“Nọgidenụ Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”
“Nọgidenụ Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”
“[Nọgidenụ] na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”—JỌN 15:8.
1. (a) Olee ihe a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs gwara ndịozi ya? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
Ọ BỤ n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya. Jizọs ewepụtawo oge hiri nne iji gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume site n’ịgwa ha okwu n’ụzọ na-emetụ n’obi. Ọ ghaghị ịbụwo na ọ gafeela etiti abalị ugbu a, ma Jizọs nọgidere na-ekwu okwu n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ezi ndị enyi ya nọ. Mgbe ahụ, ka mkparịta ụka ahụ na-aga n’ihu, o chetaara ha otu ihe ọzọ a chọrọ ka ha na-eme iji nọgide na-abụ ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 15:8) Ànyị na-eme ihe a a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ taa? Gịnị ka ‘ịmị mkpụrụ dị ukwuu’ pụtara? Iji chọpụta, ka anyị laghachi ná mkparịta ụka ahụ e nwere n’uhuruchi ahụ.
2. Olee ihe atụ Jizọs nyere banyere mkpụrụ osisi n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya?
2 Ndụmọdụ banyere ịmị mkpụrụ so n’ihe atụ Jizọs nyere ndịozi ya. Ọ sịrị: “Abụ m ezi osisi vaịn ahụ, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya. Alaka ọ bụla dị na mụ nke na-adịghị amị mkpụrụ ka ọ na-ewepụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ. Unu adịworị ọcha n’ihi okwu m gwaworo unu. Nọgidenụ bụrụ ndị mụ na ha dị n’otu, mụ onwe m na unu Jọn 15:1-10.
adịkwa n’otu. Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ọ gwụla ma ọ̀ dịgidere n’osisi vaịn ahụ, n’otu ụzọ ahụ unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ, ọ gwụla ma mụ na unu ọ̀ nọgidere na-adị n’otu. Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya. . . . A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m. Dị nnọọ ka Nna m hụworo m n’anya, mụ onwe m ahụkwa unu n’anya, nọgidenụ n’ịhụnanya m. Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m.”—3. Gịnị ka ụmụazụ Jizọs na-aghaghị ime iji na-amị mkpụrụ?
3 N’ihe atụ a, Jehova bụ Onye kụrụ osisi vaịn ahụ, Jizọs bụ osisi vaịn ahụ, ndịozi ahụ Jizọs na-agwa okwu bụkwa alaka ya. Ọ bụrụhaala na ndịozi ahụ agbalịsie ike ‘ịnọgide soro Jizọs na-adị n’otu,’ ha ga-amị mkpụrụ. Jizọs kọwaziri otú ndịozi ahụ pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnọgide n’ịdị n’otu a dị oké mkpa, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m.” E mesịa, Jọn onyeozi gaje idegara Ndị Kraịst ibe ya okwu ndị yiri nke ahụ, sị: “[Kraịst] na onye na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu na-anọgide na-adị n’otu.” * (1 Jọn 2:24; 3:24) N’ihi ya, site n’idebe ihe Kraịst nyere n’iwu, ya na ụmụazụ ya na-anọgide na-adị n’otu, ịdị n’otu ahụ, n’aka nke ya kwa, na-eme ka ha nwee ike ịmị mkpụrụ. Gịnị ka e ji amata mkpụrụ ọ dị mkpa ka anyị na-amị?
Ohere Maka Uto
4. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova “na-ewepụ” alaka ọ bụla na-adịghị amị mkpụrụ?
4 N’ihe atụ nke osisi vaịn ahụ, Jehova “na-ewepụ,” ma ọ bụ na-egbupụ, alaka mgbe ọ na-adịghị amị mkpụrụ. Gịnị ka nke a na-agwa anyị? Ọ na-agwa anyị ọ bụghị nanị na a chọrọ ka ndị nile na-eso ụzọ na-amị mkpụrụ kamakwa na ha nile pụrụ ime otú ahụ, n’agbanyeghị ihe pụrụ ịbụ ọnọdụ ma ọ bụ erughị eru ha. E kwuwerị, ọ ga-abụ ihe na-ekwekọghị n’ụzọ ịhụnanya nke Jehova ‘iwepụ’ onye na-eso ụzọ Kraịst, ma ọ bụ ikwu na o rughị eru, n’ihi na ọ pụghị imezu ihe karịrị ike ya.—Abụ Ọma 103:14; Ndị Kọlọsi 3:23; 1 Jọn 5:3.
