Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Dị Ka Igirigi Ndụ

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Dị Ka Igirigi Ndụ

“Bịakwutenụ m, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Dị Ka Igirigi Ndụ

IHE ịrụ ụka adịghị ya na Jizọs Kraịst gụnyere ụmụazụ ya na-eto eto mgbe ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” (Matiu 11:28) Mgbe ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụntakịrị ha, ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ha. Ma Jizọs sịrị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Mgbe ahụ, ọbụna Jizọs “kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha.” (Mak 10:14-16) Obi abụọ adịghị ya na Jizọs lere ndị na-eto eto anya dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa.

Bible kọrọ banyere ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, nakwa ndị ntorobịa na ụmụaka, bụ́ ndị setịpụrụ ihe nlereanya ndị magburu onwe ha n’ijere Chineke ozi. E buru amụma n’akwụkwọ Abụ Ọma banyere “ụmụ okorobịa” bụ́ ndị na-enye ume ọhụrụ dị ka igirigi. Ọ na-ekwukwa banyere “ụmụ okorobịa” na “ụmụ agbọghọ” ito aha Jehova.—Abụ Ọma 110:3; 148:12, 13.

Ebe Ndị Ntorobịa Ga-anọ Na-eme nke Ọma

Ntụnyere ahụ e ji igirigi mee dabara adaba, n’ihi na a na-ejikọta igirigi na ịba ụba nakwa ngọzi. (Jenesis 27:28) Igirigi na-adị nro n’ahụ́ ma na-enye ume ọhụrụ. N’oge ọnụnọ Kraịst a, imerime Ndị Kraịst na-eto eto na-eji ọchịchọ obi ha na oké mmasị ewepụta onwe ha. Dị nnọọ ka igirigi ndụ, ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ ji obi ụtọ ejere Chineke ozi ma na-enyere ndị ha na ha na-efekọ ofufe aka.—Abụ Ọma 71:17.

Ọ bụghị nanị ndị ọzọ ka ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-eme ka ha nwee ume ọhụrụ; ha onwe ha na-enwetakwa ume ọhụrụ n’ozi ha. Nzukọ Chineke na-eme ka e nwee gburugburu ebe ha pụrụ ịnọ na-eme nke ọma. N’ịbụ ndị na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu, ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ na-eso Chineke enwe mmekọrịta chiri anya. (Abụ Ọma 119:9) N’ime ọgbakọ, ha na-ekerekwa òkè n’ọrụ ndị dị mma ma na-achọta ezi ndị enyi—ihe ndị so eme ka ndụ bụrụ ihe na-enye afọ ojuju ma nwee nzube.

‘Ihe Na-agwọ Ọrịa na Ihe Na-enye Ume Ọhụrụ’

Ọ̀ na-adị ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst n’onwe ha ka ha bụ “igirigi”? Tụlee ihe banyere Tania, bụ́ nwa agbọghọ na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ma jiri obi ụtọ na-etinye ihe karịrị awa 70 n’ọnwa n’ozi. Olee otú ọ na-adị ya? “Ana m enweta ume ọhụrụ ma bụrụ onye e wuliri elu,” ka ọ na-ekwu. “Inwe Jehova na nzukọ elu ala ya ná ndụ m abụworo m ‘ihe na-agwọ ọrịa na ihe na-enye ume ọhụrụ.’”—Ilu 3:8.

Ariel, bụ́ onye ozi oge nile ọzọ na-eto eto, na-enwe ekele maka nri ime mmụọ ọ na-eri n’ime ọgbakọ. “Mgbe m gara nzukọ Ndị Kraịst, mgbakọ ukwu na mgbakọ nta, ana m eri nri na tebụl ime mmụọ Jehova, nke a na-enye m ume ọhụrụ n’ezie n’ụzọ ime mmụọ,” ka ọ na-ekwu. “Ana m abụkwa onye e wuliri elu ịmara na n’ụwa nile, enwere m ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ.” N’ịkọwa ihe kasị enye ya ume ọhụrụ, ọ na-asị: “Ọ bụ ihe na-enye nnọọ ume ọhụrụ inwe Jehova dị ka enyi, karịsịa mgbe m nụrụ ma ọ bụ hụ mmetụta ndị dị njọ usoro ihe a na-enwe n’ebe ndị mmadụ nọ.”—Jems 2:23.

Mgbe Abishai dị afọ 20, ọ na-eje ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile na ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. O si otú a kọwaa ahụmahụ ya: “Ana m enweta ume ọhụrụ n’ihi na amaara m otú e si edozi ọtụtụ nsogbu ndị na-eto eto na-eche ihu taa. Eziokwu sitere na Bible enyeworo m aka ilekwasị anya n’ihe dị m mkpa ime iji jiri mkpụrụ obi m dum na-ejere Jehova ozi.”

Ná mmalite afọ iri na ụma ya, Antoine bụ onye iwe ọkụ. N’otu oge, ọ kụrụ nwata akwụkwọ ibe ya oche, maakwa onye nke ọzọ pensịl. Antoine abụtụghị onye na-eme ka e nwee ume ọhụrụ! Ma ntụziaka sitere na Bible gbanwere akparamàgwà ya. Ugbu a ọ dị afọ 19 ma na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi na onye ozi oge nile n’ọgbakọ, ọ na-ekwu, sị: “Ana m ekele Jehova maka ikwe ka m nweta ihe ọmụma banyere ya na inyere m aka ịhụ mkpa ọ dị inwe njide onwe onye ma gbanwee omume m. N’ụzọ dị otú a, ezerewo m ọtụtụ nsogbu.”

Ndị ọzọ na-ahụ àgwà na-enye ume ọhụrụ nke Ndị Kraịst na-eto eto na-akpa. Matteo bụ Onyeàmà na-eto eto n’Ịtali. Onye nkụzi ya kpebiri na a ga-eri onye ọ bụla nọ na klas ya nke kwuru okwu rere ure obere nhá. Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, ụmụaka ahụ rịọrọ ka a kagbuo iwu ahụ n’ihi na, ka ha kwuru, “o kweghị omume ịghara ikwu okwu rere ure.” “Ma,” ka Matteo na-akọwa, “onye nkụzi ahụ kwuru na ọ bụghị eziokwu, o jikwa m, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, maa atụ, na-aja m mma n’ihu klas ahụ dum maka okwu dị ọcha m na-ekwu.”

N’otu ọnụ ụlọ klas a na-eme aghara na Thailand, onye nkụzi kpọpụtara Racha dị afọ 11 n’ihu klas ahụ ma jaa ya mma maka akparamàgwà ya, na-asị: “Gịnị ma unu nile were ya dị ka onye nlereanya? Ọ dị uchu n’ihe ọmụmụ ya ma na-akpa ezi àgwà.” Ọ gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Echere m na ọ ga-adị unu mkpa ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, dị ka Racha, iji mee ka omume unu ka mma.”

Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ ka ọtụtụ puku ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-abịa amara Jehova nke ọma karị ma na-eme uche ya. Ọmarịcha ndị na-eto eto dị otú ahụ na-egosipụta amamihe karịrị afọ ndụ ha. Chineke pụrụ inyere ha aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ha na-adị ugbu a nakwa inye ha ọdịnihu dị ebube n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. (1 Timoti 4:8) N’ala usoro ihe a nke na-adịghị eme nri n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ nke ndị ntorobịa na-enweghị afọ ojuju na ndị ahụ́ na-agbakasị jupụtara, ha dị iche n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ!