Eziokwu Banyere Ọdịnihu
Ì chetụla echiche otú ọdịnihu ga-adị? Baịbụl gwara anyị ihe ndị dị mkpa ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ihe ndị ahụ ga-emetụtakwa mmadụ niile bi n’ụwa.
Jizọs kwuru otú anyị ga-esi ‘ama na Alaeze Chineke dị nso.’ (Luk 21:31) Ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru anyị ga-eji amata ya bụ agha, oké ala ọma jijiji, ụkọ nri nakwa ọrịa na-efe efe. Anyị na-ahụ ka ihe ndị a niile na-eme taa.—Luk 21:10-17.
Baịbụl kwukwara na otu n’ime ihe ndị a ga-eji amata “oge ikpeazụ” nke ọchịchị ụmụ mmadụ bụ na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ọjọọ. I nwere ike ịgụ banyere ya na 2 Timoti 3:1-5. Mgbe ị na-ahụ ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ndị ahụ, o doro anya na ị ga-ekweta na amụma a Baịbụl buru na-emezu n’oge a.
Gịnị ka mmezu amụma a na-egosi? Ọ na-egosi na oge Alaeze Chineke ga-eji eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mma n’ụwa adịla nso. (Luk 21:36) Na Baịbụl, Chineke kwuru ihe ọma ọ ga-eme n’ụwa nakwa ihe ọ ga-emere ndị ga-ebi na ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
EZIGBO ỌCHỊCHỊ
“E nyere [Jizọs] ọchịchị, mee ka a na-akwanyere ya ùgwù, nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.”—DANIEL 7:14.
Ihe ọ pụtara: Ị ga-enwe obi ụtọ mgbe ọchịchị kacha mma ga-achịwa ụwa niile. Ọ bụ Chineke hiwere ọchịchị a, ma mee Ọkpara ya Eze ya.
EZIGBO AHỤ́ IKE
“O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ’Ahụ́ adịghị m.’”—AỊZAYA 33:24.
Ihe ọ pụtara: Ị gaghị arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ. Ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
UDO ZURU ỤWA ỌNỤ
“Ọ na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”—ABỤ ỌMA 46:9.
Ihe ọ pụtara: Agha na ahụhụ niile ọ na-akpata agaghịzi adị.
NAANỊ NDỊ EZI OMUME GA-EBIZI N’ỤWA
“Ndị ajọ omume agaghịzi anọ . . . Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa.”—ABỤ ỌMA 37:10, 11.
Ihe ọ pụtara: A gaghịzi enwe ndị ọjọọ n’ụwa. Ọ bụ naanị ndị chọrọ irubere Chineke isi ga-ebi na ya.
ỤWA NIILE GA-ABỤ PARADAỊS
“Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya.” —AỊZAYA 65:21, 22.
Ihe ọ pụtara: Ụwa niile ga-ama mma. Chineke ga-aza ekpere anyị bụ́ ka uche ya mee “n’ụwa.”—Matiu 6:10.