Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
“Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ha ga-azụlite obi ha a ịtụ egwu m na idebe ihe nile m nyere n’iwu mgbe nile.”—DEUTERỌNỌMI 5:29, NW.
1. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na otu ụbọchị, ndị mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’egwu?
IHE a kpọrọ mmadụ anọwo n’egwu ruo ọtụtụ narị afọ. Egwu maka agụụ, ọrịa, mpụ, ma ọ bụ agha emewo ka ọtụtụ nde mmadụ nọgide na-enwe nchegbu. N’ihi nke a, e kwupụtara ọchịchọ nke ime ka e nwee ụwa ebe mmadụ nile ga-enwere onwe ha pụọ n’egwu n’okwu mmalite nke Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ. * N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Chineke n’onwe ya na-emesi anyị obi ike na ụwa dị otú ahụ ga-abịa—ọ bụ ezie na ọ bụghị site ná mgbalị nke ụmụ mmadụ. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Maịka, Jehova na-ekwe anyị nkwa na n’ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume, ‘ọ dịghị onye ga-eme ka ndị ya maa jijiji.’—Maịka 4:4.
2. (a) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si agba anyị ume ịtụ egwu Chineke? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa pụrụ ibilite mgbe anyị na-atụle ọrụ dịịrị anyị ịtụ egwu Chineke?
2 N’aka nke ọzọ, egwu pụkwara ịbụ ihe mkpali ziri ezi. N’Akwụkwọ Nsọ, a gbara ndị ohu Chineke ume ugboro ugboro ịtụ egwu Jehova. Mosis gwara ụmụ Israel, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu; ọ bụkwa Ya ka ị ga-efe ofufe.” (Deuterọnọmi 6:13) Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Solomọn dere, sị: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 12:13) Site n’ọrụ nkwusa anyị, bụ́ nke anyị na-arụ n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, anyị na-agba mmadụ nile ume n’otu aka ahụ ka ha ‘tụọ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto.’ (Mkpughe 14:6, 7) Tụkwasị n’ịtụ egwu Jehova, ndị Kraịst aghaghị iwere obi ha dum hụ ya n’anya. (Matiu 22:37, 38) Olee otú anyị pụrụ isi hụ Chineke n’anya ma tụọ egwu ya n’otu oge ahụ? Gịnị mere o ji dị mkpa ịtụ Chineke na-ahụ n’anya egwu? Uru ndị dị aṅaa ka anyị na-erite site n’ịzụlite egwu Chineke? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị aghaghị ibu ụzọ ghọta ihe egwu Chineke pụtara na otú ụdị egwu a si bụrụ akụkụ bụ́ isi nke mmekọrịta anyị na Jehova.
Ụjọ, Nsọpụrụ Ofufe, na Egwu
3. Gịnị ka egwu Chineke pụtara?
3 Egwu Chineke bụ mmetụta ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ebe Onye mere ha nọ. Otu nkọwa e nyere egwu a bụ “ụjọ na nsọpụrụ ofufe miri emi maka Onye Okike na egwu ziri ezi nke imejọ ya.” Ya mere, egwu Chineke na-emetụta akụkụ abụọ dị mkpa nke ndụ anyị: àgwà anyị n’ebe Chineke nọ na àgwà anyị n’ebe omume ọ kpọrọ asị dị. N’ụzọ doro anya, akụkụ abụọ ahụ dị mkpa ma kwesị ka e chebasiere ha echiche ike. Dị ka Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere mere ka ọ pụta ìhè, nye ndị Kraịst, egwu nsọpụrụ a bụ ‘ihe mkpali na-achịkwa ndụ, ma n’okwu ndị metụtara ihe ime mmụọ ma ná ndị metụtara omume.’
4. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite mmetụta nke ụjọ na nsọpụrụ ofufe n’ebe Onye Okike anyị nọ?
