Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị
Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị
“N’ihi na gị onwe gị asịwo, Jehova bụ ebe mgbaba m; . . . ihe ọjọọ agaghị adakwasị gị.—ABỤ ỌMA 91:9, 10.
1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova bụ ebe mgbaba anyị?
JEHOVA bụụrụ ndị ya ezigbo ebe mgbaba. Ọ bụrụ na anyị raara onwe anyị nye ya kpam kpam, a pụrụ ‘ịkpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a gaghị akpagbubiga anyị ókè; anyị pụrụ inwe obi abụọ, ma anyị agaghị enwebiga ya ókè; a pụrụ isogbu anyị, ma a gaghị ahapụ nanị anyị; a pụrụ ịtụda anyị n’ala, ma a gaghị ala anyị n’iyi.’ N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova na-enye anyị “ọkịka nke ike.” (2 Ndị Kọrint 4:7-9) Ee, Nna anyị nke eluigwe na-enyere anyị aka ibi ndụ nsọpụrụ Chineke, anyị pụkwara iburu n’uche okwu ọbụ abụ bụ́: “N’ihi na gị onwe gị asịwo, Jehova bụ ebe mgbaba m; n’ihi na ọ bụ Onye kachasị ihe nile elu ka i meworo ebe obibi gị; ihe ọjọọ agaghị adakwasị gị.”—Abụ Ọma 91:9, 10.
2. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere Abụ Ọma nke 91 na ihe ndị o kwere ná nkwa?
2 Ọ pụrụ ịbụwo Mosis dere okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma nke 91. Ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 90 kpọrọ ya aha dị ka onye dere ya, Abụ Ọma nke 91 sochikwara n’enweghị okwu na-egosi na ọ bụ onye ọzọ dere ya. Ikekwe, a bụrụ Abụ Ọma nke 91 n’ụdị a bụọ e kwee; ya bụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ na-abụ otu onye buru ụzọ bụọ (91:1, 2), ndị ukwe ekweere ya (91:3-8). Ikekwe otu onye abụọkwa ọzọ (91:9a), ndị ukwe ekweekwara ya (91:9b-13). Ọ pụrụ ịbụwo na otu onye na-abụtọpụzi ya (91:14-16). N’agbanyeghị otú e si bụọ ya, Abụ Ọma nke 91 na-ekwe ndị Kraịst e tere mmanụ nkwa nchebe ime mmụọ dị ka otu òtù ma na-enye ndị enyi ha raara onwe ha nye mmesi obi ike yiri nke ahụ dị ka otu ìgwè. * Ka anyị buru ndị ohu Jehova nile dị otú ahụ n’uche tụlee abụ ọma a.
Ndị Nọ ná Nchebe ‘n’Ebe Nzuzo nke Chineke’
3. (a) Gịnị bụ ‘ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu’? (b) Gịnị ka anyị na-enweta site ‘n’ịnọ ọnọdụ abalị n’okpuru ndo nke Onye pụrụ ime ihe nile’?
3 Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye na-ebi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu, ọ bụ n’okpuru ndo nke Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ na-anọ ọnọdụ abalị. M ga-asị Jehova, Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike; Ị bụ Chineke m, Onye m na-atụkwasị obi.” (Abụ Ọma 91:1, 2) ‘Ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu’ bụ ebe nchebe ihe atụ dịịrị anyị, karịsịakwa ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị Ekwensu lekwasịrị anya n’ụzọ pụrụ iche. (Mkpughe 12:15-17) Ọ gaara ebibi anyị nile ma ọ́ bụghị nchebe anyị na-enweta dị ka ndị ọbịa ime mmụọ nọ ọnọdụ abalị n’ụlọ Chineke. Site ‘n’ịnọ ọnọdụ abalị n’okpuru ndo nke Onye pụrụ ime ihe nile,’ anyị na-enweta ndo Chineke bụ́ nke na-enye nchebe. (Abụ Ọma 15:1, 2; 121:5) Ọ dịghị ebe mgbaba dị nchebe ma ọ bụ ebe e wusiri ike karịa Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova.—Ilu 18:10.