5. (a) Olee otú ihe atụ Jizọs si egosi na anyị pụrụ inwe ọganihu n’ịmị mkpụrụ? (b) Olee ụdị mkpụrụ abụọ anyị ga-atụle?
5 Ihe atụ Jizọs banyere osisi vaịn ahụ na-egosikwa na dị ka ọnọdụ anyị kwere anyị mee, anyị aghaghị ịchọ ohere anyị ga-eji na-enwe ọganihu n’ọrụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ. Rịba ama otú Jizọs si kwuo ya: “Alaka ọ bụla dị na mụ nke na-adịghị amị mkpụrụ ka ọ na-ewepụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.” (Jọn 15:2) Ná ngwụsị nke ihe atụ ahụ, Jizọs gbara ụmụazụ ya ume ịmị “mkpụrụ dị ukwuu.” (Amaokwu nke 8) Gịnị ka nke a pụtara? Dị ka ndị na-eso ụzọ, anyị ekwesịtụghị ịbụ ndị onwe ha juru afọ. (Mkpughe 3:14, 15, 19) Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịchọ ụzọ isi na-enwe ọganihu n’ịmị mkpụrụ. Olee ụdị mkpụrụ anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịmịkwu n’ụba? E nwere (1) “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” na (2) mkpụrụ nke Alaeze.—Ndị Galeshia 5:22, 23; Matiu 24:14.
Mkpụrụ nke Àgwà Ndị Kraịst
6. Olee otú Jizọs Kraịst si mesie ike uru nke mbụ e depụtara n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ bara?
6 Ịhụnanya bụ nke mbụ e depụtara n’ime “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Mmụọ nsọ Chineke na-amịpụta ịhụnanya n’ime Ndị Kraịst, n’ihi na ha na-erube isi n’iwu Jizọs nyere n’oge na-adịghị anya tupu ya enye ihe atụ nke osisi vaịn ahụ na-amị mkpụrụ. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) N’ezie, ná mkparịta ụka ha ahụ dum n’abalị ikpeazụ ahụ ọ dịrị ndụ n’elu ala, Jizọs chetaara ndịozi ya ugboro ugboro mkpa ọ dị igosipụta ịhụnanya.—Jọn 14:15, 21, 23, 24; 15:12, 13, 17.
7. Olee otú Pita onyeozi si gosi na ịmị mkpụrụ metụtara igosipụta àgwà ndị yiri nke Kraịst?
7 Pita, bụ́ onye nọ ya n’abalị ahụ, ghọtara na ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịdị na-egosipụta n’etiti onwe ha ịhụnanya yiri nke Kraịst na àgwà 2 Pita 1:5-8) Ihe ọ sọkwara ọnọdụ anyị ya bụrụ, anyị ga-egosipụtali mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ya mere, ka anyị na-agbalịsi ike igosipụta ịhụnanya, obiọma, ịdị nwayọọ, na àgwà ndị ọzọ yiri nke Kraịst ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị, n’ihi na “ọ dịghị iwu [ma ọ bụ ókè] na-emegide ihe ndị dị otú ahụ.” (Ndị Galeshia 5:23) N’ezie, ka anyị “na-amịkwu mkpụrụ.”
ndị yiri ya. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pita gbara Ndị Kraịst ume ịzụlite àgwà ndị dị ka njide onwe onye, mmetụta ụmụnna, na ịhụnanya. Ọ gbakwụnyere na ime otú ahụ na-egbochi anyị “ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.” (Ịmị Mkpụrụ nke Alaeze
8. (a) Olee njikọ dị n’etiti mkpụrụ nke mmụọ nsọ na mkpụrụ nke Alaeze? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịtụle?