4 Olee otú anyị pụrụ isi zụlite mmetụta nke ụjọ na nsọpụrụ ofufe n’ebe Onye Okike anyị nọ? Ibobo na-anwụ anyị n’ahụ mgbe anyị hụrụ ala mara mma, nsụda mmiri na-akpali mmasị, ma ọ bụ ọdịda anyanwụ na-adọrọ adọrọ. Mmetụta a na-esikwu ike mgbe anyị ji anya nke Abụ Ọma 8:3, 4) Ụjọ a miri emi na-eduga n’inye nsọpụrụ ofufe, bụ́ nke na-akpali anyị ikele na ito Jehova maka ihe nile ọ na-emere anyị. Devid dekwara, sị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”—Abụ Ọma 139:14.
okwukwe hụ aka Chineke n’ọrụ okike ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, dị ka Eze Devid, anyị na-aghọta na ọ dịghị ihe anyị bụ ma e jiri anyị tụnyere ihe okike ndị dị egwu nke Jehova. “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?” (5. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtụ egwu Jehova, ezi ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka anyị nwere n’akụkụ a?
5 Mmetụta nke ụjọ na nsọpụrụ ofufe na-akpata ịtụ egwu ziri ezi na nke na-egosi nkwanye ùgwù maka ike Chineke nwere dị ka Onye Okike nakwa dị ka Onye Ọchịchị o ruuru ịchị eluigwe na ala. N’ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ, “ndị na-apụta n’aka anụ ọhịa ahụ ná mmeri, ya na n’aka ihe oyiyi ya”—ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ n’ọnọdụ ha n’eluigwe—na-akpọsa, sị: “Ọrụ Gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ Gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị?” (Mkpughe 15:2-4) Egwu Chineke, bụ́ nke a na-atụ n’ihi nsọpụrụ ofufe maka ịdị ukwuu ya, na-eme ka ndị a ha na Kraịst ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe na-asọpụrụ Chineke dị ka onye nwere ikike kasịnụ. Mgbe anyị tụlere ihe nile Jehova rụzuru na ụzọ ezi omume o si achị eluigwe na ala, ọ̀ bụ na anyị enweghị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-atụ egwu ya?—Abụ Ọma 2:11; Jeremaịa 10:7.
6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee egwu ziri ezi nke imejọ Jehova?
6 Otú ọ dị, tụkwasị n’ụjọ na nsọpụrụ ofufe, egwu Chineke aghaghị ịgụnye egwu ziri ezi nke imejọ ya ma ọ bụ inupụrụ ya isi. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ezie na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ ma na-aba ụba n’ebere,’ anyị aghaghị icheta na “ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ọ bụ ezie na Jehova na-ahụ n’anya ma nwee obi ebere, ọ dịghị agbachi ajọ omume na mmehie a ma ụma na-eme nkịtị. (Abụ Ọma 5:4, 5; Habakuk 1:13) Ndị ma ụma na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova n’enweghị nchegharị bụ́kwa ndị na-edo onwe ha megide ya, apụghị ime ya n’enwetaghị ntaramahụhụ. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.” Inwe egwu ziri ezi nke ịdaba n’ọnọdụ dị otú ahụ ga-emesị bụụrụ anyị ihe nchebe.—Ndị Hibru 10:31.
“Ya Ka Unu Ga-arapara n’Ahụ”
7. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji tụkwasị obi n’ike nzọpụta nke Jehova?
7 Inwe egwu nsọpụrụ n’ebe Chineke nọ na ịmara nke ọma banyere ike ya dị egwu bụ ihe ndị na-ebutere inwe ntụkwasị obi na obi ike n’ebe Jehova nọ ụzọ. Dị nnọọ ka nwatakịrị na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe mgbe nna ya nọ nso, otú ahụ ka anyị na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe ma na-enwe obi ike n’okpuru nduzi nke Jehova. Rịba ama otú ụmụ Israel si meghachi omume mgbe Jehova dupụtasịrị ha n’Ijipt: “Israel wee hụ aka ukwu nke Jehova ji megide ndị Ijipt, ndị Israel wee tụọ egwu Jehova, kwere na Jehova.” (Ọpụpụ 14:31) Ahụmahụ Elaịsha na-agbakwa akaebe nye eziokwu ahụ bụ́ na “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.” (Abụ Ọma 34:7; 2 Ndị Eze 6:15-17) Akụkọ ihe mere eme nke ndị Jehova n’oge a nakwa, ma eleghị anya, ahụmahụ nke onwe anyị, na-agba akaebe na Chineke na-egosipụta ike ya n’ihi ndị na-ejere ya ozi. (2 Ihe E Mere 16:9) N’ụzọ dị otú a, anyị na-abịa ghọta na “n’egwu Jehova ka ntụkwasị obi siri ike dị.”—Ilu 14:26.
