Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye Boaz na Rut nke Yiri Ihe Na-agaghị Ekwe Omume

Alụmdi na Nwunye Boaz na Rut nke Yiri Ihe Na-agaghị Ekwe Omume

Alụmdi na Nwunye Boaz na Rut nke Yiri Ihe Na-agaghị Ekwe Omume

EBE nzọcha ọka dị nso na Betlehem na-ekwo ekwo. Ụbọchị achọghị ịgwụ agwụ. Ísì ụtọ nke ọka a ka hụrụ n’ọkụ emee ka ndị ọrụ ahụ agụụ ji mara na oge eruola ka ha gaa rie nri. Aka ájá ájá ga-ebutere onye nke ọ bụla n’ime ha ọnụ mmanụ mmanụ.

Boaz, bụ́ aka ji akụ̀ nke nwere ala, erijuo ma ṅujuo afọ ya ma nọrọ n’akụkụ nnukwu ikpo ọka na-ezu nnọọ ike. N’ikpeazụ, owuwe ihe ubi nke ụbọchị ahụ abịa ná njedebe, onye nke ọ bụla n’ime ha agaa n’ebe ahụ́ ga-eru ya ala izuru ike. Boaz, n’ịbụ onye nwere afọ ojuju, ewerezie ákwà kpuchie onwe ya, ụra eburu ya.

Nzute Nzuzo

N’etiti abalị, Boaz ebilie ka oyi ji ya aka ọjọọ. Leenụ, a marawo ụma kpughee ákwà o ji kpuchie ụkwụ ya, e nwekwara onye dina kpọmkwem n’ebe ahụ! Ebe ọ na-amaghị onye ọ bụ n’ọchịchịrị ahụ, ọ jụrụ, sị: “Ònye ka ị bụ?” Olu nwanyị azaa, sị: “Mụ onwe m bụ Rut, ohu gị nwanyị: gbasaakwa ọnụ ọnụ uwe mwụda gị n’ahụ́ ohu gị nwanyị; n’ihi na onye mgbapụta ka ị bụ.”—Rut 3:1-9.

Nanị ha abụọ nọ n’ọchịchịrị ahụ na-ekwurịta okwu. A dịghị ahụ ụmụ nwanyị otú a n’ebe nzọcha ọka. (Rut 3:14) Ka o sina dị, n’ihi arịrịọ Boaz rịọrọ ya, Rut anọgide dinara n’ụkwụ ya ruo nnọọ mgbe ọ fọrọ nke nta ka chi bọọ bụ́ mgbe o ji bilie lawa, si otú a zere ịbụ onye a ga-eji gbawa asịrị na-enweghị isi.

Nzute a ọ̀ bụ nke ndọrọ mmekọahụ? Rut—nwanyị di ya nwụrụ nke si mba na-ekpere arụsị—ò ji akọ rata nwoke a bara ọgaranya nke metụworo agadi? Ka Boaz ò ji ọnọdụ Rut nọ na ya na ọnụnọ nanị ya nọ n’ebe ahụ n’abalị ahụ mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma? Azịza nke ajụjụ ndị ahụ na-egosipụta iguzosi ike n’ihe ha na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. Ihe ndị merenụ na-emetụkwa nnọọ n’ahụ́.

Ònye bụdị Rut? Gịnị bụ ebumnobi ya? Ònyekwa bụ ọgaranya a, bụ́ Boaz?

“Nwanyị Na-ejide Onwe Ya nke Ọma”

Ọtụtụ afọ tupu ihe a emee, ụnwụ nri dara na Juda. Otu ezinụlọ Izrel nke mmadụ anọ mejupụtara—Elimelek; nwunye ya, bụ́ Naomi; na ụmụ ha nwoke abụọ, bụ́ Mahlon na Kilion—kwagara n’ala Moab nke na-eme nri. Ụmụ ha nwoke ahụ lụrụ ụmụ nwanyị Moab abụọ, bụ́ Rut na Ọpa. Mgbe ọnwụ ndị ikom atọ ahụ gasịrị na Moab, ndị inyom atọ ahụ nụrụ na ihe adịla mma n’Izrel. Ya mere, Naomi—bụ́zi nwanyị di ya nwụrụ, nke nwere obi ilu, nke na-enweghịkwa ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ—kpebiri ịlaghachi n’ala nna ya.—Rut 1:1-14.

