Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị

Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị

IHE MERE O JI DỊ MKPA

N’afọ ndị gara aga, ọ na-abụkarị ndị nne na nna na-ebu ụzọ agwa ụmụ ha gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Ha na-eji nwayọọ nwayọọ na-akụziri ha ya ka ha na-eto.

Ma n’oge anyị a, ọ dịghịzi otú ahụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Lolita Effect kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụaka taa na-ebido mgbe ha ka dị ezigbo ntakịrị matawa ihe ndị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Ụdị ihe ndị ahụ na-ejupụtazi n’ihe ndị a na-emepụta maka ụmụaka.” Ihe ndị a hà ga-enyere ụmụaka aka ka hà ga-emebi ha?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọ ahụ́ juru ebe niile. Deborah Roffman dere n’akwụkwọ ya a na-akpọ Talk to Me First na ‘ihe ndị na-akpali agụụ mmekọ ahụ́ na-ejupụtazi ná mkparịta ụka, vidio na egwú ndị e ji akpọsa ngwá ahịa, fim, akwụkwọ, egwú, tiivi, ekwentị nakwa kọmputa. Ihe ndị a na-emezi ka ọtụtụ [ụmụaka] na-eche na mmekọ nwoke na nwaanyị bụ ihe kacha mkpa ná ndụ.’

Ndị na-akpọsa ngwá ahịa sokwa na-akpata nsogbu a. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-eme ka ọhaneze kweta na efe ụmụaka ndị na-egosi ahụ́ ha magburu onwe ya. Ndị na-ere ahịa na-eresịkwa ọhaneze ụdị efe ndị ahụ. Ha si otú ahụ na-akụziri ụmụaka na ụdị efe ndị ahụ bụ ebe a nọ. Otu akwụkwọ a na-akpọ So Sexy So Soon kwuru, sị: “Ndị na-akpọsa ngwá ahịa ma na ihe na-ewu ewu na-amasị ụmụaka. Ha na-ejikwa ihe ndị ahụ arata ha. Ma, o doro anya na ihe bụ́ mkpa ndị na-ere ahịa abụghị ime ka ụmụaka ndị a mebie,” kama ọ bụ “ka ha repụ ahịa ha.”

Ịkọrọ ụmụ gị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị abụghị ebe okwu biri. O nwere ihe dị iche n’ịma otú ụgbọala si arụ ọrụ na ịbụ ọkwọ ụgbọala aka siri ike. N’otu aka ahụ, o nwere ihe dị iche n’ịma gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na iji ihe ahụ ị ma eme ezigbo mkpebi.

Ihe ị ga-eburu n’obi bụ: Ọ bụ n’oge anyị a ka ọ kacha mkpa inyere ụmụ gị aka ka ha zụọ “ikike nghọta” ha ka ha nwee ike “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”Ndị Hibru 5:14.

IHE I NWERE IKE IME

Bido rụwa ọrụ dịịrị gị. Ọ bụ eziokwu na o nwetụrụ otú ọ dị ịgwawa nwa gị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, ma ọ bụ ọrụ dịịrị gị. Gbalịa rụọ ya.Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 22:6.

Akọrọla ya ihe niile otu mgbe. Kama, iwepụta otu oge ị ga-eji kọọrọ nwa gị ihe niile, i nwere ike iji oge ụfọdụ gị na ya nọ kọọrọ ya ihe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ mgbe unu na-aga ihe ma ọ bụ mgbe unu na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. I nwere ike ịjụ ya ajụjụ ndị ga-eme ka o kwuo ihe dị ya n’obi. Dị ka ihe atụ, kama ịjụ ya, sị: “Ihe ndị a ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-egosi hà na-amasị gị?” i nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe i chere mere ndị na-akpọsa ngwá ahịa ji egosi ụdị ihe ndị a?” Ọ zachaa, i nweziri ike ịjụ ya, sị: “Gịnịkwanụ ka gịnwa chere?”Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Diuterọnọmi 6:6, 7.

Kụziere ya ihe ya na ya hà. I nwere ike ịkụziri nwa gị na-ebidobeghị akwụkwọ ihe a na-akpọ ahú nwoke ya ma ọ bụ ahụ́ nwaanyị ya, nakwa ihe ọ ga-eme ma mmadụ chọọ imetọ ya. Ka ọ na-eto, i nweziri ike ịgwa ya ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịma gbasara ahụ́ ya. O kwesịrị ịbụ na ọ matala ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị tupu ya aghọọ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, matakwa otú Chineke si ele ya anya.

Kụziere ya àgwà ọma. I kwesịrị ibido mgbe ọ ka dị obere kụziwere ya ịna-ekwu eziokwu, ịna-akpa àgwà ọma nakwa ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù. Ọ ga-emezi ka ịkụziri ya gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị dị mfe. Meekwa ka ihe ị na-akụziri ya doo ya anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ma na inwe mmekọahụ tupu alụọ dị na nwunye adịghị mma, gwa ya ya hoo haa. Gwakwa ya ihe mere na ọ dịghị mma, nakwa nsogbu ọ ga-akpata. Otu akwụkwọ aha ya bụ Beyond the Big Talk kwuru, sị: “Ọ ga-esi ike ka ndị na-eto eto ma na ndị mụrụ ha kpọrọ ịkwa iko asị kwaa iko.”

Na-eme ihe ị na-ekwu. Na-eme ihe ị na-akụziri nwa gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-atọ gị ụtọ ma e jiri ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na-eme ihe ọchị? Ị̀ na-eji ejiji na-adịghị mma? Ị̀ na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị? Nwa gị hụ ka ị na-eme ihe ndị a, o nwere ike ime ka ọ ghara ịmụta ihe ndị ahụ ị na-akụziri ya.Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 2:21.

Emela ka o yie ihe ọjọọ. Mmekọ nwoke na nwaanyị bụ onyinye si n’aka Chineke. Ọ bụkwa ihe na-enye obi ụtọ ma ndị kwesịrị ime ya mee ya, ya bụ, ndị lụrụ di na nwunye. (Ilu 5:18, 19) Mee ka nwa gị mata na o nwere ike ime ya mgbe oge ruru, ya bụ, mgbe ọ na-agaghị na-amapụ ya obi ma ọ bụkwanụ na-echegbu onwe ya maka ibute ọrịa.1 Timoti 1:18, 19.