IHE BAỊBỤL KWURU
The Mesaya
Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-abịa n’ụwa. Ya bịa, ọ ga-anapụta ụmụ mmadụ n’ọrịa, ahụhụ, na ọnwụ. Ọ̀ bụ Jizọs Kraịst bụ Mesaya ahụ?
Olee otú ndị mmadụ ga-esi mata onye bụ́ Mesaya?
Baịbụl buru amụma na Mesaya ma ọ bụ Kraịst ga-arụ ụzọ ọrụ abụọ, ma ọ gaghị abụ otu mgbe. Ya rụchaa nke mbụ, ogologo oge ga-aga tupu ya arụọ nke abụọ. * Ka o nwee ike ịrụ ọrụ nke mbụ ahụ, ọ ga-abụ mmadụ. Ndị dere Baịbụl buru amụma gbasara ụdị ndụ ọ ga-ebi ma ọ bịa n’ụwa nakwa otú ọ ga-esi jee ozi ya ka ndị mmadụ nwee ike ịmata onye ọ bụ. Ọ bụ “ịgba àmà banyere Jizọs” bụ isi ihe mere e ji buo amụma ndị dị na Baịbụl.—Mkpughe 19:10.
Ihe niile Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa gosiri ihe ọ ga-eme ma ọ malite ịchị ụwa. N’oge ahụ, ọ ga-eme ya n’ụwa niile
IHE BAỊBỤL KWURU
Mesaya ga-esi . . .
-
n’agbụrụ Eze Devid.—Aịzaya 9:7; Luk 3:23-31. *
-
A ga-amụ ya na Betlehem.—Maịka 5:2; Luk 2:4-7.
-
Ọ ga-eji obi umeala na-ekwusa “ozi ọma.”—Aịzaya 61:1; Luk 4:43.
-
Ndị mmadụ ga-eleda ya anya, o nweghịkwa ihe ha ga-eji ya kpọrọ.—Aịzaya 53:3; Matiu 26:67, 68.
-
A ga-eji maka mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ nyefee ya n’aka ndị iro ya.—Zekaraya 11:12, 13; Matiu 26:14, 15.
-
A ga-ebo ya ebubo ụgha, maakwa ya ikpe ọnwụ, ma ọ gaghị atụpụ ọnụ.—Aịzaya 53:6, 7; Matiu 27:12-14.
-
A ga-egbu ya otú e si egbu “nwa atụrụ” e ji achụ àjà. Ọ ga-ebupụkwa mmehie ụmụ mmadụ ma mee ka ha na Chineke dị ná mma.—Aịzaya 53:7; Jọn 1:29, 34, 36.
-
A ga-egbu ya, ma a gaghị agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla.—Abụ Ọma 34:20; Jọn 19:33, 36.
-
A ga-eli ya n’ili ndị ọgaranya.—Aịzaya 53:9; Matiu 27:57-60.
-
Ọ ga-ebili n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ.—Matiu 16:21; 28:5-7.
Amụma a niile nakwa ọtụtụ amụma ndị ọzọ mezuru n’isi Jizọs. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. O si otú a mee ka anyị ghọtakwuo na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, meekwa ka obi sie anyị ike na nkwa Baịbụl kwere na ọ ga-eme ihe ndị a n’ụwa niile ga-emezu. (Luk 7:21-23; Mkpughe 21:3, 4) Mgbe Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ gara nọdụ ala “n’aka nri” Chineke, na-eche ka oge ruo ka ọ rụchaa ọrụ ya.—Abụ Ọma 110:1-6.
“Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke nwoke a na-eme?”—Jọn 7:31.
Olee otú Mesaya ga-esi rụchaa ọrụ ya?
Oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu chere na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom ma chịwa ha. (Ọrụ Ndịozi 1:6) Ọ bụ ka oge na-aga ka ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ọ ga-anọ n’eluigwe rụchaa ọrụ ya mgbe ọ ghọrọla mmụọ ozi dị ike nke e nyerela ikike ịchị eluigwe na ụwa.—Matiu 28:18.
IHE BAỊBỤL KWURU
Mgbe Mesaya ga-arụ ọrụ nke abụọ ahụ, . . .
-
Ọ ga-abụ Eze Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-achị ụwa niile.—Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15.
-
Ọ ga-emere ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ihe ọma.—Jenesis 22:17, 18; Abụ Ọma 72:7, 8.
-
Ọ ga-eme ka ‘ọtụtụ mba na ndị eze ha kụja’ mgbe ọ ga-ebibi ha maka na ha na-emegide ya.—Aịzaya 52:15; Mkpughe 19:19, 20.
-
Ọ ga-eme ka “oké ìgwè mmadụ” na-erubere Chineke isi baa n’ụwa ọhụrụ.—Mkpughe 7:9, 10, 13-17.
-
Ọ ga-eso Chineke kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ebiri n’ụwa e mere ka ọ bụrụ Paradaịs.—Luk 23:43; Jọn 5:21, 28, 29.
-
Ọ ga-akụziri ndị ọ ga-achị otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo.—Aịzaya 11:1, 2, 9, 10.
-
Ọ ga-ewepụ mmehie, bụ́ ihe kpatara ọrịa na ọnwụ.—Jọn 1:29; Ndị Rom 5:12.
-
Ọ ga-ebibi ọrụ Setan kpamkpam ma mee ka mmadụ niile na Jehova Chineke dịghachi ná mma.—1 Ndị Kọrịnt 15:25-28; 1 Jọn 3:8.
Ọ bụ Jizọs rụrụ ọrụ nke mbụ ahụ e kwuru na Mesaya ga-arụ. Ọ ga-arụkwa nke abụọ a. Onye ọ bụla ma ihe kwesịrị ileru anya ala mụọ gbasara Jizọs n’ihi na o kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.”—Jọn 14:6.
““N’oge ọchịchị ya, onye ezi omume ga na-ama pokopoko, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị. Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị . . . ruo ná nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 72:7, 8.