MAKA NDỊ NA-ETO ETO
9: Chọpụta Ụdị Onye Ị Bụ
IHE Ọ PỤTARA
Ọ bụghị naanị aha mmadụ na otú onye ahụ dị ka e ji amata onye ọ bụ. A na-ejikwa ihe mmadụ ji kpọrọ ihe, ihe ndị o kweere na otú o si akpa àgwà amata onye ọ bụ. N’eziokwu, ihe e ji amata onye mmadụ bụ bụ ihe niile gbasara onye ahụ.
IHE MERE O JI DỊ MKPA
Ị mara ụdị mmadụ ị bụ, ọ ga-eme ka ị nọgide na-eme ihe ị maara na ọ dị mma, kama imewe ihe ọ bụla ndị ọgbọ gị chọrọ ka i mee.
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Adrian kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị dị ka ihe a kpụrụ akpụ ndị na-ere uwe ji ekowe uwe. Ọ bụghị ihe ndị ahụ na-ekpebi uwe ha ga-eyi, ọ bụ onye na-ere ákwà na-ekpebi nke ọ ga-eyiwe ha.”
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Courtney kwuru, sị: “Amụtala m otú m ga-esi nọgide na-eme ihe dị mma, ma mgbe o siiri m ike ime otú ahụ. Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi m bụ ndị ọ na-abụ mụ na ha nọrọ, obi eruo m ala n’ihi na ha anaghị amanye m ime ihe m na-achọghị ime.”
IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Kwụsịnụ ịna-eme omume otú ndị oge a si eme, kama gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche.’—Ndị Rom 12:2.
IHE I NWERE IKE IME
Chọpụta ụdị mmadụ ị bụ ugbu a na ụdị mmadụ ị chọrọ ịbụ n’ọdịnihu. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọpụta ihe ndị ị na-emeta, ihe ndị ị na-anaghị emeta na ihe ndị i kweere. Otú kacha mma iji malite bụ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ.
Ihe ndị ị na-emeta: Olee nkà ma ọ bụ aka ọrụ m nwere? Olee ihe ndị m na-eme nke ọma na ha? (Dị ka ihe atụ: M̀ na-aga ihe n’oge? M̀ na-ejide onwe m? M̀ na-arụsi ọrụ ike? M̀ na-emesapụ aka?) Olee ihe ndị dị mma m na-eme?
IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA: Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike icheta ihe ndị i merela dị mma, jụọ papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ ezigbo enyi gị ka ọ gwa gị ihe ndị ị na-emeta na ihe mere o ji chee na ị na-eme nke ọma n’ihe ndị ahụ.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.
Ihe ndị ị na-anaghị emeta: Olee ebe ndị m kacha kwesị imezikwu ihe n’otú m si akpa àgwà? Olee mgbe ọ na-akacha adị m ka m mee ihe na-adịghị mma? Olee ebe ndị m kwesịrị ịna-ejidekwu onwe m?
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ bụrụ na anyị asị: ‘Anyị anaghị eme mmehie,’ anyị na-aghọgbu onwe anyị.”—1 Jọn 1:8.
Ihe ndị i kweere: Olee ihe ndị m weere ka ihe dị mma, oleekwa ihe mere m ji were ha otú ahụ? M̀ kweere na Chineke? Olee ihe ndị mere m ji kweta na Chineke dị? Olee ihe ndị m weere ka ihe na-ezighị ezi? Oleekwa ihe mere m ji were ha otú ahụ? Olee ihe ndị m kweere ga-eme n’ọdịnihu?
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ichebara ihe echiche nke ọma ga-eche gị nche, ịghọta ihe ga-echebekwa gị.”—Ilu 2:11.