Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jekọb Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe

Jekọb Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe

Jekọb Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe

NDỤ Jekọb jupụtara n’esemokwu na ahụhụ. Iwe na-akpata igbu ọchụ nke ejima ya mere ka Jekọb gbalaga n’ihi ndụ ya. Kama ịlụ nwa agbọghọ ọ hụrụ n’anya, a ghọgburu ya ibu ụzọ lụọ onye ọzọ ma mesịa bụrụ onye nwere ndị nwunye anọ na ọtụtụ nsogbu ndị si na ya pụta. (Jenesis 30:1-13) Ruo afọ 20, ọ rụụrụ nwoke na-aghọgbu ya ọrụ. Ya na mmụọ ozi gbara mgba nke kpataara ya mmerụ ahụ́ na-adịghị ala ala. E dinara nwa ya nwanyị n’ike, ụmụ ya ndị nwoke kpatara mgbuchapụ, ọ kwara ákwá n’ihi ọnwụ na-agbawa obi nke nwa ya nwoke na nwunye ya ọ hụkarịsịrị n’anya. N’ịbụ onye a manyere ịgbapụ n’obodo ya n’agadi n’ihi ụnwụ nri, o kwetara na ụbọchị ya adịwo “ole na ole, jọọkwa njọ.” (Jenesis 47:9) N’agbanyeghị ihe nile, Jekọb bụ nwoke tụkwasịrị Chineke obi nke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Okwukwe ya ò hiere ụzọ? Olee ihe ndị a pụrụ ịmụta site n’ịtụle nanị ole na ole n’ahụmahụ Jekọb?

Ọ Dị Nnọọ Iche n’Ebe Nwanne Ya Nwoke Nọ

Ihe kpatara esemokwu ya na nwanne ya nwoke bụ na Jekọb ji akụ̀ ime mmụọ kpọrọ ihe, ebe Ịsọ ledara ha anya. Jekọb nwere mmasị ná nkwa ọgbụgba ndụ e kwere Ebreham ma tinye nnọọ onwe ya n’ilekọta ezinụlọ ndị Chineke họpụtara dị ka ndị nketa. N’ihi ya, Jehova ‘hụrụ ya n’anya.’ Jekọb “enweghị ụta,” bụ́ okwu na-enye echiche nke inwe omume magburu onwe ya. N’ụzọ dị iche, Ịsọ weere ihe nketa ime mmụọ ya dị ka ihe dị nnọọ nta nke na o resịrị ya Jekọb maka nanị nwa ntakịrị ihe. Mgbe Jekọb, site n’ihu ọma Chineke, weere ihe ruuru ya ma nweta ngọzi gaara abụ nke nwanne ya, Ịsọ were iwe ọkụ. Mgbe ahụ Jekọb hapụrụ ihe nile ọ hụrụ n’anya, ma ihe ndị mezirinụ wepụrụ nnọọ nkụda mmụọ ọ bụla ọ pụrụ inwewo.—Malakaị 1:2, 3; Jenesis 25:27-34; 27:1-45.

Ná nrọ, Chineke gosiri Jekọb ndị mmụọ ozi na-arịgo ma na-arịda ubube, ma ọ bụ okwute yiri steepụ nke dị n’agbata eluigwe na ụwa ma kwuo na ya ga-echebe Jekọb na mkpụrụ ya. “A ga-agọzikwa agbụrụ nile nke elu ụwa n’ime gị na n’ime mkpụrụ gị. Ma, lee Mụ onwe m nọnyeere gị, m ga-edebekwa gị n’ebe ọ bụla ị na-eje, m ga-emekwa ka ị lọta n’ala nke a, n’ihi na m gaghị ahapụ gị ruo mgbe m ga-emeworị ihe m gwaworo gị okwu banyere ya.”—Jenesis 28:10-15.

Lee nnọọ okwu mmesi obi ike nke a bụ! Jehova mesiri ya ike na nkwa o kwere Ebreham na Aịzik ga-eme ka ezinụlọ Jekọb baa ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ. E mere ka Jekọb mara na ndị mmụọ ozi pụrụ ijere ndị nwere ihu ọma Chineke ozi, e mesikwara ya obi ike na ọ ga-enweta nchebe Chineke. Iji gosi ekele ya, Jekọb kwere nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova.—Jenesis 28:16-22.