4. Olee atụmatụ ndị “osi ọnyà,” bụ́ Setan, ji eme ihe, oleekwa otú anyị si ewepụga onwe anyị?
4 Ọbụ abụ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ya onwe ya [Jehova] ga-anapụta gị n’igbudu nke osi ọnyà, na n’aka ajọ ọrịa na-efe efe nke na-eweta ịla n’iyi.” (Abụ Ọma 91:3) Osi ọnyà n’Israel oge ochie na-ejikarị ọnyà ma ọ bụ igbudu ejide nnụnụ. Ajọ òtù na “atụmatụ aghụghọ dị iche iche” so n’ọnyà nke “osi ọnyà,” bụ́ Setan. (Ndị Efesọs 6:11, ihe odide ala ala peeji nke NW) A na-ezobe igbudu n’ụzọ anyị iji rata anyị ime ihe ọjọọ ma wetara anyị mbibi ime mmụọ. (Abụ Ọma 142:3) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị ajụwo ajọ omume, ‘mkpụrụ obi anyị dị ka nnụnụ nke wepụgara onwe ya n’igbudu.’ (Abụ Ọma 124:7, 8) Lee ekele anyị na-enwe na Jehova na-anapụta anyị n’aka ajọ “osi ọnyà” ahụ!—Matiu 6:13.
5, 6. Olee “ajọ ọrịa” nke wetaworo “ịla n’iyi,” ma gịnị mere ọ dịghị egbu ndị Jehova?
5 Ọbụ abụ ahụ hotara “ajọ ọrịa na-efe efe nke na-eweta ịla n’iyi.” Dị ka ajọ ọrịa fesazuru ebe nile, e nwere ihe na-ewetara ezinụlọ mmadụ na ndị na-akwado ọbụbụeze Jehova “ịla n’iyi.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arnold Toynbee dere banyere nke a, sị: “Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ịhụ mba n’anya emewo ka mba ndị nweere onwe ha mụbaa okpukpu abụọ . . . Àgwà ịkpata nkewa na-arịwanye elu n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ n’oge a.”
6 N’ime narị afọ ndị gafeworonụ, ndị ọchịchị ụfọdụ emewo ka esemokwu dị n’etiti mba dị iche iche ka njọ. Ha ekwuwokwa ka a na-efe ha ma ọ bụ ihe oyiyi dị iche iche ofufe. Ma ọ dịbeghị mgbe Jehova kwere ka “ajọ ọrịa na-efe efe” dị otú ahụ gbuo ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi. (Daniel 3:1, 2, 20-27; 6:7-10, 16-22) Dị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-ahụ n’anya, anyị na-enye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa, na-anọpụ iche mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, ma na-ekweta n’eleghị mmadụ anya n’ihu na “n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu [Chineke], onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35; Ọpụpụ 20:4-6; Jọn 13:34, 35; 17:16; 1 Pita 5:8, 9) Ọ bụ ezie na “ịla n’iyi” na-adakwasị anyị n’ụdị nke mkpagbu a na-akpagbu anyị dị ka ndị Kraịst, anyị na-aṅụrị ọṅụ ma na-enweta nchebe ime mmụọ “n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu.”
7. Olee otú Jehova si ‘eji nku ya’ echebe anyị?
7 Ebe Jehova bụ ebe mgbaba anyị, anyị na-enweta nkasi obi site n’okwu ndị bụ́: “Nku Ya ka Ọ ga-eji kpuchie gị, ọ bụkwa n’okpuru nku Ya Abụ Ọma 91:4) Chineke na-echebe anyị, ọbụna dị ka nnụnụ mụrụ nwa si efegharị n’elu ụmụ ya iji chebe ha. (Aịsaịa 31:5) ‘Nku ya ka O ji ekpuchi anyị.’ Nnụnụ na-eji nku ya ekpuchi ụmụ ya, na-echebe ha pụọ n’aka ihe ndị na-eri ha. Dị ka ụmụ nnụnụ, anyị nọ ná nchebe n’okpuru nku ihe atụ nke Jehova n’ihi na anyị agbabawo n’ezi nzukọ ndị Kraịst ya.—Rut 2:12; Abụ Ọma 5:1, 11.
