Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú brik ndị a hụrụ na Babịlọn oge ochie nakwa otú e si akpụ brik n’ebe ahụ si gosi na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu?

NDỊ na-egwupụta ihe ndị mgbe ochie egwupụtala ọtụtụ brik ndị a nụchara n’ọkụ e ji rụọ obodo Babịlọn. Otu onye so ná ndị na-egwupụta ihe n’ala aha ya bụ Robert Koldewey kwuru na a nụchara brik ndị ahụ n’ọkụ ndị a kwanyere ‘n’azụ obodo ahụ, ebe e nwere ụrọ dị mma e ji akpụ brik nakwa nkụ a ga-eji anụcha ha.’

Ndị na-egwupụta ihe n’ala ahụla ihe ndị gosiri na ndị ọchịchị Babịlọn oge ochie jikwa ọkụ ndị ahụ ha kwanyere mee ihe dị ezigbo njọ. Otu prọfesọ n’ihe gbasara akụkọ ndị Asiria oge ochie nakwa asụsụ ha na mahadum dị na Toronto aha ya bụ Paul-Alain Beaulieu sịrị: “Ọtụtụ ihe e dere a chọpụtara na Babịlọn oge ochie gosiri na eze nyere iwu ka a tụba ndị nupụụrụ ya isi nakwa ndị mere arụ n’ime ọkụ ndị dị n’ebe ahụ.” Otu ihe e dere n’oge Eze Nebukadneza kwuru gbasara ikpe a mara ụfọdụ ndị n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Gbuo ha, kpọọ ha ọkụ, hụọ ha n’ọkụ, . . . n’ekwú e ji esi ihe . . . ka anwụrụ ọkụ ha kwụgoo elu, tụbakwa ha n’ọkụ ka ha nọrọ ebe ahụ nwụọ.”

Ihe a na-echetara ndị na-agụ Baịbụl ihe e dere na Daniel isi atọ. Ebe ahụ kwuru na Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe na mbara ala Dura nke dị n’azụ obodo Babịlọn. Mgbe ụmụ okorobịa Hibru atọ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego na-ekweghị akpọrọ ihe ahụ isiala, ezigbo iwe were Nebukadneza, ya enye iwu ka e mee ka ọkụ ahụ “dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ na-adịbu,” nakwa ka a tụba ụmụ okorobịa atọ ahụ “ná nnukwu ọkụ ahụ.” Otu mmụọ ozi dị ike chebere ha ka ha ghara ịnwụ.​—Dan. 3:1-6, 19-28.

© The Trustees of the British Museum. Licensed under CC BY-NC-SA 4.0. Source

Brik a nụchara n’ọkụ e dere aha Nebukadneza na ya

Brik ndị dị na Babịlọn gosikwara na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. E nwere ọtụtụ n’ime ha e dere ihe ndị e ji eto eze Babịlọn. Otu n’ime ha sịrị: “Nebukadneza, Eze Babịlọn . . . Obí eze, ebe mụnwa bụ́ Eze Ukwu rụrụ . . . Ka ụmụ m na-achị na ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ihe ndị a e dere na brik a yiri ihe e dere na Daniel 4:30, ebe Nebukadneza turu ọnụ, sị: “Ihe a ọ́ bụghị Babịlọn Ukwu nke m ji ike m na ume m rụọ ka ọ bụrụ obí eze, ka ọ bụrụkwa ihe a ga-eji na-akwanyere m nnukwu ùgwù?”