Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere e ji nye iwu ahụ dị na Levitikọs 19:16 nke sịrị: “Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị”? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta na ya?

Jehova gwara ndị Izrel ka ha dịrị nsọ. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Agala na-ekwutọsị onye ọzọ n’ihu ụmụnna gị. Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị. Abụ m Jehova.”​—Lev. 19:​2, 16.

Olee otú anyị kwesịrị isi aghọta okwu a bụ́ agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị? Otu akwụkwọ Hibru kọwara akwụkwọ Levitikọs kwuru gbasara ihe a, sị: “Ihe e kwuru n’amaokwu a . . . siri ike ịsụgharị n’ihi na o siri ike ịghọta ihe akpaala okwu Hibru ahụ pụtara. A sụgharịa okwu ndị ahụ, ọ pụtara ‘eguzola n’akụkụ ihe ma ọ bụ n’ebe dị ya nso.’”

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl chere na o nwere ihe jikọrọ okwu ahụ na ihe e kwuru n’amaokwu bu ya ụzọ nke sịrị: “Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu emerela ogbenye ebere maka na ọ bụ ogbenye. Unu emenyekwarala ọgaranya maka na ọ bụ ọgaranya. Na-ekpenụ mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.” (Lev. 19:15) Ọ bụrụ otú ahụ, iwu ahụ dị n’amaokwu nke iri na isii nke kwuru ka mmadụ ghara iguzo n’akụkụ onye ọzọ ma ọ bụ ịnọ ya nso nwere ike ịpụta na ndị Chineke ekwesịghị imegide mmadụ ibe ha n’ụlọ ikpe, n’azụmahịa ma ọ bụkwanụ n’ezinụlọ. Onye ahụ ekwesịghị ịghọgbu onye ọzọ ka ọ baara ya uru. Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ime ihe ndị a, ma, e nwere otú ka mma anyị nwere ike isi ghọta amaokwu nke iri na isii a.

Chegodị ihe e kwuru ná mmalite amaokwu nke iri na isii ahụ. Chineke nyere ndị ya iwu ka ha ghara ịna-akatọ ndị ọzọ. Cheta na nkatọ dị njọ karịa ịgba asịrị, ọ bụ eziokwu na asịrị nwekwara ike ịkpata nsogbu. (Ilu 10:19; Ekli. 10:​12-14; 1 Tim. 5:​11-15; Jems 3:6) Nkatọ na-abụkarị ụgha mmadụ kpachaara anya ghagide mmadụ ibe ya iji mebie aha onye ahụ. Onye na-akatọ mmadụ nwere ike gbaa akaebe ụgha iji megide mmadụ, ọ bụrụgodị na ime otú ahụ nwere ike ịkpata ọnwụ onye ahụ. Cheta na ọ bụ ndị nkatọ gbara akaebe ụgha megide Nebọt nke mere ka e jiri nkume tụgbuo ya. (1 Eze 21:​8-13) N’eziokwu, e nwere ike ikwu na onye na-akatọ mmadụ na-agba mbọ ka o gbuo ya, dị ka e kwuru ná ngwụcha Levitikọs 19:16.

Ihe ọzọkwa bụ na mmadụ nwere ike ịkatọ mmadụ ibe ya n’ihi na ọ kpọrọ ya asị. 1 Jọn 3:​15, sịrị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwa na e nweghị ogbu mmadụ ga-enweta ndụ ebighị ebi.” Ọ dị mkpa ịmara na mgbe Chineke kwuchara ihe dị n’amaokwu nke iri na isii, ọ sịrị: “Akpọla nwanna gị asị n’obi gị.”​—Levitikọs 19:17.

N’ihi ya, ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 19:16 na-akụziri Ndị Kraịst ihe dị ezigbo mkpa. Anyị ekwesịghị ịna-echere mmadụ echiche ọjọọ ma ọ bụ na-akatọ mmadụ. Ọ bụrụ na anyị akatọọ mmadụ n’ihi na anyị na-emere ya anyaụfụ, o nwere ike igosi na anyị kpọrọ ya asị. Ndị Kraịst kwesịkwara izere ịkpọ mmadụ asị chaa chaa.​—Matiu 12:​36, 37.