Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme?

Jehova Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme?

Jehova Ọ̀ Na-ahụ Ihe Na-eme?

OLEE otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ? Ọtụtụ ndị ga-aza, sị: ‘Ekweere m na Chineke hụrụ ihe ndị ikom dị ka Mozis, Gidiọn, na Devid rụzuru, ma echeghị m na o nwere mmasị n’ihe ọ bụla m pụrụ ime. N’ezie, abụghị m Mozis, Gidiọn, ma ọ bụ Devid.’

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible ji okwukwe mee ihe ndị dị ịrịba ama. Ha ‘meriri alaeze dị iche iche n’ọgụ, mechie ọnụ ọdụm, nagide ike nke ọkụ, ma gbanahụ ihu mma agha.’ (Ndị Hibru 11:33, 34) Otú ọ dị, ndị ọzọ gosipụtara okwukwe ha n’ụzọ ndị na-adịchaghị ịrịba ama otú ahụ, Bible na-emesikwa anyị obi ike na Chineke hụkwara ihe ha ji okwukwe mee. Iji maa atụ, tụlee ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ banyere otu onye ọzụzụ atụrụ, otu onye amụma, na otu nwanyị di ya nwụrụ.

Otu Onye Ọzụzụ Atụrụ Achụọ Àjà

Gịnị ka ị na-echeta banyere Ebel, bụ́ nwa nwoke nke abụọ nke Adam na Iv? Ị pụrụ icheta na ọ nwụrụ n’ihi okwukwe ya, bụ́ ihe pụrụ ịdabara mmadụ ole na ole n’ime anyị ma eleghị anya. Ma Chineke bu ụzọ hụ Ebel n’ihi ihe ọzọ.

Otu ụbọchị, Ebel weere ụfọdụ n’ime anụmanụ ndị kasị mma n’etiti ìgwè ewu na atụrụ ya ma chụọrọ Chineke àjà. A pụrụ ile onyinye ya anya taa dị ka ihe dị nnọọ nta, ma Jehova hụrụ ya ma gosipụta na ya nabatara ya. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị nke ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ ka nke ahụ gasịrị, Jehova kpaliri Pọl onyeozi ide banyere ya n’akwụkwọ Ndị Hibru. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, Chineke echefughị ntakịrị àjà ahụ!—Ndị Hibru 6:10; 11:4.

Olee otú Ebel si kpebie ụdị ihe ọ ga-eji chụọ àjà? Bible ekwughị, ma ọ ghaghị ịbụwo na o chebasiiri nke ahụ echiche ike. Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ, n’ihi ya ọ bụghị ihe ijuanya na ọ chụrụ ụfọdụ anụmanụ sitere n’ìgwè ewu na atụrụ ya n’àjà. Otú ọ dị, rịba ama na o nyere ndị kasị mma—“iberibe ha mara abụba.” (Jenesis 4:4) O kwekwara omume na ọ tụgharịrị uche n’okwu Jehova gwara agwọ ahụ n’ogige Iden, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:9) Ọ bụ ezie na Ebel aghọtaghị onye “nwanyị ahụ” na “mkpụrụ” ya bụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ ghọtara na ‘ichipịa mkpụrụ nwanyị ahụ n’ikiri ụkwụ’ ga-agụnye ịwụfu ọbara. Ọ ghọtara n’ezie na ọ dịghị ihe ọzọ pụrụ ịba uru karịa ihe e kere eke dị ndụ ma na-eku ume. Nke kasị mkpa, àjà ọ chụrụ kwesịrị ekwesị n’ezie.

Dị ka Ebel, Ndị Kraịst taa na-achụrụ Chineke àjà. Ihe ha na-achụ n’àjà abụghị mkpụrụ mbụ nke ìgwè ewu na atụrụ ha, kama “mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha [Chineke] n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) Egbugbere ọnụ anyị na-eme nkwupụta n’ihu ọha mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kweere.

Ọ̀ ga-amasị gị ime ka àjà gị dịkwuo mma? Mgbe ahụ, chebara mkpa nke ndị nọ n’ókèala gị echiche nke ọma. Gịnị na-echegbu ha? Gịnị na-amasị ha? Olee ozi dị na Bible nke ga-amasị ha? Ka ị na-eme nkwusa, tụlee ebe ndị ị gaworo, na-eburu n’uche ime ka ị bụrụ onye dị irè karị. Mgbe ị na-ekwukwa okwu banyere Jehova, na-ekwu ya dị ka onye na-ekwu ihe doro ya anya, ma jiri obi gị na-eme ya. Mee ka àjà gị bụrụ ezigbo “àjà otuto.”

