma jụọ Santina ma m̀ nwere ike ịkwụ ya ụgwọ ka ọ kpaara di m uwe oyi. Ka izu abụọ gasịrị, enwetara m uwe oyi ahụ, mụ na Santina malitekwara iji akwụkwọ bụ́ “The Truth Shall Make You Free” amụchi Bible anya. Santina mụtara ịgụ ihe, n’agbanyeghịkwa na di ya megidere ya, o nwere ọganihu, e meekwa ya baptizim. Ụmụ ya ndị nwanyị ise ghọrọ Ndịàmà, Santina enyewokwara ọtụtụ ndị ọzọ aka ịnabata eziokwu Bible.
Na March 1951, e kenyere anyị na mmadụ abụọ ọzọ bụ́ ndị ozi ala ọzọ—Ruth Cannon * na Loyce Callahan, bụ́ onye mesịrị lụọ Bill Wengert—ozi na Brescia, bụ́ ebe a na-enweghị Ndịàmà. Anyị chọtara otu ụlọ nwere ihe nile e ji ebi n’ụlọ, ma ọnwa abụọ ka nke ahụ gasịrị, onye nwe ụlọ ahụ nyere anyị awa 24 iji kwapụ n’ụlọ ahụ. Ebe ọ bụ na e nweghị Ndịàmà ọzọ bi n’ógbè ahụ, ọ dịghị ihe ọzọ anyị maara anyị ga-eme ma ọ́ bụghị ibi na họtel ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa abụọ.
Ihe anyị ji emere nri bụ nanị kọfị, mgbadume, cheese na mkpụrụ osisi. N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ, anyị nwere obi ụtọ na afọ ojuju. Ka oge na-aga, anyị chọtara otu obere ụlọ, mgbe anyị na-echetakwa ọnwụ Kraịst n’afọ 1952, mmadụ 35 sonyeere anyị n’obere ọnụ ụlọ anyị ji mere Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Imeri Ihe Ịma Aka
N’oge ahụ, ndị ụkọchukwu ka nwere ikike dị nnọọ ukwuu n’ahụ́ ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, ka anyị na-ekwusa ozi ọma na Brescia, ndị ụkọchukwu gbara ụmụ okoro ụfọdụ ume ka ha tụọ anyị nkume. Otú ọ dị, ka oge na-aga, mmadụ 16 malitere iso anyị amụ Bible, ka obere oge gasịkwara, ha ghọrọ Ndịàmà. Ị̀ ma onye so na ha? Ọ bụ otu n’ime ụmụaka ahụ kwuru na ha ga-atụ anyị nkume! Ọ bụ okenye ugbu a n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Brescia. Mgbe anyị hapụrụ Brescia na 1955, ndị nkwusa Alaeze 40 nọ na-arụ ọrụ nkwusa ahụ.
Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị jere ozi ruo afọ atọ na Leghorn (Livorno), bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà e nwere bụ ụmụ nwanyị. Nke a pụtara na anyị bụ́ ụmụnna nwanyị aghaghị ịrụ ọrụ ụfọdụ ụmụnna nwoke na-arụ. Anyị kwagaziri Genoa, bụ́ ebe anyị malitere ozi anyị afọ 11 tupu mgbe ahụ. Ugbu a, e nweela ọgbakọ ebe ahụ. Ụlọ Nzukọ Alaeze ha dị n’okpukpu nke mbụ nke ụlọ ebe ahụ anyị bibu.
Mgbe anyị rutere Genoa, amalitere m ịmụrụ otu nwanyị di ya bụbu onye na-akụ ọkpọ, nke na-elekọtakwa otu ebe a na-amụ ịkụ ọkpọ, ihe. Nwanyị ahụ nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ ma ghọọ nwanna anyị nwanyị. Otú ọ dị, di ya megidere ya ruo ogologo oge. O mesịziri malite iso nwunye ya na-abịa nzukọ. Kama ịbata n’ime ụlọ nzukọ, ọ na-anọ n’èzí ege ntị. Ka oge na-aga, mgbe anyị hapụrụla Genoa, anyị nụrụ na ọ rịọla ka a mụwara ya Bible. E mesịrị mee ya baptizim, ya aghọọkwa okenye ọgbakọ nke na-ahụ n’anya. Ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya.
