Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

A kwadebere isiokwu ndị a dịịrị ọmụmụ karịsịa maka ndị ntorobịa nọ n’etiti Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, anyị na-agba ndị na-eto eto ume ka ha mụọ isiokwu ndị a nke ọma ma zaa nnọọ ajụjụ ókè ha nwere ike mgbe a ga-amụ ya n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ.

“Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”—Ilu 27:11.

1, 2. (a) Kọwaa ma nanị ịbụ onye ihe ụwa dọọrọ mmasị ya ọ̀ pụtara na i rughịzi eru ịbụ Onye Kraịst. (Ndị Rom 7:21) (b) Gịnị ka ị na-amụta site n’ihe mere Esaf? (Lee igbe dị na peeji nke 13.)

KA E were ya na ị na-achọ ịzụ uwe. Ka ị na-achọgharị nke ị ga-azụ n’ebe e kosara ha, ị hụ otu nke dọọrọ mmasị gị ozugbo. Otú uwe ahụ na-acha na otú e si kwaa ya eyie nnọọ ka ọ ga-adị gị mma n’ahụ́, ego ole e dere mapanye na ya egosikwa na ọ dịghị oké ọnụ. Ma mgbe e mesịrị, i lerukwuo ya anya. N’ụzọ tụrụ gị n’anya, ị chọpụta na ọnụ uwe ahụ richasịrị erichasị nakwa na a gbazighị eri ya agbazi. Ọ bụ ezie na uwe ahụ mara mma n’anya, ọ bụghị nke ezigbo ya. Ị̀ ga-eji ego gị azụ uwe dị otú ahụ na-abụghị nke ezigbo ya?

2 Jiri nke a tụnyere ọnọdụ pụrụ iche gị ihu dị ka Onye Kraịst bụ ntorobịa. Ọ bụrụ na e lee ihe nke ụwa a anya mbụ—dị nnọọ ka uwe ahụ—ọ pụrụ iyi ihe na-adọrọ nnọọ mmasị. Dị ka ihe atụ, ụmụ akwụkwọ ibe gị pụrụ ịdị na-aga nnọkọ ntụrụndụ ndị na-akpali akpali, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụ mmanya, na-eme mfegharị, ma na-enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye. Ụzọ ndụ dị otú ahụ ọ̀ na-adọrọ mmasị gị mgbe ụfọdụ? Ọ̀ na-agụ gị agụụ inwetụ ihe ahụ ha sị na ọ bụ nnwere onwe? Ọ bụrụ otú ahụ, ekwubila ngwa ngwa na ị bụ onye ajọ omume, nakwa na i rughị nnọọ eru ịbụ Onye Kraịst. E kwuwerị, Bible na-ekweta na ụwa pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ nnọọ adọrọ—ọbụna nye onye chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.—2 Timoti 4:10.

3. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-abaghị uru ịchụso ihe nke ụwa? (b) Olee otú otu Onye Kraịst si kọwaa otú o si bụrụ ihe efu ịchụso ihe nke ụwa?

3 Ọ dị mma, biko lerukwuo ya anya, dị nnọọ ka ị ga-elerukwu uwe nke i nwere mmasị ịzụ anya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú usoro ihe a dị?’ Bible na-ekwu na “ụwa na-agabiga.” (1 Jọn 2:17) Ihe ụtọ ọ bụla a na-enweta n’ime ya ga-adịrurị nwa oge. Ọzọkwa, àgwà asọpụrụghị Chineke na-efu oké ihe. Uru adịghị ya ma ọlị. Otu Onye Kraịst, bụ́ onye na-aghaghị ịnagide ihe ọ kpọrọ “ihe mgbu nke oge ntorobịa e ji mee inyo kpatara,” na-ekwu sị: “Ụwa pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ ma na-adọ akpịrị. Ọ na-achọkwa ka i kwere na ị pụrụ inwe ụdị mkpori ndụ ya n’enweghị ihe mgbu. Ma o doro anya na nke a ekweghị omume. Ụwa ga-eji gị hichaa aka, mgbe o hichasịrị, ya atụfuo gị.” * N’ihi gịnị ka ị ga-eji jiri oge ntorobịa gị bie ụdị ndụ dị otú ahụ na-enweghị isi?

