Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ịhụnanya Unu Nile Na-aba Ụba’

‘Ịhụnanya Unu Nile Na-aba Ụba’

‘Ịhụnanya Unu Nile Na-aba Ụba’

ỌTỤTỤ ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara Japan aka ọjọọ na 2004. Ajọ ifufe, idei mmiri, na ala ọma jijiji so na ha. Ọ kpara ndụ ọtụtụ ndị aka ọjọọ, gụnyere Ndịàmà Jehova. (Eklisiastis 9:11) Otú ọ dị, ọdachi ndị a nyere Ndịàmà ohere igosirịta ibe ha mmetụta ụmụnna.—1 Pita 1:22.

Dị ka ihe atụ, n’ihi oké mmiri ozuzo zoro na July, otu osimiri dị n’etiti Japan tofere ikperé ya. Idei mmiri kwaturu ihe karịrị ụlọ 20 nke Ndịàmà Jehova. N’ime otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, mmiri toruru ihe dị ka otu mita. Ndịàmà Jehova nọ n’ọgbakọ ndị gbara ya gburugburu gbatara ozugbo inye aka. Ọtụtụ narị mmadụ ndị wepụtara onwe ha sachasịrị ụlọ ndị ahụ apịtị juru na ha. E ji nanị izu abụọ hichachaa Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ma rụzigharịa ya.

N’October 23, oké ala ọma jijiji mekwara n’otu ógbè ahụ. Ọ dịkarịa ala, mmadụ 40 nwụrụ, ihe karịkwara otu narị puku mmadụ kwapụrụ n’ụlọ ha. Mmiri, gas, na ọkụ eletrik adịghịzi. N’agbanyeghị na ebe ala ọma jijiji ahụ mere dị nanị kilomita 50 site n’ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị, Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ a rụzigharịrị arụzigharị adaghị. Ozugbo ahụ, ọ ghọrọ ebe a na-edebe ihe enyemaka ruo nwa oge. Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta letara ndị kwere ekwe ibe ha n’egbughị oge iji hụ ma ò nwere nke merụrụ ahụ́, ma obi ruru ha ala mgbe ha chọpụtara na ọ dịghị onye merụrụ ahụ́ ma ọ bụ nke nwụrụ anwụ. N’isi ụtụtụ echi ya, Ndịàmà isii bụ́ ndị idei mmiri ahụ mere na July metụtara ji ịnụ ọkụ n’obi wepụta onwe ha ibuga nri na mmiri n’ebe ahụ ala ọma jijiji mere. N’ime awa ole na ole ala ọma jijiji ahụ mechara, e nwetara ihe enyemaka.

Otu onye nlekọta kọrọ, sị: “Ndị idei mmiri ahụ metụtara lere ọrụ enyemaka ahụ a rụrụ iji nyere ndị ala ọma jijiji ahụ metụtara anya dị ka ohere iji gosi ekele ha nwere maka aka e nyeere ha onwe ha. Ha rụsiri ọrụ ike site n’isi ụtụtụ ruo n’ime abalị. Ọnụ bụkwa ha sọ ọchị!”

Ma idei mmiri ma ala ọma jijiji enweghị nke pụrụ ịdọbi ụdọ ịhụnanya jikọtara òtù ụmụnna Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Kama nke ahụ, mgbe e nwere ọdachi ndị dị otú ahụ, Ndị Kraịst na-ahụ ihe ahụ Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Tesalonaịka: “Ịhụnanya nke onye ọ bụla n’ime unu na unu nile na-abakwa ụba n’ebe ibe unu nọ.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:3.