Jekọb anaraghị Ịsọ ihe nketa ya n’ike n’ụzọ ọ bụla. Tupu a mụọ ụmụaka abụọ ahụ, Jehova kwuru na ‘nke okenye ga-efe nke nta.’ (Jenesis 25:23) ‘Ọ́ gaaraghị aka mfe ma a sị na Chineke mere ka e buru ụzọ mụọ Jekọb?’ ka mmadụ pụrụ ịjụ. Ihe sochirinụ kụziri eziokwu ndị dị mkpa. Chineke adịghị ewere ngọzi ya nye ndị chere na o ruuru ha, ma ọ na-egosi ndị ọ chọrọ obiọma na-erughịrị mmadụ. Otú a ka ọnọdụ diọkpara si gaara Jekọb, ọ bụghị nwanne ya nke tọrọ ya, bụ́ onye na-ejighị ya kpọrọ ihe. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ihi na ndị Juu dị ka mba gosiri otu àgwà ahụ Ịsọ nwere, e ji Izrel ime mmụọ dochie ha. (Ndị Rom 9:6-16, 24) Taa, mmadụ na Jehova adịghị enwe ezi mmekọrịta dị ka ihe nketa onye ahụ na-etinyeghịrị mgbalị, ọ bụrụgodị na a mụnyere mmadụ n’ezinụlọ na gburugburu ebe a na-atụ egwu Chineke. Ndị nile chọrọ ngọzi Chineke aghaghị ịgbalịsi ike ịbụ ndị na-asọpụrụ Chineke, na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe n’ezie.

Leban Anabata Ya

Ka o rutere na Padan-eram ịchọ nwunye n’etiti ndị ikwu ya, Jekọb zutere nwa nwanne nne ya bụ́ Rechel, nwa Leban, n’otu olulu mmiri ma nupụ nnukwu okwute e ji kpuchie ya ka ụmụ anụ ndị ọ na-azụ wee ṅụọ mmiri. * Rechel jiiri ọsọ laa n’ụlọ ịkọrọ ha ọbịbịa Jekọb, Leban mekwara ngwa ịga zute ya. Ọ bụrụ na Leban na-echeta akụ̀ na ụba ndị ezinụlọ ha natara n’aka odibo Ebreham, ọ hụrụ ihe dị iche, n’ihi na Jekọb gba aka bịa. Ma o doro anya na Leban hụrụ onye ọ pụrụ irigbu—onye ọrụ dị uchu.—Jenesis 28:1-5; 29:1-14.

Jekọb kọrọ akụkọ ya. O doghị anya ma o kwutere aghụghọ o jiri nata ọnọdụ diọkpara, ma ka ọ nụchara “ihe nile ndị a,” Leban kwuru, sị: “N’ezie ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ m ka ị bụ.” Otu onye ọkà mmụta kwuru na a pụrụ iwere okwu a dị ka nnabata na-ekpo ọkụ iji mee ka Jekọb nọrọ ma ọ bụ nkwenye na Leban kwesịrị ichebe ya n’ihi na ha bụ nwanne. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ dịghị anya Leban echewe otú ọ pụrụ isi rigbuo nwa nwanne ya nwanyị.

Leban webatara ihe ga-akpata esemokwu n’afọ 20 ndị na-esonụ. “Ọ̀ bụ n’ihi na nwanne m ka ị bụ na ị ga-efe m n’efu?” ka ọ jụrụ. “Gosi m, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ gị?” Ọ bụ ezie na Leban mere ka ọ̀ bụ deede nwere obiọma, ọ gbanwere ịbụ nwanne nke ya na Jekọb ịghọ nkwekọrịta ọrụ. Ebe ọ bụ na Jekọb hụrụ Rechel n’anya nke ukwuu, ọ zara sị: “M ga-efe gị afọ asaa n’ihi Rechel bụ́ nwa gị nwanyị nke nta.”—Jenesis 29:15-20.

Ikwe nkwa alụmdi na nwunye bụ nke a na-eme site n’ịkwụ ezinụlọ nke nwanyị ụgwọ isi nwanyị. Mgbe e mesịrị, Iwu Mozis setịpụrụ shekel ọlaọcha 50 dị ka ihe a ga-akwụ maka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị a rafuru. Ọkà mmụta bụ́ Gordon Wenham kwenyere na nke a “bụ onyinye alụmdi na nwunye kasịnụ” ma na ihe ka ọtụtụ “na-adị nnọọ ala karị.” (Deuterọnọmi 22:28, 29) Jekọb apụghị ịkwụ ụgwọ ahụ. O nyefere onwe ya ịrụrụ Leban ọrụ ruo afọ asaa. “Ebe ọ bụ na a na-akwụ ndị ọrụ ụbọchị ihe dị n’agbata ọkara shekel na otu shekel n’otu ọnwa n’oge Babilọn oge ochie” (ihe dị n’agbata shekel 42 na 84 n’afọ asaa zuru ezu), ka Wenham gara n’ihu na-ekwu, “Jekọb na-ekwe Leban nkwa inye ya nnukwu onyinye alụmdi na nwunye iji lụọ Rechel.” Leban kwetara ngwa ngwa.—Jenesis 29:19.

Afọ asaa yiri “ụbọchị ole na ole” n’anya Jekọb, ịhụnanya o nwere n’ebe Rechel nọ buru ibu nke ukwuu. Ka e mesịrị, ọ naara nwunye ọhụrụ ya e kpuchiri ihu n’echetụghị na Leban ga-aghọ ya aghụghọ. Cheedị echiche ụdị akpata oyi wụrụ ya n’ahụ́ n’ụtụtụ echi ya mgbe ọ chọpụtara na ọ bụghị Rechel ka ya na ya rahụrụ kama na ọ bụ nwanne ya nwanyị bụ́ Lia! Jekọb jụrụ, sị: “Gịnị bụ nke a i meworo m? Ọ́ bụghị n’ihi Rechel ka m fere ofufe n’aka gị? N’ihi gịnịkwa ka ị ghọgburu m?” Leban wee zaghachi, sị: “A dịghị eme otú a n’ebe nke anyị, inye nke nta tupu e nye nke okenye. Debezuo abalị asaa nke nwanyị a, ma anyị ga-enyekwa gị nwanyị a n’ihi ofufe ị ga-efekwa ọzọ n’aka m afọ asaa ọzọ.” (Jenesis 29:20-27) N’enweghị onye ga-agbachitere ya, nakwa n’ịbụ onye tọrọ atọ, Jekọb enweghị ihe ọzọ ọ pụrụ ime ma ọ bụghị ịnabata ihe e kwuru ma ọ bụrụ na ọ chọrọ Rechel.

N’adịghị ka afọ asaa mbụ ahụ, afọ asaa nke abụọ a bụ nke iwe. Olee otú Jekọb ga-esi leghara aghụghọ ọjọọ Leban anya? Gịnịkwanụ banyere Lia, onye kwetara iso n’aghụghọ ahụ? N’ezie, Leban achọghị nnọọ ịma ụdị ọdịnihu jupụtara ná nsogbu nke ọ kwadebeere Lia na Rechel. Ọdịmma onwe onye ka ya mkpa. Ekworo zutere iwe mgbe Lia mụrụ ụmụ nwoke anọ a mụpụ a mụchie, ebe Rechel ka bụ nwanyị aga. Mgbe ahụ, Rechel n’ịbụ onye chọsiri ike ịmụta ụmụ, kpọnyere ohu ya nwanyị ịbụ onye ga-amụchitere ya nwa, Lia, n’ịma aka, mekwara otu ihe ahụ. Jekọb hụtara onwe ya ịbụ onye nwere ndị nwunye 4, ụmụ 12 na ezinụlọ obi ụtọ kọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nọ na-eme Jekọb ka ọ bụrụ otu nnukwu mba.—Jenesis 29:28–30:24.