abụọ ka ị ga-agbaba: ọta ukwu na ọta dị gburugburu ka eziokwu Ya bụ.” (8. Olee otú “eziokwu” Jehova si bụrụ ọta ukwu na ọta dị gburugburu?
8 Anyị na-atụkwasị obi ‘n’eziokwu,’ ma ọ bụ n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ dị ka ọta ukwu nke oge ochie, nke na-adịkarị ka ibo ụzọ ma na-ebu nnọọ ibu ruo n’ókè nke ikpuchi mmadụ ahụ ya dum. (Abụ Ọma 5:12) Inwe obi ike ná nchebe dị otú ahụ na-eme ka anyị ghara ịtụ egwu. (Jenesis 15:1; Abụ Ọma 84:11) Dị ka okwukwe anyị, eziokwu Chineke bụ ọta ukwu na-enye nchebe nke na-akwụsị àkụ́ ụta na-enwu ọkụ nke Setan ma na-eme ka aka ndị iro ghara imetụ anyị. (Ndị Efesọs 6:16) Ọ bụkwa ọta dị gburugburu, mgbidi siri ike gbara anyị gburugburu nke na-enye nchebe bụ́ nke anyị guzosiri ike n’ime ya.
‘Anyị Agaghị Atụ Egwu’
9. N’ihi gịnị ka abalị pụrụ iji bụrụ oge na-eyi egwu, ma gịnị mere egwu adịghị atụ anyị?
9 N’iburu nchebe Chineke n’uche, ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Ị gaghị atụ egwu site n’oké egwu nke abalị, ma ọ bụ site n’àkụ́ nke na-efegharị n’ehihie; ma ọ bụ site n’ajọ ọrịa na-efe efe nke na-ejegharị n’ọchịchịrị, ma ọ bụ site ná mbipụ nke na-ebibi n’etiti ehihie.” (Abụ Ọma 91:5, 6) Ebe ọ bụ na a na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ n’ọchịchịrị, abalị pụrụ ịbụ oge na-eyi egwu. N’ime ọchịchịrị ime mmụọ nke na-ekpuchi ụwa ugbu a, ndị iro anyị na-ejikarị omume aghụghọ eme ihe ná mgbalị imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị na ịkwụsị ọrụ nkwusa anyị. Ma ‘anyị adịghị atụ egwu site n’oké egwu nke abalị’ n’ihi na Jehova na-eche anyị nche.—Abụ Ọma 64:1, 2; 121:4; Aịsaịa 60:2.
10. (a) Gịnị ka “àkụ́ nke na-efegharị n’ehihie” yiri ka ọ̀ pụtara, oleekwa otú anyị si emeghachi omume n’ebe ọ dị? (b) Olee otú e si arịa “ajọ ọrịa na-efe efe nke na-ejegharị n’ọchịchịrị,” gịnịkwa mere anyị adịghị atụ ya egwu?
