Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Bịaruonụ Chineke Nso”

“Bịaruonụ Chineke Nso”

“Bịaruonụ Chineke Nso”

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8.

1, 2. (a) Gịnị ka ụmụ mmadụ na-azọrọkarị? (b) Agbamume dị aṅaa ka Jems nyere, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa?

“CHINEKE nọnyeere anyị.” E dewo okwu ndị ahụ n’ihe nnọchianya mba ụfọdụ na ọbụna n’uwe ndị agha. E dewo okwu bụ́ “Na Chineke ka anyị tụkwasịrị obi” n’ọtụtụ mkpụrụ ego na akwụkwọ ego ndị nke oge a. Ọ bụ ihe a na-anụkarị bụ́ ụmụ mmadụ ịzọrọ na ha na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya. Otú ọ dị, ị́ gaghị ekweta na inwe mmekọrịta dị otú ahụ n’ezie chọrọ nnọọ ihe karịrị nanị ikwu ya ekwu ma ọ bụ ide ya n’ebe a ga-ahụ ya anya?

2 Bible na-egosi na o kwere omume iso Chineke nwee mmekọrịta. Otú ọ dị, ọ chọrọ mgbalị. Ọbụna ọ dị ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na narị afọ mbụ mkpa iwusikwu mmekọrịta ha na Jehova Chineke ike. Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta bụ́ Jems aghaghị ịdọ ụfọdụ aka ná ntị banyere ọchịchọ anụ ahụ́ na adịghị ọcha ime mmụọ ha. Ka ọ na-enye ndụmọdụ ahụ, o nyere agbamume a bụ́ ịgba: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:1-12) Gịnị ka Jems bu n’uche mgbe ọ sịrị ‘bịaruonụ nso’?

3, 4. (a) Gịnị ka okwu bụ́ “bịaruonụ Chineke nso” pụrụ ichetaworo ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ Jems na narị afọ mbụ? (b) Gịnị mere anyị pụrụ iji jide n’aka na ọ ga-ekwe omume ịbịaru Chineke nso?

3 Jems ji okwu ọ ga-abụwo na ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ ya maara nke ọma mee ihe. E nyere ndị nchụàjà ntụziaka a kapịrị ọnụ n’Iwu Mozis banyere otú ha ga-esi “na-abịakwute” Jehova n’ihi ndị ya. (Ọpụpụ 19:22) A pụrụ isiwo otú ahụ chetara ndị na-agụ akwụkwọ Jems na ịbịaru Jehova nso abụghị ihe a ga-eji gwurie egwu. Jehova nọ n’ọkwá kasị dị ùgwù n’eluigwe na ala.

4 N’aka nke ọzọ, dị ka otu ọkà mmụta Bible si kwuo, “agbamume a [dị na Jems 4:8] na-egosipụta olileanya dị ukwuu.” Jems maara na Jehova ji ịhụnanya na-akpọ ụmụ mmadụ na-ezughị okè òkù mgbe nile ịbịaru Ya nso. (2 Ihe E Mere 15:2) Àjà Jizọs meghere ụzọ isi bịaruo Jehova nso n’echiche ka zuo ezuo. (Ndị Efesọs 3:11, 12) Taa, e megheworo ọtụtụ nde mmadụ ụzọ isi bịaruo Chineke nso! Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi jiri ohere a magburu onwe ya mee ihe? Anyị ga-atụle ná mkpirikpi ụzọ atọ anyị pụrụ isi bịaruo Jehova Chineke nso.

Nọgide ‘Na-enweta Ihe Ọmụma’ Banyere Chineke

5, 6. Olee otú ihe atụ nke Samuel na-eto eto si gosi ihe “inweta ihe ọmụma” banyere Chineke na-agụnye?

5 Dị ka Jọn 17:3 si kwuo, Jizọs sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” Ọtụtụ nsụgharị nke amaokwu a dịtụ iche na nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Kama ịsị “inweta ihe ọmụma” banyere Chineke, ihe e mere bụ nnọọ ịsụgharị ngwaa ahụ ịbụ “mara” Chineke ma ọ bụ “ịmara” Chineke. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwuru na echiche dị n’okwu Grik mbụ e ji mee ihe n’ebe a na-agụnye ihe karịrị nke ahụ—usoro na-aga n’ihu n’ihu, nke pụrụ ọbụna iduga n’otu onye na ibe ya inwe mmekọrịta chiri anya.

