Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Kwụghachiri Ya Ụgwọ Maka Nnọgidesi Ike Ya

A Kwụghachiri Ya Ụgwọ Maka Nnọgidesi Ike Ya

A Kwụghachiri Ya Ụgwọ Maka Nnọgidesi Ike Ya

Ọtụtụ ndị nwere ezi obi na-achọ ka ndị ha hụrụ n’anya mụta nzube Chineke ma si otú ahụ na-ebi ndụ obi ụtọ. Mgbe mmadụ raara onwe ya nye Chineke, ndị ọzọ, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, pụrụ inyeworo ya aka ime mkpebi ahụ amamihe dị na ya site n’àgwà ọma ha. Otú ahụ ka ọ dị Jearim, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma nke bi na Mexico, bụ́ onye nyere ụmụnna mpempe akwụkwọ e dere ihe na-esonụ, n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke Ndịàmà Jehova.

“Achọrọ m isoro unu kerịta ọṅụ na obi ụtọ m nwere. Ka m gwa unu ihe kpatara ya. Afọ 18 gara aga, bụ́ mgbe a na-amụbeghị m, nne na nna m mụtara eziokwu ahụ. Mama m nwere ọganihu, ka e mesịkwara, mụ na nwanne m nwoke mekwara otú ahụ. Anyị jikọrọ aka kpekuo Jehova ekpere ka papa m batakwa n’ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ. Afọ 18 agafeela, taa bụkwa ụbọchị pụrụ nnọọ iche nye anyị. A na-aga ime papa m baptizim. Ekelere m Jehova na o wetaghị ọgwụgwụ tupu oge a a tụwara anya ya eri ogologo oge eruo. Jehova, i meela!”

N’ezie, n’ime afọ ndị gafeworonụ, ezinụlọ nwa agbọghọ a bu n’uche ụkpụrụ dị na ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị na 1 Pita 3:1, 2, bụ́ nke na-asị: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.” N’ezie, Jearim na-eto eto tinyekwara okwu ndị dị na Deuterọnọmi 5:16 n’ọrụ: “Sọpụrụ nna gị na nne gị, dị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, nyere gị iwu.” N’ezie, itinye ụkpụrụ ndị dị otú a n’ọrụ na iji ndidi na-echere Jehova wetaara Jearim na ezinụlọ ya ọtụtụ ngọzi.