Si n’Ógbè ahụ Dị Ize Ndụ Pụọ!
Si n’Ógbè ahụ Dị Ize Ndụ Pụọ!
Ọ BỤ ọrụ ndị ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa ime nchọpụta na inyocha ihe àmà e nwere ma dọzie aka ná ntị banyere mgbawa ugwu ndị na-aga ime. (Ozugbo Ugwu Fugen gbawara, ndị uwe ojii mere ka ndị mmadụ si n’ógbè ahụ dị ize ndụ pụọ.) N’otu aka ahụ, ndị mmụta Bible na-achọpụta ihe ịrịba ama nke “ọgwụgwụ oge a” ma na-eme ka ndị ọzọ mara banyere ihe ize ndụ na-abịanụ.—Matiu 24:3.
N’otu isiakwụkwọ Bible ahụ dọrọ aka ná ntị banyere ọdachi ga-ezu ụwa ọnụ nke na-abịanụ, anyị pụrụ ịgụ nkọwa a e nyere banyere ihe ndị ga-ebu ụzọ mee: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. . . . Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebilikwa, duhiekwa ọtụtụ mmadụ. N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi. . . . A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:7-14.
Ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị na-enyocha akụkọ iji ghọta mmezu nke amụma a n’oge a. Karịsịa kemgbe 1914, anyị anọwo na-ahụ ya. E nwewo agha ụwa abụọ na narị afọ a, ọtụtụ agha obodo, agha ógbè, nakwa esemokwu agbụrụ na nke okpukpe. Ụnwụ nri ndị agha ndị dị otú ahụ kpatara emekpọwo ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ, tinyere ụkọ ndị ọdachi ndị meere onwe ha kpatara. Ala ọma jijiji alawo ọtụtụ ndụ n’iyi. E nweela òtù nzuzo ndị a na-enyo ndị ndú ha enyo, ndị ndị nọ na ha na-anụbigakwa ọkụ n’obi ókè. ‘Ịba ụba nke ihe na-emebi iwu’ echigharịwo ndị mmadụ pụọ n’igosipụta ịhụnanya, omume nke ịbụ ezi onye agbata obi abụghịzikwa ụkpụrụ a na-agbaso.
N’ezie, a na-arụzu ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, nke bụ́ akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ. Legodị ihu magazin a, ị ga-ahụkwa okwu ndị bụ́ “Ikwupụta Alaeze Jehova” dị ka akụkụ nke aha ya. Ụlọ Nche, bụ́ nke a na-ebipụta n’asụsụ 132, 2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpughe 6:1-8.
nke a na-ekesakwa ihe karịrị nde 22, bụ ngwá ọrụ bụ́ isi nye ndị na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe” n’elu ụwa dum mmadụ bi. Ozi ọma ahụ na-agụnye ozi bụ́ na Onye Okike nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke, eguzobewo Alaeze eluigwe nke ga-ebibi ajọ usoro ihe a ma weta paradaịs n’elu ala. N’ezie, a na-ahụzi ihe àmà na-egosi na Chineke ga-eme ihe n’isi nso, na-egosi na ndụ ndị mmadụ n’usoro ihe a dị n’ihe ize ndụ.—TụleeỤbọchị Dị Egwu nke Jehova
Gịnị ga-eme mgbe oge ruru maka Jehova imezu ihe o kpere n’ikpe? Gee ntị ná nkọwa doro anya nke ya onwe ya nyere banyere ihe ga-eme mgbe ahụ: “M ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa: ọbara, na ọkụ, na ogidi nke anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tutu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.”—Joel 2:30, 31.
Ụbọchị ahụ, bụ́ nke na-eyi egwu, nke ga-ebibikwa ihe karịa mgbawa ugwu ma ọ bụ ala ọma jijiji ọ bụla e nwetụworo, dị nso. Zefanaịa onye amụma na-ekwu, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu: . . . a ga-eji ọkụ nke ekworo Ya ripịa ala ha nile: n’ihi na ngwụsị, nke bụ́ nanị obi ọlụlọ mmiri, ka Ọ ga-eme ka ndị nile bi n’ala nke a gwụsịa.” Ọ bụ ezie na “ọlaọcha ha ma ọ bụ ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha anapụta n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova,” e nwere ụzọ a ga-esi alanarị ụbọchị ahụ dị egwu.—Zefanaịa 1:14–18.
