Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge Nsogbu
Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge Nsogbu
“Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.”—ABỤ ỌMA 46:1.
1, 2. (a) Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na o zughị ezu ikwu na anyị tụkwasịrị Chineke obi? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mee ihe karịrị nanị ikwu na anyị tụkwasịrị Jehova obi?
Ọ BỤ otu ihe ikwu na anyị tụkwasịrị Chineke obi. Ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ igosipụta ya n’omume anyị. Dị ka ihe atụ, okwu bụ́ “Na Chineke Ka Anyị Tụkwasịrị Obi” apụtawo n’akwụkwọ ego na mkpụrụ ego nke U.S. eri ogologo oge. * Na 1956, Òtù Ndị Omeiwu nke U.S. nyere iwu ka e jiri okwu ahụ mee ihe dị ka ụkpụrụ nduzi mba nke United States. N’ụzọ na-emegide onwe ya, ọtụtụ mmadụ—ọ bụghị nanị ná mba ahụ kamakwa n’ụwa nile—na-atụkwasị ego na ihe onwunwe obi nke ukwuu karịa Chineke.—Luk 12:16-21.
2 Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị aghaghị ime ihe karịrị ikwu na anyị tụkwasịrị Jehova obi. Dị nnọọ ka “okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ nke nwụrụ anwụ,” otú ahụkwa anyị ịzọrọ na anyị tụkwasịrị Chineke obi abaghị uru, ọ gwụla ma anyị gosipụtara ya n’omume. (Jems 2:26) N’isiokwu bu ụzọ, anyị mụtara na anyị na-egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi mgbe anyị na-agakwuru ya n’ekpere, mgbe anyị na-achọ ntụziaka site n’Okwu ya, na mgbe anyị na-elegara nzukọ ya anya maka nduzi. Ugbu a, ka anyị tụlee otú anyị ga-esi were nzọụkwụ atọ ndị ahụ n’oge nsogbu.
Mgbe A Chụrụ Gị n’Ọrụ Ma Ọ Bụ Mgbe Ego Ị Na-enweta Dị Obere
3. Olee nsogbu akụ̀ na ụba ndị ohu Jehova na-enwe ‘n’oge ndị a pụrụ iche,’ oleekwa otú anyị si mara na Chineke dị njikere inyere anyị aka?
3 ‘N’oge ndị a pụrụ iche,’ anyị, dị ka Ndị Kraịst 2 Timoti 3:1) Ya mere, anyị pụrụ ịbụ ndị a chụrụ n’ọrụ na mberede. Ma ọ bụ anyị pụrụ ịbụ ndị na-amaghị ihe ọzọ anyị ga-eme ma ọ bụghị ịrụ ọrụ ọtụtụ awa ma na-enweta ụgwọ ọrụ dị nta. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ isiri anyị ike ‘igboro ndị nke aka anyị mkpa ha.’ (1 Timoti 5:8) Chineke Kasị Ihe Nile Elu ọ̀ dị njikere inyere anyị aka n’oge ndị dị otú ahụ? Eenụ! N’ezie, Jehova adịghị echebe anyị pụọ n’ihe isi ike nile nke ndụ n’usoro ihe a. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma 46:1 ga-abụ ihe na-eme eme n’ọnọdụ anyị: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị nile n’oge e nwere nsogbu akụ̀ na ụba?
na-enwe nsogbu akụ̀ na ụba dị ka ndị ọzọ na-enwe. (4. Mgbe anyị nwere nsogbu akụ̀ na ụba, gịnị ka anyị pụrụ ikpe ekpere maka ya, oleekwa otú Jehova si emeghachi omume n’ụdị ekpere ndị ahụ?
