Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Soro Jehova Na-akpachi Anya

Soro Jehova Na-akpachi Anya

Soro Jehova Na-akpachi Anya

“BỊARUONỤ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. (Jemes 4:8) Ọbụ abụ bụ́ Devid bụkwara, sị: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.” (Abụ Ọma 25:14) N’ụzọ doro anya, Jehova Chineke chọrọ ka anyị na ya na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla na-efe Chineke ma na-erube isi n’iwu ya na-enwecha mmetụta nke ịnọ ya nso.

Gịnị banyere gị onwe gị? Ị̀ na-eso Chineke na-enwe mmekọrịta onwe onye chiri anya? Obi abụọ adịghị ya na ị chọrọ ịbịarukwu ya nso. Ànyị pụrụ isi aṅaa soro Chineke na-akpachi anya? Gịnị ka nke a ga-apụtara anyị? Isi nke atọ nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-enye azịza ha.

Na-egosipụta Ebere ma Na-ekwu Eziokwu

Eze Solomọn nke Israel oge ochie jiri okwu ndị a na-esonu malite isi nke atọ nke Ilu: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.” (Ilu 3:1, 2) Ebe ọ bụ na Solomọn ji ike mmụọ nsọ Chineke dee akwụkwọ ya, n’ezie ndụmọdụ a yiri nke nna, si n’aka Jehova Chineke na-abịa, ọ bụkwa anyị ka a na-enye ya. A na-adụ anyị ọdụ n’ebe a irube isi n’ihe ncheta Chineke—iwu, ma ọ bụ ozizi ya, na ihe ndị o nyere n’iwu—ndị e dekọrọ n’ime Bible. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, “ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị” anyị. Ee, ọbụna ugbu a, anyị pụrụ ibi ndụ dị jụụ, anyị pụkwara izere nchụso ndị na-ekpughe anyị nye ihe ize ndụ nke nnwụchu ọnwụ bụ́ nke na-adakwasịkarị ndị na-eme ihe ọjọọ. Ọzọkwa, anyị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke udo.—Ilu 1:24-31; 2:21, 22.

N’ịga n’ihu, Solomọn na-ekwu, sị: “Ekwela ka ebere na eziokwu hapụ gị: kee ha n’olu gị; dee ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi gị: chọtakwa amara na ezi uche n’anya Chineke na mmadụ.”Ilu 3:3, 4.

Ihe ọzọ a na-asụgharị okwu mbụ e ji mee ihe maka “ebere” bụ “ezi ịhụnanya,” ọ na-agụnyekwa ikwesị ntụkwasị obi, ịdị n’otu, na iguzosi ike n’ihe. Ànyị kpebisiri ike ịrapara n’ebe Jehova nọ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ? Ànyị na-egosipụta ebere ná mmekọrịta anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị? Ànyị na-agba mbọ ịnọ ha nso? Ná mmekọrịta anyị na ha na-enwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ànyị na-eme ka ‘iwu nke ebere dịkwasị n’ire anyị’ ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ?—Ilu 31:26.

N’ịbụ onye na-aba ụba n’ebere, Jehova bụ “onye na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ọ bụrụ na anyị echegharịwo ná mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga ma na-emere ụkwụ anyị ụzọ ndị guzoziri eguzozi ugbu a, a na-emesi anyị obi ike na “oge inwe ume ndụ” ga-esi n’aka Jehova bịa. (Ọrụ 3:19) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi Chineke anyị site n’ịgbaghara ndị ọzọ mmehie ha?—Matiu 6:14, 15.

Jehova bụ “Chineke nke eziokwu,” ọ na-achọkwa “eziokwu” n’aka ndị na-achọ ka ha na ya na-akpachi anya. (Abụ Ọma 31:5) Ànyị pụrụ ịtụ anya n’ezie ka Jehova bụrụ Enyi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ụdị ndụ abụọ—na-eme omume n’otu ụzọ mgbe anyị na ndị enyi anyị bụ́ ndị Kraịst nọ ma na-eme omume n’ụzọ ọzọ mgbe anyị na ha na-anọghị—dị ka ‘ndị mmadụ efu’ bụ́ ndị na-ezochi ụdị mmadụ ha bụ? (Abụ Ọma 26:4) Lee nzuzu nke ahụ ga-abụ, ebe ọ bụ na “ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya” Jehova!—Ndị Hibru 4:13.