8 Mkpụrụ osisi ndị nwere àgwà mara mma ma dị pokopoko na-achọ osisi mma. Otú ọ dị, uru mkpụrụ osisi ndị dị otú ahụ bara abụghị nanị ịchọ osisi mma. Mkpụrụ osisi dịkwa oké mkpa iji mee ka osisi na-amụba. N’otu aka ahụ, mkpụrụ nke mmụọ nsọ na-eme nnọọ ihe karịrị ịchọ àgwà anyị dị ka Ndị Kraịst mma. Àgwà ndị dị ka ịhụnanya na okwukwe na-akwalikwa anyị ịgbasa ozi Alaeze ahụ yiri mkpụrụ nke a na-achọta n’Okwu Chineke. Rịba àmà otú Pọl onyeozi si mesie njikọ a dị oké mkpa ike. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị onwe anyị kwa na-egosipụta okwukwe [nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ], ya mere anyị na-ekwukwa okwu.” (2 Ndị Kọrint 4:13) N’ụzọ dị otú a, ka Pọl na-akọwakwu, anyị ‘na-achụrụ Chineke àjà otuto, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ’—ụdị mkpụrụ nke abụọ ọ dị mkpa ka anyị na-amị. (Ndị Hibru 13:15) Ànyị nwere ohere nke ịmịkwu mkpụrụ, n’ezie nke ‘ịmị mkpụrụ dị ukwuu,’ ná ndụ anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze Chineke?
9. Ịmị mkpụrụ na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ hà bụ otu ihe? Kọwaa.
9 Iji zaa ya nke ọma, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ ghọta ihe mkpụrụ nke Alaeze bụ. Ọ̀ ga-abụ ihe ziri ezi ikwubi na ịmị mkpụrụ pụtara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ? (Matiu 28:19) Mkpụrụ anyị ga-amị ọ̀ na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’ebe ndị anyị ga-enyere aka ịghọ ndị e mere baptizim dị ka ndị na-efe Jehova ofufe nọ? Ee e. A sị na ọ bụ ihe ọ na-ezo aka na ya, ọnọdụ ahụ ga-abụ nnọọ ihe nkụda mmụọ nye Ndịàmà nile anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ozi Alaeze ahụ ruo ọtụtụ afọ n’ókèala ndị a na-adịghị anabata ozi ọma na ha. Leenụ, a sị na mkpụrụ nke Alaeze anyị na-amị bụ nanị ndị ọhụrụ anyị mere ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, Ndịàmà dị otú ahụ na-arụsi ọrụ ike gaara adị ka alaka ndị ahụ na-adịghị amị mkpụrụ nke ihe atụ Jizọs! N’ezie, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Gịnịzi bụ mkpụrụ Alaeze bụ́ isi ozi anyị na-amị?
Ịmị Mkpụrụ Site n’Ịgbasa Mkpụrụ nke Alaeze
10. Olee otú ihe atụ Jizọs banyere ọgha mkpụrụ na ụdị ala dị iche iche si egosi ihe mkpụrụ Alaeze bụ na ihe ọ na-abụghị?
10 Ihe atụ Jizọs banyere ọgha mkpụrụ na ala ndị ahụ dị iche iche na-enye azịza ya—azịza na-agba ume nye ndị na-agba àmà n’ókèala ndị na-adịchaghị amị mkpụrụ. Jizọs kwuru na mkpụrụ ahụ bụ ozi Alaeze ahụ nke a na-achọta n’Okwu Luk 8:8) Olee ụdị mkpụrụ ha mịrị? Mgbe ókpòrò ọka wit pulitere ma too nke ọma, mkpụrụ ọ na-amị abụghị ụmụ obere ọka wit na-etolite etolite, kama ọ bụ mkpụrụ ọhụrụ. N’otu aka ahụ, mkpụrụ Onye Kraịst na-amị abụchaghị ndị ọhụrụ o mere ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, kama ọ bụ mkpụrụ Alaeze ọhụrụ.