4 Otu ụzọ anyị si egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi bụ ịgakwuru ya n’ekpere. Ma gịnị ka anyị pụrụ ikpe ekpere maka ya? N’ezie, n’ịbụ ndị na-enwe nsogbu akụ̀ na ụba, ezi amamihe pụrụ ịdị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, na-ekpe ekpere maka ya! Okwu Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha; a ga-enyekwa ya.” (Jems 1:5) Ya mere, na-arịọ Jehova maka amamihe—ikike nke iji ihe ọmụma na nghọta eme ihe nke ọma—iji nwee ike ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha na nhọrọ ndị ziri ezi. Nna anyị nke eluigwe na-emesi anyị obi ike na ọ ga-ege ntị n’ekpere ndị dị otú ahụ. Ọ dị njikere mgbe nile ime ka okporo ụzọ ndị ji obi ha nile na-atụkwasị ya obi zie ezie.—Abụ Ọma 65:2; Ilu 3:5, 6.
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-elegara Okwu Chineke anya maka nduzi iji nagide nsogbu akụ̀ na ụba? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji belata nchegbu mgbe a chụrụ anyị n’ọrụ?
5 Ilegara Okwu Chineke anya maka nduzi bụ ụzọ ọzọ anyị si egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi. Ihe ncheta ya ndị amamihe dị na ha a na-achọta na Bible abụrụwo ihe “kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 93:5) Ọ bụ ezie na e dezuru ya ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, akwụkwọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nwere nduzi ndị a pụrụ ịdabere na ha na nghọta ndị pụrụ inyere anyị ka ịnagide nsogbu akụ̀ na ụba nke ọma karị. Tụlee ihe atụ ụfọdụ nke amamihe ndị dị na Bible.
6 Eze Solomọn maara ihe kwuru ogologo oge gara aga, sị: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-ala ọrụ ubi bụ, ma ọ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:12) Ọ na-ewe oge na ego iji na-arụzi, na-eme ka ihe onwunwe anyị na-adị ọcha, na-eme ka ha nọrọ n’ọnọdụ dị mma ma na-echebe ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na a chụọ anyị n’ọrụ, anyị pụrụ iji ohere ahụ nyochagharịa ụzọ ndụ anyị, na-agbalị ịmata ihe ndị dị anyị mkpa site n’ihe ndị anyị chọrọ. Iji belata nchegbu, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ime mgbanwe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ ga-ekwe omume ime ka ndụ gị dịkwuo mfe, ikekwe ịkwaga n’ebe obibi dịtụ nta ma ọ bụ iwepụ ihe onwunwe ndị na-adịchaghị mkpa?—Matiu 6:22.
7, 8. (a) Olee otú Jizọs si mee ka a mara na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ nke ichegbubiga onwe ha ókè banyere ihe onwunwe? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.) (b) Ndụmọdụ dị aṅaa amamihe dị na ya ka Jizọs nyere banyere otú e si ezere mmadụ ịbụ onye na-echegbubiga onwe ya ókè?
7 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs dụrụ ọdụ, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.” * (Matiu 6:25) Jizọs maara na dị ka o kwesịrị, ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-echegbu onwe ha banyere inweta ihe ndị bụ́ isi dị ha mkpa. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi ‘kwụsị ichegbu onwe anyị’ banyere ihe ndị dị otú ahụ? “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,” ka Jizọs kwuru. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla anyị na-ezute, anyị aghaghị ịnọgide na-ebute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, mgbe ahụ Nna anyị nke eluigwe ‘ga-atụkwasịrị anyị’ ihe nile na-akpa anyị kwa ụbọchị. Site n’otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ, ọ ga-eme ka o kwe anyị omume ịnọgide na-enweta ihe ndị dị anyị mkpa.—Matiu 6:33.
8 Jizọs nyekwuru ndụmọdụ a: “Unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya.” (Matiu 6:34) Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya mmadụ ichegbubiga onwe ya ókè banyere ihe pụrụ ime echi. Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu adịghị adịkebe njọ dị ka anyị na-atụ egwu.” Iji obi umeala na-etinye ịdọ aka ná ntị Bible nke ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ na ịghara ichegbu onwe anyị banyere echi pụrụ inyere anyị aka izere ichegbubiga onwe anyị ókè.—1 Pita 5:6, 7.
9. Mgbe anyị nwere nsogbu akụ̀ na ụba, olee enyemaka anyị pụrụ ịchọta n’akwụkwọ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta?