Anyị ga-eji ebere na eziokwu kpọrọ ihe dị ka ihe olu dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ‘anyị kere n’olu,’ n’ihi na ha na-enyere anyị aka ‘ịchọta amara n’anya Chineke na mmadụ.’ Ọ bụghị nanị na ọ dị anyị mkpa igosipụta àgwà ndị a egosipụta kamakwa ọ dị anyị mkpa ide ha ‘n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi anyị,’ na-eme ka ha bụrụ akụkụ dị mkpa nke àgwà anyị.

Zụlite Ntụkwasị Obi Zuru Ezu n’Ebe Jehova Nọ

Eze ahụ maara ihe gara n’ihu, na-sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.”Ilu 3:5, 6.

Jehova ruru eru n’ezie ịbụ onye anyị ga-atụkwasị obi kpam kpam. Dị ka Onye Okike, ọ ‘bara ụba n’ike,’ bụrụkwa Isi Iyi nke “ike.” (Aịsaịa 40:26, 29) Ọ pụrụ imezu ihe nile o zubeworo. Leenụ, aha ya pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” aha a na-ewulitekwa obi ike anyị nwere n’ikike ya imezu ihe o kweworo ná nkwa! Eziokwu ahụ bụ́ na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha’ na-eme ka Ọ bụrụ eziokwu n’onwe ya. (Ndị Hibru 6:18) Àgwà ya bụ́ isi bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ‘onye ezi omume n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere n’ọrụ Ya nile.’ (Abụ Ọma 145:17) Ọ bụrụ na anyị apụghị ịtụkwasị Chineke obi, ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi? N’ezie, iji zụlite ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, ọ dị anyị mkpa ‘idetụ ire, hụ na Jehova dị mma’ site n’itinye ihe anyị na-amụta na Bible n’ọrụ ná ndụ anyị nakwa site n’ịtụgharị uche n’ezi ihe nke a na-arụpụta.—Abụ Ọma 34:8.

Olee otú anyị pụrụ isi ‘mara Jehova n’ụzọ anyị nile’? Ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-asị: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:12) Ebe ọ bụ na a pụghị ịhụ Chineke anya, ịtụgharị uche n’oké ọrụ ya nakwa ná mmeso ọ na-emeso ndị ya dị mkpa iji soro ya na-akpachi anya.

Ekpere bụkwa ụzọ dị mkpa isi mara Jehova. Eze Devid nọgidere na-akpọku Jehova “ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 86:3) Devid ji ogologo abalị nile kpee ekpere mgbe mgbe, dị ka mgbe ọ gbagara n’ọzara. (Abụ Ọma 63:6, 7) “Na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ. (Ndị Efesọs 6:18) Ugboro ole ka anyị na-ekpe ekpere? Ọ̀ na-atọ anyị ụtọ isoro Chineke na-enwe nkwurịta okwu sitere n’ezi obi? Mgbe ọnọdụ ndị siri ike chere anyị ihu, ànyị na-arịọ ya maka enyemaka? Ànyị na-eji ekpere achọ nduzi ya tupu anyị ana-eme mkpebi ndị dị mkpa? Ekpere anyị ji ezi obi na-ekpegara Jehova na-eme ka ọ hụ anyị n’anya. Anyị nwekwara obi ike na ọ ga-anụ ekpere anyị ma ‘mee ka okporo ụzọ anyị nile zie ezi.’

Lee nzuzu ọ bụ ‘ịdabere ná nghọta anyị’ ma ọ bụ na nke ndị a ma ama n’ụwa mgbe anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ! “Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị,” ka Solomọn na-ekwu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-adụ ọdụ, sị: “Tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị: ya bụrụ ihe na-agwọ otubo gị, ya bụrụkwa ụmị dịịrị ọkpụkpụ gị nile.” (Ilu 3:7, 8) Egwu ziri ezi nke ịkpasu Chineke iwe kwesịrị ịchịkwa omume, echiche, na mmetụta uche anyị nile. Egwu nsọpụrụ dị otú ahụ na-egbochi anyị ime ihe ọjọọ, ọ na-agwọkwa ọrịa ma na-enye ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.