N’igosi ụzọ ọ bụ, Zefanaịa na-ekwu, sị: “Mgbe ọnụma nke iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, . . . chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:2, 3) Anyị pụrụ ịbanye n’ebe mgbaba site ‘n’ịchọ Jehova, ịchọ ezi omume, na ịchọ umeala n’obi.’ Ole ndị taa na-achọ Jehova?
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-eji okwu ahụ bụ́ “Jehova” eme ihe banyere Ndịàmà Jehova n’ihi ọrụ nkwusa ha. Ị pụrụ ịnatawo magazin a site n’aka otu n’ime ha. A maara ha dị ka ụmụ amaala na-agbaso ụkpụrụ omume ọma bụ́ ndị na-ebi ndụ ziri ezi. Ha na-agbalịsi ike iyikwasị “mmadụ ọhụrụ,” bụ́ nke na-agụnye ịzụlite ịdị umeala n’obi. (Ndị Kọlọsi 3:8-10) Ha na-ekweta na a na-enweta nke a site n’ịbụ ndị e nyere ọzụzụ ná nzukọ Jehova a na-ahụ anya, bụ́ nke ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova dị n’ụwa nile na-anọchite anya ya n’ógbè dị iche iche. Ee, ị pụrụ isoro “ndị bụ́ òtù ụmụnna” n’etiti Ndịàmà Jehova n’ụwa nile banye n’ebe mgbaba.—1 Pita 5:9.
Banye n’Ebe Mgbaba Ugbu A
Iji banye n’ebe mgbaba site n’ịchọ Jehova, anyị aghaghị ịbụ ndị enyi ya. Gịnị ka nke ahụ na-agụnye? Bible na-aza, sị: “Ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Iji bụrụ ndị enyi Chineke, anyị aghaghị ikewapụ onwe anyị ná nkekọ mmetụta uche ọ bụla nke anyị na ajọ ụwa dị ugbu a, nke e ji àgwà inupụrụ Chineke isi mara, nwere.
Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Ọtụtụ ndị taa bụ ndị agụụ anụ ahụ—agụụ mmekọahụ a na-achịkwaghị achịkwa, iji anyaukwu achụ ego, na iji ikike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi—na-akwali. Ma iji nọrọ n’akụkụ Jehova, mmadụ aghaghị imeri agụụ ndị dị otú ahụ.—Ndị Kọlọsi 3:5-8.
I nwere ike ịgụwo akwụkwọ a site n’oge ruo n’oge, ị pụkwara ikwenye n’otú o si akọwa amụma Bible. Ma, ị pụrụ igbu oge iwere nzọụkwụ ọzọ nke bụ́ isonyere Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ọ
bụrụ na ọdachi chere anyị ihu, ò zuru ezu nanị ịnụrụ ịdọ aka ná ntị? Dị ka anyị pụrụ ịhụ site n’ihe mere ná mgbawa nke Ugwu Fugen, ọ dị anyị mkpa ime ihe ịdọ aka ná ntị ahụ na-ekwu. Cheta, ọ dịkarịa ala mmadụ 15 bụ́ ndị nta akụkọ na ndị na-ese foto bụ́ ndị bu n’uche inweta akụkọ ga-ehi ụdụ, tụfuru ndụ ha. N’ezie, otu onye na-ese foto nwụrụ mgbe mkpụrụ aka ya ka pịkwasịrị na bọtịn kamera ya nke ọ na-apị aka were na-ese foto. Otu onye ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa—onye kwuworo, sị, “Ọ bụrụ na m ga-anwụrịrị otu ụbọchị, achọrọ m ka ọ bụrụ n’ala ala ugwu mgbawa”—tụfuru ndụ ya dị nnọọ ka o siworo chọọ. Ha nile mikpuru onwe ha n’ọrụ ha nakwa ná nchụso ha. Ma, ha ji ndụ ha kwụọ ụgwọ—ihe ileghara ịdọ aka ná ntị anya, furu ha.Ọtụtụ ndị taa na-anụ ozi banyere mkpebi Chineke mere ibibi ajọ usoro ihe a, na-aghọtakwa, ruo n’ókè ụfọdụ, izi ezi nke ịdọ aka ná ntị ahụ. ‘Ọ pụrụ imesị bịa,’ ka ha pụrụ iche n’echiche, ‘ma ọ bụghị taa.’ Ha na-eji ntụsara ahụ atụpụ ụbọchị Jehova n’ihu ka ha wee ghara ịbụ ndị e chigharịrị ihu pụọ n’ihe ha weere dị ka ihe ka mkpa n’oge ahụ.