6 Ịbịa mara Chineke nke ọma abụghị echiche ọhụrụ n’oge Jizọs. Dị ka ihe atụ, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, anyị na-agụ na mgbe Samuel bụ nwata, ọ ‘ka-amaghị Jehova.’ (1 Samuel 3:7) Nke a ọ̀ pụtara na Samuel maara ihe dị nnọọ nta banyere Chineke ya? Ee e. Ọ ghaghị ịbụwo na ndị mụrụ ya na ndị nchụàjà kụziiri ya ọtụtụ ihe. Otú ọ dị, dị ka otu ọkà mmụta kwuru, a pụrụ iji okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe ahụ ‘mee ihe maka mmekọrịta kasị chie anya.’ Samuel aka-amaghị Jehova nke ọma dị ka ọ ga-emesị mara ya mgbe ọ ga-ejewe ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova. Ka Samuel nọgidere na-eto, ọ bịara mara Jehova n’ezie, soro ya nwee mmekọrịta onwe onye chiri anya.—1 Samuel 3:19, 20.

7, 8. (a) N’ihi gịnị ka ozizi ndị miri emi nke Bible na-ekwesịghị iji gwụ anyị ike? (b) Olee ụfọdụ eziokwu ndị miri emi nke Okwu Chineke bụ́ ndị ọ ga-adị mma ka anyị mụọ banyere ha?

7 Ị̀ na-enweta ihe ọmụma banyere Jehova iji soro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya? Iji mee otú ahụ, ọ dị gị mkpa ‘ịzụlite agụụ’ maka nri ime mmụọ nke Chineke na-enye. (1 Pita 2:2) Enwela afọ ojuju nanị n’ozizi ndị bụ́ isi. Gbalịa ịmụta ozizi ụfọdụ ka mie emie nke Bible. (Ndị Hibru 5:12-14) Ozizi ndị dị otú ahụ hà na-agwụ gị ike, nke na ị na-ewere ha dị ka ihe siri oké ike? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na Jehova bụ “Onye Nkụzi Ukwu” ahụ. (Aịsaịa 30:20, NW) Ọ maara otú e si akụziri ụmụ mmadụ na-ezughị okè eziokwu ndị miri emi. Ọ pụkwara ịgọzi ezi mgbalị ndị ị na-eme iji ghọta ihe ndị ọ na-akụziri gị.—Abụ Ọma 25:4.

8 Gịnị ma i nyochaa onwe gị banyere ihe ụfọdụ “ndị miri emi nke Chineke”? (1 Ndị Kọrint 2:10) Ha abụghị isiokwu ndị na-adịghị akpali mmasị dị ka ndị nke ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị ụkọchukwu pụrụ ịrụrịta ụka banyere ha. Ha bụ ozizi ndị bara uru bụ́ ndị anyị pụrụ isi na ha mụta ihe ndị na-akpali nnọọ mmasị banyere uche na obi Nna anyị nke na-ahụ n’anya. Dị ka ihe atụ, ihe mgbapụta ahụ, ‘ihe nzuzo dị nsọ,’ na ọgbụgba ndụ dịgasị iche iche Jehova jiworo gọzie ndị ya ma mezuo nzube ya dị iche iche—isiokwu ndị a na ọtụtụ ndị dị ka ha bụ ihe ndị na-akpali mmasị ma baa uru ime nnyocha onwe onye na ịmụ banyere ha.—1 Ndị Kọrint 2:7.

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka ịdị mpako ji dị ize ndụ, gịnịkwa ga-enyere anyị aka izere ya? (b) Mgbe a bịara n’ihe ọmụma banyere Jehova, n’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịgbalịsi ike ịdị umeala n’obi?