Nye Jehova Ihe Kasị Mma I Nwere

Olee ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi bịaruo Chineke nso? “Sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile,” ka eze ahụ na-atụzi. (Ilu 3:9) Ịsọpụrụ Jehova pụtara ịkwanyere ya ùgwù hiri nne na ibuli ya elu n’ihu ọha site n’ikere òkè na n’ịkwado mkpọsa a na-akpọsa aha ya n’ihu ọha. Akụ̀ ndị anyị ji asọpụrụ Jehova bụ oge anyị, nkà anyị, ume anyị, na ihe onwunwe anyị. Ha aghaghị ịbụ mkpụrụ mbụ—kpọmkwem ndị kasị mma anyị nwere. Otú anyị si eji ihe onwunwe anyị eme ihe ó kwesịghị igosipụta mkpebi anyị mere ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze Ya, na ezi omume Chineke’?—Matiu 6:33.

Ịsọpụrụ Jehova site n’akụ̀ anyị abụghị ihe na-adịghị eweta ụgwọ ọrụ. “Ọ̇bá gị nile ga-ejupụtakwa n’ihe nriju afọ,” ka Solomọn na-emesi obi ike, “ebe nzọcha mkpụrụ vine gị nile ga-etiwakwa ná mmanya vine ọhụrụ.” (Ilu 3:10) Ọ bụ ezie na inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ n’onwe ya adịghị eduga n’inwe ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe, iji mmesapụ aka na-eji ihe ndị anyị nwere asọpụrụ Jehova na-eweta ngọzi bara ụba. Ime uche Chineke bụụrụ Jisọs “ihe oriri” na-edozi ahụ. (Jọn 4:34) N’otu aka ahụ, ikere òkè n’ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ nke na-enye Jehova otuto na-edozi anyị ahụ. Ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike n’ọrụ ahụ, ọbá ime mmụọ anyị ga-ejupụta n’ihe nriju afọ. Ọṅụ anyị—nke e ji mmanya vine ọhụrụ mee ihe atụ ya—ga-etiwa.

Ọ̀ bụ na anyị adịghịkwa elegara Jehova anya ma na-ekpegara ya ekpere maka ihe oriri ga-ezuru anyị kwa ụbọchị? (Matiu 6:11) N’ezie, ihe nile anyị nwere si n’aka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya rute anyị aka. Jehova ga-awụpụkwu ngọzi ruo n’ókè anyị na-ejiru akụ̀ anyị eme ihe iji nye ya otuto.—1 Ndị Kọrint 4:7.

Nabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova

N’ịrịba ama mkpa ịdọ aka ná ntị dị n’isoro Jehova na-akpachi anya, eze Israel ahụ na-adụ anyị ọdụ, sị: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova: ike agwụkwala gị n’ịba mba Ya: n’ihi na onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.”Ilu 3:11, 12.

Otú ọ dị, ọ pụrụ isiri anyị ike ịnara ịdọ aka ná ntị. “Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute,” ka Pọl onyeozi dere, “ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ịba mba na ịdọ aka ná ntị bụ akụkụ dị mkpa nke ọzụzụ na-adọtakwu anyị nso n’ebe Chineke nọ. Mgbazi sitere n’aka Jehova—ma ànyị na-enweta ya site n’aka ndị mụrụ anyị, site n’ọgbakọ ndị Kraịst, ma ọ bụ site n’ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ n’oge anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye—bụ ngosipụta nke ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ. Anyị ga-abụ ndị nwere amamihe ịnara ya.

Jidesie Amamihe na Nghọta Ike

Ọzọ, Solomọn mesiri ike mkpa amamihe na nghọta dị n’iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ọ na-ekwupụta, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. . . . Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.”Ilu 3:13-18.

N’ichetara anyị ngosipụta Jehova gosipụtara amamihe na nghọta n’ọrụ okike ya dị ebube, eze ahụ na-ekwu, sị: “Jehova jiri amamihe tọọ ntọala ụwa; O doziri eluigwe site ná nghọta. . . . Nwa m, ekwela ka ha si n’anya gị abụọ wezụga onwe ha; chebe nzube ihe na izuzu; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ, bụkwaara olu gị amara.”Ilu 3:19-22.