Nchebe Pụọ n’Aka “Ajọ Onye Ahụ”

4, 5. (a) Gịnị ka Jizọs rịọrọ Jehova n’ekpere obere oge tupu ọnwụ ya? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ arịrịọ kwesịrị ekwesị?

4 N’ịmata na ọ dịghị ihe bara uru a na-enweta n’usoro ihe a, ndị na-eto eto nọ n’etiti Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike izere ịbụ ndị enyi nke ụwa a. (Jems 4:4) Ì so ná ndị ntorobịa a na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ na i so, i kwesịrị ịja mma. N’ezie, ọ dịghị mfe iguzogide nrụgide ndị ọgbọ na ịbụ onye a maara dị ka onye dị iche, ma i nwere enyemaka.

5 Obere oge tupu ọnwụ ya, Jizọs kpere ekpere ka Jehova “chee” ndị na-eso ụzọ ya “nche n’ihi ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:15) E nwere ezi ihe mere Jizọs ji rịọ arịrịọ a. Ọ maara na ọ gaghị adịrị ụmụazụ ya mfe iguzosi ike n’ezi ihe, n’agbanyeghị afọ ndụ ha. N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na dị ka Jizọs kwetara, ndị na-eso ụzọ ya ga-eche otu onye iro dị ike a na-adịghị ahụ anya—“ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu—ihu. Bible na-ekwu na ajọ mmụọ a e kere eke “na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8.

6. Olee otú anyị si mara na Setan enweghị ọmịiko n’ahụ́ ndị na-eto eto?

6 N’akụkọ ihe mere eme nile, iwetara ụmụ mmadụ oké ihe ọjọọ ndị kasị agbawa obi anọwo na-atọ Setan ụtọ arụrụala. Tụlee ajọ ọdachi ndị ahụ Setan wetaara Job na ezinụlọ ya. (Job 1:13-19; 2:7) Eleghị anya ị pụrụ icheta ihe ndị a kọworo n’akụkọ ụwa n’oge ndụ gị bụ́ ndị na-egosipụta mmụọ ime ihe ike nke Setan. Ekwensu nọ na-awagharị, ka ọ na-achọkwa ndị ọ ga-eripịa, ọ dịghị emere ndị ntorobịa ebere. Dị ka ihe atụ, ná mmalite nke narị afọ mbụ O.A., Herọd kpara nkata igbu ụmụntakịrị nwoke nile nọ na Betlehem bụ́ ndị dị site n’afọ abụọ gbadaa. (Matiu 2:16) O yikarịrị ka ọ bụ Setan kpaliri Herọd ime ihe ahụ o mere—ihe a nile ná mgbalị igbu nwata ahụ nke ga-emesị otu ụbọchị ghọọ Mezaịa Chineke kwere ná nkwa ma mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi Setan! (Jenesis 3:15) N’ụzọ doro anya, Setan enweghị ọmịiko n’ahụ́ ndị na-eto eto. Ọchịchọ ya bụ nanị iripịa ọtụtụ mmadụ ruo ókè o kwere ya mee. Nke a dị otú ahụ ugbu a karịsịa n’ihi na e siwo n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa, ya ‘ana-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.’—Mkpughe 12:9, 12.

7. (a) Olee otú Jehova si dị nnọọ iche n’ebe Setan nọ? (b) Olee otú gị ikpori ndụ na-adị Jehova?