8. (a) N’ihi gịnị ka egwu Chineke ji akpali anyị ije ije n’ụzọ ya? (b) Kọwaa otú anyị ga-esi ‘rapara Jehova n’ahụ.’
8 Ọ bụghị nanị na inwe egwu ziri ezi n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị nwee ntụkwasị obi na obi ike n’ebe ọ nọ kamakwa, ọ na-akpali anyị ije ije n’ụzọ ya. Mgbe Solomọn raara ụlọ nsọ ahụ nye, o kpekuru Jehova ekpere, sị: “Ka [Israel] wee tụọ egwu Gị, ije ije n’ụzọ Gị nile, ụbọchị nile nke ha onwe ha na-ebi n’elu ala ahụ nke I nyere nna anyị hà.” (2 Ihe E Mere 6:31) Tupu mgbe ahụ, Mosis gbara ụmụ Israel ume, sị: “Jehova, bụ́ Chineke unu, ka unu ga na-ejeso n’azụ, Ya ka unu ga-atụ egwu, ihe nile O nyere n’iwu ka unu ga-edebe, olu Ya ka unu ga-ege ntị, Ya ka unu ga-efe ofufe, Ya ka unu ga-arapara n’ahụ.” (Deuterọnọmi 13:4) Dị ka amaokwu ndị a gosiri n’ụzọ doro anya, a na-enwe ọchịchọ ije ije n’ụzọ nke Jehova na ‘ịrapara’ n’ahụ ya mgbe e nwere ntụkwasị obi na obi ike n’ebe Chineke nọ. Ee, egwu Chineke na-eduga anyị n’irubere Jehova isi, ijere ya ozi, na ịrapara n’ahụ ya, dị nnọọ ka nwatakịrị pụrụ ịrapara n’ahụ nna ya bụ́ onye o nwere ntụkwasị obi na obi ike zuru ezu n’ebe ọ nọ.—Abụ Ọma 63:8; Aịsaịa 41:13.
Ịhụ Chineke n’Anya Bụ Ịtụ Egwu Ya
9. Olee njikọ dị n’etiti ịhụ Chineke n’anya na ịtụ egwu Chineke?
9 Site n’echiche Akwụkwọ Nsọ, ọ dịghị ụzọ ọ bụla ịtụ egwu Chineke si kagbuo ịhụ ya n’anya. N’ụzọ dị iche, e nyere ụmụ Israel ntụziaka “ịtụ egwu Jehova, . . . ije ije n’ụzọ Ya nile, na ịhụ Ya n’anya.” (Deuterọnọmi 10:12) Ya mere, ịtụ egwu Chineke na ịhụ Chineke n’anya nwere njikọ chiri anya. Egwu Chineke na-akpali anyị ije ije n’ụzọ ya, nke a, n’aka nke ya, na-enye ihe àmà na anyị hụrụ ya n’anya. (1 Jọn 5:3) Ezi uche dị na nke a n’ihi na mgbe anyị hụrụ mmadụ n’anya, n’ụzọ ziri ezi, anyị na-atụ egwu ime ihe ga-ewute ya. Ụmụ Israel mere ihe wutere Jehova n’ihi ụzọ nnupụisi ha gbasoro n’ọzara. N’ezie, anyị agaghị achọ ime ihe ga-ewute Nna anyị nke eluigwe otú ahụ. (Abụ Ọma 78:40, 41) N’aka nke ọzọ, ebe ọ bụ na “ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ndị na-atụ egwu Ya,” nrubeisi na ikwesị ntụkwasị obi anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Abụ Ọma 147:11; Ilu 27:11) Inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị ime ihe na-atọ ya ụtọ, egwu Chineke na-egbochikwa anyị ime ihe ga-ewute ya. Ha bụ àgwà ndị na-agakọ ọnụ, ha adịghị emegiderịta onwe ha.
