Ha Hụrụ Otú Ụmụnna Si Hụ Ha n’Anya
OTU nwaanyị aha ya bụ Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke aha ha bụ Marcelo na Hiver bi n’otu obere obodo dị na Gụatemala. Yomara na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ụmụnne ya ndị nwoke mechakwara soro ya mụwa Baịbụl. Ma, e nwere otu nsogbu dịnụ. Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ahụ kpuru ìsì. Ha anaghịkwanụ agụli ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. N’ihi ya, onye na-amụrụ ha Baịbụl na-agụpụtara ha ihe ha na-amụ na amaokwu Baịbụl ndị dị na ya.
Ịga ọmụmụ ihe anaghị adịrị ha mfe. Ha agaghị agali Ụlọ Nzukọ Alaeze n’onwe ha. Ọ ga-ewe ha nkeji iri anọ ịgaru Ụlọ Nzukọ Alaeze kacha dịrị ha nso. Ma, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha haziri ka ha na-akpọ ha aga ọmụmụ ihe niile. Mgbe ụmụnne ya ndị nwoke malitere ime ihe omume ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ ihe etiti izu, ụmụnna na-enyere ha aka ibute ihe omume ha n’isi.
N’ọnwa Mee afọ 2019, a malitere inwe ọmụmụ ihe n’obodo ha. N’oge ahụ, e nwere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ oge niile kwatara n’ododo ha. Ha kpebiri ịkụziri Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ahụ otú e si agụ na otú e si ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ọ bụ eziokwu na hanwa amaghị ya. N’ihi ya, ha gara n’otu ọ́bá akwụkwọ nweta akwụkwọ ndị kwuru otú e si akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.
N’ime ọnwa ole na ole, ụmụnne atọ ahụ malitere ịgụ ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Ihe a mekwara ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ. a Ugbu a, Yomara, Marcelo, na Hiver bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Marcelo bụ ohu na-eje ozi. Ha na-eji ọrụ gbasara ofufe Jehova n’aka mgbe niile. Otú ha si anụ ọkụ n’obi na-emekwa ka ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi.
Obi dị Yomara na ụmụnne ya abụọ ụtọ maka otú ụmụnna si enyere ha aka. Yomara sịrị: “Malite n’ụbọchị mbụ anyị matara Ndịàmà Jehova, ha na-egosi anyị na ha hụrụ anyị n’anya.” Marcelo sịrị: “Anyị nwere ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ. Anyị sokwa n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ hụrụ ibe ha n’anya.” Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke na-atụ anya mgbe ha ga-eji anya ha hụ ka e mere ka ụwa ghọọ paradaịs.—Ọma 37:10, 11; Aịza. 35:5.
a E nwere otu broshọ aha ya bụ Learn to Read Braille. Ihe mere e ji wepụta akwụkwọ ahụ bụ ka o nyere ndị ìsì na ndị na-anaghị ahụcha ụzọ aka ịmụta otú e si agụ mkpụru akwụkwọ ndị ìsì.