Chineke, nakwa na ala ahụ na-anọchi anya obi ihe atụ nke mmadụ. Ụfọdụ mkpụrụ “dara n’ezi ala, mgbe ha pulitesịrị, ha mịkwara mkpụrụ.” (11. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ihe mkpụrụ nke Alaeze bụ?
11 N’ihi ya, ihe bụ́ mkpụrụ ahụ n’ọnọdụ a abụghị ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ma ọ bụ ezi àgwà Ndị Kraịst. Ebe ọ bụ na mkpụrụ a ghara bụ okwu nke Alaeze ahụ, mkpụrụ ọ mịrị aghaghị ịbụ mmụba a mụbara mkpụrụ ahụ. Ịmị mkpụrụ n’ọnọdụ a na-ezo aka n’ikwu banyere Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Ịmị mkpụrụ Alaeze dị otú ahụ—ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ—ọ̀ bụ ihe anyị ga-emeli, n’agbanyeghị ihe ọnọdụ anyị pụrụ ịbụ? Ee, ọ bụ! N’otu ihe atụ ahụ, Jizọs kọwara ihe kpatara ya.
Ime Ike Anyị Nile Iji Na-enye Chineke Otuto
12. Ndị Kraịst nile hà ga-amịli mkpụrụ Alaeze? Kọwaa.
12 “Nke ahụ a ghara n’ala dị mma,” ka Jizọs kwuru, “na-emepụta ihe, nke a okpukpu otu narị, nke ahụ iri isii, nke ọzọ iri atọ.” (Matiu 13:23) Mkpụrụ a ghara n’ubi pụrụ ịmị mkpụrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche dị ka ọnọdụ ha si dị. N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe anyị pụrụ ime n’ikwusa ozi ọma ahụ pụrụ ịdịgasị iche dị ka ọnọdụ anyị si dị, Jizọs gosikwara na ya ghọtara nke a. Ụfọdụ pụrụ inwe ohere ka ukwuu; ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị ahụ́ siri ike karị na ndị nwere ume karị. N’ihi ya, ihe anyị pụrụ ime pụrụ ịdị ukwuu ma ọ bụ dị obere karịa ihe ndị ọzọ na-eme, ma, ọ bụrụhaala na ọ bụ ike anyị nile ka anyị na-eme, obi na-adị Jehova ụtọ. (Ndị Galeshia 6:4) Ọ bụrụgodị na ịka nká ma ọ bụ ọrịa na-eme ka anyị gharazie imeru ókè anyị na-emerubu n’ọrụ nkwusa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Nna anyị nwere ọmịiko, bụ́ Jehova, na-ele anyị anya dị ka otu n’ime ndị “nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu.” N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-enye ya ‘ihe nile anyị nwere’—ozi anyị ji mkpụrụ obi anyị dum na-eje. *—Mak 12:43, 44; Luk 10:27.
13. (a) Olee isi ihe mere anyị ga-eji ‘gaa n’ihu’ n’ịmị mkpụrụ Alaeze? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-amị mkpụrụ n’ókèala ndị a na-adịchaghị anabata ozi ọma na ha? (Lee igbe dị na peeji nke 21.)