Ka ha nọ n’ụzọ na-ala Izrel, Naomi mere ka Ọpa kweta ịlaghachikwuru ndị ya. Naomi gwaziri Rut, sị: “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwuruwo ndị ya, laghachikwuru chi ya: gị soro nwunye nwanne di gị laghachi.” Ma Rut sịrị: “Arịọla m ịhapụ gị, . . . n’ihi na ebe ị na-eje ka m ga-eje; . . . ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m: ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m.” (Rut 1:15-17) Ya mere ndị inyom abụọ ahụ di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ n’ụkọ laghachiri Betlehem. N’ebe ahụ, ịhụnanya Rut nwere n’ebe nne di ya nọ na nlekọta ọ na-elekọta ya masịrị ndị agbata obi ha nke ukwuu, nke na ha weere ya na ọ “dịrị [Naomi] mma karịa ụmụ ndị ikom asaa.” Ndị ọzọ kọwara ya dị ka “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma.”—Rut 3:11; 4:15.

Na Betlehem, ka o ruru oge owuwe ihe ubi nke ọka bali, Rut gwara Naomi, sị: “Biko, ka m jee n’ubi, chịkọta ihe n’etiti oko ọka n’azụ onye m ga-ahụta amara n’ihu ya.”—Rut 2:2.

Ọ bịara n’ubi Boaz, bụ́ onye ikwu nna di ya, bụ́ Elimelek, ná ndabara. Ọ natara ikike n’aka onye na-elekọta ubi ahụ ịchịkọta ihe fọdụrụ n’ubi. Ịdị uchu ya n’ịchịkọta ihe ndị fọdụrụ n’ubi pụtara ìhè, onye na-elekọta ubi ahụ emeekwa ka Boaz mara banyere ịdị uchu ya n’ọrụ.—Rut 1:22–2:7.

Onye Nchebe na Onye Na-eme Ihe Ọma

Boaz ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Kwa ụtụtụ, Boaz na-eji okwu ndị bụ́: “Jehova nọnyere unu” ekele ndị na-ewere ya ihe ubi, ha na-azaghachikwa, sị: “Jehova gọzie gị.” (Rut 2:4) Mgbe Boaz hụsịrị ịdị uchu Rut n’ọrụ, matakwa banyere iguzosi ike n’ihe ya nye Naomi, o meere Rut ndokwa pụrụ iche n’ihe banyere ịchịkọta ihe ndị fọdụrụ n’ubi. N’igbu ya nkenke, ọ gwara ya, sị: ‘Nọrọ n’ubi m; ọ dịghị gị mkpa ịga ebe ọzọ. Rapara n’ahụ́ ụmụ agbọghọ m; ọ dịghị ihe ga-eme gị. Enyewo m ụmụ okorobịa m iwu ka ha ghara imetụ gị aka. Mgbe akpịrị kpọrọ gị nkụ, ha ga-esetara gị mmiri.’—Rut 2:8, 9.

Rut adaa kpuo ihu ya n’ala ma kwuo, sị: ‘Gịnị mere m ji hụta amara n’ihu gị, ebe mụ onwe m bụ ọbịa? Boaz azaa, sị: ‘E gosiri m nke ọma ihe nile i mewooro nne di gị mgbe ọnwụ di gị gasịrị—otú i si hapụ nna gị, nne gị, ndị ikwu gị, na ala a mụrụ gị wee bịakwute otu ndị nke ị na-amaghị na mgbe gara aga. Jehova kwụghachi gị ọrụ gị. Ya nyekwa gị ụgwọ ọrụ zuru ezu.’—Rut 2:10-12.

Boaz adịghị anwa ime ka Rut hụ ya n’anya. O ji ezi obi na-aja ya mma. Rut ji amara wetuo onwe ya ala, na-ekele ya maka nkasi obi ya nke na-emesighachi obi ike. O weere ya dị ka ihe na-erughịrị ya ma nọgide ọbụna na-arụsi ọrụ ike. E mesịa, mgbe oge nri ruru, Boaz akpọọ Rut, sị: ‘Bịaruo nso, rie ụfọdụ n’ime nri, sunyekwa iberibe achịcha gị n’ime mmanya vaịn gbara ụka.’ O rijuo afọ ya, werekwa nke ọ ga-enye Naomi ma ọ laruo.—Rut 2:14.

Ka ọ na-erule oge uhuruchi, Rut achịkọtala ihe dị ka lita ọka bali 22. Ya ewere ya na nri ahụ o rifọrọ laghachikwuru Naomi n’ụlọ. (Rut 2:15-18) N’ịbụ onye ihe ndị ahụ o wetara n’ụba mere ka o nwee obi ụtọ, Naomi ajụọ, sị: “Olee ebe ị chịkọtaworo ọka taa? . . . ka onye na-amata gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” N’ịmata na ọ bụ Boaz, Naomi ekwuo, sị: “Onye a gọziri agọzi dịịrị Jehova, ka ọ bụ, Onye na-ahapụghị ebere ọ na-emere ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. . . . Onye ahụ́ anyị ka nwoke ahụ bụ, otu n’ime ndị mgbapụta anyị ka ọ bụ.”—Rut 2:19, 20.