9 Mgbe anyị nwere nsogbu akụ̀ na ụba, anyị pụkwara igosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi site n’ilegara akwụkwọ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta anya maka enyemaka. (Matiu 24:45) Site n’oge ruo n’oge, magazin Teta! na-ebu isiokwu ndị nwere ndụmọdụ na aro ndị na-enye aka n’ihe banyere nsogbu akụ̀ na ụba. Isiokwu bụ́ “Ịbụ Onye A Chụrụ n’Ọrụ—Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Ndị E Nwere?” nke pụtara ná mbipụta Teta! (Bekee) nke August 8, 1991, depụtara ụkpụrụ nduzi asatọ ndị dị irè bụ́ ndị nyewooro ọtụtụ ndị aka ịkwụsi ike n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na ná mmetụta uche mgbe ha na-enweghị ọrụ. * N’ezie, a ghaghị ijikọta ụkpụrụ nduzi ndị dị otú ahụ na otú e si ele mkpa ego dị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. A tụlere nke a n’isiokwu bụ́ “Ihe Dị Nnọọ Mkpa Karịa Ego,” nke pụtakwara n’otu mbipụta ahụ.—Eklisiastis 7:12.
Mgbe Nsogbu Ahụ́ Ike Kpataara Anyị Obi Erughị Ala
10. Olee otú ihe nlereanya Eze Devid si gosi na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị ọrịa siri ike?
10 Ọ̀ bụ ihe kwere omume ịtụkwasị Jehova obi mgbe anyị na-arịa ọrịa siri ike? Eenụ! Jehova na-eche banyere ndị ya na-arịa ọrịa. Karịsịakwa, ọ dị njikere inyere ha aka. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Eze Devid. Ọ ga-abụ na ya onwe ya nọ na-arịa ọrịa siri ike mgbe o dere banyere mmeso Abụ Ọma 41:1, 3, 7, 8) Ntụkwasị obi Devid nwere n’ebe Chineke nọ siri nnọọ ike, eze ahụ mesịkwara gbakee n’ọrịa ya. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta na anyị tụkwasịrị Chineke obi mgbe nsogbu ahụ́ ike kpataara anyị obi erughị ala?
Chineke na-emeso ndị ezi omume na-arịa ọrịa. Ọ sịrị: “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ́ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka Ị gbanweworo n’ọrịa ya.” (11. Mgbe anyị dara ọrịa, gịnị ka anyị pụrụ ịrịọ Nna anyị nke eluigwe?
11 Mgbe anyị dara ọrịa, otu ụzọ anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi bụ ịrịọ ya n’ekpere ka o nyere anyị aka ịtachi obi. Anyị pụrụ ịrịọ ya ka o nyere anyị aka iji “ezi amamihe” mee ihe ka anyị wee nwee ike inweta ahụ́ ike ruo n’ókè ọnọdụ anyị kwere anyị mee. (Ilu 3:21, NW) Anyị pụkwara ịrịọ ya ka o nyere anyị aka inwe ndidi na ntachi obi iji nwee ike ịnagide ọrịa ahụ. Karịsịa, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka ọ na-akwado anyị, na-enye anyị ume ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya ma ghara ịda mbà, n’agbanyeghị ihe ọ bụla pụrụ imenụ. (Ndị Filipaị 4:13) Ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke dị mkpa ọbụna karịa ichebe ndụ anyị dị ugbu a. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ihe, Onye Ukwu ahụ Na-akwụ Ụgwọ Ọrụ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi na ahụ́ ike zuru ezu.—Ndị Hibru 11:6.
12. Olee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha mgbe a bịara n’ịnara ọgwụgwọ?
12 Ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akpalikwa anyị ilegara Okwu ya, bụ́ Bible anya maka nduzi dị irè. Ụkpụrụ ndị a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha mgbe a bịara n’ihe banyere ọgwụgwọ. Dị ka ihe atụ, n’ịmara na Bible katọrọ “ime mgbaasị,” anyị ga-ezere usoro ọgwụgwọ ọ bụla nke metụtara mgbaasị. (Ndị Galeshia 5:19-21; Deuterọnọmi 18:10-12) Lee ihe atụ ọzọ nke amamihe ndị dị na Bible e kwesịrị ịtụkwasị obi: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) N’ihi ya, mgbe anyị na-achọ ọgwụgwọ, anyị na-eme nke ọma ịchọ inweta ihe ọmụma site n’ebe a pụrụ ịtụkwasị obi kama ‘ikwere okwu nile ọ bụla.’ “Uche zuru okè” dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka iji nlezianya tụlee nhọrọ ndị anyị nwere na ime mkpebi dabeere n’ezi ihe ọmụma.—Taịtọs 2:12.
13, 14. (a) Isiokwu ndị dị aṅaa na-enye ihe ọmụma banyere ahụ́ ike ka e bipụtaworo na magazin Ụlọ Nche na Teta!? (Lee igbe dị na peeji nke 17.) (b) Ndụmọdụ dị aṅaa banyere otú e si anagide ọrịa ndị na-adịghị ala ala ka e nyere na Teta! nke February 8, 2001?
13 Anyị pụkwara igosipụta ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ site n’inyocha akwụkwọ ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-ebipụta. Site n’oge ruo n’oge, e bipụtawo isiokwu ndị na-enye ihe ọmụma banyere nsogbu ahụ́ ike na ọrịa ndị dịgasị iche iche na magazin Ụlọ Nche na Teta! * Mgbe ụfọdụ, akwụkwọ ndị a na-ebu isiokwu ndị sitere n’aka ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọrịa na nkwarụ ndị dịgasị iche iche. Tụkwasị ná ndị a, isiokwu ụfọdụ atụwo aro ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, nyekwa ndụmọdụ ndị dị irè banyere otú a pụrụ isi nagide nsogbu ahụ́ ike ndị na-adịghị ala ala.
14 Dị ka ihe atụ, mbipụta Teta! nke February 8, 2001, nwere usoro isiokwu ndị na-akasi ndị ọrịa obi. Isiokwu ndị dị na ya gosiri ụkpụrụ Bible ndị na-enye aka, tinyere ihe ọmụma ndị e nwetara site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị maara nke a na-akọ bụ́ ndị rịaworo ọrịa ndị na-akpata nkwarụ ruo ọtụtụ afọ. Isiokwu bụ́ “Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịnagide Ọrịa Gị—N’ụzọ Dị Aṅaa?” nyere ndụmọdụ na-esonụ: Mụta banyere ọrịa gị dị ka o kwere gị mee. (Ilu 24:5) Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru, gụnyere ihe mgbaru ọsọ nke inyere ndị ọzọ aka, ma ghọta na o nwere ike ị gaghị eru ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ pụrụ iru. (Ọrụ 20:35; Ndị Galeshia 6:4) Zere ikewapụ onwe gị n’ebe ndị ọzọ nọ. (Ilu 18:1) Na-eme ka nleta a na-eleta gị bụrụ ahụmahụ dị ụtọ nye ndị ọzọ. (Ilu 17:22) Nke kasị mkpa, soro Jehova na ọgbakọ na-enwe mmekọrịta chiri anya. (Nehum 1:7; Ndị Rom 1:11, 12) Ị́ dịghị enwe ekele maka nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi nke Jehova na-enye site ná nzukọ ya?
Mgbe Adịghị Ike Anụ Ahụ́ Na-ekweghị Nkwụsị
15. Olee otú Pọl onyeozi si nwee ike imeri n’ọgụ ya megide adịghị ike nke anụ ahụ́ na-ezughị okè, oleekwa mmesi obi ike anyị pụrụ inwe?