10 “Àkụ́ nke na-efegharị n’ehihie” yiri ka ọ̀ pụtara okwu ọjọọ. (Abụ Ọma 64:3-5; 94:20) Ka anyị na-anọgidesi ike n’inye ihe ọmụma bụ́ eziokwu, mmegide ihu ọha dị otú ahụ n’ebe ozi anyị dị nsọ dị, na-akụ afọ n’ala. Ọzọkwa, anyị adịghị atụ egwu “ajọ ọrịa na-efe efe nke na-ejegharị n’ọchịchịrị.” Nke a bụ ajọ ọrịa na-efe efe ihe atụ nke a na-ebute n’ime ọchịchịrị nke ụwa a na-arịa ọrịa n’ụzọ omume na n’ụzọ okpukpe, nke na-atọgbọkwa n’ike Setan. (1 Jọn 5:19) Ọ na-eme ka e nwee ọnọdụ uche na nke obi na-egbu egbu, na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ìsì banyere Jehova, nzube ya, na ndokwa ndị o ji ịhụnanya na-eme. (1 Timoti 6:4) N’ime ọchịchịrị a, egwu adịghị atụ anyị, ebe ọ bụ na anyị na-enweta ìhè ime mmụọ n’ụba.—Abụ Ọma 43:3.
11. Gịnị na-eme ndị na-enweta ‘mbibi n’etiti ehihie’?
11 Anyị adịghịkwa atụ “mbipụ nke na-ebibi n’etiti ehihie” egwu. ‘Etiti ehihie’ pụrụ ịpụta ihe ahụ a sịrị na ọ bụ mmepeanya nke ụwa. Ndị na-adaba n’echiche ya nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na-enweta mbibi ime mmụọ. (1 Timoti 6:20, 21) Ka anyị ji anyaike na-akpọsa ozi Alaeze ahụ, ọ dịghị onye n’ime ndị iro anyị anyị na-atụ egwu, n’ihi na Jehova bụ Onye Nchebe anyị.—Abụ Ọma 64:1; Ilu 3:25, 26.
12. N’akụkụ ole ndị ka ọtụtụ puku mmadụ ‘na-ada,’ ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
12 Ọbụ abụ ahụ gara n’ihu, sị: “[Otu puku mmadụ] ga-ada n’akụkụ gị, [puku mmadụ iri] ga-adakwa n’aka nri gị; ma ọ gaghị abịaru gị nso. Ọ bụ nanị na Ị ga-eji anya gị abụọ legide, wee hụ nkwụghachi nke ndị na-emebi iwu.” (Abụ Ọma 91:7, 8) N’ihi emeghị Jehova ebe mgbaba ha, ọtụtụ ‘na-ada’ n’ọnwụ ime mmụọ “n’akụkụ” anyị. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, “puku mmadụ iri” adawo “n’aka nri” nke ụmụ Israel ime mmụọ nke oge a. (Ndị Galetia 6:16) Ma ànyị bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ma ọ bụ ndị enyi ha raara onwe ha nye, anyị nọ ná nchebe “n’ebe nzuzo” nke Chineke. Nanị ihe anyị na-eme bụ ‘ilegide anya wee hụ nkwụghachi nke ndị na-emebi iwu,’ bụ́ ndị na-enweta nsogbu dị ka ihe ubi n’ụzọ achụmnta ego, okpukpe, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ.—Ndị Galetia 6:7.
‘Ihe Ọjọọ Agaghị Adakwasị Anyị’
13. Olee ihe ọjọọ ndị na-adịghị adakwasị anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
13 Ọ bụ ezie na nchebe nke ụwa a na-ada ada, anyị na-ebute Chineke ụzọ ma na-enweta obi ike site n’okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “N’ihi na gị onwe gị asịwo, Jehova bụ ebe mgbaba m; n’ihi na ọ bụ Onye kachasị ihe nile elu ka i meworo ebe obibi gị; ihe ọjọọ agaghị adakwasị gị, ihe otiti agaghị abịarukwa nso ụlọikwuu gị.” (Abụ Ọma 91:9, 10) Ee, Jehova bụ ebe mgbaba anyị. Otú ọ dị, anyị na-emekwa Onye Kachasị Ihe Nile Elu ‘ebe obibi anyị,’ bụ́ ebe anyị na-enweta nchebe. Anyị na-eto Jehova dị ka Eze Eluigwe na Ala, ‘na-ebi’ n’ime ya dị ka Isi Iyi nke nchebe anyị, ma na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ya. (Matiu 24:14) N’ihi ya, ‘ihe ọjọọ agaghị adakwasị anyị’—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ọjọọ ndị e kwuru na mbụ n’abụ ọma a ga-adakwasị anyị. Ọbụna mgbe ihe ọjọọ ndị dị ka ala ọma jijiji, oké ifufe, idei mmiri, na mbibi ndị agha kpatara dakwasịkọtara anyị na ndị ọzọ, ihe ndị a adịghị emebi okwukwe anyị ma ọ bụ nchebe ime mmụọ anyị.
