‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’
‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’
‘Ọ dị mkpa ka anyị na-etinye uche n’ihe ndị anyị na-anụ karịa otú anyị na-adị etinye, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.’—NDỊ HIBRU 2:1.
1. Nye ihe atụ otú ndọpụ uche pụrụ isi kpata ọdachi.
IHE ọghọm ụgbọala na-ata isi ihe dị ka mmadụ 37,000 kwa afọ na United States nanị. Ndị ọkachamara na-ekwu na a pụrụ izetewo ọtụtụ n’ime ọnwụ ndị a ma ọ bụrụ na ndị ọkwọ ụgbọala kpachapụkwuru anya n’okporo ụzọ. Saịn bọdụ, bọọdụ mkpọsa, ma ọ bụ iji fon ha na-enweghị eriri eme ihe na-adọpụ uche ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala. E nwekwara ndị na-erikarị ihe ka ha na-akwọ ụgbọala. N’ọnọdụ a nile, ndọpụ uche pụrụ ịkpata ọdachi.
2, 3. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ndụmọdụ ya ji kwesị ekwesị?
2 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 tupu e chepụta ụgbọala, Pọl onyeozi kwuru ụdị ihe ndọpụ uche nke nọworo na-akpatara ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ọdachi. Pọl mesiri ya ike na e nyere Jizọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie ọnọdụ karịrị nke ndị mmụọ ozi nile elu, n’ihi na e mere ka ọ nọdụ n’aka nri Chineke. Onyeozi ahụ kwuziri, sị: “Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị na-etinye uche n’ihe ndị anyị na-anụ karịa otú anyị na-adị etinye, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.”—Ndị Hibru 2:1.
3 N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa ‘itinye uche n’ihe ndị ha nụrụ banyere Jizọs karịa otú ha na-adị etinye’? Ọ bụ n’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 agafewo kemgbe Jizọs hapụsịrị ụwa. Ebe Nna ha ukwu na-anọghị ya, ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst amalitewo ịkpafu site n’ezi okwukwe ahụ. Okpukpe ndị Juu, bụ́ ụzọ mbụ ha si efe ofufe, nọ na-adọpụ uche ha.
Ọ Dị Ha Mkpa Itinyekwu Uche n’Ihe
4. N’ihi gịnị ka a pụrụ ijiwo nwaa ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ịlaghachi n’okpukpe ndị Juu?
4 N’ihi gịnị ka a pụrụ ijiwo nwaa Onye Kraịst ọnwụnwa ịlaghachi n’okpukpe ndị Juu? Usoro ife ofufe n’okpuru Iwu ahụ gụnyere ihe ndị a na-ahụ anya. Ndị mmadụ pụrụ ịhụ ndị nchụàjà ma nụ ísì nke àjà a na-esure n’ọkụ. Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ, Iso Ụzọ Kraịst dị nnọọ iche. Ndị Kraịst nwere Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ́ Jizọs Kraịst, ma a hụbeghị ya n’ụwa ruo afọ iri atọ. (Ndị Hibru 4:14) Ha nwere ụlọ nsọ, ma ebe dị nsọ ọ dị bụ n’eluigwe n’onwe ya. (Ndị Hibru 9:24) N’adịghị ka ibi úgwù anụ ahụ́ n’okpuru Iwu ahụ, ibi úgwù nke Ndị Kraịst bụ “nke obi site ná mmụọ.” (Ndị Rom 2:29) N’ihi ya, nye ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst, Iso Ụzọ Kraịst pụrụ ịmalitewo iyi ihe na-adịghị adị.
5. Olee otú Pọl si gosi na usoro ife ofufe nke Jizọs guzobere dị elu karịa nke ahụ e guzobere n’okpuru Iwu ahụ?
Ndị Hibru 9:13, 14) Ee, mgbaghara mmehie nke a na-enweta site n’okwukwe e nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst dị nnọọ ukwuu n’ọtụtụ ụzọ karịa nke a na-enweta site n’àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ.—Ndị Hibru 7:26-28.
5 Ọ dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa ịghọta ihe dị nnọọ ịrịba ama banyere usoro ife ofufe nke Kraịst guzobere. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’okwukwe karịa n’ihe a na-ahụ anya, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị elu karịa Iwu ahụ e nyere site n’aka Mozis onye amụma. “Ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi na ntụ nke nwa ehi e fesara n’ahụ́ ndị e merụworo emerụ na-edo nsọ ruo n’ókè nke ime ka anụ ahụ́ dị ọcha,” ka Pọl dere, “ruo ókè ka ukwuu há aṅaa ka ọbara nke Kraịst ahụ, bụ́ onye sitere na mmụọ ebighị ebi chụọ onwe ya n’àjà nye Chineke n’enweghị mmerụ, ga-eme ka akọ na uche anyị dị ọcha pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ?” (6, 7. (a) Ọnọdụ dị aṅaa mere ka ọ dị ngwa ka ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ‘tinye uche n’ihe ndị ha nụrụ karịa otú ha na-adị etinye’? (b) Mgbe Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ya, ogologo oge ha aṅaa fọdụụrụ Jeruselem? (Lee ihe odide ala ala peeji.)
6 E nwere ihe ọzọ mere o ji dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa itinyesi uche ike n’ihe ha nụrụ banyere Jizọs. O buwo amụma na a ga-ebibi Jeruselem. Jizọs kwuru, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị mgbe ndị iro gị ga-eji osisi a pịrị ọnụ wuo ihe e wusiri ike gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma site n’akụkụ ọ bụla kpagbuo gị, ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala, ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị, n’ihi na ị ghọtaghị oge e ji eleta gị.”—Luk 19:43, 44.
7 Olee mgbe nke a ga-eme? Jizọs ekpugheghị ụbọchị na awa ọ ga-abụ. Kama nke ahụ, o nyere ntụziaka a: “Mgbe unu hụrụ Jeruselem ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya wezụga onwe ha, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) N’ime afọ 30 sochirinụ ka Jizọs kwusịrị okwu ndị ahụ, ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Jeruselem kwụsịrị inwe echiche nke ịdị ngwa ma bụrụ ndị a dọpụrụ uche ha. Ha wepụrụ anya ha n’okporo ụzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ bụrụ na ha agbanweghị ụzọ ha si eche echiche, ọdachi aghaghị ịdakwasị ha. Ma hà chere otú ahụ ma ọ bụ na ha echeghị, mbibi Jeruselem dị ezi nso! * E nwere olileanya na ndụmọdụ Pọl kpọtere Ndị Kraịst nọ na Jeruselem bụ́ ndị nọ na-ehi ụra n’ụzọ ime mmụọ.
‘Itinye Uche n’Ihe Taa Karịa Otú A Na-adị Etinye’
8. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ‘itinye uche n’eziokwu nke Okwu Chineke karịa otú anyị na-adị etinye’?
8 Dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ọ dị anyị mkpa ‘itinye uche n’eziokwu nke Okwu Chineke karịa otú anyị na-adị etinye.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị onwe anyị na-eche mbibi dị ezi nso ihu, ọ bụghị nke nanị otu mba, kama nke otu usoro ihe dum. (Mkpughe 11:18; 16:14, 16) N’ezie, anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị na awa Jehova ga-eweta ya. (Matiu 24:36) Otú o sina dị, anyị ji anya anyị na-ahụ mmezu nke amụma dị iche iche nke Bible bụ́ ndị na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnọ na nche megide ihe ọ bụla nke pụrụ ịdọpụ uche anyị. Ọ dị anyị mkpa itinye uche n’Okwu Chineke ma nọgide na-enwe nnọọ echiche nke ịdị ngwa. Ọ bụ nanị site n’ime otú ahụ ka anyị ‘ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ.’—Luk 21:36.
9, 10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-etinye uche n’ihe ime mmụọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka okwu Chineke si bụrụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị’ na ‘ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị’?
9 N’oge a dị egwu, olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-etinye ‘uche n’ihe ime mmụọ karịa otú anyị na-adị etinye’? Otu ụzọ bụ site n’ịdị na-agachi nzukọ na mgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst anya. Anyị kwesịkwara ịbụ ndị na-amụchi Bible anya ka anyị wee nwee ike ịbịaru Onye Chepụtara ya, bụ́ Jehova, nso. (Jems 4:8) Ọ bụrụ na anyị na-enweta ihe ọmụma banyere Jehova site n’ọmụmụ ihe onwe onye nakwa site n’ịga nzukọ, anyị ga-adị ka ode abụ ahụ bụ́ onye gwara Chineke, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105.
10 Bible na-arụ ọrụ dị ka ‘ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị’ mgbe ọ na-agwa anyị ihe ndị Chineke zubere maka ọdịnihu. Ọ bụkwa ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ pụrụ inyere anyị aka ịma ihe ọzọ anyị ga-eme mgbe anyị na-enwe nsogbu ndị siri ike ná ndụ. Ọ bụ ya mere o ji dị oké mkpa ka anyị ‘na-etinye uche n’ihe mgbe anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị zukọrọ ịnara ntụziaka na mgbe anyị na-agụ Okwu Chineke n’onwe anyị karịa otú anyị na-adị etinye.’ Ihe ọmụma anyị na-enweta ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha na ndị bara uru bụ́ ndị ga-amasị Jehova ma mee ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11; Aịsaịa 48:17) Olee otú anyị pụrụ isi mụbaa ogologo oge anyị na-etinyeru uche n’ihe ná nzukọ nakwa n’oge anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ka anyị wee nwee ike irite uru kasị ukwuu site ná ndokwa ime mmụọ ndị Chineke mere?
Ime Ka Otú Anyị Si Ege Ntị ná Nzukọ Ka Mma
11. N’ihi gịnị ka ige ntị ná nzukọ Ndị Kraịst ji abụ ihe ịma aka mgbe ụfọdụ?
11 Mgbe ụfọdụ, ige ntị ná nzukọ Ndị Kraịst na-abụ ihe ịma aka. Uche pụrụ ịbụ nke a dọpụrụ n’ụzọ dị mfe, ikekwe mgbe nwa ọhụrụ na-ebe ákwá ma ọ bụ mgbe onye bịara n’azụ oge na-achọ oche. Mgbe anyị rụsịrị ọrụ ụbọchị were ogologo oge, ike pụrụ nnọọ ịgwụ anyị. Onye na-ekwu okwu n’ikpo okwu nwere ike ghara ịbụ onye kasị ekwu okwu n’ụzọ na-adọrọ mmasị, tupu anyị amarakwa ihe na-emenụ, anyị mụzi anya na-arọ nrọ—ma eleghị anya ọbụna na-ehi ụra! N’ihi ihe ọmụma dị oké mkpa nke a na-enye, anyị ga-eme nke ọma ịmụba ikike anyị nwere itinye uche n’ihe ná nzukọ ọgbakọ. Ma olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
12. Gịnị pụrụ ime ka ọ dịkwuoro anyị mfe ige ntị ná nzukọ?
12 Ọ na-adịkarị mfe karị ige ntị ná nzukọ ma ọ bụrụ na anyị kwadebere nke ọma. N’ihi ya, gịnị ma i wepụta oge iji tụgharịtụ uche n’ihe a ga-atụle? Ọ na-ewe nanị minit ole na ole kwa ụbọchị iji gụọ ma tụgharịa uche n’akụkụ ụfọdụ nke isiakwụkwọ ndị e depụtara maka ọgụgụ Bible dịịrị izu. Ọ bụrụ na anyị emetụ nhazi, anyị pụkwara ịchọta oge iji kwadebe maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. N’agbanyeghị usoro ihe omume anyị họọrọ, otu ihe doro anya: Ime nkwadebe ga-enyere
anyị aka ige ntị n’ihe a na-atụle ná nzukọ ọgbakọ.13. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-ege ntị n’ihe a na-atụle ná nzukọ?
13 Tụkwasị n’ịkwadebe nke ọma, ụfọdụ na-achọpụta na ha na-aka ege ntị ná nzukọ mgbe ha nọ n’oche ihu n‘Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ịdị na-ele ọkà okwu anya n’anya, ịdị na-ele anya na Bible mgbe a na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ, na idetu ihe bụ ụzọ ndị ọzọ isi mee ka uche anyị ghara ịdị na-awagharị awagharị. Otú ọ dị, inwe obi a kwadebere akwadebe dị nnọọ mkpa karịa ụzọ ọ bụla e si ege ntị. Ọ dị anyị mkpa ịghọta nzube anyị ji ezukọta. Nzube bụ́ isi anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị ji ezukọ bụ ife Jehova ofufe. (Abụ Ọma 26:12; Luk 2:36, 37) Nzukọ bụ ụzọ dị mkpa e si azụ anyị n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 24:45-47) Ọzọkwa, ha na-enye anyị ohere ‘ịkpali ibe anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—Ndị Hibru 10:24, 25.
14. Gịnị n’ezie na-eme ka nzukọ gaa nke ọma?
14 Ụfọdụ pụrụ ịnwa iji ikike izi ihe nke ndị kwuru okwu na-ekpebi otú nzukọ dị. Ọ bụrụ na ndị kwuru okwu bụcha ndị aka ochie, a pụrụ ịkpọ ya nzukọ dị ụtọ. Ma ọ bụrụ na o yiri ka ha ezichaghị ihe n’ụzọ dị ire, anyị pụrụ iche ihe dị iche. Ọ bụ ezie na ndị nwere ihe omume kwesịrị ime ike ha nile iji jiri nkà na-ezi ihe ma karịsịa ha kwesịrị ịdị na-eru n’obi. (1 Timoti 4:16) Otú ọ dị, anyị bụ́ ndị na-ege ntị ekwesịghị ịdị na-eme nkatọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ bụ ezie na ikike izi ihe nke ndị nwere ihe omume dị mkpa, ọ bụghị ya bụ nanị ihe na-eme ka nzukọ gaa nke ọma. Ọ̀ bụ na i kweghị na nchegbu anyị bụ́ isi ekwesịghị ịbụ otú ọkà okwu kwuziruru okwu ya ekwuzi kama otú anyị geruru ntị nke ọma? Mgbe anyị gara nzukọ ma gee ntị n’ihe a na-atụle, anyị na-efe Chineke n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. Ọ bụ nke ahụ na-eme ka nzukọ na-aga nke ọma. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike inweta ihe ọmụma banyere Chineke, anyị ga-erite uru ná nzukọ, n’agbanyeghị nkà nke ọkà okwu nwere. (Ilu 2:1-5) Mgbe ahụ ka anyị kpebisie nnọọ ike ịdị ‘na-etinye uche n’ihe ná nzukọ anyị karịa otú anyị na-adị etinye.’
