Ònye Bụ Ekwensu?
Ònye bụ Ekwensu?
Ị̀ GA-ASỊ na Ekwensu bụ . . .
Mmụọ?
Ihe ọjọọ dị́ mmadụ n’obi?
Ihe ndị mmadụ chere na ọ dị adị?
IHE BAỊBỤL KWURU
Ekwensu gwara Jizọs okwu ma “nwaa ya ọnwụnwa.” (Matiu 4:1-4) Ihe ọ pụtara bụ na Ekwensu bụ ajọ mmụọ, ọ bụghị ihe ọjọọ dị́ mmadụ n’obi ma ọ bụ ihe ndị mmadụ chere na ọ dị adị.
OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?
Ekwensu bụbu mmụọ ozi dị nsọ, mana ‘o guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ọ ghọrọ onye ụgha na onye iro Chineke.
Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sooro Setan nupụrụ Chineke isi.—Mkpughe 12:9.
Ekwensu na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bụ mmụọ dị adị.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.
Ekwensu ò nwere ike iduhie mmadụ?
ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na e nweghị onye bụ́ Ekwensu nke na-eduhie ndị mmadụ. Ma, ụjọ na-atụ ndị ọzọ na ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ịbanye n’ime ha na-akpa ike. Gịnị ka i chere?
IHE BAỊBỤL KWURU
“Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ekwensu na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ, ma ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-eduhie.
OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?
Ekwensu na-eji aghụghọ eduhie ndị mmadụ.—2 Ndị Kọrịnt 11:14.
Mgbe ụfọdụ, ndị mmụọ ọjọọ na-aba n’ime ụfọdụ ndị, na-eme ha ihe masịrị ha.—Matiu 12:22.
Ma Chineke ga-enyeliri gị aka iguzogide Ekwensu.—Jems 4:7.