Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ịghara ịna-echegbukarị onwe gị?
Gịnị ka ị ga-aza?
Ee
Mba
O nwere ike
Ihe Baịbụl kwuru
“Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Baịbụl ga-eme ka obi sie gị ike na Chineke ga-emeli ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Ekpere ga-enyere gị aka inweta “udo nke Chineke.” Udo nke Chineke a ga-eme ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ihe ọzọ bụ na ịgụ Baịbụl ga-eme ka ị ghara ịna-echegbucha onwe gị.—Matiu 11:28-30.
Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya?
Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na onye ọ bụla dị ndụ ga na-echegbu onwe ya, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ naanị mgbe mmadụ nwụrụ ka ọ ga-akwụsị ichegbu onwe ya. Gịnị ka i chere?
Ihe Baịbụl kwuru
Chineke ga-ewepụ ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya. “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, ndị mmadụ ga-ebi n’udo, obi eruokwa ha ala.—Aịzaya 32:18.
Ndị mmadụ agaghịzi na-echeta ihe ọ bụla na-eme ka ha na-echegbu onwe ha.—Aịzaya 65:17.