Rite Uru Zuru Ezu n’Ọmụmụ Ihe Onwe Onye
15. Olee otú ọmụmụ ihe na ntụgharị uche pụrụ isi baara anyị uru?
15 Anyị na-erite uru dị nnọọ ukwuu site n’ịdị ‘na-etinye uche n’ihe n’oge ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche karịa otú anyị na-adị etinye.’ Ịgụ na ịtụgharị uche n’ihe dị na Bible na n’akwụkwọ Ndị Kraịst ga-enye anyị ohere ndị dị oké ọnụ ahịa ịkụbanye eziokwu nke Okwu Chineke n’ime obi anyị. N’aka nke ya, nke a ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’ụzọ anyị si eche echiche na n’ụzọ anyị si eme ihe. N’ezie, ọ ga-enyere anyị aka ịbụ ndị ọ na-atọ ụtọ ime uche Jehova. (Abụ Ọma 1:2; 40:8) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịzụlite ikike ndị anyị nwere itinye uche n’ihe ka ha wee nwee ike ịbara anyị uru mgbe anyị na-amụ ihe. Ọ dị nnọọ mfe ịbụ onye a dọpụrụ uche ya! Ntakịrị ihe mgbochi—ụda fon ma ọ bụ mkpọtụ, pụrụ ịdọpụ uche anyị. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ na anyị adịghị etinye uche n’ihe ruo ogologo oge ma è nwere ihe ndọpụ uche ma ọ bụ na e nweghị. Anyị pụrụ ịnọdụ ala na-enwe ezi ebumnobi nke iri nri ime mmụọ, ma n’oge na-adịghị anya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, obi anyị pụrụ ịmalite ịta nri n’ebe ịta nri ọzọ. Olee otú anyị pụrụ isi ‘na-etinye uche n’ihe mgbe anyị na-amụ Okwu Chineke n’onwe anyị karịa otú anyị na-adị etinye’?
16. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị dokwaa oge maka ọmụmụ ihe onwe onye? (b) Olee otú i siworo wepụta oge maka ịmụ Okwu Chineke?
16 Ọ bara uru inwe usoro ihe omume ma họrọ ọnọdụ kasị mma ịnọ na-amụ ihe. Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị, anyị na-enwe nnọọ oge dị nta anyị ji anọrọ onwe anyị. Ọ pụrụ ịdị anyị ka ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi kwa ụbọchị ọ na-ebugharị anyị ka obere alaka osisi nọ n’elu mmiri na-asọsi ike. N’ezie, ọ dị anyị mkpa iguzogide mmiri ahụ na-asọsi ike, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma chọta oge dị jụụ site n’oge anyị jupụtara n’ihe omume. Anyị agaghị nnọọ echere ka ohere iji mụọ ihe pụtara onwe ya. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịchịkwa ọnọdụ dịnụ site n’iwepụta oge maka ọmụmụ ihe. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ụfọdụ ndị na-ewepụta oge dị mkpirikpi n’ụtụtụ mgbe ọ pụrụ ịbụ na e nwechaghị ihe ndọpụ uche. Ụfọdụ ndị na-achọpụta na ha na-enwe oge ka mma n’uhuruchi. Ihe a na-ekwu bụ na anyị agatụghị eleghara oké mkpa ọ dị inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke na Ọkpara ya anya. (Jọn 17:3) N’ihi ya, ka anyị dokwaa oge maka ọmụmụ ihe onwe onye ma gbasosie ya ike.
17. Gịnị bụ ntụgharị uche, oleekwa otú ọ pụrụ isi baara anyị uru?
17 Ntụgharị uche—usoro nke iche echiche banyere ihe ndị anyị mụtara site n’ọmụmụ ihe—bara oké uru. Ọ na-enyere anyị aka ime ka echiche Chineke si n’akwụkwọ ndị e biri ebi banye n’obi anyị. Ntụgharị uche na-enyere anyị aka ịhụ otú anyị ga-esi etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ ka anyị wee bụrụ “ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghịkwa ndị na-anụ nanị ọnụnụ.” (Jems 1:22-25) Ọzọkwa, ntụgharị uche na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso karị, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’àgwà ya dị iche iche na n’otú e si kọwapụta ha n’ihe a na-amụ n’oge ọmụmụ ihe.
18. Ọnọdụ ndị dị aṅaa dị mkpa maka ntụgharị uche dị irè?