14. Dị ka ndị ohu Jehova, gịnị mere anyị adịghị enweta ihe otiti ndị na-egbu egbu?
14 Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka ndị ọbịa bi n’ụlọikwuu, ndị nọpụrụ iche n’usoro ihe a. (1 Pita 2:11) ‘Ihe otiti adịghị abịaru nso ụlọikwuu ha.’ Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị abụghị akụkụ nke ụwa, anyị adịghịkwa enweta ihe otiti ime mmụọ ya ndị na-egbu egbu ndị dị ka omume rụrụ arụ, ịhụ ihe onwunwe n’anya, okpukpe ụgha, na ife “anụ ọhịa ahụ” na “ihe oyiyi” ya, bụ́ òtù Mba Ndị Dị n’Otu, ofufe.—Mkpughe 9:20, 21; 13:1-18; Jọn 17:16.
15. Olee otú o si bụrụ na anyị na-enweta enyemaka ndị mmụọ ozi?
15 Banyere nchebe anyị na-enweta, ọbụ abụ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ndị mmụọ ozi Ya ka Ọ [Jehova] ga-enye iwu banyere gị, idebe gị n’ụzọ gị nile. N’elu ọbụ aka ha ka ha ga-eburu gị, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.” (Abụ Ọma 91:11, 12) E nyewo ndị mmụọ ozi ike ichebe anyị. (2 Ndị Eze 6:17; Abụ Ọma 34:7-9; 104:4; Matiu 26:53; Luk 1:19) Ha na-echebe anyị ‘n’ụzọ anyị nile.’ (Matiu 18:10) Dị ka ndị nkwusa Alaeze, anyị na-enweta nduzi na nlekọta nke ndị mmụọ ozi, anyị adịghịkwa asụ ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 14:6, 7) Ọbụna “nkume” ndị dị ka mmachibido iwu n’ọrụ anyị emebeghị ka anyị sụọ ngọngọ ma ọ bụ mee ka ihu ọma Chineke funahụ anyị.
16. Olee otú mwakpo “nwa ọdụm” na-eme na nke “ajụala” na-eme si dị iche, oleekwa otú anyị si emeghachi omume n’ebe ha dị?
16 Ọbụ abụ ahụ gara n’ihu, sị: “Ọbụna ọdụm na ajụala ka ị ga-azọkwasị ụkwụ: ị ga-azọgbu nwa ọdụm na ogologo anụ mmiri.” (Abụ Ọma 91:13) Dị nnọọ ka nwa ọdụm si anọ n’ihu ọha eme mwakpo ihu na ihu, ụfọdụ n’ime ndị iro anyị na-emegide anyị n’ihu ọha site n’iti iwu ndị a tụpụtara iji kwụsị ọrụ nkwusa anyị. E wezụga nke ahụ, anyị na-enwetakwa mwakpo anyị na-atụghị anya ha dị ka nke ajụala na-eme site n’ebe zoro ezo. N’ịbụ ndị zoro onwe ha, ndị ụkọchukwu na-awakpo anyị mgbe ụfọdụ site n’aka ndị omeiwu, ndị ọkàikpe, na ndị ọzọ. Ma site ná nkwado Jehova, anyị na-eji udo achọ ahụ efe n’ụlọikpe, si otú ahụ ‘na-agbachitere ozi ọma, ma na-eme ka o guzosie ike n’ụzọ iwu kwadoro.’—Ndị Filipaị 1:7; Abụ Ọma 94:14, 20-22.
17. Olee otú anyị si azọgbu “nwa ọdụm”?
17 Ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ịzọgbu “nwa ọdụm na ogologo anụ mmiri.” Nwa ọdụm pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-eyi egwu, ogologo anụ mmiri pụkwara ịbụ anụ buru ibu na-akpụ akpụ. (Aịsaịa 31:4) Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú nwa ọdụm pụrụ isi bụrụ ihe na-eyi egwu mgbe ọ na-eme mwakpo ihu na ihu ya, anyị na-azọgbu ya n’ụzọ ihe atụ site n’ikwenyere Chineke karịa ụmụ mmadụ ma ọ bụ òtù ndị yiri ọdụm. (Ọrụ 5:29) Ya mere, “ọdụm” ahụ na-eyi egwu adịghị emerụ anyị ahụ n’ụzọ ime mmụọ.
18. Ònye ka “ogologo anụ mmiri” pụrụ ichetara anyị, gịnịkwa ka ọ dị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na a na-awakpo anyị?
18 Na Septuagint nke Grik, a kpọrọ “ogologo anụ mmiri” ahụ “dragọn.” Nke a pụrụ ichetara anyị nnọọ “dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” (Mkpughe 12:7-9; Jenesis 3:15) Ọ dị ka ajọ anụ na-akpụ akpụ nke nwere ikike igwepịa ma ọ bụ ilo anụ o jidere. (Jeremaịa 51:34) Mgbe Setan na-anwa ijide anyị, igwepịa anyị site ná nrụgide nke ụwa a, na iloda anyị, ka anyị wepụga onwe anyị n’agbụ ya ma zọgbuo “ogologo anụ mmiri” a. (1 Pita 5:8) Ihe fọdụrụ e tere mmanụ aghaghị ime nke a ma ọ bụrụ na ha gaje ikere òkè ná mmezu nke Ndị Rom 16:20.
Jehova—Isi Iyi nke Nzọpụta Anyị
19. N’ihi gịnị ka anyị ji agbaba n’ime Jehova?
19 Banyere onye na-efe ezi ofufe, ọbụ abụ ahụ na-akọwa Chineke dị ka onye na-asị: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, M ga-emekwa ka ọ gbapụta: M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.” (Abụ Ọma 91:14) Nkebi ahịrịokwu bụ́ “M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu” pụtara “M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe aka na-agaghị eru.” Anyị na-agbaba n’ime Jehova dị ka ndị na-efe ya ofufe karịsịa n’ihi na ‘anyị ahụwo ya n’anya.’ (Mak 12:29, 30; 1 Jọn 4:19) N’aka nke ya, Chineke ‘na-eme ka anyị gbapụta’ n’aka ndị iro anyị. Ọ dịghị mgbe a ga-ekpochapụ anyị n’ụwa. Kama nke ahụ, a ga-azọpụta anyị n’ihi na anyị maara aha Chineke ma na-akpọku ya n’okwukwe. (Ndị Rom 10:11-13) Anyị kpebisikwara ike ‘ijegharị n’aha Jehova ruo mgbe ebighị ebi.’—Maịka 4:5; Aịsaịa 43:10-12.
20. Ka Abụ Ọma nke 91 na-emechi, gịnị ka Jehova na-ekwe ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ná nkwa?
20 Ka Abụ Ọma nke 91 na-emechi, Jehova na-ekwu banyere ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Ọ ga-akpọku m, M ga-azakwa ya; Mụ onwe m ga-anọnyere ya n’ahụhụ: M ga-adọpụta ya, sọpụrụkwa ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo ka M ga-eji mee ka afọ ju ya, M ga-emekwa ka o lekwasị nzọpụta m anya.” (Abụ Ọma 91:15, 16) Mgbe anyị kpọkuru Chineke n’ekpere dị ka ọchịchọ ya si dị, ọ na-aza anyị. (1 Jọn 5:13-15) Anyị ataalarị ahụhụ nke ukwuu n’ihi ibu iro Setan kpaliri. Ma okwu ndị bụ́ “m ga-anọnyere ya n’ahụhụ” na-akwadebe anyị maka ọnwụnwa ndị ga-abịa n’ọdịnihu ma na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-akwagide anyị mgbe a ga-ebibi ajọ usoro ihe a.