13 Ruo ókè ọ bụla anyị nwere ike ịmị mkpụrụ Alaeze, anyị ga-abụ ndị a kpaliri ‘ịga n’ihu wee nọgide na-amị mkpụrụ’ ma ọ bụrụ na anyị eburu n’uche ihe mere anyị ji na-eme ya. (Jọn 15:16) Jizọs kwuru isi ihe kpatara ya, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu.” (Jọn 15:8) Ee, ọrụ nkwusa anyị na-edo aha Jehova nsọ n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 109:30) Honor, bụ́ Onyeàmà na-ekwesị ntụkwasị obi nke dị ihe dị ka afọ 75, na-ekwu, sị: “Ọbụna n’ókèala ndị a na-adịchaghị anabata ozi ọma ahụ na ha, ọ bụ ihe ùgwù ịnọchite anya Onye Kasị Ihe Nile Elu.” Mgbe a jụrụ Claudio, bụ́ Onyeàmà nọworo na-anụ ọkụ n’obi kemgbe 1974, ihe mere o ji nọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ókèala ya na-anabata ozi ọma, o hotara Jọn 4:34, bụ́ ebe anyị na-agụ okwu Jizọs bụ́: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” Claudio gbakwụnyere, sị: “Dị ka Jizọs, achọrọ m ọ bụghị nanị ịmalite ọrụ m dị ka onye nkwusa Alaeze kamakwa achọrọ m ịrụcha ya.” (Jọn 17:4) Ndịàmà Jehova n’ụwa nile kwenyere na nke ahụ.—Lee igbe bụ́ “Otú E Si ‘Eji Ntachi Obi Amị Mkpụrụ,’” nke dị na peeji nke 21.
Ime Nkwusa na Izi Ihe
14. (a) Nzube dị aṅaa gbara mkpị ka ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim na nke Jizọs nwere? (b) Olee otú ị ga-esi akọwa ọrụ Ndị Kraịst taa?
14 Onye mbụ e kwuru banyere ya n’Oziọma ndị ahụ dị ka onye nkwusa Alaeze bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Matiu 3:1, 2; Luk 3:18) Nzube ya bụ́ isi bụ ‘ịgba àmà,’ o jikwa okwukwe sitere n’obi nakwa olileanya na ‘ụdị mmadụ nile pụrụ ikwere’ mee ya. (Jọn 1:6, 7) N’ezie, ụfọdụ n’ime ndị Jọn kwusaara ozi ọma ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Jọn 1:35-37) N’ihi ya, Jọn bụ onye nkwusa nakwa onye na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ. Jizọs n’onwe ya bụkwa onye nkwusa na onye ozizi. (Matiu 4:23; 11:1) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ọ bụghị nanị ikwusa ozi Alaeze ahụ kamakwa inyere ndị nabatara ya aka ịghọ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 28:19, 20) N’ihi ya, ọrụ anyị taa bụ ma ime nkwusa ma izi ihe.
15. Olee otú ụzọ e si meghachi omume n’ọrụ nkwusa ahụ a rụrụ na narị afọ mbụ O.A. na nke a na-arụ taa si yie?
15 N’ime ndị nọ na narị afọ mbụ O.A. bụ́ ndị nụrụ ka Pọl mere nkwusa ma zie ihe, “ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ndị a na-ekwu; ndị ọzọ ekweghị.” (Ọrụ 28:24) Taa, mmeghachi omume a na-enweta bụ nnọọ otu ihe ahụ. N’ụzọ dị mwute, ihe ka ọtụtụ ná mkpụrụ nke Alaeze na-ada n’ala na-adịghị eme ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ mkpụrụ ka na-ada n’ala dị mma, na-agba mkpọrọgwụ, ma na-epulite, dị nnọọ ka Jizọs buru n’amụma. N’ezie, n’ụwa nile, nkezi nke ihe karịrị mmadụ 5,000 na-aghọ ezi ndị na-ezo ụzọ Kraịst n’izu ọ bụla n’afọ! Ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ ‘na-ekwere ihe ndị a na-ekwu,’ ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ndị ọzọ adịghị eme otú ahụ. Gịnị na-enye aka eme ka obi ha na-anabata ozi Alaeze ahụ? Mgbe mgbe, ọ bụ mmasị onwe onye Ndịàmà na-egosi—ịgba mkpụrụ ahụ a ghara ọhụrụ mmiri, dị ka a pụrụ isi kwuo ya—na-eme ka ha na-anabata ya. (1 Ndị Kọrint 3:6) Tụlee nanị abụọ n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị e nwere.
Mmasị Onwe Onye Na-agbanwe Ihe
16, 17. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa igosi mmasị onwe onye n’ebe ndị anyị na-ezute n’ozi nọ?
