Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Kpọrọ Asị Juru Ebe Niile

Ndị A Kpọrọ Asị Juru Ebe Niile

Ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ebe niile maka na a kpọrọ ha asị.

A kọwa akụkọ ụwa, anyị na-anụkarị ka a na-ekwu na ndị mmadụ na-esi n’Ịntanet nakwa n’akwụkwọ ozi ekwu ihe ndị gosiri na ha kpọrọ ndị ọzọ asị. Ha na-emekwa ihe ndị gosiri na o nwere ndị ha kpọrọ asị. Ndị mmadụ taa na-atakwa ahụhụ n’ihi na a kpọrọ ha asị. A na-akwa ha emo, na-akparị ha, na-eyi ha egwu, na-emebisịkwa ihe ha ma ọ bụ na-eburu ihe ndị ha nwere. Ịkpọasi juru ebe niile.

Ụlọ Nche a kwuru ihe mmadụ ga-eme ka ọ kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Ihe a abụghị mmadụ ịmụ anya arọ nrọ. Ọ bụ ihe na-eme eme. E nwere ọtụtụ ndị n’ụwa taa kwụsịrịla ịkpọ ndị ọzọ asị.