Ịchọta “Izu Ike”

N’ịbụ onye chọsiri ike ịchọtara nwunye nwa ya “izu ike,” ma ọ bụ ebe obibi, Naomi ejiri ohere ahụ mee ndokwa ịrịọ maka mgbapụta, n’ikwekọ n’Iwu Chineke. (Levitikọs 25:25; Deuterọnọmi 25:5, 6) Naomi abịazie kụziere Rut ụzọ kasị dị irè, ọbụna na-akpalitụ mmasị, ọ ga-esi mee ihe—ụzọ isi dọta mmasị Boaz. N’ịbụ onye dị njikere nke e nyerela ntụziaka nke ọma, Rut agaa n’ebe nzọcha ọka nke Boaz n’abalị. Ya ahụ ya ebe ọ na-ehi ụra. Ya ekpughee ụkwụ ya ma chere ka o teta.—Rut 3:1-7.

Mgbe Boaz tetara, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe Rut mere n’ụzọ ihe atụ nyeere Boaz aka ịghọta ihe arịrịọ ya nke ya ‘ịgbasa ọnụ ọnụ uwe mwụda ya n’ahụ́ ohu ya nwanyị,’ pụtara. Ihe Rut mere mere ka nwoke Juda ahụ meworo agadi mara banyere ibu ọrụ ya dị ka onye mgbapụta, ebe ọ bụ onye ikwu nke di Rut, bụ́ Mahlon.—Rut 3:9.

Boaz atụghị anya ije a Rut bịara na nke ya n’abalị. N’agbanyeghị nke ahụ, mmeghachi omume Boaz na-enye echiche na ihe Rut kwuru banyere mgbapụta abụchaghị ihe a na-atụghị anya ya. Boaz dị njikere ime ihe ahụ Rut rịọrọ ya.

Ọ ghaghị ịbụwo na olu Rut dara ka nke onye ụjọ ji, nke kpaliri Boaz imesi ya obi ike, sị: “Ugbu a, nwa m, atụla egwu; ihe ọ bụla nke ị na-asị, m ga-emere gị ya: n’ihi na ọnụ ụzọ ámá nile nke ndị m maara na nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma ka ị bụ.”—Rut 3:11.

O doro anya na Boaz lere ihe ahụ Rut mere anya dị ka ihe dị mma n’ihi ihe a o kwuru, bụ́: “Nwanyị a gọziri agọzi dịịrị Jehova ka ị bụ, nwa m: i mewo ebere nke ọma n’ikpeazụ karịa na mbụ.” (Rut 3:10) Na mbụ, Rut gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, n’ebe Naomi nọ. Nke ikpeazụ bụ na o mere ka Boaz, bụ́ nwoke tọrọ ya nke ọma mata ya, n’ihi na ọ bụ onye mgbapụta. Ọ dị njikere ịmụta nwa n’aha Mahlon, bụ́ di ya nwụrụ anwụ, nakwa n’aha Naomi.

Onye Mgbapụta Esere Aka Ya

N’ụtụtụ echi ya, Boaz akpọọ onye ikwu ya a kpọrọ “Nwoke m” (NW), nke bụ́ onye ahụ́ Naomi karịa Boaz. Boaz ekwuo n’ihu ndị nọdụrụ ebe ahụ na ndị okenye obodo ahụ, sị: ‘M ga-ekpughepụ ntị gị ka ị nụ ya na ọ bụ gị ka o ruuru ịgbapụta n’aka Naomi ubi di ya bụ́ Elimelek, n’ihi na ọ ghaghị ire ya.’ Boaz agaa n’ihu, sị: ‘Ị̀ ga-agbapụta ya? Ọ bụrụ na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ m ga-agbapụta ya.’ Ma mgbe Nwoke m ahụ nụsịrị ihe Boaz kwuru, o kwuru na ya ga-agbapụta ya.—Rut 4:1-4.

Ma Nwoke m ahụ ka gaje ịnụ ihe ga-atụ ya n’anya! Boaz ekwuzie n’ihu ndị àmà ahụ nile, sị: “N’ụbọchị ị ga-azụrụ ubi ahụ n’aka Naomi, ọ bụkwa n’aka Rut, bụ́ nwanyị Moab, bụ́ nwunye onye nwụrụ anwụ, ka ị ga-azụrụ ya, ime ka aha onye nwụrụ anwụ bilie n’elu ihe nketa ya.” N’ihi ịtụ egwu na ọ ga-emebi ihe nketa nke ya, onye ahụ ka bụrụ onye ahụ́ gbahapụrụ oruru o ruuru ya ime mgbapụta ahụ na-asị: “Apụghị m ịgbapụta ya.”—Rut 4:5, 6.