Amamihe na nghọta bụ àgwà nsọpụrụ Chineke. Ọ bụghị nanị na ọ dị anyị mkpa ịzụlite ha kamakwa ọ dị anyị mkpa ijisi ha aka ike site n’adaghị mbà mgbe ọ bụla n’ojiji anyị ji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ ma na-etinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ. “Mgbe ahụ ka ị ga na-eje ije n’ụzọ gị ná ntụkwasị obi,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “ị gaghị akpọbikwa ụkwụ gị.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na i dinaa ala, ị gaghị atụ oké egwu: ee, ị ga-edina ala, ụra gị ga-atọkwa ụtọ.”Ilu 3:23, 24.

Ee, anyị pụrụ ije ije ná ntụkwasị obi ma jiri obi iru ala na-ehi ụra ka anyị na-echere ọbịbịa nke ụbọchị ‘mbibi mberede’ nke ga-abịakwasị ajọ ụwa Setan dị ka onye ohi. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3; 1 Jọn 5:19) Ọbụna n’oge mkpagbu ukwu ahụ nke dị ezi nso, anyị pụrụ inwe mmesi obi ike a: “Atụla egwu site n’oké egwu mberede, ma ọbụ site n’ikuku siri ike nke ndị na-emebi iwu, mgbe ọ na-abịa: n’ihi na Jehova ga-abụ ntụkwasị obi gị, Ọ ga-edebekwa ụkwụ gị ka a ghara ijide ya.”Ilu 3:25, 26; Matiu 24:21.

Na-eme Ezi Ihe

“Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị,” ka Solomọn na-adụ n’ọdụ, “mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Imere ndị ọzọ ezi ihe na-agụnye iji mmesapụ aka na-eji ihe onwunwe anyị emere ha ihe, nke a nwekwara ọtụtụ akụkụ. Ma, inyere ndị ọzọ aka isoro ezi Chineke ahụ na-enwe mmekọrịta chiri anya ọ́ bụghị kpọmkwem ihe kasị mma anyị pụrụ imere ha na “mgbe ọgwụgwụ” a? (Daniel 12:4) Ugbu a bụzi oge igosipụta ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20.

Eze ahụ nwere amamihe depụtakwara omume ndị a ga-ezere, na-asị: “Asịla mmadụ ibe gị, Jee, lọta, echi ka m ga-enye gị; mgbe ọ dị n’aka gị. Echepụtala ihe ọjọọ megide mmadụ ibe gị, ebe onye ahụ na-ebi gị nso ná ntụkwasị obi. Gị na mmadụ esela okwu n’efu, ma ọ bụrụ na o mesoghị gị ihe ọjọọ. Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala otu efu n’ụzọ ya nile.”Ilu 3:28-31.

N’ịchịkọta ihe mere o ji nye ndụmọdụ ya, Solomọn na-ekwu, sị: “N’ihi na ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị. Ọbụbụ ọnụ Jehova dị n’ụlọ onye na-emebi iwu; ma ebe obibi ndị ezi omume ka Ọ na-agọzi. Ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-akwa emo ka Ya onwe ya na-akwa emo, ma ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Ọ na-enye amara. Nsọpụrụ ka ndị maara ihe ga-eketa; ma ndị nzuzu na-ebuli nlelị.”Ilu 3:32-35.

Ọ bụrụ na anyị na Jehova ga na-akpachi anya, anyị agaghị anwa anwa echepụta echiche aghụghọ na nke ajọ ihe. (Ilu 6:16-19) Anyị ga-enweta ihu ọma na ngọzi Chineke nanị ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ziri ezi n’anya ya. Anyị pụkwara inweta nsọpụrụ anyị na-atụghị anya ya mgbe ndị ọzọ hụrụ na anyị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’amamihe Chineke. Ya mere, ka anyị jụ ụzọ aghụghọ dị iche iche nke ajọ ụwa a na-eme ihe ike. N’ezie, ka anyị gbasoo ụzọ ziri ezi ma soro Jehova na-akpachi anya!

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

“Sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị”