Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Ga-esi Ghara Ịna-emefusi Ikike Eletrik na Mmanụ Ụgbọala

Otú Anyị Ga-esi Ghara Ịna-emefusi Ikike Eletrik na Mmanụ Ụgbọala

IKIKE ọkụ eletrik dị anyị mkpa iji mee ka ụlọ anyị kpere ọkụ ma ọ bụ jụọ oyi. Mmanụ e ji akwọ ụgbọala dị anyị mkpa iji na-akwọ ụgbọala na iji mee ihe ndị ọzọ anyị na-eme kwa ụbọchị. Ma, ọtụtụ ndị taa anaghị enweta ihe ndị a.

Otu nwoke onye Saụt Afrịka aha ya bụ Gary sịrị na “otú ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala si arị elu” na-enye ya nsogbu n’obi. Otu nwaanyị onye Filipinz aha ya bụ Jennifer, na-echegbu onwe ya n’ihi na “iwe ọkụ eletrik enweghịzi ihe ọ bụ.” Fernando, onye El Salvadọ kwuru na “ihe na-enye ya nsogbu n’obi bụ otú ikike eletrik na mmanụ ụgbọala sị na-emetọ gburugburu ebe obibi anyị.” N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ebe ndị e si enweta ihe ndị a na-emetọ gburugburu ebe obibi.

Mmadụ nwere ike ịna-ajụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi merie nsogbu ndị a?’

Anyị niile nwere ike ikpebi na anyị agaghị na-emefusị ọkụ eletrik na mmanụ ụgbọala. Ime otú ahụ ga-aba ezigbo uru. Ọ ga-ebelata ego ole anyị na-akwụ maka ha, nye aka cheekwa gburugburu ebe obibi anyị, meekwa ka ọ gharazi ịna-adị ụkọ.

Ugbu a, ka anyị leba anya n’ebe atọ anyị nwere ike isi selata aka n’imefusi ikike si n’eletrik na mmanụ ụgbọala: n’ụlọ anyị, mgbe anyị na-eme njem, nakwa n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị.

N’ỤLỌ ANYỊ

Na-agbalata ihe ndị na-eme ka ụlọ kpere ọkụ ma ọ bụ jụọ oyi. Otu nchọpụta e mere na Briten gosiri na mmadụ ịgbalatatụ ihe ndị na-eme ka ụlọ kpere ọkụ n’oge oyi iji belatatụ okpomọkụ ya dị mma, n’ihi na ọ na-eme ka ikike eletrik mafọ. Otu onye Kanada aha ya bụ Derek kwuru, sị: “Iyiri uwe oyi kama ịgbaru ihe na-eme ka ụlọ kporo ọkụ n’isi, na-ebelatara ezinụlọ anyị ikike eletrik ọ na-efu anyị n’oge oyi.”

Ọ bụkwa eziokwu n’ihe gbasara ikike eletrik ole na-efu n’ime ka ụlọ jụọ oyi n’oge okpomọkụ. Rodolfo bụ́ onye Filipinz na-agbalata nke dị n’ụlọ ya. Gịnị mere o ji agbalata ya? Ọ sịrị: “Anyị na-ebelata ego ọ na-efu anyị, na-ebelatakwa ikike eletrik ọ na-ewe.”

Mechie windo na ụzọ ụlọ gị mgbe ọ bụla ị gbanyere ihe na-eme ka ụlọ kporo ọkụ ma ọ bụ jụọ oyi. * Anyị nwere ike ịghara ịdị na-emefusị ikike eletrik ma ọ bụrụ na anyị egbochie ikuku ọ bụla isi n’ụlọ anyị na-apụ n’èzí. Dị ka ihe atụ, ighewe ọnụ ụzọ ụlọ anyị oghe n’oge oyi ga-eme ka o wee ọtụtụ oge iji mee ka ụlọ kpere ọkụ.

Ewezụga imechi ụzọ na windo, ụfọdụ ndị na-emekwa ihe ndị ọzọ iji mee ka okpomọkụ ma ọ bụ oyi ghara isi n’ụlọ ha na-apụ. Ha etinyela windo ndị na-egbochikwu okpomọkụ na oyi nke ọma.