Beruk nwere nsogbu dị otú ahụ. N’ịbụ odeakwụkwọ nke onye amụma oge ochie bụ́ Jeremaịa, Beruk ji obi ike dọọ ụmụ Israel aka ná ntị banyere mbibi na-aga ịdakwasị Jerusalem. Ma, n’otu oge, ọrụ e nyere ya gwụrụ ya ike. Mgbe nke ahụ mere, Jehova gbaziri ya, sị: “Gị onwe gị, ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha.” Ma ọ̀ bụ akụ̀ na ụba, ịbụ onye a ma ama, ma ọ bụ ịnọ ná nchebe n’ụzọ ihe onwunwe, Beruk agajeghị ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu.’ O kwesịrị inwe mmasị n’otu ihe, ime uche Chineke iji nyere ndị mmadụ aka iguzo n’akụkụ Ya. N’ihi ya, ọ ga-enweta ‘ndụ ya dị ka ihe nkwata.’ (Jeremaịa 45:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, kama ‘ịchọrọ onwe anyị ihe ukwu,’ anyị kwesịrị ịchọ Jehova, bụ́ nke pụrụ iduga n’ịzọpụta ndụ anyị.
N’Ugwu Fugen, ihe karịrị ndị uwe ojii na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ afọ ofufo 12 nọ n’ọrụ mgbe ihe ahụ dị oké ọkụ bụ́ nke si ná mgbawa ahụ na-asọpụta, wụsara ha. Ha nọ na-agbalị inyere ndị nọ n’ihe ize ndụ aka na ichebe ha. Ha dị ka ndị ikom na ndị inyom nwere ezi ebumnobi bụ́ ndị na-emikpu onwe ha n’ime ka ụwa a ka mma. N’agbanyeghị na ha pụrụ inwe ezi ebumnobi, “ihe nke gbagọrọ agbagọ, a pụghị ime ka ọ dịzie.” (Eklisiastis 1:15) A pụghị ịgbatị usoro ihe a gbagọrọ agbagọ. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya bụ́ mmadụ ime onwe ya “enyi nke ụwa” site n’ịnwa ịzọpụta usoro ihe zuru ụwa ọnụ nke Chineke kpebiri ikpochapụ?
Ị Gbapụhaala, Abatala Ọzọ
Otu ihe bụ isi n’usoro ihe a dị ize ndụ gbapụ, ihe ọzọ bụ ịnọgide ná nlekọta dị nchebe nke “òtù ndị bụ́ ụmụnna.” (1 Pita 2:17) Ka anyị ghara ichefu ndị ọrụ ugbo ahụ bụ́ ndị, mgbe a kpọpụsịrị ha, laghachiri azụ inyocha ugbo ha ndị dị nso n’Ugwu Fugen. Ma eleghị anya, ha nwere ọchịchọ siri ike ịlaghachi ná ndụ ha “na-ebibu.” Ma ị na-achọpụta na mkpebi ha mere ịlaghachi azụ bụ nke nzuzu. Ikekwe nke ahụ abụghị mgbalị mbụ ha mere ịgafe ókè ahụ. Ha pụrụ ịbanyewo n’ógbè ahụ dị ize ndụ ruo nanị nwa oge n’enweghị ihe merenụ. N’oge ọzọ, ha pụrụ ịnọwo ruo oge dị ukwuu karị, ma ọ dịghịkwa ihe ọ bụla merenụ. Ikekwe, n’oge na-adịghị anya, ịgafe ókè nchebe ahụ bịara mara ha ahụ, obi akaakwa ha ịnọ ọdụ n’ógbè ahụ dị ize ndụ.