7 N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe Setan, bụ́ onye “na-ewe oké iwe” nọ, Jehova nwere “obi ọmịiko.” (Luk 1:78) Ọ bụ ịhụnanya n’onwe ya. N’ezie, e ji àgwà a magburu onwe ya mara Onye Okike anyị ruo n’ókè nke na Bible na-ekwu, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Lee nnọọ ka Chineke i nwere ihe ùgwù ife ofufe si dị nnọọ iche na chi nke usoro ihe a! Ka Setan na-achọ onye ọ ga-eripịa, Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla.’ (2 Pita 3:9) Ọ na-ele ndụ mmadụ ọ bụla anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa—gụnyere nke gị. Mgbe Jehova na-agba gị ume n’Okwu ya ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa, ọ dịghị anwa igbochi gị ikpori ndụ ma ọ bụ imegharị ahụ́. (Jọn 15:19) N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-eche gị nche n’ihi ajọ onye ahụ. Nna gị nke eluigwe chọrọ ka i nweta ihe ka ihe ụtọ na-anaghị adịte aka nke ụwa a mma. Ọchịchọ ya bụ ka i nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. (1 Timoti 6:17-19) Jehova chọrọ ka i nwee ihe ịga nke ọma, ọ na-agbakwa gị ume ime otú ahụ. (1 Timoti 2:4) Ọzọkwa, Jehova na-akpọ gị òkù pụrụ iche. Gịnị ka ọ bụ?

“Mee Ka Obi M Ṅụrịa”

8, 9. (a) Onyinye dị aṅaa ka ị pụrụ inye Jehova? (b) Olee otú Setan si na-ata Jehova ụta, dị ka e gosiri n’ihe banyere Job?

8 Ị̀ zụtatụrụla ezigbo enyi gị onyinye ma hụ ka ihu ya gbukepụrụ n’ihi na ọ tụrụ ya n’anya nakwa n’ihi ekele o nwere mgbe ọ natara ya? Eleghị anya i chesiri echiche ike ruo ogologo oge banyere ụdị onyinye ga-ekwesị onye ahụ. Ugbu a tụlee ajụjụ a: Olee ụdị onyinye ị ga-enye Onye Okike gị, bụ́ Jehova Chineke? Na mbụ, echiche ahụ pụrụ ịda gị ka ihe ezi uche na-adịghị na ya. Olee ihe Onye Pụrụ Ime Ihe Nile chọrọ n’aka mmadụ nkịtị? Gịnịdị ka ị pụrụ inye ya nke ọ na-enwebeghị? Bible na-aza n’Ilu 27:11, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”

9 Dị ka ị maara, ma eleghị anya site n’ịmụ Bible, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-ata Jehova ụta. Ọ na-ekwu na onye ọ bụla nke na-ejere Chineke ozi na-eme otú ahụ, ọ bụghị n’ihi na ọ hụrụ ya anya, kama n’ihi ọchịchọ onwe onye. Setan na-azọrọ na ọ bụrụ na e kwe ka ha taa ahụhụ, ha ga-agbahapụ ezi ofufe ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Setan gwara Jehova banyere nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job: “Ọ́ bụghị Gị onwe gị gbaworo ya, gbaakwara ụlọ ya, gbaakwara ihe nile o nwere, ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya abụọ, ihe nnweta ya agbasawokwa n’ala. Ma otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:10, 11.

10. (a) Olee otú anyị si mara na ọ bụghị nanị iguzosi ike n’ezi ihe nke Job ka Setan nyoro enyo? (b) Olee otú ihe iseokwu metụtara ọbụbụeze si gbasa gị?

10 Dị ka e gosiri n’ihe ndekọ Bible, ọ bụghị nanị iguzosi ike n’ihe Job ka Setan nyoro enyo kamakwa, ọ na-enyo nke ndị ọzọ nile na-ejere Chineke ozi enyo—gụnyere nke gị. N’ezie, n’ikwu banyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha, Setan gwara Jehova, sị: “Ihe nile nke mmadụ [ọ bụghị nanị Job kama mmadụ ọ bụla] nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) Ị̀ hụrụ ebe ihe iseokwu a dị oké mkpa si gbasa gị? Dị ka e gosiri n’Ilu 27:11, Jehova na-ekwu na e nwere ihe ị pụrụ inye ya—ihe ọ ga-eji zaghachi onye na-ata ya ụta, bụ́ Setan, okwu. Cheedị banyere ya—Eze Eluigwe na Ala na-akpọ gị ka i soro n’idozi ihe iseokwu kasịnụ e nwetụrụla. Lee ibu ọrụ na ihe ùgwù dị ebube i nwere! Ị̀ pụrụ imezu ihe Jehova na-achọ n’aka gị? Job mere otú ahụ. (Job 2:9, 10) Otú ahụkwa ka Jizọs na ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ mere n’akụkọ ihe mere eme nile, gụnyere ọtụtụ ndị ntorobịa. (Ndị Filipaị 2:8; Mkpughe 6:9) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Otú ọ dị, buru n’obi na mmadụ apụghị ịsị na ọ dịghị ebe ya kwụ n’okwu a. Site n’omume gị, ị ga-egosi na ị na-akwado ma ọ́ bụghị ụta Setan na-ata Jehova ọ bụrụ ihe Jehova na-azaghachi ya. Olee nke ị ga-ahọrọ ịkwado?

Jehova Na-eche Banyere Gị!

11, 12. Ọ̀ gbasara Jehova ma ị họọrọ ijere ya ozi ma ọ bụ na ị họrọghị? Kọwaa.

11 Nhọrọ ị na-eme ọ̀ dị Jehova mkpa n’ezie? Ọ̀ bụ na ọtụtụ mmadụ ekwesịbeghị ntụkwasị obi iji nye ya ihe zuru ezu ọ ga-eji zaghachi Setan okwu? N’ezie, Ekwensu kwuru na ọ dịghị onye ji ịhụnanya ejere Jehova ozi, bụ́ ebubo nke e gosipụtawororị na ọ bụ ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-achọ ka ị kwụnyere ya n’ihe iseokwu metụtara ọbụbụeze n’ihi na ọ na-eche banyere gị onwe gị. Jizọs sịrị: “Ọ naghị adị Nna m nọ n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”—Matiu 18:14.

12 N’ụzọ doro anya, ụzọ ndụ ị na-ahọrọ gbasara Jehova. Nke ka mkpa, ọ na-emetụta ya. Bible na-eme ka o doo anya na Jehova nwere mmetụta miri emi bụ́ nke omume ọma ma ọ bụ nke omume ọjọọ nke ụmụ mmadụ na-akpali. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel nupụrụ isi ugboro ugboro, Jehova ‘were iwe.’ (Abụ Ọma 78:40, 41) Tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, mgbe “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne,” Jehova ‘nwere mwute n’obi ya.’ (Jenesis 6:5, 6) Chee banyere ihe nke a pụtara. Ọ bụrụ na ị họrọ ụzọ ndụ ọjọọ, ị pụrụ ime ka Onye Okike gị nwee mwute. Nke a apụtaghị na Chineke adịghị ike ma ọ bụ na ọ bụ onye mmetụta na-achịkwa. Kama nke ahụ, ọ hụrụ gị n’anya ma na-eche banyere ọdịmma gị. N’aka nke ọzọ, mgbe i mere ihe ziri ezi, obi Jehova na-aṅụrị. Obi na-adị ya ụtọ, ọ bụghị nanị n’ihi na o nwekwuola ihe ọ ga-eji zaghachi Setan okwu, kamakwa n’ihi na ọ pụziri ịghọ Onye ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ. Nke ahụ bụkwa ihe ọ chọrọ ịghọ. (Ndị Hibru 11:6) Lee Nna na-ahụ n’anya nke Jehova Chineke bụụrụ gị!

Ngọzi Ndị Bara Ụba Ugbu A

13. Olee otú ijere Jehova ozi si eweta ngọzi ọbụna ugbu a?

13 Ọ bụghị nanị n’ọdịnihu ka a ga-enweta ngọzi ndị na-abịa site n’ijere Jehova ozi. Ọtụtụ ndị ntorobịa nọ n’etiti Ndịàmà Jehova bụ ndị e ji ọṅụ na afọ ojuju na-agọzi ugbu a, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. “Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ,” ka ọbụ abụ ahụ dere. (Abụ Ọma 19:8) Jehova maara ihe dị anyị mma karịa ka mmadụ ọ bụla maara. Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.

14. Olee otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere gị aka izere ihe mgbu nke iji ụgwọ?

14 Ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible ga-enyere gị aka izere ọtụtụ ihe mgbu na obi mgbawa. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na ndị zụliteworo ịhụnanya maka ego “ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.” (1 Timoti 6:9, 10) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ò mezuwo n’ụzọ dị njọ n’ahụ́ onye ọgbọ gị ọ bụla? Ụfọdụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ abanyewo n’oké ụgwọ nanị n’ihi na ha siri ọnwụ na ha ga na-azụrịrị uwe ndị kasị ewu ewu na ngwá nkà na ụzụ ndị kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ. Ịbụ onye na-aghaghị ịdị na-akwụ ọmụrụ nwa dị ukwuu ruo ogologo oge n’ihi ịzụ ihe ndị aka gị na-erughị n’ezie bụ ụdị ịgba ohu dị mwute!—Ilu 22:7.

15. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ụkpụrụ Bible si echebe gị pụọ n’ihe ndị dị mwute na-esi ná mmekọahụ rụrụ arụ apụta?

15 Tụleekwa ihe banyere mmekọahụ rụrụ arụ. Kwa afọ, gbaa gburugburu ụwa, imerime ndị dị afọ iri na ụma na-alụbeghị di na-atụrụ ime. Ụfọdụ na-amụ nwa ha na-enweghị ọchịchọ ma ọ bụ ikike ịzụlite. Ndị ọzọ na-esikwopụ afọ ime ha ma na-enwe obi amamikpe na-eso ya. E nwekwara ụmụ okoro na agbọghọ ndị na-ebute ọrịa ndị na-esite ná mmekọahụ, dị ka ọrịa AIDS. N’ezie, nye onye maara Jehova, ihe ọjọọ kasịnụ ọ ga-arụpụtara ya ga-abụ imebi mmekọrịta ya na Jehova. * (Ndị Galeshia 5:19-21) E nwere ezi ihe mere Bible ji na-asị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.”—1 Ndị Kọrint 6:18.

Ijere “Chineke Onye Obi Ụtọ” Ozi

16. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova na-achọ ka i nwee obi ụtọ n’onye ntorobịa ị bụ? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji esetịpụ ụkpụrụ ndị ị ga na-agbaso?

16 Bible na-akọwa Jehova dị ka “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Ọ chọkwara ka gị onwe gị na-enwe obi ụtọ. N’ezie, Okwu ya kpọmkwem na-ekwu, sị: ‘Nwee obi ụtọ n’onye ntorobịa ị bụ. Nwee obi ụtọ mgbe ị ka na-eto eto.’ (Eklisiastis 11:9, Today’s English Version) Jehova na-ahụ karịa ihe na-eme ugbu a ma nwee ike ịmata ihe ndị na-adịte aka pụrụ isi na ma àgwà ọma ma àgwà ọjọọ apụta. Ọ bụ ya mere o ji na-adụ gị ọdụ, sị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 12:1.

17, 18. Olee otú otu Onye Kraịst na-eto eto si kwupụta obi ụtọ o nwere n’ijere Jehova ozi, oleekwa otú ị pụrụ isi nweta ọṅụ yiri nke ahụ?