15 “N’anụ ahụ́ m, ọ dịghị ezi ihe bi n’ime ya,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Rom 7:18) Pọl maara site n’ahụmahụ ya otú ọ pụrụ isi sie ike ịlụso ọchịchọ na adịghị ike nke mmadụ na-ezughị okè ọgụ. Otú ọ dị, Pọl nwekwara obi ike na ya pụrụ imeri. (1 Ndị Kọrint 9:26, 27) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ya mere Pọl ji nwee ike ikwu sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-anwụ ọnwụ a? Ọ bụ Chineke site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Ndị Rom 7:24, 25) Gịnị banyere anyị? Anyị onwe anyị na-alụsokwa adịghị ike nke anụ ahụ́ ọgụ. Ka anyị na-alụso adịghị ike dị otú ahụ ọgụ, ọ na-adị mfe mmadụ ịbụ onye na-enweghịzi obi ike, na-ekweta na ọ dịghị mgbe anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ma Jehova ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị, dị ka Pọl, adabere n’ebe Ọ nọ n’ezie n’abụghị nanị n’ike nke onwe anyị.
16. Mgbe adịghị ike anụ ahụ́ na-ekweghị nkwụsị, gịnị ka ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere maka ya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị adaghachi azụ?
Luk 11:9-13) Anyị pụrụ ịrịọ kpọmkwem maka njide onwe onye, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị adaghachi azụ? N’ezie, anyị ekwesịghị ịda mbà. Ka ike ghara ịgwụ anyị n’ikpegara Chineke anyị nwere obi ebere ekpere, na-arịọ ya maka mgbaghara na enyemaka. Jehova agaghị ajụ ma ọ bụ gbakụta “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” n’ihi obi amamikpe azụ. (Abụ Ọma 51:17) Ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi na nke nwere nchegharị na-ekpegara Jehova ekpere, ọ ga-enyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
16 Mgbe adịghị ike anụ ahụ́ na-ekweghị nkwụsị, anyị pụrụ igosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi site n’ịrịọ ya arịrịọ n’ekpere. Ọ dị anyị mkpa ịrịọ Jehova maka enyemaka nke mmụọ nsọ ya. (17. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe enyemaka ịtụle otú Jehova si ele adịghị ike ọ bụla anyị pụrụ ịdị na-alụso ọgụ anya? (b) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iburu n’isi mgbe anyị na-agbalị ịkwụsị iwe iwe ọkụ? ịkwa ire anyị nga? iguzogide ọchịchọ inwe ntụrụndụ ndị na-adịghị mma?
17 Anyị pụkwara igosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi site n’inyocha Okwu ya maka enyemaka. Site n’iji ndepụta okwu ndị dị na Bible ma ọ bụ ndepụta ndị na-apụta n’Ụlọ Nche na Teta! ná ngwụsị afọ eme ihe, anyị pụrụ ịchọ azịza nke ajụjụ bụ́, ‘Olee otú Jehova si ele adịghị ike m na-alụso ọgụ anya?’ Iche echiche banyere otú Jehova si ele okwu ahụ anya pụrụ iwusi ọchịchọ anyị nwere ime ihe na-atọ ya ụtọ ike. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị pụrụ ịmalite ile ihe anya dị ka o si ele ha, na-akpọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị. (Abụ Ọma 97:10) Ụfọdụ ahụtawo ya dị ka ihe na-enye aka ibu akụkụ Bible ndị na-ekwu banyere adịghị ike ndị ha na-alụso ọgụ n’isi. Ànyị na-agbalịsi ike ịkwụsị iwe iwe ọkụ? Mgbe ahụ anyị pụrụ iburu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Ilu 14:17 na Ndị Efesọs 4:31 n’isi. Ọ̀ na-esiri anyị ike ịkwa ire anyị nga? Anyị pụrụ iburu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Ilu 12:18 na Ndị Efesọs 4:29 n’isi. Ànyị na-enwe ọchịchọ inwe ntụrụndụ ndị na-adịghị mma? Anyị pụrụ ịgbalị icheta amaokwu ndị dị ka Ndị Efesọs 5:3 na Ndị Kọlọsi 3:5.
18. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwere ka ihere mee ka anyị ghara ịrịọ ndị okenye inyere anyị aka imeri adịghị ike anyị?