Jehova Emee Ya Ọgaranya

N’agbanyeghị ọnwụnwa, Jekọb chọpụtara na Chineke nọnyeere ya dị ka o kwere ná nkwa. Leban chọpụtakwara ya, n’ihi na ụmụ anụ ole na ole o nwere tupu Jekọb abịa mụbara nke ukwuu n’okpuru nlekọta nwa nwanne ya. N’ihi na ọ chọghị ka Jekọb laa, Leban gwara ya ka o kwuo ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ ya ka o wee gaa n’ihu ijere ya ozi, mgbe ahụ ka Jekọb gwara ya ka ọ bụrụ ụmụ anụ ndị tụrụ àgwà a na-adịghị ahụkebe n’etiti ìgwè anụ ụlọ Leban. A na-ekwu na n’ógbè ahụ, atụrụ na-adịkarị ọcha, ewu ana-adịkarịkwa oji ma ọ bụ na-acha nchara nchara; ọ bụ nanị ole na ole na-atụ àgwà. N’ihi ya, ebe ọ na-eche na ọ ga-erite uru, Leban kwetara ngwa ngwa ma n’egbughị oge kpọpụ ụmụ anụ ya nile ndị tụrụ àgwà a na-adịghị ahụkebe n’ebe dịtụ anya ka ha na anụ ụlọ ya ndị ọzọ Jekọb ka na-elekọta ghara inwe mmekọ. O doro anya na o kweere na Jekọb ga-erite ntakịrị uru ná nkwekọrịta ahụ, n’ezie, na ọ gaghị enwetaru pasent 20 nke ụmụ atụrụ na ewu ndị a mụrụ ọhụrụ bụ́ nke ndị ọzụzụ atụrụ oge ochie na-enweta dị ka ụgwọ ọrụ. Ma echiche Leban hiere ụzọ, n’ihi na Jehova nọnyeere Jekọb.—Jenesis 30:25-36.

Site ná nduzi Chineke, Jekọb zụlitere ụmụ anụ gbasiri ike, ndị nwekwara ụdị àgwà ọ chọrọ. (Jenesis 30:37-42) Echiche ya banyere ọzụzụ anụ ezighị ezi. Ka o sina dị, “n’ụzọ nkà mmụta sayensị, a pụrụ ịrụzu ihe ahụ ọ chọrọ site n’anụ ndị nwere otu àgwà . . . bụ́ ndị bu mkpụrụ ndụ nke anụ ndị tụrụ àgwà ịgba ibe ha ọtụtụ ugboro,” ka ọkà mmụta bụ́ Nahum Sarna na-akọwa, “a na-eji . . . mgbasi ike [ha] pụrụ iche amata ụdị anụ ndị ahụ.”

Ka ọ chọpụtara ihe merenụ, Leban gbalịrị ịgbanwe nkwekọrịta ha banyere anụ ndị ga-abụ nke nwa nwanne ya—ndị nwere akara n’ahụ́, nwee ntụpọ, tụọ akịka, ma ọ bu tụọ àgwà. Ọ na-achọ uru onwe ya, ma n’agbanyeghị otú Leban si gbanwee nkwekọrịta ahụ, Jehova hụrụ na Jekọb nọgidere na-amụba. Leban pụrụ nanị ịta ikikere ezé. N’oge na-adịghị anya, Jekọb kpakọbara akụ̀ na ụba dị ukwuu, ìgwè anụ ụlọ, ndị odibo, kamel, ịnyịnya ibu, ọ bụghị n’ihi na ọ dị nkọ, kama n’ihi na Jehova kwụ ya n’azụ. O mechara kọwaara Rechel na Lia, sị: “Nna unu akwawo m emo wee gbanwee ụgwọ ọrụ m ugbo iri, ma Chineke ekweghị ya mejọọ m. . . . Chineke wee napụ anụ ụlọ nna unu nye m.” Jehova mesikwara Jekọb obi ike na Ya na-ahụ ihe nile Leban na-eme ma na ọ dịghị mkpa ka Jekọb chegbuo onwe ya. “Laghachi n’ala gị, laghachikwuru ụmụnna gị,” ka Chineke sịrị, “M ga-emekwa gị mma.”—Jenesis 31:1-13; 32:9.