Amụkwaara m otu nwanyị onye uwe ojii kwere nkwa ọlụlụ Bible. Ná mmalite, onye
uwe ojii ahụ gositụrụ mmasị, ma mgbe ha gbasịrị akwụkwọ, àgwà ya gbanwere. O megidere nwunye ya, nwunye ya kwụsịkwara ịmụ ihe. Mgbe ọ maliteghachiri ịmụ Bible, di ya yiri ya egwu, gwa ya na ọ bụrụ na ya ahụ anyị ebe anyị na-amụ ihe, na ya ga-agbagbu anyị abụọ. O nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ ma ghọọ Onyeàmà e mere baptizim. Ọ bazighị uru ikwu na di ya agbagbughị anyị. Kama nke ahụ, ọtụtụ afọ ka e mesịrị, mgbe m gara mgbakọ na Genoa, otu onye si n’azụ kpuchie m aka n’anya ma sị m kọọ onye ya bụ. Anya mmiri pụrụ m n’anya mgbe m hụrụ na ọ bụ di nwanyị ahụ. Mgbe ọ makụsịrị m, ọ gwara m na ya gosipụtara nrara ya raara onwe ya nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptizim n’ụbọchị ahụ!Malite na 1964 ruo 1972, enwere m ihe ùgwù nke iso Charles ka ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị letara ọgbakọ nile dị n’ebe ugwu Ịtali—na Piedmont, Lombardy, nakwa na Liguria. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị maliteghachiri ọrụ ọsụ ụzọ n’ebe dịdebere Florence, mesịakwa jee ozi na Vercelli. Na 1977, e nwere nanị otu ọgbakọ na Vercelli, ma mgbe anyị hapụrụ ebe ahụ na 1999, e nwere ọgbakọ atọ ebe ahụ. N’afọ ahụ, agbara m afọ 91, a gbakwara anyị ume ịgafe n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Rom, bụ́ otu obere ụlọ mara mma nke dị n’ebe dịtụ jụụ.
Ọdachi Ọzọ
Na March 2002, Charles, bụ́ onye ahụ́ siburu nnọọ ike, dara ọrịa. Ọrịa ya kawanyere njọ ruo mgbe ọ nwụrụ na May 11, 2002. Ruo afọ 71, anyị bekọrọ ákwá ọnụ mgbe ihe siri ike ma ṅụrịkọọ ọṅụ mgbe ihe ọma meere anyị. Ọnwụ ya bụ mfu na-agbawa obi nye m.
M na-ejikarị anya nke uche m ahụ Charles, ka o yi kootu ma kpuru okpu ya nke wuru n’ihe dị ka n’afọ 1930. Ọ na-adị m ka m̀ na-ahụ ya ka ọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma ọ bụ nụ ka ọ na-achị ụdị ọchị ọ na-achịkarị. Enyemaka Jehova na ịhụnanya nke ọtụtụ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ n’anya enyeworo m aka ịgabiga oge ọjọọ a. Eji m oké atụmanya na-echere mgbe m ga-ahụ Charles ọzọ.
Ịga n’Ihu n’Ozi M
Ijere Onye Okike m ozi bụ ihe kasị mma meerela m ná ndụ. Ruo ọtụtụ afọ, ‘edetụwo m ire ma hụ na Jehova dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Ahụwo m ihe ndị na-egosi na ọ hụrụ m n’anya ma na-eche banyere m. Ọ bụ ezie na nwa m nwụnahụrụ m, Jehova enyewo m ọtụtụ ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị n’ụzọ ime mmụọ—n’akụkụ nile nke Ịtali—bụ́ ndị meworo mụ na Jehova obi ụtọ.
Ihe kasị amasị m bụ ịgwa ndị ọzọ banyere Onye Okike m. Ọ bụ ya mere m ji nọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-eduzi ọmụmụ Bible. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ewute m na enweghị m ike ime karịa ihe m na-eme ugbu a n’ihi ahụ́ ike m. Ma amaara m na Jehova ma ebe ike m ruru nakwa na ọ hụrụ m n’anya ma jiri ihe m nwere ike ime kpọrọ ihe. (Mak 12:42) Ana m agbalịsi ike ime ka okwu ndị a dị n’Abụ Ọma 146:2 bụrụ nke m: “M ga-eto Jehova n’ogologo ndụ m nile: m ga-abụku Chineke m abụ ọma mgbe m nọ na-adị ndụ.” *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 E bipụtara ahụmahụ nwanne m nwoke bụ́ Angelo Catanzaro n’Ụlọ Nche nke October 1, 1975, peeji nke 584-587.
^ par. 28 Maka akụkọ ndụ ya, lee Ụlọ Nche, (Bekee) May 1, 1971, peeji nke 277-280.
^ par. 41 Nwanna Nwanyị Benanti nwụrụ na July 16, 2005, ka a na-akwado ibipụta isiokwu a. Ọ gbara afọ 96.
[Foto dị na peeji nke 13]
Camille
[Foto dị na peeji nke 14]
Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị, na 1931
[Foto dị na peeji nke 14]
Ọ bụ ezie na mama m enweghị mmasị ná mmalite, o mesịrị kweta na anyị nile kwesịrị ịmụ Bible
[Foto dị na peeji nke 15]
Anyị na Nwanna Knorr n’oge ngụsị akwụkwọ Gilead, na 1946
[Foto dị na peeji nke 17]
Mụ na Charles obere oge tupu ya anwụọ