Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ bụrụ na Onye Kraịst na-anụ olu, nke ahụ ọ̀ na-apụtacha na mmụọ ọjọọ ji ya?

Ee e. Ọ bụ ezie na a kọwo na ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ike n’ụzọ dị otú ahụ, ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe mmetụta ndị ọzọ na-enye nsogbu a na-apụghị ịkọwa isi ha, achọpụtawo mgbe ha mere nnyocha na ha nwere nsogbu ahụ́ ike.

Ọbụna na narị afọ mbụ, a ghọtara nke ọma na mwakpo ndị mmụọ ọjọọ na nsogbu ahụ́ ike na-eyi ibe ha mgbe ụfọdụ. Na Matiu 17:14-18, anyị na-agụ banyere otu nwa okoro nke Jizọs gwọrọ. Ọ bụ ezie na akwụkwụ na-adọsi nwa okoro ahụ ike, n’ezie ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ mere o ji na-ata ahụhụ. Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, mgbe a kpọtaara Jizọs ìgwè ndị na-ata ahụhụ ka ọ gwọọ ha, ụfọdụ n’ime ha bụ “ndị mmụọ ọjọọ ji na ndị akwụkwụ.” (Matiu 4:24) O doro anya na a maara na ụfọdụ ndị akwụkwụ abụghị ndị ndị mmụọ ọjọọ ji. Nsogbu ha bụ nke ahụ́ ike.

A na-akọ na ụfọdụ ndị na-arịa isi mgbaka, bụ́ ọrịa a na-ejikarị ọgwụ agwọ, na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe ihe mgbaàmà ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ iyi ka hà si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. * Nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ pụkwara ịkpata uche mgbasasị bụ́ nke ụfọdụ ndị pụrụ iche n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ kpatara ya. N’ihi ya, ọ bụ ezie na onye sịrị na ya na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe mmetụta ndị na-enye ya nsogbu nwere ike ọ gaghị ekwu na ọ bụghị ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya nsogbu, e kwesịrị ịgba ya ume n’ezie ka ọ gaa chọpụta ma ihe na-eme ya ọ̀ bụ nsogbu ahụ́ ike.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ịkọwa Ihe Omimi Dị n’Ọrịa Uche” nke dị na Teta! (Bekee) nke September 8, 1986, bụ́ magazin a na-ebipụtakọ ya na Ụlọ Nche.