Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O nweghị Onye Ga-erite Ọrịa Ná Nri n’Oge Na-adịghị Anya

O nweghị Onye Ga-erite Ọrịa Ná Nri n’Oge Na-adịghị Anya

O nweghị Onye Ga-erite Ọrịa Ná Nri n’Oge Na-adịghị Anya

Ọ BỤ eziokwu na e nwere ihe ndị ị ga-eme ka ị ghara irite ọrịa ná nri, o nwere ọtụtụ ihe ị na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, o nweghị otú ị ga-esi marachaa ihe niile gara ná nri ị chọrọ ịzụ. O nwere ike bụrụ ná mba ọzọ ka e mere ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na kemikal ọjọọ a gbanyere n’ikuku, ná mmiri, ma ọ bụkwanụ n’ala metụrụ na ya tupu ị zụrụ ya.

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na mba niile kwesịrị ịgbakọta aka leba anya n’ihe gbasara ọrịa ndị a na-erite ná nri. Ihe mere ha ji kwuo ya bụ na nsogbu a zuru ụwa ọnụ.

Ebe ọ bụ na ihe a bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ọtụtụ ndị nwere ike ịna-eche ihe mere anyị ji kwuo na n’oge na-adịghị anya, o nweghịzi onye ga na-erite ọrịa ná nri. Ihe mere anyị ji kwuo ya bụ na ‘Jehova, Onyenwe ụwa dum,’ kwere nkwa na ya ga-edozi nsogbu a. (Jọshụa 3:13) Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịsị na ebe ọ bụ Chineke kere nri ndị anyị na-eri, ọ bụ yanwa ka ọrịa ndị anyị na-erite ná nri si n’aka. Weregodị ya na e nwere onye sichara nri bunye mmadụ ka ọ gaa bunye onye ọzọ, onye ahụ o bunyere ya etinye ihe ná nri ahụ. Ọ bụrụ na onye ga-eri ya erie ya rite ọrịa, ị̀ ga-asị na o si onye siri nri ahụ n’aka? Ị manụ na o sighị ya n’aka.

Otú ahụkwa, ụmụ mmadụ ekwesịghị ịta Chineke ụta maka ọrịa ha na-erite ná nri. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke kere ala anyị a ka ọ na-emepụta nri ndị dị mma. Ọ bụzi ụmụ mmadụ ji aka ha na-emebi nri ọma ala na-emepụta. Ma, Chineke kwere nkwa na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

E nwedịrị ọtụtụ ihe Chineke merela iji gosi na ya achọghị ka ụmụ mmadụ na-erite ọrịa ná nri. Baịbụl kwuru na mgbe Chineke kere ụwa, o kere osisi ndị ‘dị mma ile anya, dịkwa mma oriri.’ (Jenesis 2:9) Mgbe ụmụ mmadụ bidokwara ịrịa ọrịa, Jehova gwara ha ihe ndị ha kwesịrị ime ka nri ha na-eri ghara ịna-akpatara ha ọrịa.—Gụọ igbe e dere “Ihe Ọ Ga-abụ Mmadụ Na-eme Ya Aghara Irite Ọrịa ná Nri.”

Olee ụdị nri Chineke chọrọ ka anyị na-eri? Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] na-eme ka ahịhịa ndụ puoro anụmanụ, meekwa ka ihe ọkụkụ puo bụ́ nke ga-abara ụmụ mmadụ uru, ka e wee si n’ala nweta ihe oriri, na mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ, iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ, nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.” (Abụ Ọma 104:14, 15) Baịbụl kwukwara na Chineke kere ‘anụ ọ bụla na-agagharị agagharị nke dị ndụ ka ọ bụrụ ihe oriri.’—Jenesis 9:3.

Baịbụl kwuru otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “[Chineke] ga-emekwa ka mmiri zooro mkpụrụ ị kụrụ n’ala, nyekwa gị ihe oriri dị ka mkpụrụ nke ala, bụ́ nke ga-ama abụba, gbaakwa mmanụ. Anụ ụlọ gị ga-ata nri n’ụbọchị ahụ n’ebe ịta nri nke sara mbara.” (Aịzaya 30:23) N’eziokwu, oge na-abịa mgbe ụmụ mmadụ na-agaghịzi erite ọrịa ná nri. Oge ahụ jikwa ọsọ na-abịa.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Chineke kwere anyị nkwa na nri ga-abụ atụrụ tawa na Paradaịs

[Igbe dị na peeji nke 8]

IHE Ọ GA-ABỤ MMADỤ NA-EME YA AGHARA IRITE ỌRỊA NÁ NRI

N’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel iwu. Iwu ndị ahụ nyeere ha aka ka ha ghara irite ọtụtụ ọrịa ná nri. Legodị ụfọdụ n’ime ha:

● A gwara ha ka ha ghara imetụ arịa ọ bụla aka ma o metụ ozu. Iwu ahụ kwuru, sị: “A ga-asụnye arịa ọ bụla a na-eji eme ihe n’ime mmiri, ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede, mgbe ahụ ọ ga-adị ọcha.”—Levitikọs 11:31-34.

● Ha agaghị eri anụ nwụụrụ onwe ya. E dere, sị: “Unu erila anụ ọ bụla nwụrụ anwụ.”—Diuterọnọmi 14:21.

● A gwara ha ka ha ghara iri nri nọtere aka. Iwu ahụ sịrị: ‘E nwere ike iri nke fọdụrụ na ya echi ya. Ma ihe fọdụrụ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.’—Levitikọs 7:16-18.

O juru otu dọkịta aha ya bụ́ A. Rendle Short anya mgbe ọ gụrụ iwu ndị a magburu onwe ha Chineke nyere mba Izrel. Iwu ndị a e nyere ha, bụ́ ndị a na-enyeghị mba ndị ọzọ e nwere n’oge ahụ, mere ka ha ghara ịna-eritekarị ọrịa ná nri.