17 Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto enwetawo obi ụtọ dị ukwuu n’ijere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, Lina onye dị afọ 15 na-ekwu, sị: “Apụrụ m ịnya isi. Ahụ́ gbasiri m ike n’ihi na adịghị m ese siga, adịghịkwa m aṅụ ọgwụ ọjọọ. Enwere m nduzi bara uru a na-enye m site n’ọgbakọ bụ́ nke na-enyere m aka iguzogide nrụgide ọjọọ nke Setan. Ihu na-abụ m sọ ọchị n’ihi mkpakọrịta na-ewuli elu m na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke kasịnụ, enwere m atụmanya na-enweghị atụ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.”

18 Dị ka Lina, ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-alụsi ọgụ ike maka okwukwe ahụ, nke a na-enyekwa ha ọṅụ. Ha maara na ndụ ha—ọ bụ ezie na ihe ịma aka na-eso ya mgbe ụfọdụ—nwere ezi nzube na ezi ọdịnihu. N’ihi ya, nọgide na-ejere Chineke nke bu ọdịmma gị kasịnụ n’obi ozi. Na-eme ka obi ya ṅụrịa, ọ ga-emekwa ka ị na-aṅụrị ọṅụ ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 5:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee isiokwu bụ́ “Eziokwu Nyeghachiri M Ndụ M,” nke pụtara ná mbipụta Teta! (Bekee) nke October 22, 1996.

^ par. 15 Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na mgbe mmadụ chegharịrị, kwụsị ime ihe ọjọọ, ma kwupụta mmehie ya, Jehova “ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:7.

Ị̀ Na-echeta?

• Ihe ize ndụ dị aṅaa ka ị na-eche ihu n’aka “ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan?

• Olee otú ị pụrụ isi mee ka obi Jehova ṅụrịa?

• Olee otú Bible si egosi na Jehova na-eche banyere gị?

• Olee ngọzi ụfọdụ ndị na-abịa site n’ijere Jehova ozi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]

Ọ Fọrọ Ntakịrị Ka Otu Nwoke Bụ́ Onye Ezi Omume Sụọ Ngọngọ

Esaf bụ onye Livaị a ma ama nke na-abụ abụ n’ụlọ nsọ Jehova n’Izrel oge ochie. Ọbụna ọ rọrọ abụ ndị e ji mee ihe n’ofufe ihu ọha. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ùgwù ndị pụrụ iche Esaf nwere, ruo oge ụfọdụ, ọ ghọrọ onye àgwà asọpụrụghị Chineke nke ndị ọgbọ ya, bụ́ ndị yiri ka ha na-emebi iwu Chineke n’enwetaghị ntaramahụhụ, dọọrọ mmasị ya. “Ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha; nzọụkwụ m fọdụrụ nke nta ka ha gbụchapụ,” ka Esaf mesịrị kweta. “Ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ.”—Abụ Ọma 73:2, 3.

Mgbe e mesịrị, Esaf gara n’ebe nsọ Chineke ma tinye okwu ahụ n’ekpere. N’ịbụ onye e mere ka ọ hụkwuo ihe n’ụzọ ime mmụọ, ọ bịara ghọta na Jehova kpọrọ ihe ọjọọ asị nakwa na ka oge na-aga, ma ndị na-emebi iwu ma ndị ezi omume ga-aghọrọ mkpụrụ ha na-agha. (Abụ Ọma 73:17-20; Ndị Galeshia 6:7, 8) N’ezie, ndị na-emebi iwu nọ n’ala na-alọ alọ. N’ikpeazụ, ha ga-ada mgbe Jehova ga-ebibi usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke.—Mkpughe 21:8.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jehova bu ọdịmma gị kasịnụ n’obi, ebe nzube Setan bụ iripịa gị

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-enweta obi ụtọ kasịnụ site n’iso Ndị Kraịst ibe ha na-ejere Jehova ozi