21. Olee otú e siwororịị sọpụrụ ndị e tere mmanụ?
21 N’agbanyeghị ajọ mmegide nke Setan, a ga-asọpụrụ ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị e tere mmanụ n’etiti anyị n’eluigwe mgbe oge Jehova ruru—mgbe ha nọsịrị “ụbọchị ndụ dị ogologo” n’ụwa. Ma, ndọpụta ndị dị ịrịba ama Chineke na-eme ewetawororị ndị e tere mmanụ nsọpụrụ ime mmụọ. Leekwa ka ha si bụrụ ndị a sọpụụrụ site na ha ibute ụzọ dị ka Ndịàmà Jehova n’ụwa na mgbe ikpeazụ ndị a! (Aịsaịa 43:10-12) Ndọpụta kasịnụ Jehova ga-adọpụta ndị ya ga-abụ mgbe ọ ga-alụ agha ukwu ya bụ́ Amagedọn, bụ́ mgbe ọ ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta ma doo aha nsọ ya nsọ.—Abụ Ọma 83:18; Ezikiel 38:23; Mkpughe 16:14, 16.
22. Olee ndị ‘ga-elekwasị nzọpụta Jehova anya’?
22 Ma ànyị bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ma ọ bụ ndị enyi ha raara onwe ha nye, anyị na-elegara Chineke anya maka nzọpụta. N’ime “ụbọchị Jehova . . . , bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu,” a ga-azọpụta ndị ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Chineke ozi. (Joel 2:30-32) Ndị nọ n’etiti anyị bụ́ ndị ga-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” nke ga-alanarị banye n’ụwa ọhụrụ Chineke, ndị ga-anọgidekwa na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ule ikpeazụ, ga-abụ ndị ‘o ji ụbọchị ndụ dị ogologo’—ndụ na-enweghị ọgwụgwụ—‘mee ka afọ ju.’ Ọ ga-akpọlitekwa ìgwè mmadụ n’ọnwụ. (Mkpughe 7:9; 20:7-15) N’ezie, obi ga-adị Jehova ụtọ nke ukwuu ‘n’ime ka anyị lekwasị nzọpụta ga-esi n’aka Jisọs Kraịst anya.’ (Abụ Ọma 3:8) N’ịbụ ndị atụmanya dị otú ahụ dị ebube na-echere, ka anyị nọgide na-elegara Chineke anya maka enyemaka n’ịgụta ụbọchị anyị n’ụzọ na-ewetara ya otuto. Site n’okwu na omume anyị, ka anyị nọgide na-egosi na Jehova bụ ebe mgbaba anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ebughị amụma ndị metụtara Mesaịa n’uche tụlee Abụ Ọma nke 91. N’ezie, Jehova bụ ebe mgbaba na ebe e wusiri ike nye nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, ọbụna dị ka Ọ bụ nye ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ na ndị enyi ha raara onwe ha nye dị ka otu ìgwè na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.”—Daniel 12:4.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Gịnị bụ ‘ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu’?
• Gịnị mere egwu adịghị atụ anyị?
• Olee otú o si bụrụ na ‘ihe ọjọọ agaghị adakwasị anyị’?
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova bụ isi iyi nke nzọpụta anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
Ị̀ maara otú eziokwu Jehova si bụrụ ọta ukwu nye anyị?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Jehova na-enyere ndị ohu ya aka ije ozi ha n’agbanyeghị mwakpo ndị a na-atụghị anya ha na mmegide ihu ọha
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ubí: A. N. Jagannatha Rao, Trustee, Madras Snake Park Trust