Otu Onye Amụma Ekwusaara Ndị Agbata Obi Na-adịghị Aṅa Ntị Ozi Ọma

Tụlezie ihe banyere Ịnọk onye amụma. Ọ pụrụ ịbụwo nnọọ na ọ bụ nanị ya bụ onye àmà nke Jehova Chineke n’oge ahụ. Dị ka Ịnọk, ọ̀ bụ nanị gị bụ onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’ezinụlọ unu? Ọ̀ bụ nanị gị bụ onye na-agbaso ụkpụrụ Bible na klas gị ma ọ bụ n’ebe e were gị n’ọrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ inwe ihe ịma aka dị iche iche. Ndị enyi gị, ndị ikwu gị, ndị klas gị, ma ọ bụ ndị ọrụ ibe gị pụrụ ịgba gị ume imebi iwu Chineke. “Ọ dịghị onye ga-ama ihe i mere,” ka ha pụrụ ikwu. “Ọ dịghị onye anyị ga-agwa.” Ha pụrụ ịnọgide na-agwa gị na ọ bụ ihe nzuzu ichegbu onwe gị banyere ụkpụrụ omume nke Bible n’ihi na Chineke achọghị ịma ihe ị na-eme. N’ịbụ ndị na-ewe iwe n’ihi na ị dịghị eche echiche ma na-eme omume ka ha, ha pụrụ ime ihe nile ha pụrụ ime iji mee ka ị kwụsị iguzosi ike.

N’eziokwu, ọ dịghị mfe ịnagide nrụgide dị otú ahụ, ma ọ bụghị ihe na-apụghị ikwe omume. Chee banyere Ịnọk, bụ́ onye nke asaa site n’Adam. (Jud 14) Ka ọ na-erule n’oge a mụrụ Ịnọk, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ enweghịkwa mmetụta ime omume ọma. Ihe ha na-ekwu n’ọnụ na-eme ihere; omume ha “na-awụ akpata oyi.” (Jud 15) Ha mere nnọọ omume n’otu ụzọ ahụ ọtụtụ ndị si eme taa.

Olee otú Ịnọk si nagide ọnọdụ ahụ? Azịza nye ajụjụ ahụ na-akpali mmasị anyị taa. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ nanị Ịnọk bụ nwoke nọ n’ụwa nke fere Jehova ofufe n’oge ahụ, ọ nọghị nanị ya n’ezie. Ịnọk na Chineke yikọrọ jegharịa.—Jenesis 5:22.

Ime ihe na-atọ Chineke ụtọ bụ ihe mbụ ná ndụ Ịnọk. Ọ maara na iso Chineke na-ejegharị pụtara ihe karịrị nanị ibi ndụ dị ọcha na ime omume ọma. Jehova tụrụ anya ka o mee nkwusa. (Jud 14, 15) Ọ dị mkpa ka a dọọ ndị ahụ aka ná ntị na a hụwo omume asọpụrụghị Chineke nke ha na-eme. Ịnọk nọgidere soro Chineke na-ejegharị ruo ihe karịrị afọ 300—ogologo oge karịrị nnọọ ihe onye ọ bụla n’ime anyị tachiworo obi. Ruo mgbe ọ nwụrụ, ọ nọgidere soro Chineke na-ejegharị.—Jenesis 5:23, 24.

Dị ka Ịnọk, e nyewokwa anyị onwe anyị iwu ime nkwusa. (Matiu 24:14) Tụkwasị n’ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-agbalị iji ozi ọma ahụ jekwuru ndị ikwu anyị, ndị anyị na ha na-azụkọ ahịa, na ndị klas anyị. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịla azụ ikwuwa okwu. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ na-adị gị? Obi ekoropụla gị. Na-eṅomi Ndị Kraịst oge mbụ, ma na-ekpegara Chineke ekpere inye gị obi ike. (Ọrụ 4:29) Echefula na ọ bụrụhaala na i so Chineke na-eje ije, ị nọghị nanị gị n’ezie.

Otu Nwanyị Di Ya Nwụrụ Akwadebe Nri

Cheedị banyere nke a, otu nwanyị di ya nwụrụ a na-akpọghị aha ya nwetara ngọzi abụọ n’ihi na ọ kwadebere nri dị mfe! Ọ bụghị onye Izrel, kama ọ bụ onye ala ọzọ nke biri ndụ na narị afọ nke iri T.O.A. n’obodo Zarefat. Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke oké ọkọchị na ụnwụ nri nke dịruru ogologo oge, ihe oriri nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere bịara fọdụ nnọọ obere. Nanị ihe fọdụụrụ ya bụ ntakịrị ụtụ ọka na mmanụ ga-ezu nanị iji kwadebe ihe oriri ikpeazụ nke ya na nwa ya nwoke ga-eri.

N’oge a, ọ bịara nwee otu onye ọbịa. Ọ bụ onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịja, bụ́ onye rịọrọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ ka o nyetụ ya nri ya dị ntakịrị. Ihe o nwere agadịghị ezuru ya na nwa ya, n’ezie o nweghị nke ga-abara onye ọbịa ahụ. Ma Ịlaịja ji okwu Jehova mesie ya obi ike na ọ bụrụ na o nyetụ ya ihe oriri ya, ya na nwa ya agaghị anọ agụụ. Ọ chọrọ okwukwe n’aka ya iji kwere na Chineke Izrel ga-ahụ ya, bụ́ nwanyị ala ọzọ di ya nwụrụ. Otú ọ dị, o kweere ihe Ịlaịja kwuru, Jehova kwụghachikwara ya ụgwọ. “Okpokoro ụtụ ọka ahụ agwụghị, ite mmanụ ahụ akọghịkwa, dị ka okwu Jehova si dị, nke O kwuru n’aka Ịlaịja.” Nwanyị ahụ na nwa ya nwoke nọgidere na-enweta ihe oriri ruo mgbe ụnwụ nri ahụ bịara ná njedebe.—1 Ndị Eze 17:8-16.