Tinye ọkụ ndị na-anaghị eri ikike eletrik buru ibu n’ụlọ gị. Jennifer, onye anyị kwuburu banyere ya ná mmalite kwuru, sị: “Anyị wepụsịrị ọkụ ndị ahụ na-eri ikike eletrik buru ibu, jiri ndị nke na-eri obere ikike eletrik dochie ha.” Ọ bụ eziokwu na ụdị ọkụ ndị a na-adị ọnụ karịa ndị nke ọzọ, ma, ego a na-akwụfu n’ụgwọ eletrik na-ebelata.

MGBE ANYỊ NA-EME NJEM

O kwe mee, na-eji ụgbọala ọhaneze eme njem. Nwoke onye Briten aha ya bụ Andrew kwuru, sị: “M na-eji ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ ígwè m aga ọrụ mgbe ụfọdụ.” Akwụkwọ aha ya bụ Energy: What Everyone Needs to Know kwuru, sị: “Mmanụ ụmụ obere ụgbọala na-eri maka otu onye ọ bụla o bu, na-eji okpukpu atọ karịa nke ụgbọala bọs ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè ndị na-adịghị agate aka na-eri n’isi otu onye ọ bụla o bu.”

Hazie njem gị nke ọma. Nhazi dị mma nwere ike ime ka i belata njem ole ị ga-eme. Nke a ga-ebelata mmanụ ụgbọala ole njem ndị ahụ gaara eri, ego amafọkwara gị.

Jethro, onye bi na Filipinz na-ekpebi otú mmanụ ọ ga-agbanye n’ụgbọala ya n’ọnwa ga-aha. Ọ sịrị: “Ọ na-eme ka m na-ahazi njem ndị m ga-eji ụgbọala mee nke ọma.”

IHE NDỊ Ị NA-EME KWA ỤBỌCHỊ

Selata aka n’isi mmiri ọkụ. Otu nchọpụta e mere gosiri na “n’Ọstrelia, e kee ikike eletrik na-abata n’ụlọ ọ bụla ụzọ anọ, ihe karịrị otu ụzọ n’ime ya bụ mmiri ọkụ ka e ji ya esi.”

Ebe ọ bụ na isi mmiri ọkụ na-eri ikike eletrik buru ibu, iselata aka n’isi mmiri ọkụ ga-eme ka ihe katụ mma. Otu nwoke onye Saụt Afrịka aha ya bụ Victor kwuru, sị: “Anyị na-agbalị ike anyị iji hụ na anyị belatara mmiri ọkụ anyị na-eji asa ahụ́.” Otu onye sayensị aha ya bụ Steven Kenway kwuru, sị: ‘Iselata aka ná mmiri ọkụ na-aba ezigbo uru, n’ihi na ọ na-egbubilata ikike eletrik na mmiri ọ na-ewe iji sie ya. Ọ na-ebelatakwa ihe ọ na-efu ụlọ ọrụ na-enye ikike eletrik na mmiri iji mepụta ha, na-emekwa ka ego mafọrọ ezinụlọ dị iche iche.’

Gbanyụsịa ihe niile. Gbanyụọ ọkụ, tiivi, kọmputa na ngwá elektrọniks ndị ọzọ. Ọtụtụ n’ime ihe ndị a nwekwara ike ịka na-amịrị ikike eletrik mgbe a gbanyụchara ha. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ kacha mma ịkwụpụcha ha n’ọkụ. Fernando, anyị kwuburu gbasara ya kwuru, sị: “M na-agbanyụcha ọkụ niile, kwụpụchaakwa ngwá elektrọniks m niile n’ọkụ mgbe ọ na-enweghị ihe m ji ha eme.”

Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ike ime ihe ọ bụla gbasara ego ole ikike eletrik ma ọ bụ ego ole mmanụ ụgbọala na-ada, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọ na-akpata na gburugburu ebe obibi anyị, ma, anyị nwere ike ikpebi ịghara ịna-emefusi ha. Ihe a ka ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-agbalị ime. Ọ bụ eziokwu na ime ihe a chọrọ mgbalị na inwe nhazi dị mma, ma, ọ na-aba ezigbo uru. Otu nwaanyị onye Meksiko aha ya bụ Valeria kwuru, sị: “Ego na-amafọrọ m, m na-enyekwa aka echekwa gburugburu ebe obibi anyị.”

^ para. 10 Gbalịa ka ị na-eme ihe niile ndị rụrụ ihe na-eme ka ụlọ kpere ọkụ ma ọ bụ jụọ oyi i tinyere n’ụlọ gị kwuru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha kwuru ka e mepee ụzọ ma ọ bụ mepee windo mgbe ha na-arụ ọrụ iji na-ewepụ ikuku ụfọdụ.