10. Olee otú Jisọs si gosi na ọ na-atọ ya ụtọ ịtụ egwu Jehova?
10 Ụzọ ndụ Jisọs Kraịst na-egosi n’ụzọ doro anya otú anyị pụrụ isi hụ Chineke n’anya ma tụọ egwu ya n’otu oge ahụ. Aịsaịa onye amụma Aịsaịa 11:2, 3) Dị ka amụma a si kwuo, mmụọ Chineke kpaliri Jisọs ịtụ egwu Nna ya nke eluigwe. Ọzọkwa, anyị na-arịba ama na egwu a, n’ịbụ nke na-abụtụghị ibu arọ, bụ isi iyi nke afọ ojuju. Jisọs nwetara ọṅụ n’ime uche Chineke na n’ime ihe na-atọ ya ụtọ, ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike. Mgbe oge na-eru maka igbu ya n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara Jehova, sị: “Ọ bụghị dị ka Mụ onwe m na-achọ, kama dị ka Gị onwe gị na-achọ.” (Matiu 26:39) N’ihi egwu Chineke a, Jehova ṅara ntị n’arịrịọ nke Ọkpara ya, wusie ya ike, ma zọpụta ya n’ọnwụ.—Ndị Hibru 5:7.
dere banyere Jisọs, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Ịmụta Ịtụ Egwu Jehova
11, 12. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji mụta ịtụ egwu Chineke? (b) Olee otú Jisọs si akụziri anyị ịtụ egwu Jehova?
11 N’adịghị ka ụjọ ebumpụta ụwa anyị na-atụ mgbe anyị hụrụ ike na ịdị ebube nke ihe okike, egwu Chineke adịghị abịa n’onwe ya. Ọ bụ ya mere Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, ji akpọ anyị òkù n’ụzọ amụma, sị: “Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: egwu Jehova ka m ga-ezi unu.” (Abụ Ọma 34:11) Olee otú anyị pụrụ isi mụta ịtụ egwu Jehova site n’aka Jisọs?
12 Jisọs na-akụziri anyị ịtụ egwu Jehova site n’inyere anyị aka ịghọta àgwà dị ebube nke Nna anyị nke eluigwe. (Jọn 1:18) Ihe nlereanya nke Jisọs kpughere otú Chineke si eche echiche na otú o si emeso ndị ọzọ ihe, n’ihi na Jisọs gosipụtara àgwà Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9, 10) Ọzọkwa, site n’àjà Jisọs chụrụ, Jehova na-anụ olu anyị mgbe anyị kpekuru ya ekpere maka mgbaghara nke mmehie anyị. Ngosipụta a dị ịrịba ama nke ebere Chineke bụ n’onwe ya ezi ihe mere anyị ga-eji na-atụ egwu ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “N’aka Gị ka mgbaghara dị, ka e wee tụọ egwu Gị.”—Abụ Ọma 130:4.
13. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa e depụtara n’akwụkwọ Ilu na-enyere anyị aka ịtụ egwu Jehova?
13 E depụtara nzọụkwụ ndị ga-enyere anyị aka ịzụlite egwu Chineke n’akwụkwọ Ilu. “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; . . . mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” (Ilu 2:1-5) N’ihi ya, iji tụọ egwu Chineke, anyị aghaghị ịmụ Okwu ya, gbalịsie ike ịghọta ntụziaka dị na ya, ma ṅazie ntị nke ọma na ndụmọdụ ya.
14. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ndụmọdụ e nyere ndị eze Israel?
14 E nyere eze Israel ọ bụla ntụziaka idepụtaghachi Iwu ahụ ma ‘na-agụ ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya: ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya idebe okwu nile nke iwu ahụ.’ (Deuterọnọmi 17:18, 19) Ịgụ na ịmụ Bible dị anyị nnọọ oké mkpa n’otu aka ahụ ma ọ bụrụ na anyị ga-amụta ịtụ egwu Jehova. Ka anyị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị na-eji nwayọọ nwayọọ enweta amamihe na ihe ọmụma Chineke. Anyị na-abịa ‘ghọta egwu Jehova’ n’ihi na anyị na-ahụ ihe dị mma ọ na-arụpụta ná ndụ anyị, anyị na-ejikwa mmekọrịta anyị na Chineke akpọrọ ihe. Ọzọkwa, site n’iso ndị kwere ekwe ibe ha na-agbakọta mgbe nile, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi pụrụ ige ntị n’ihe Chineke na-ezi, mụta ịtụ egwu Chineke, ma na-eje ije n’ụzọ ya.—Deuterọnọmi 31:12.
Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Onye Ọ bụla nke Na-atụ Egwu Jehova Bụ
15. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka egwu Chineke si emetụta ofufe anyị na-efe ya?
15 Site n’ihe ndị e kwuru n’elu, anyị pụrụ ịhụ na egwu Chineke bụ àgwà ziri ezi nke anyị nile kwesịrị ịzụlite, ebe ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke ofufe anyị na-efe Jehova. Ọ na-eduga anyị n’ịtụkwasị ya obi kpam kpam, ije ije n’ụzọ ya, na ịrapara n’ahụ ya. Dị ka ọ dị n’ebe Jisọs Kraịst nọ, egwu Chineke pụkwara ịkpali anyị imezu nkwa nraranye anyị ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi.
16. N’ihi gịnị ka Jehova ji agba anyị ume ịtụ egwu ya?
16 Egwu Chineke abụghị ịtụ egwu na-enweghị isi ma ọ bụ nke na-amachibido mmadụ gabiga ókè. Bible na-emesi anyị obi ike na “onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ, nke na-eje ije n’ụzọ Ya nile.” (Abụ Ọma 128:1) Jehova na-agba anyị ume ịtụ egwu ya n’ihi na ọ maara na àgwà a ga-echebe anyị. Anyị na-ahụ nchegbu ịhụnanya ya n’okwu ọ gwara Mosis, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ha [ụmụ Israel] ga-azụlite obi ha a ịtụ egwu m na idebe ihe nile m nyere n’iwu mgbe nile ka o wee gaara ha na ụmụ ha nke ọma ruo mgbe ebighị ebi!”—Deuterọnọmi 5:29, NW.
17. (a) Uru ndị dị aṅaa ka anyị na-erite site n’ịtụ egwu Chineke? (b) Akụkụ ndị dị aṅaa nke egwu Chineke ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
17 N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị azụlite obi anyị ịtụ egwu Chineke, ihe ga-agara anyị nke ọma. N’ụzọ ndị dị aṅaa? Nke mbụ, àgwà dị otú ahụ ga-atọ Chineke ụtọ, ọ ga-adọtakwa anyị nso n’ebe ọ nọ. Devid maara site n’ahụmahụ nke ya na “ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.” (Abụ Ọma 145:19) Nke abụọ, egwu Chineke ga-abara anyị uru n’ihi na ọ ga-emetụta àgwà anyị n’ebe ihe ọjọọ dị. (Ilu 3:7) Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú ụjọ dị otú a si echebe anyị pụọ n’ihe ize ndụ ime mmụọ, ọ ga-atụlekwa ụfọdụ ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị tụrụ egwu Chineke ma si n’ihe ọjọọ wezụga onwe ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 Nzukọ Ezumezu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu nabatara Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na December 10, 1948.
Ị̀ Pụrụ Ịza Ajụjụ Ndị Na-esonụ?
• Gịnị ka egwu Chineke pụtara, oleekwa otú o si emetụta anyị?
• Olee njikọ dị n’etiti ịtụ egwu Chineke na ije ije n’ụzọ Chineke?
• Olee otú ihe nlereanya Jisọs si gosi na ịtụ egwu Chineke na ịhụ Chineke n’anya nwere njikọ?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi zụlite obi anyị ịtụ egwu Jehova?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
E nyere ndị eze Israel iwu idepụtara onwe ha Iwu ahụ ma na-agụ ya kwa ụbọchị
[Foto dị na peeji nke 18]
Egwu Jehova na-eduga anyị n’ịtụkwasị ya obi dị ka nwatakịrị si atụkwasị nna ya obi
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]
Kpakpando: Foto nke Malin sere, © IAC/RGO 1991