16 Karolien, bụ́ Onyeàmà na-eto eto nọ na Belgium, kpọtụụrụ otu agadi nwanyị nke na-egosighị mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Ebe ọ bụ na e kere nwanyị ahụ bandeeji n’aka, Karolien na onye ya na ya so rịọrọ ya ka ha nyere ya aka, ma nwanyị ahụ ekweghị. Ụbọchị abụọ ka e mesịrị, otu Ndịàmà ahụ gaghachiri n’ụlọ nwanyị ahụ ma jụọ ya otú ahụ́ dị ya. “Nke a gbanwere ihe,” ka Karolien kwuru. “Ọ tụrụ ya n’anya ịhụ na anyị nwere mmasị n’ezie n’ebe ya onwe ya nọ. Ọ gwara anyị ka anyị bata n’ụlọ ya, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible.”
17 Sandi, bụ́ Onyeàmà nọ na United States, na-egosikwa mmasị onwe onye n’ebe ndị ọ na-ekwusara ozi ọma nọ. Ọ na-enyocha akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ha ma ọ̀ ga-ahụ ebe a mara ọkwà banyere nwa ọhụrụ a mụrụ, ọ bụrụ na ọ dị, ọ na-eji akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible agakwuru ndị ahụ mụrụ nwa ọhụrụ. * Ebe ọ bụ na nwanyị ahụ mụrụ nwa ọhụrụ na-anọkarị n’ụlọ ma na-enwe mmasị igosi ndị bịara ileta ya nwa ya, a na-amalite mkparịta ụka mgbe mgbe. “Ana m agwa ndị ahụ mụrụ nwa banyere mkpa ọ dị iso nwa ọhụrụ na-enwe nkekọ site n’ịgụ ihe,” ka Sandi na-akọwa. “E mesịa, ana m agwa ha banyere ihe ịma aka nke ịzụlite ụmụ n’ụwa taa.” N’oge na-adịbeghị anya, n’ihi nleta dị otú ahụ, otu nne na ụmụ ya isii malitere ijere Jehova ozi. Ibute ụzọ na igosi mmasị onwe onye pụrụ ịrụpụta ihe yiri nke ahụ na-enye ọṅụ n’ozi anyị.
18. (a) N’ihi gịnị ka ihe ahụ a chọrọ anyị n’aka nke bụ́ ‘ịmị mkpụrụ dị ukwuu’ ji bụrụ ihe anyị nile ga-emeli? (b) Olee ihe atọ e kwuru n’Oziọma Jọn bụ́ ndị a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị i kpebisiri ike imezu?
18 Lee ihe na-emesighachi obi ike ọ bụ ịmara na ihe ahụ a chọrọ anyị n’aka nke bụ́ ‘ịnọgide na-amị mkpụrụ dị ukwuu’ bụ ihe anyị ga-emeli! Ma ànyị bụ́ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, ma ahụ́ ò siri anyị ike ma anyị na-arịa ọrịa, ma ànyị na-eme nkwusa n’ókèala ndị a na-anabata ozi ọma na ha ma ọ bụ ná ndị a na-adịghị anabata ya, anyị nile nwere ike ịmị mkpụrụ dị ukwuu. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu na site n’ịgbasa ozi Alaeze Chineke ruo ókè ike kwere anyị. N’otu mgbe ahụ, anyị na-agbalịsi ike ‘ịnọgide n’okwu Jizọs’ na ‘inwe ịhụnanya n’etiti onwe anyị.’ Ee, site n’imezu ihe atọ a dị mkpa a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị e kwuru n’Oziọma Jọn, anyị na-egosi na anyị “bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ [Kraịst].”—Jọn 8:31; 13:35.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Ọ bụ ezie na alaka osisi vaịn nke ihe atụ ahụ na-ezo aka n’ebe ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst ndị ọzọ bụ́ ndị ga-eketa ọnọdụ n’Alaeze eluigwe nke Chineke nọ, ihe atụ ahụ bu eziokwu ụmụazụ Kraịst nile taa pụrụ irite uru na ha.—Jọn 3:16; 10:16.