Dị ka omenala si dị, onye jụrụ ịgbapụta ihe ga-agbụpụ akpụkpọ ụkwụ ya ma nye ya onye nke ọzọ. Ya mere, mgbe onye mgbapụta ahụ sịrị Boaz, “Zụrụ ya n’onwe gị,” ọ gbụpụrụ akpụkpọ ụkwụ ya. Boaz agwazie ndị okenye na ndị ahụ nile, sị: “Ndị àmà ka unu bụ taa, na azụrụwo m ihe nile nke Elimelek nwere, na ihe nile nke Kilion na Mahlon nwere, n’aka Naomi. Ọzọkwa, Rut, bụ́ nwanyị Moab, bụ́ nwunye Mahlon, ka m zụrụwokwara ịbụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ bilie n’elu ihe nketa ya . . . Ndị àmà ka unu bụ taa.”—Rut 4:7-10.

Ndị nile nọ n’ọnụ ụzọ ámá asị Boaz: “Jehova mee nwanyị a nke na-aba n’ụlọ gị ka ọ dị ka Rechel na dị ka Lia, ndị ha abụọ wuru ụlọ [Izrel]: gị meekwa dimkpa n’Efrata, mee ka a mara aha gị na Betlehem.”—Rut 4:11, 12.

N’ịbụ onye ndị ahụ gọziworo, Boaz akpọrọ Rut dị ka nwunye ya. Ọ mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Obed, Rut na Boaz esikwa otú a ghọọ nne na nna ochie nke Eze Devid nakwa nke Jizọs Kraịst.—Rut 4:13-17; Matiu 1:5, 6, 16.

‘Ụgwọ Ọrụ Zuru Okè’

N’ihe ndekọ a nile, site n’ekele obiọma o kelere ndị ọrụ ya ruo n’ịnakwere ibu ọrụ nke ịhụ na ámá Elimelek echighị, Boaz gosiri na ya bụ nwoke a ma ama—ekwu eme na onye nwere ikike. N’otu mgbe ahụ, ọ bụ nwoke nwere njide onwe onye na okwukwe, ma na-eguzosi ike n’ezi ihe. Boaz bụkwa onye na-emesapụ aka, onye dị obiọma, dị ọcha n’omume, ma na-erube isi n’iwu Jehova n’ụzọ zuru ezu.

A ma Rut ama n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ, n’ihi ezi ịhụnanya o nwere n’ebe Naomi nọ, nakwa n’ihi ịdị uchu na obi umeala ya. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ lere ya anya dị ka “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma.” Ọ dịghị eri “nri umengwụ,” n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya, o nwekwara ihe ya na nne di ya nọ ná mkpa kerịtara. (Ilu 31:27, 31) N’ịrụchitere Naomi ọrụ dịịrị ya, Rut aghaghị inwetaworị obi ụtọ nke na-abịa site n’inye ihe.—Ọrụ 20:35; 1 Timoti 5:4, 8.

Lee ihe nlereanya ndị dị mma anyị na-ahụ n’akwụkwọ Rut! Jehova chetara Naomi. Rut natara ‘ụgwọ ọrụ zuru ezu’ nke ịbụ nne ochie Jizọs Kraịst. E ji “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma” gọzie Boaz. A bịakwa n’ebe anyị nọ, anyị na-enweta ihe nlereanya nke okwukwe n’ebe ụdị mmadụ ndị ahụ nọ.

[Igbe dị na peeji nke 26]

Olileanya Dịtụ

Ọ bụrụ na i chetụla na ị na-ebi n’oge na-adịghị enye obi ụtọ ná ndụ, akụkọ banyere Rut pụrụ ime ka ị malite inwe olileanya. Ọ pụtara ìhè dị ka akụkọ ntụkwasị dị mkpa nye akwụkwọ Ndị Ikpe. Akwụkwọ Rut na-akọ otú Jehova si jiri nwanyị di ya nwụrụ nke dị umeala n’obi bụ́ onye si mba ọzọ bụ́ Moab, nwetara ndị ya eze. Mgbe a tụlere ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ndị Ikpe, okwukwe Rut na-enwu dị ka ìhè nke oge ahụ.

Site n’ịgụ akụkọ Rut, ị pụrụ inwe obi ike na n’agbanyeghị otú ihe pụrụ isiru n’ike, Chineke na-elekọta ndị ya mgbe nile ma na-emezu nzube ya.