18 Ịchọ enyemaka site n’aka ndị okenye e ji mmụọ nsọ họpụta bụ ụzọ ọzọ isi na-egosipụtakwu na anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ. (Ọrụ 20:28) E kwuwerị, “onyinye n’ụdị mmadụ” ndị a bụ ndokwa nke Jehova mere site n’aka Kraịst iji na-echebe ma na-elekọta atụrụ ya. (Ndị Efesọs 4:7, 8, 11-14) N’ezie, ọ pụrụ ịbụ ihe siri ike ịrịọ maka enyemaka iji nagide adịghị ike. Anyị pụrụ ime ihere, na-atụ ụjọ na ndị okenye agaghị ele anyị anya ọma. Ma obi abụọ adịghị ya na ndị okenye a tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ ga-akwanyere anyị ùgwù n’ihi inwe obi ịrịọ maka enyemaka. Ọzọkwa, ndị okenye na-agbalịsi ike igosipụta àgwà Jehova n’imeso ìgwè atụrụ ya ihe. Ndụmọdụ na ntụziaka ha ndị dị irè ma na-akasi obi bụ́ ndị sitere n’Okwu Chineke pụrụ ịbụ nnọọ ihe dị anyị mkpa iji mee ka mkpebi anyị imeri adịghị ike anyị sikwuo ike.—Jems 5:14-16.
19. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Setan si achọ iji ihe efu nke ndụ n’usoro ihe a eme ihe? (b) Gịnị ka ntụkwasị obi gụnyere, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mkpebisi ike anyị?
19 Ya adịla mgbe ị ga-echefu na Setan maara na oge ya dị mkpirikpi. (Mkpughe 12:12) Ọ chọrọ iji ihe efu nke ndụ n’ime ụwa a mee ihe iji kụda anyị obi ma mee ka anyị daa mbà. Ka anyị nwee obi ike zuru ezu n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 8:35-39: “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst ahụ? Ọ̀ ga-abụ ahụhụ ka ọ̀ bụ nsogbu ka ọ̀ bụ mkpagbu ka ọ̀ bụ agụụ ka ọ̀ bụ ịgba ọtọ ka ọ̀ bụ ihe ize ndụ ka ọ̀ bụ mma agha? . . . Kama nke ahụ, n’ihe ndị a nile anyị na-enwe mmeri n’ụzọ zuru ezu site n’onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya. N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” Lee okwu na-egosipụta ntụkwasị obi e nwere n’ebe Jehova nọ nke ahụ bụ! Otú ọ dị, ntụkwasị obi dị otú ahụ karịrị mmetụta nkịtị. Kama nke ahụ, ọ bụ ntụkwasị obi nke gụnyere mkpebi ndị ezi uche dị na ha anyị na-eme ná ndụ anyị kwa ụbọchị. Ya mere, ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe nile n’oge nsogbu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 N’otu akwụkwọ ozi o degara n’Ebe Obibi Ego nke U.S., nke akara ụbọchị ya bụ November 20, 1861, Odeakwụkwọ Ngalaba Ndebe Akụ̀ bụ́ Salmon P. Chase dere, sị: “Ọ dịghị mba pụrụ isi ike ma ọ bụghị site n’ike Chineke na-enye, ma ọ bụ nọrọ ná nchebe ma ọ bụghị site ná nchebe Ya. E kwesịrị ibi ntụkwasị obi ndị obodo anyị nwere n’ebe Chineke nọ ná mkpụrụ ego mba anyị.” N’ihi ya, e biri ụkpụrụ nduzi ahụ bụ́ “Na Chineke Ka Anyị Tụkwasịrị Obi” nke mbụ ya ná mkpụrụ ego U.S. e nwere na 1864.
^ par. 7 A kọwara nchegbu a na-ekwu maka ya n’ebe a dị ka “nchegbu na-abịa n’ihi ụjọ, bụ́ nke na-eme ka mmadụ ghara inwe ọṅụ ná ndụ.” Ụfọdụ nsụgharị na-asị “unu echegbula onwe unu.” Ma nsụgharị dị otú ahụ na-enye echiche na anyị ekwesịghị ịmalite ichegbu onwe anyị. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ọdịdị okwu ngwaa Grik ahụ bụ iwu nọ n’ụdị okwu bụ́ nke na-egosi ihe ndị na-eme ugbu a, na-enye iwu ka a kwụsị ime ihe a maliteworo ime.”