Mgbe o mesịrị tọhapụ onwe ya n’agbụ nke onye aghụghọ bụ́ Leban, Jekọb chere ihu n’ụzọ ụla. Ọ bụ ezie na afọ 20 agafewo, ọ ka na-atụ ụjọ Ịsọ, karịsịa mgbe ọ nụrụ na Ịsọ ji narị ndị ikom anọ na-abịa izute ya. Gịnị ka Jekọb pụrụ ime? N’ịbụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke na-atụkwasị Chineke obi mgbe nile, o mere ihe n’okwukwe. O kpere ekpere, na-ekweta na ya erughị eru inweta mmesapụ aka Jehova ma rịọ Chineke ka ọ zọpụta ya na ezinụlọ ya n’aka Ịsọ n’ihi nkwa Ya.—Jenesis 32:2-12.

Mgbe ahụ, ihe a na-atụghị anya ya mere. Otu onye ọ na-amabughị, onye o mechara mara na ọ bụ mmụọ ozi, gbasoro Jekọb mgba n’abalị, ma were aka o metụrụ ya nupụ nkwonkwo úkwù Jekọb. Jekọb jụrụ ịhapụ mmụọ ozi ahụ ma ó bughị ụzọ gọzie ya. Onye amụma bụ́ Hozea mesịrị kwuo na Jekọb “kwara ákwá, rịọ Ya arịrịọ.” (Hosea 12:2-4; Jenesis 32:24-29) Jekọb maara na ndị mmụọ ozi a hụrụ n’oge ndị gara aga metụtara mmezu nke ọgbụgba ndụ Ebreham site ná mkpụrụ ya. N’ihi ya, ọ gbasiri mgba ike ma nweta ngọzi. N’oge a, Chineke gbanwere aha ya ịbụ Izrel, nke pụtara “Onye Jisịworo Ike (Onye Nọgidesiri Ike) n’Ebe Chineke Nọ” ma ọ bụ “Chineke Na-ejisi Ike.”

Ị̀ Dị Njikere Ịgba Mgba?

Ịgbaso mmụọ ozi mgba na izute Ịsọ abụghị nanị nsogbu ndị Jekọb gabigara. Ma, ihe ndị a tụlere n’ebe a na-egosi ụdị mmadụ ọ bụ. Ọ bụ ezie na Ịsọ atachilighị obi ná ntakịrị agụụ n’ihi ọnọdụ diọkpara ya, Jekọb gbara mgba ndụ ya nile iji nweta ngọzi, ọbụna gbasoo mmụọ ozi mgba. Dị ka Chineke kwere ná nkwa, Jekọb nwetara nduzi na nchebe Chineke, wee bịa bụrụ nna nke otu nnukwu mba na nna nna nke Mezaịa ahụ.—Matiu 1:2, 16.

Ị̀ dị njikere itinye mgbalị iji nweta ihu ọma Jehova, ịgba mgba maka ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Ndụ nke taa jupụtara n’ihe isi ike na ihe ịma aka n’ebe ndị chọrọ ime uche Chineke nọ, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-abụ ọgụ na mgba ime mkpebi ndị dị mma. Otú ọ dị, ezi ihe nlereanya Jekọb na-enye anyị ihe siri ike mere anyị ga-eji jigidesie olileanya nke ụgwọ ọrụ nke Jehova setịpụrụ n’ihu anyị ike.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nzute a yiri oge nne Jekọb, Rebeka, nyere kamel Elieza mmiri. Mgbe ahụ, Rebeka gbalara n’ụlọ ịkọ maka ọbịbịa nke onye ọbịa ahụ. Mgbe Leban hụrụ ọlaedo ndị nwanne ya nwanyị natara n’onyinye, ọ gbaara ọsọ jee ịnabata Elieza.—Jenesis 24:28-31, 53.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ná ndụ ya nile, Jekọb gbara mgba iji nweta ngọzi