Jisọs Kraịst zoro aka n’ọnọdụ yiri nke ahụ bụ́ nke ga-adị na mgbe “ọgwụgwụ oge a.” O kwuru, sị: “Dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile; otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:3, 38, 39.
Rịba ama na Jisọs kpọtụrụ iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịlụ di na nwunye, aha. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ nke dị njọ n’onwe ya n’anya Jehova. Oleezi ihe dị njọ? Ndị nke oge Noa ‘amaghị,’ ha na-ebi ndụ hiwere isi n’ihe ndị ha na-eme mgbe dum. N’oge e nwere ọnọdụ mberede, mmadụ apụghị ibi ndụ ọ “na-ebibu.” I sihaala n’ụwa a a mara ikpe gbapụ, ma ọ bụ wezụga onwe gị, ị ghaghị ịlụ ọgụ megide mkpali ọ bụla nke ịlaghachi azụ iji rite uru 1 Ndị Kọrint 7:31) I nwere ike isi n’ógbè dị nchebe n’ụzọ ime mmụọ pụọ ma lọghachite n’emerụghị ahụ, ọbụna n’enweghị onye chọpụtara ya. Otú ọ dị, o yikarịrị ka nke ahụ ọ ga-eme ka obi kaa gị ma mee ka ị laghachi n’ụwa ọzọ, na-anọtụkwu ọdụ na ya. N’oge na-adịghị anya, ị pụrụ ịzụlite àgwà bụ́: “Ọgwụgwụ ahụ agaghị abịa taa.”
n’ihe ọ bụla a pụrụ inweta na ya. (Cheekwa banyere ndị ọkwọ ụgbọala atọ ahụ tụfuru ndụ ha ka ha nọ na-eche ndị nta akụkọ na ndị na-ese foto mgbe ihe ndị si ná mgbawa ahụ si n’ugwu ahụ sọdata. Ụfọdụ ndị taa pụrụ isonyere ndị ọzọ bụ́ ndị obi siri ike ịlaghachi azụ n’ime ụwa. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, o doro anya na ya na ihe ize ndụ dị n’ịbụ onye a ratara n’ịlaghachi n’ógbè ahụ dị ize ndụ ahataghị.
Ndị nile nwụrụnụ ná mgbawa nke Ugwu Fugen gafere ókè ahụ kewapụrụ ebe dị nchebe ma banye n’ógbè ahụ dị ize ndụ. Ọ bụ ezie na ha tụrụ anya na ugwu ahụ ga-agbawa otu ụbọchị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha chere na ọ ga-abụ n’ụbọchị ahụ. Site n’inyocha ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ oge a, ọtụtụ ndị na-atụ anya na ụbọchị Jehova ga-abịa otu ụbọchị kama o yighị ha ka ọ bụ n’isi nso. Ụfọdụ na-eche ọbụna na ụbọchị ahụ enweghị ike ịbụ “taa” ma ọlị. Àgwà dị otú ahụ dị ize ndụ n’ezie.
“Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi,” ka Pita onyeozi dọrọ aka ná ntị. Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche, “na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke, na-emekwa ka ọ bịa ngwa ngwa,” na-anụ “ọkụ n’obi ka e wee hụ [anyị] n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya.” (2 Pita 3:10-14) Mgbe e bibisịrị ajọ usoro ihe dị ugbu a, ihe ga-esochi bụ ụwa paradaịs nke Alaeze Chineke ga-achị. Ka a ghara ịnwa anyị ma ọlị ịkachi obi laghachi n’ógbè ahụ dị ize ndụ, n’ihi ihe ọ bụla uche anyị pụrụ ịgwa anyị, ebe ọ bụ na ụbọchị anyị gafere ókè ahụ laghachi n’ime ụwa pụrụ ịbụ ụbọchị nke Jehova.
Soro ndị Jehova banye n’ebe mgbaba, sorokwa ha nọrọ.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Soro ndị Jehova banye n’ebe mgbaba, sorokwa ha nọrọ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Iwasa/Sipa Press