9 Ka ị na-enwekwu ihe ọmụma banyere eziokwu ime mmụọ ndị miri emi karị, kpachara anya maka ihe ize ndụ nke inwe ihe ọmụma pụrụ ịkpata—mpako. (1 Ndị Kọrint 8:1) Mpako dị ize ndụ, n’ihi na ọ na-ekewapụ ụmụ mmadụ n’ebe Chineke nọ. (Ilu 16:5; Jems 4:6) Cheta, ọ dịghị onye ọ bụla nwere ihe ọ ga-eji tuo ọnụ n’ihi ihe ọmụma ya. Iji maa atụ, tụlee okwu ndị a sitere n’okwu mmalite nke otu akwụkwọ nyochara ọganihu ihe a kpọrọ mmadụ nwere na nkà mmụta sayensị n’oge na-adịbeghị nnọọ anya: “Ka anyị na-amata ihe, otú ahụ ka anyị na-aghọtakwu otú ihe anyị maara dịruru nta. . . . Ihe nile anyị mụtaworo adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ihe anyị na-amụtabeghị.” Obi umeala dị otú ahụ dị nnọọ mma. Ma, mgbe a bịara n’ihe ọmụma kasịnụ—ihe ọmụma banyere Jehova Chineke—anyị nwere ọbụna ihe ka ukwuu mere anyị ga-eji nọgide na-adị umeala n’obi. N’ihi gịnị?

10 Rịba ama ihe ụfọdụ Bible kwuru banyere Jehova. “Echiche Gị miri emi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 92:5) “Nghọta [Jehova] enweghị ọnụ ọgụgụ.” (Abụ Ọma 147:5) “Ọ dịghị ngwupụta a na-egwupụta nghọta [Jehova].” (Aịsaịa 40:28) “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke!” (Ndị Rom 11:33) N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mgbe anyị ga-amata ihe nile banyere Jehova. (Eklisiastis 3:11) Ọ kụziworo anyị ọtụtụ ihe ndị dị ebube, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị ga-enwe mgbe nile ọtụtụ ihe anyị ga-amụtakwu. Ọ̀ bụ na atụmanya dị otú ahụ abụghị ma ihe na-akpali akpali ma nke na-eme ka mmadụ wetuo onwe ya ala? Ya mere, dị ka anyị mụtaworo, ka anyị jiri ihe ọmụma anyị mere ihe ndabere mgbe nile maka ịbịaru Jehova nso nakwa maka inyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ—ghara iji ya mgbe ọ bụla mee ihe dị ka ihe anyị ga-eji na-ebuli onwe anyị elu karịa ndị ọzọ.—Matiu 23:12; Luk 9:48.

Gosipụta Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Jehova Nọ

11, 12. (a) Olee otú ihe ọmụma anyị na-enweta banyere Jehova kwesịrị isi na-emetụta anyị? (b) Gịnị na-ekpebi ma ịhụnanya mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ ọ̀ bụ nke ezigbo ya?

11 N’ụzọ dabara adaba, Pọl onyeozi gosiri njikọ dị n’etiti ihe ọmụma na ịhụnanya. O dere, sị: “Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.” (Ndị Filipaị 1:9) Kama ime ka anyị jiri nganga na-afụli onwe anyị elu, eziokwu ọ bụla dị oké ọnụ ahịa anyị mụtara banyere Jehova na nzube ya kwesịrị ime ka anyị nwekwuo ịhụnanya n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ.

12 N’ezie, ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha hụrụ Chineke n’anya ahụghị ya n’anya n’ezie. Oké mmetụta ha na-enwe pụrụ isi ha n’obi. Mmetụta ndị dị otú ahụ dị mma, ọbụna kwesị ịja mma, mgbe ha kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma. Ma nanị ha abụghị inwe ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ. N’ihi gịnị? Rịba ama otú Okwu Chineke si akọwa ịhụnanya dị otú ahụ: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) Ya mere, ịhụnanya e nwere n’ebe Jehova nọ na-abụ ezigbo ya nanị mgbe e ji omume nrubeisi egosipụta ya.

13. Olee otú egwu Chineke ga-esi enyere anyị aka igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ?

13 Egwu Chineke ga-enyere anyị aka irubere Jehova isi. Inwe ụjọ a miri emi na oké nkwanye ùgwù maka Jehova na-esite n’inweta ihe ọmụma banyere ya, ịmata banyere ịdị nsọ, ebube, ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya ya ndị na-enweghị nsọtụ. Egwu dị otú ahụ dị mkpa iji bịaruo ya nso. N’ezie, rịba ama ihe Abụ Ọma 25:14 na-ekwu: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.” Ya mere, ọ bụrụ na anyị nwere egwu ziri ezi ịghara imejọ Nna anyị nke eluigwe anyị hụrụ n’anya, anyị pụrụ ịbịaru ya nso. Egwu Chineke ga-enyere anyị aka ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya e dekọrọ n’Ilu 3:6: “N’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Gịnị ka nke ahụ pụtara?

14, 15. (a) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime mkpebi ndị anyị nwere ime ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee mkpebi n’ụzọ na-egosipụta na anyị na-atụ egwu Chineke?

14 Ị ghaghị ime mkpebi kwa ụbọchị, ma ndị siri ike ma ndị dị mfe. Dị ka ihe atụ, olee ụdị mkparịta ụka gị na ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, na ndị agbata obi gị ga-enwe? (Luk 6:45) Ị̀ ga-adị uchu n’ọrụ e nyere gị rụọ, ka ị̀ ga-achọ ụzọ ị ga-esi rụchapụ ya n’etinyeghị mgbalị hiri nne na ya? (Ndị Kọlọsi 3:23) Ị̀ ga na-abịarukwu ndị na-enwechaghị ma ọ bụ ndị na-enwedịghị ịhụnanya n’ebe Jehova nọ nso, ka ị̀ ga-achọ iwusikwu mmekọrịta gị na ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ike? (Ilu 13:20) Gịnị ka ị ga-eme ọbụna n’ụzọ dị nta, iji kwalite ihe ndị metụtara Alaeze Chineke? (Matiu 6:33) Ọ bụrụ na ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka ndị e depụtara n’ebe a na-eduzi mkpebi ndị ị na-eme kwa ụbọchị, mgbe ahụ, ị na-amara Jehova n’ezie “n’ụzọ gị nile.”

15 Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe kwesịrị iduzi anyị ná mkpebi ọ bụla anyị na-eme bụ echiche a: ‘Gịnị ka Jehova ga-achọ ka m mee? Ụzọ ndụ dị aṅaa ga-amasị ya karịsịa?’ (Ilu 27:11) Igosipụta egwu Chineke n’ụzọ dị otú a bụ ụzọ magburu onwe ya isi gosipụta ịhụnanya n’ebe Jehova nọ. Egwu Chineke ga-akpalikwa anyị ịnọgide na-adị ọcha—n’ụzọ ime mmụọ, n’omume, na n’anụ ahụ́. Cheta, n’otu amaokwu ahụ Jems gbara Ndị Kraịst ume ‘ịbịaru Chineke nso,’ ọ dụkwara ọdụ, sị: “Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.”—Jems 4:8.

16. Gịnị ka anyị na-apụghị ịrụzu ma ọlị site n’inye Jehova ihe, n’agbanyeghị nke ahụ, gịnị ka anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma mgbe nile ime?

16 N’ezie, igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-agụnye ihe karịrị nnọọ izere ihe ọjọọ. Ịhụnanya na-akpalikwa anyị ime ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume ná mmesapụ aka dị ukwuu nke Jehova? Jems dere, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa.” (Jems 1:17) N’eziokwu, mgbe anyị nyere Jehova ihe onwunwe anyị, anyị adịghị eme ka ọ baa ọgaranya. Ọ bụ ya nwe ihe onwunwe nile. (Abụ Ọma 50:12) Mgbe anyị jikwara oge na ike anyị jeere Jehova ozi, anyị adịghị egboro ya mkpa nke ọ na-agaghị egboli. Ọ bụrụgodị na anyị ajụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, ọ pụrụ ime ka nkume tie mkpu! Gịnịzi mere anyị ga-eji na-enye Jehova ihe onwunwe, oge, na ume anyị? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi na nke ahụ bụ ụzọ anyị si egosi na anyị ji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ume anyị dum hụ ya n’anya.—Mak 12:29, 30.

17. Gịnị pụrụ ịkpali anyị iji mgbasapụ ihu na-enye Jehova ihe?

17 Mgbe anyị na-enye Jehova ihe, anyị kwesịrị iji obi ụtọ na-eme ya, “n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Ụkpụrụ e dekọrọ na Deuterọnọmi 16:17 pụrụ inyere anyị aka iji mgbasapụ ihu na-enye ihe: “Nwoke ọ bụla dị ka onyinye aka ya si dị, dị ka ngọzi Jehova, bụ́ Chineke gị, si dị, nke O nyeworo gị.” Mgbe anyị tụgharịrị uche n’otú Jehova siworo na-emesapụrụ anyị aka, anyị na-enwe ọchịchọ iji mgbasapụ ihu enye ya ihe. Inye ya ihe n’ụzọ dị otú ahụ na-eme ka obi ya ṅụrịa, dị nnọọ ka obere onyinye nke nwata a hụrụ n’anya nyere nne ma ọ bụ nna ya si enye ya obi ụtọ. Igosipụta ịhụnanya anyị n’ụzọ dị otú a ga-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso.

Jiri Ekpere Na-azụlite Mmekọrịta Chiri Anya

18. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịtụle otú anyị pụrụ isi mee ka ekpere anyị na-adịkwu mma?

18 Oge anyị ji ekpe ekpere onwe onye na-enye anyị ohere magburu onwe ya—ohere maka ịkọrọ Nna anyị nke eluigwe ihe nzuzo dị ka ezigbo enyi anyị. (Ndị Filipaị 4:6) Ebe ekpere bụ ụzọ dị oké mkpa isi bịaruo Chineke nso, o kwesịrị ekwesị ịkwụsị ma chee echiche otú ekpere anyị na-adị. Ọ bụghị na ihe anyị na-ekpe n’ekpere na otú anyị si ahazi ya aghaghị ịbụ ịgba, kama ha kwesịrị ịbụ eziokwu ndị sitere n’obi. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ekpere anyị na-adịkwu mma?

19, 20. N’ihi gịnị ka a ga-eji tụgharịa uche tupu e kpewe ekpere, oleekwa isi ihe ụfọdụ kwesịrị ekwesị a pụrụ ịtụgharị uche na ha?

19 Anyị pụrụ ịgbalị ịtụgharị uche tupu anyị ekpewe ekpere. Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche tupu anyị ekpewe ekpere, anyị pụrụ ịkpọ okwu aha n’ekpere anyị ma kwuo ihe ndị ezi uche dị na ha, si otú ahụ na-ezere ikwughachi okwu ndị e jikarị eme ihe bụ́ ndị na-abata n’uche ngwa ngwa. (Ilu 15:28, 29) Ikekwe ịtụgharị uche n’isi ihe ndị Jizọs kpọtụrụ uche n’ekpere nlereanya ya ma tụlezie otú o si metụta ọnọdụ anyị pụrụ inye aka. (Matiu 6:9-13) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị banyere òkè dị nta anyị na-atụ anya ikere n’ime uche Jehova n’ụwa ebe a. Ànyị pụrụ ịgwa Jehova n’ekpere ọchịchọ anyị nwere ịbara ya uru ruo ókè o kwere mee ma rịọ ya ka o nyere anyị aka ịrụzu ọrụ ọ bụla o nyeworo anyị? Ànyị na-enwe oké nchegbu banyere mkpa ihe onwunwe anyị? Olee mmehie anyị chọrọ ka a gbaghara anyị, ònyekwa ka ọ dịkwu mkpa ka anyị gbaghara? Ọnwụnwa ndị dị aṅaa ka anyị na-eche ihu, ànyị na-aghọtakwa otú nchebe Jehova dịruru anyị mkpa ngwa ngwa n’akụkụ ahụ?