^ par. 9 Isi ihe asatọ ndị ahụ bụ: (1) Enwela obi nkoropụ; (2) nwee echiche ziri ezi; (3) mee ka obi gị nabata ụdị ọrụ ndị ọhụrụ; (4) na-ebi ndụ dị ka ihe ị na-akpata hà—ọ bụghị ịchọ ịdị ka onye ọzọ; (5) lezie anya otú i si eji kaadị e ji azụ ihe n’aka eme ihe; (6) na-eme ka ezinụlọ gị na-emekọ ihe ọnụ; (7) nọgide na-enwe ùgwù; na (8) mee atụmatụ otú i si emefu ego.
^ par. 13 Akwụkwọ ndị a dabeere na Bible adịghị akwado ụdị ọgwụgwọ ọ bụla, na-amata na nke a bụ mkpebi onwe onye. Kama nke ahụ, e bu n’uche ka isiokwu ndị ahụ na-ekwu banyere ụdị ọrịa dị iche iche mee ka ndị na-agụ ha mata ihe ndị kasị ọhụrụ a mataworo banyere ha.
Ị̀ Na-echeta?
• Mgbe anyị nwere nsogbu akụ̀ na ụba, ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi?
• Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị tụkwasịrị Chineke obi mgbe anyị nwere obi erughị ala n’ihi nsogbu ahụ́ ike?
• Mgbe adịghị ike anụ ahụ́ na-ekweghị nkwụsị, olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ n’ezie?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe dị na peeji nke 17]
Ị̀ Na-echeta Isiokwu Ndị A?
Mgbe nsogbu ahụ́ ike mere ka obi ghara iru anyị ala, ọ bụ ihe na-agba ume ịgụ banyere ndị ọzọ bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọrịa ma ọ bụ nkwarụ. E nwere n’okpuru ebe a isiokwu ụfọdụ ndị e bipụtaworo na magazin Ụlọ Nche na Teta!
“Ịnagide Adịghị Ike M” bụ́ nke na-ekwu banyere imeri echiche ndị na-ezighị ezi na ịda mbà n’obi.—Ụlọ Nche nke May 1, 1990.
“Ịba Uru ma Nwee Obi Ụtọ n’Agbanyeghị Ikpu Ìsì M.”—Teta!, March 8, 1999.
“Mgbe Ọ Bụla M Na-adịghị Ike, Mgbe Ahụ Ka M Na-adị Ike” nke lekwasịrị anya n’ịnagide ọrịa rheumatoid arthritis.—Teta!, February 8, 1997.
“Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi” kwuru banyere ịnagide ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ.—Ụlọ Nche nke December 1, 2000.
“Mgbalị Loida Mere Ikwu Okwu” bụ́ nke lekwasịrị anya n’ịnagide ọrịa ụbụrụ—Teta! nke September 8, 2000.
“Ọ Bụ Ezie na M Bụ Onye Ntị Chiri nke Kpuru Ìsì, Enwetara M Nchebe.”—Teta!, June 8, 2001.
“Ịnagide Ihe Ndọghachi Azụ Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ.”—Teta!, February 8, 2001.
“A Tụdara M n’Ala, Ma A Laghị M n’Iyi.”—Ụlọ Nche nke November 1, 1995.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọ bụrụ na a chụrụ anyị n’ọrụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya anyị inyochagharị ụzọ ndụ anyị
[Foto dị na peeji nke 16]
Akụkọ ndụ Loida na-egosi otú ịtụkwasị Jehova obi si enyere mmadụ aka ịtachi obi. (Lee igbe dị na peeji nke 17)
[Foto dị na peeji nke 18]
Ihere ekwesịghị ime anyị ịrịọ maka enyemaka iji merie adịghị ike anyị