Otú ọ dị, ngọzi ọzọ na-echere nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Obere oge ka a rụsịrị ọrụ ebube ahụ, nwa ya dara ọrịa ma nwụọ. N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, Ịlaịja rịọrọ Jehova ka o mee ka nwa okoro ahụ dịghachi ndụ. (1 Ndị Eze 17:17-24) Nke ahụ ga-achọ ịrụ ọrụ ebube a na-arụtụbeghị ụdị ya mbụ. E nweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere onye a kpọlitere n’ọnwụ tupu mgbe ahụ! Jehova ọ̀ ga-emere nwanyị ala ọzọ a di ya nwụrụ ebere ọzọ? O mere otú ahụ. Jehova nyere Ịlaịja ike ime ka nwa okoro ahụ dịghachi ndụ. Jizọs mesịrị kwuo banyere nwanyị a nwere ihe ùgwù, sị: ‘E nwere ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ n’Izrel ma e ziri Ịlaịja ka ọ gaa nanị Zarefat dị n’ala Saịdọn gakwuru otu nwanyị di ya nwụrụ.’—Luk 4:25, 26.

E jitụghị ọnọdụ akụ̀ na ụba nke oge a n’aka, ọbụna n’ala ebe ndị e nwere ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe. Ọtụtụ nnukwu ụlọ ọrụ achụọla ndị ọrụ ha nọworo na-eguzosi ike n’ihe ruo ọtụtụ iri afọ n’ọrụ. N’ịbụ onye ga na-atụ anya na a pụrụ ịchụ ya n’ọrụ, Onye Kraịst pụrụ ịbụ onye a nwara ọnwụnwa itinye oge gabigara ókè n’ọrụ, na-enwe olileanya na ụlọ ọrụ ya agaghị achụ ya. Ime otú ahụ pụrụ ime ka ọ ghara inwecha ohere ịga nzukọ Ndị Kraịst, ikere òkè n’ozi ubi, ma ọ bụ igbo mkpa mmetụta uche na nke ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Otú ọ dị, ọ na-eche na ya aghaghị ịnọgide na-arụ ọrụ ahụ n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu.

Onye Kraịst nke nwere ihe isi ike akụ̀ na ụba dị otú ahụ nwere ihe mere ọ ga-eji nwee nchegbu. Ọ na-esi ike ịchọta ọrụ taa. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị adịghị adọga ịba ọgaranya, ma dị ka nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ, anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri. Otú ọ dị, Pọl onyeozi na-echetara anyị na Chineke kwuru, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Anyị pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Jehova bụ onye inyeaka m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” (Ndị Hibru 13:5, 6) Pọl dị njikere itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi nkwa ahụ, Jehova lekọtakwara ya mgbe nile. Chineke ga-emere anyị otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị agbahapụghị ya.

Anyị pụrụ iche na anyị apụghị ma ọlị ime ihe ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe dị ka Mozis, Gidiọn, na Devid mere, ma anyị pụrụ iṅomi okwukwe ha. Anyị pụkwara icheta ntakịrị omume Ebel, Ịnọk, na nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ ji okwukwe mee. Jehova nwere mmasị n’ihe nile e ji okwukwe mee—ọbụna ndị nke dị ntakịrị. Mgbe nwata akwụkwọ nke na-atụ egwu Chineke jụrụ ịnara ọgwụ ọjọọ n’aka ndị ọgbọ ya, mgbe Onye Kraịst na-arụ ọrụ jụrụ onye na-achọ ka ya na ya mee omume rụrụ arụ n’ebe ọrụ, ma ọ bụ mgbe Onyeàmà meworo agadi ji ikwesị ntụkwasị obi na-aga nzukọ ọgbakọ n’agbanyeghị ike ọgwụgwụ na nsogbu ahụ́ ike, Jehova na-ahụ ya. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ!—Ilu 27:11.

Ị̀ Na-ahụ Ihe Ndị Ọzọ Na-eme?

Ee, Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme. N’ihi ya, dị ka ndị na-eṅomi Chineke, anyị kwesịrị ịnọ na nche ịhụ mgbalị ndị ọzọ na-eme. (Ndị Efesọs 5:1) Gịnị ma i lerukwuo anya n’ihe ịma aka nke Ndị Kraịst ibe gị na-eche ihu iji bịa nzukọ ọgbakọ, iji kere okè n’ozi ubi, ọbụna iji rụọ ọrụ dịịrị ha n’ụbọchị?

Ya mere, mee ka ndị gị na ha so na-efe Jehova mara na i ji mgbalị ha kpọrọ ihe. Ha ga-enwe obi ụtọ na ị na-ahụ ihe ha na-eme, nchegbu ị na-enwekwa banyere ha pụrụ imesighachi ha obi ike na Jehova na-ahụkwa ihe ha na-eme.