^ par. 12 Ndị na-adịghị esi n’ebe obibi ha apụ n’ihi ịka nká ma ọ bụ ọrịa pụrụ inwe ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ, n’ebe e nyere ohere maka ya, iji telifon, na-agba àmà, ma ọ bụ ikekwe ha pụrụ iso ndị bịara ileta ha na-ekerịta ozi ọma ahụ.
^ par. 17 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
• Olee ụdị mkpụrụ ọ dị mkpa ka anyị na-amịkwu n’ụba?
• N’ihi gịnị ka ihe mgbaru ọsọ nke ‘ịmị mkpụrụ dị ukwuu’ ji bụrụ ihe anyị ga-eruli?
• Olee ihe atọ dị mkpa anyị tụleworo a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị e kwuru n’Oziọma Jọn?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
OTÚ E SI ‘EJI NTACHI OBI AMỊ MKPỤRỤ’
GỊNỊ na-enyere gị aka ịnọgide na-eji ikwesị ntụkwasị obi ekwusa ozi Alaeze ahụ n’ókèala ndị a na-adịchaghị anabata ozi ọma na ha? Lee ụfọdụ azịza ya ndị na-enye aka.
“Ịmara na Jizọs na-akwado anyị n’ụzọ zuru ezu na-akwali anyị inwe nchekwube na ịnọgidesi ike, otú ọ sọrọ ndị mmadụ ha siri na-emeghachi omume n’ókèala anyị.”—Harry, ọ dị afọ 72; e mere ya baptizim na 1946.
“Akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ 2 Ndị Kọrint 2:17 na-agba m ume mgbe nile. Ọ na-ekwu na anyị na-ekere òkè n’ozi ‘n’ihu anya Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.’ Mgbe m nọ n’ozi, mụ na ezi ndị enyi m na-akpakọrịta.”—Claudio, ọ dị afọ 43; e mere ya baptizim na 1974.
“N’ezie, ọrụ nkwusa bụụrụ m ọgụ na mgba. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m ahụ eziokwu nke okwu ndị dị n’Abụ Ọma 18:29: ‘Ana m esitekwa na Chineke m wụbiga mgbidi.’”—Gerard, ọ dị afọ 79; e mere ya baptizim na 1955.
“Ọ bụrụ na m pụrụ ịgụ nanị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ozi, ọ na-enye m afọ ojuju na ọ dị onye ji Bible nyochaa obi ya.”—Eleanor, ọ dị afọ 26; e mere ya baptizim na 1989.
“Anọgidere m na-anwale ụzọ dị iche iche e si ezi ozi ọma. Ha dị nnọọ ọtụtụ nke na agaghị m enwe ike iji ha nile mee ihe n’oge ndụ m fọdụrụnụ.”—Paul, ọ dị afọ 79; e mere ya baptizim na 1940.
“Mmeghachi omume na-adịghị mma nke ndị mmadụ adịghị ewute m. Ana m agbalị inwe omume enyi, na-eso ndị mmadụ akparịta ụka ma na-ege ntị n’echiche ha.”—Daniel, ọ dị afọ 75; e mere ya baptizim na 1946.
“Ezutewo m ndị ọhụrụ e mere baptizim bụ́ ndị gwara m na ọrụ nkwusa m so mee ka ha bụrụ Ndịàmà. Ka m na-amaghị, onye ọzọ mesịrị mụọrọ ha Bible ma nyere ha aka inwe ọganihu. Ọ na-enye m ọṅụ ịmara na ozi anyị bụ ozi a na-agbakọ aka eje.”—Joan, ọ dị afọ 66; e mere ya baptizim na 1954.
Gịnị na-enyere gị aka ‘iji ntachi obi na-amị mkpụrụ’?—Luk 8:15.
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Site n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ na site n’ikwusa ozi Alaeze ahụ, anyị na-amị mkpụrụ dị ukwuu
[Foto dị na peeji nke 23]
Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: ‘Nọgidenụ na-amị mkpụrụ dị ukwuu’?