Ọ Bụ Gị Ga-ekpebi Ma Ị̀ Ga-ahọrọ Ime Ihe Ọma Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ
Ụdị àgwà anyị kpebiri ịna-akpa ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ma ọ bụ ghara inwe obi ụtọ. Jehova Chineke ma na ihe a bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji chọọ ka anyị na-ebi ndụ otú o kwuru.
Jehova chọrọ ka obi ruo anyị ala nakwa ka ndụ na-atọ anyị ụtọ.
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị. Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso. Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu. Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri, ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.”—Aịzaya 48:17, 18.
Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, ọ ma otú kacha mma anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ọ na-agwa anyị ka anyị mee ihe o kwuru maka na ime ya ga-eme ka ihe gaziere anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-edebe iwu Chineke, ọ gaghị emewe anyị obi abụọ ma mkpebi anyị na-eme ọ̀ ga-emecha baara anyị uru. Anyị ga na-eme mkpebi dị mma mgbe niile, nke ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ, obi eruokwa anyị ala.
Jehova anaghị agwa anyị ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli.
“Iwu a m na-enye unu taa esighịrị unu oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe aka unu na-agaghị eru.”—Diuterọnọmi 30:11.
Jehova kwere nkwa na ọ ga-enyere ndị họọrọ ibi ndụ otú o kwuru aka.
“Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m na-asị gị, ‘Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.’”—Aịzaya 41:13.
Anyị ga-ebili ndụ otú Chineke chọrọ n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka. Ọ ga-ejili Okwu ya bụ́ Baịbụl nyere anyị aka. Okwu ya na-agbakwa anyị ume ma na-eme ka anyị nwee olileanya.
Ọtụtụ nde mmadụ n’ebe niile n’ụwa achọpụtala na ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka ndụ ha ka mma. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo gbasara ezigbo ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl? Otú i nwere ike isi malite bụ ịmụ broshọ e ji amụ Baịbụl nke isiokwu ya bụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. I nwere ike inweta ya na jw.org n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Lee isiokwu ndị gbara na ya:
-
Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Gị Aka?
-
Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
-
Obi Ò Kwesịrị Isi Gị Ike na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?
Ka ị na-amụkwu Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, ị ga-achọpụta na ọ bụghị akwụkwọ mgbe ochie, kama na ‘a ga-atụkwasịli ya obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 111:8) Otú kacha mma anyị ga-esi ebi ndụ bụ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Mana, Chineke agaghị amanye anyị amanye ime ya. (Diuterọnọmi 30:19, 20; Joshụa 24:15) Ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ma ọ̀ ga-eme ihe Chineke chọrọ ma ọ bụ na ọ gaghị eme.