20 Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ iche echiche banyere ndị anyị maara bụ́ ndị enyemaka Jehova dị mkpa karịsịa. (2 Ndị Kọrint 1:11) Otú ọ dị, e kwesịghị ichezọ ikele ekele. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ma chee echiche banyere ya, anyị pụrụ n’ezie ịhụ ihe ndị mere anyị ga-eji na-enye Jehova ekele na otuto kwa ụbọchị n’ihi ịdị mma ya bara ụba. (Deuterọnọmi 8:10; Luk 10:21) E nwekwuru uru a na-erite site n’ime otú ahụ—ọ pụrụ inyere anyị aka inwekwu àgwà ziri ezi na nke ikele ekele ná ndụ.

21. Ịmụ banyere ihe atụ ndị dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka mgbe anyị na-abịakwute Jehova n’ekpere?

21 Ịmụ ihe pụkwara inyere ekpere anyị aka. E nwere ekpere ndị bụ́ ịgba bụ́ ndị ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi kpere, bụ́ ndị e dekọrọ n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-eche nsogbu tara akpụ ihu, bụ́ nke na-eme ka anyị nwee nchegbu na ọbụna ụjọ maka ọdịmma nke anyị na ndị anyị hụrụ n’anya, anyị pụrụ ịgụ ekpere Jekọb banyere nzute ọ na-aga izute nwanne ya nwoke nke na-achọ ịbọ ọbọ n’ahụ́ ya, bụ́ Ịsọ. (Jenesis 32:9-12) Ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ ịmụ banyere ekpere Eze Esa kpere mgbe ihe dị ka otu nde ndị agha Etiopia yiri ndị Chineke egwu. (2 Ihe E Mere 14:11, 12) Ọ bụrụ na nsogbu nke na-achọ iwetara aha ọma Jehova nkọcha na-enye anyị nsogbu n’obi, mgbe ahụ o kwesịrị ka anyị tụlee ekpere Ịlaịja kpere n’ihu ndị na-efe Bel n’Ugwu Kamel, nakwa nke Nehemaịa kpere banyere ọnọdụ ọjọọ nke Jeruselem. (1 Ndị Eze 18:36, 37; Nehemaịa 1:4-11) Ịgụ na ịtụgharị uche n’ekpere ndị dị otú ahụ pụrụ iwusi okwukwe anyị ike ma mee ka anyị mata ụzọ kasị mma anyị ga-esi buru nchegbu ndị anyị nwere bịakwute Jehova.

22. Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2003, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị site n’oge ruo n’oge n’afọ a nile?

22 N’ụzọ doro anya, ọ dịghị ihe ùgwù, ọ dịghịkwa ihe mgbaru ọsọ dị mma karịa ịṅa ntị na ndụmọdụ Jems ka ‘a bịaruo Chineke nso.’ (Jems 4:8) Ka anyị na-eme otú ahụ site n’inwe ọganihu n’ihe ọmụma banyere Chineke, site n’ịgbalị ịdị na-egosipụtakwu ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ, nakwa site n’iso ya na-enwe mmekọrịta chiri anya site n’ekpere anyị. N’ime afọ 2003 nile, ka anyị na-eburu n’uche ihe e dere na Jems 4:8 nke bụ́ isiokwu dịịrị afọ a, ka anyị nọgide na-enyocha onwe anyị ịmara ma anyị na-abịaru Jehova nso n’ezie. Otú ọ dị, gịnị banyere akụkụ nke ọzọ nke okwu ahụ? N’echiche dị aṅaa ka Jehova ‘ga-abịaru gị nso,’ ngọzi ndị dị aṅaa ka ọ ga-eweta? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka ịbịaru Jehova nso ji bụrụ ihe a ga-eji kpọrọ oké ihe?

• Olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ anyị pụrụ isetịpụ n’ihe banyere inweta ihe ọmụma banyere Jehova?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị nwere ezi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi soro Jehova nwee mmekọrịta chiri anya karị n’ekpere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Isiokwu dịịrị afọ 2003 ga-abụ: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ka Samuel na-eto, ọ bịara mara Jehova nke ọma

[Foto dị na peeji nke 12]

Ekpere Ịlaịja kpere n’Ugwu Kamel bụụrụ anyị ihe nlereanya dị mma