18 Iji rite uru zuru ezu site n’ọmụmụ ihe na ntụgharị uche, anyị aghaghị iwepụ ihe ndọpụ uche ọ bụla n’uche anyị. Iji nweta ihe ọmụma ọhụrụ mgbe anyị na-atụgharị uche, ọ dị anyị mkpa ịghara ikwe ka ihe ndị na-adọpụ uche ná ndụ a na-adị n’oge a na-adọpụ uche anyị. Ime nke a na-ewe oge ma na-achọ mmadụ ịnọrọ onwe ya, ma, lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume
ọhụrụ iri nri ime mmụọ na ịṅụ mmiri nke eziokwu ahụ bụ́ ndị a na-achọta n’Okwu Chineke!19. (a) N’ihe banyere ọmụmụ ihe onwe onye, gịnị nyewooro ụfọdụ ndị aka ịmụba oge ha na-etinyeru uche n’ihe? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ọmụmụ ihe dị, uru ndị dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ irite site n’ihe omume a dị mkpa?
19 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị adịghị etinye uche n’ihe ruo ogologo oge, obi anyị abụrụkwa nke na-amalite ịwagharị mgbe anyị mụrụ ihe ruo nwa oge? Ụfọdụ achọpụtawo na ha pụrụ ịmụba ikike ha nwere itinye uche n’ihe mgbe ha na-amụ ihe site n’iji oge dị nta na-amụ ihe ná mmalite ma jiri nwayọọ nwayọọ na-amụba ya. Ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ iji oge zuru ezu na-amụ ihe, ọ bụghị ịmụ ya ọkụ ọkụ. Ọ dị anyị mkpa ịzụlite oké mmasị n’isiokwu anyị na-amụ. Anyị pụkwara imekwu nnyocha, na-eji ọtụtụ akwụkwọ ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche wepụtara na-eme ihe. Uru dị ukwuu dị n’inyoba anya ‘n’ihe ndị miri emi nke Chineke.’ (1 Ndị Kọrint 2:10) Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmụba ihe ọmụma anyị nwere banyere Chineke nakwa ịzụlite ikike nghọta anyị. (Ndị Hibru 5:14) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, anyị ‘ga-erukwa eru nke ọma izi ndị ọzọ ihe.’—2 Timoti 2:2.
20. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ma nọgide soro Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya?
20 Ịga nzukọ Ndị Kraịst na inwe ọmụmụ ihe onwe onye ga-enyere anyị aka n’ụzọ dị ukwuu ịzụlite na ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. N’ụzọ doro anya, otú ahụ ka ọ dị n’ebe ode abụ ahụ nọ bụ́ onye gwara Chineke, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Mgbe ahụ, ka anyị jisie ike na-agachi nzukọ na mgbakọ dị iche iche anya. Ka anyị na-azụchapụtakwa oge maka ọmụmụ Bible na ntụgharị uche. Anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ bara ụba n’ihi isi otú a ‘na-etinye uche n’Okwu Chineke karịa otú anyị na-adị etinye.’
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Eleghị anya e degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ na 61 O.A. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ mgbe nanị ihe dị ka afọ ise gasịrị ka usuu ndị agha Cestius Gallus gbara Jeruselem gburugburu. N’oge na-adịghị anya, usuu ndị agha ahụ pụrụ, na-enye Ndị Kraịst mụ anya ohere ịgbalaga. Afọ anọ ka e mesịrị, usuu ndị agha Rom nọ n’okpuru Ọchịagha Titus bibiri obodo ahụ.
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị mere ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ji na-akpafu site n’ezi okwukwe ahụ?
• Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-ege ntị ná nzukọ Ndị Kraịst?
• Gịnị ga-enyere anyị aka irite uru n’ọmụmụ Bible onwe onye na ntụgharị uche?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 11]
Ọ dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa ịnọ na nche banyere mbibi dị ezi nso nke Jeruselem
[Foto dị na peeji nke 13]
Ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka irite uru ná nzukọ Ndị Kraịst