IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE
Alhazen
O NWERE ike ịbụ na ị nụtụbeghị banyere Abū ‘Alī al-Ḥasan ibn al-Haytham. Aha ya n’Arabik bụ al-Hasan. Ma, ndị Bekee na-akpọ ya Alhazen. N’agbanyeghị ihe a chọrọ ịna-akpọ ya, ihe ndị o mere mgbe ọ nọ ndụ na-abara gị uru. Ọtụtụ ndị sịrị na nwoke a bụ “otu n’ime ndị kacha gbaa mbọ na sayensị n’ụwa niile.”
A mụrụ Alhazen n’obodo Basra, dị n’Ịrak, n’ihe dị ka n’afọ 965 O.N.K. O nwere mmasị na nkà mmụta ihe ndị dị na mbara igwe, ihe ọmụmụ kemịstrị, mgbakọ na mwepụ, ahụ́ ike, egwú, ìhè, ihe ọmụmụ fiziks, na ide egwú. Ma, olee ihe kacha atọ ndị mmadụ ụtọ gbasara nwoke a?
ỊRỤBICHI OSIMIRI NAỊL
Ọ dịla anya a nụwara akụkọ gbasara ihe Alhazen mere. O kwuru na ya ga-enye aka gbochie osimiri Naịl ịsọfusi. O kwuru ihe ahụ ihe dị ka otu puku afọ tupu a rụbichie osimiri Naịl n’Aswan n’afọ 1902.
E kwuru na Alhazen kwuru na ya nwere ike ime ihe ga-akwụsịlata oké idei mmiri na ụkọ mmiri ozuzo na-enyekarị ndị Ijipt nsogbu. Otú ọ chọrọ isi eme ya bụ ịrụbichi osimiri Naịl iji gbochie idei mmiri. Mgbe eze na-achị Kaịro bụ́ Caliph al-Hakim nụrụ gbasara ihe a Alhazen kwuru na ya ga-eme, o ziri ozi ka a kpọọ ya ka ọ bịa Ijipt rụbichie osimiri Naịl. Mgbe Alhazen rutere hụ osimiri ahụ, ọ chọpụtara na ya agaghị arụli ya. Iji mee ka eze a isi na-anụ ọkụ ghara igbu ya, o bidoro ime ka onye isi na-adịghị mma, nke mere ka a kpọchie ya. Ebe ahụ ka ọ nọ ruo mgbe eze ahụ nwụrụ n’afọ 1021, mgbe ihe dị ka afọ iri na otu gachara. Ebe ahụ ọ nọ mere ka o nwee ohere buru ibu ọ ga-eji mee ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ na-enwe mmasị na ha.
AKWỤKWỌ BỤ́ BOOK OF OPTICS
Tupu a tọhapụ Alhazen, o deela akwụkwọ nwere mpịakọta asaa aha ya bụ Book of Optics. E weere akwụkwọ a ka “otu n’ime akwụkwọ ndị kacha baa uru n’ihe ọmụmụ fiziks.” N’ime akwụkwọ ahụ, ọ kọwara gbasara nchọnchọ ndị o mere gbasara ìhè, kọwaakwa otú ìhè nwere ike isi wepụta ụcha ya dị iche iche, otú enyo si arụ ọrụ, nakwa otú ìhè si akpa àgwà, dị ka ihe atụ, ma o si n’ikuku
banye n’enyo ma ọ bụ ná mmiri. O mekwara nchọnchọ iji mata otú anya anyị si arụ ọrụ.Ka ọ na-erula ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga, e sila n’asụsụ Arabik sụgharịa akwụkwọ Alhazen ahụ gaa na Latịn. Ruokwa ọtụtụ narị afọ kemgbe ahụ, ndị ọkà mmụta na Yurop weere akwụkwọ ya ka o kwuchaa o bie. Ọ bụ ihe ndị na-arụpụta enyo anya na Yurop gụtara n’akwụkwọ Alhazen nyeere ha aka ịrụpụta onyokomita na enyo e ji ahụ ihe nọ ebe dị anya. Otú ha si mee ya bụ́ idowe otu enyo n’ihu ibe ya.
KAMERA OBSCURA
Alhazen chọpụtara ihe dị mkpa gbasara ise foto mgbe ọrụrụ ihe e nwere ike ịsị na ọ bụ ya bụ kamera obscura mbụ a rụpụtara. Kamera obscura a dị ka “ụlọ gbara ọchịchịrị” nwere obere oghere ha ka anya agịga ìhè na-esi abata na ya. Ìhè ahụ bataranụ na-emezi ka a hụ onyinyo ihe dị n’azụ oghere ahụ n’ime kamera obscura ahụ.
N’agbata afọ 1801 ruo afọ 1899, e tinyere ihe ga-eme ka ihe kamera obscura setara nọgide. Gịnị si na ya pụta? A rụpụtara kamera. Kamera niile e nwere taa, ma anya mmadụ, na-arụ ọrụ ka kamera obscura. *
OTÚ NDỊ SAYENSỊ SI EME NCHỌNCHỌ
Otu ihe mere nchọnchọ Alhazen ji pụọ iche bụ na ọ na-asa anya ná mmiri eleba anya n’otú ihe ndị e kere eke sị arụ ọrụ. Otú o si eme nchọnchọ pụrụ iche n’oge ahụ. O so na ndị mbụ gbalịrị ka ha chọpụta ma e nwere ihe gosiri na ihe a chọpụtara bụ eziokwu. Ọ tụghịkwa ụjọ ikwu okwu ma ọ chọpụta na o nweghị ihe gosiri na ihe ndị mmadụ kweere bụ eziokwu.
E nwere ike ikwu na ihe ndị sayensị ugbu a kweere bụ: ‘Gosi anyị ihe mere ihe i kweere ji bụrụ eziokwu.’ Ụfọdụ ndị weere Alhazen ka “onye kụziiri ndị sayensị ugbu a otú e sị eme nchọnchọ.” Ọ bụ ihe a mere obi ji atọ anyị ụtọ maka mbọ ya niile.
^ para. 13 Otú anya anyị na kamera obscura si yie edochaghị ndị ọkà mmụta nọ n’ala Bekee anya ruo mgbe otu onye sayensị aha ya bụ Johannes Kepler kọwara ya n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga.