Ịkwụwa Aka Ọtọ Bara Uru
Ịkwụwa Aka Ọtọ Bara Uru
“Ihe oriri e ji ụgha nweta na-atọ mmadụ ụtọ, ma n’ikpeazụ, ajịrịja nkume ga-eju ya ọnụ.”—Ilu 20:17.
Ọ̀ BỤ eziokwu na mmadụ na-akwụwa aka ọtọ, ọ gaghị ahụ tụrụ rachaa? Ọ bụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe anaghị agaziri onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ anaghị atụkwasị ụdị onye ahụ obi. Ị manụ na ụwa ga-ara mmadụ ahụ́ ma ndị ọzọ anaghị atụkwasị ya obi.
Uru Onye A Tụkwasịrị Obi Na-erite
Ọ bụrụ na ndị mmadụ ma na ị na-akwụwa aka ọtọ, ihe ọ bụla ị na-eme ga na-aga nke ọma. O nwedịrị ike ị gaghị ama na ọ bụ ya mere ihe ji na-agaziri gị. Ì chetara Franz, onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ? Ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ mere ihe ji gaziwere ya n’ụlọ ọrụ ha. O kwuru, sị: “Mgbe m malitere ọrụ, ndị m na-arụrụ ọrụ siiri m ọnyà aghara aghara iji mara ma m̀ na-akwụwa aka ọtọ. Amaghịdị m ihe na-aganụ mgbe ahụ. Ma, ọnyà ha amataghị m, emechakwara m chọpụta na ha siiri m ọnyà. Mgbe ha chọpụtara na m na-akwụwa aka ọtọ, ha nyekwuru m ọrụ ndị m ga na-arụ. Ka oge na-aga, ha hapụrụ m ka m jiri aka m na-eme ihe ụfọdụ. Ha bulikwara m n’ọkwá. Ama m na e nwere ndị ọzọ ka m mara ọrụ a m na-arụ, nweekwa ndị nke nwere ọgụgụ isi karịa m. Ma, a gaghị enye ha ya n’ihi na a tụkwasịrị m obi.”
Emela Ihe Ga-emecha Ghọ Gị Ahịa
N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru okwu gbasara ọchụnta ego aha ya bụ David. Nwoke ahụ kwuru, sị: “M hụ ka ndị mmadụ na-egwu ndị ọzọ wayo, na-ekpoju akpa ha, m na-agwa onwe m sị, ‘Onye ọ bụla ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ, ya abụghị taa, ọ bụrụ echi.’ Ya bụ, mee elu mee ala, onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ ga-eri ihe ya na ya so ala. E nwere ọtụtụ ọrụ ndị e wetaara anyị, bụ́ ndị gaara eme ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ. Ma, anyị ekweghị anara ha. Ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị naara ọrụ ndị ahụ mechara dakpọọ, a kpụpụkwa ụfọdụ ndị ọrụ ha ụlọikpe. O nweghị ihe mere ụlọ ọrụ anyị n’ihi na anyị kwụwara aka ọtọ.”
O nwere otu nwoke bi n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Afrịka. Aha ya bụ Ken. Mgbe ọ chọrọ imepe ebe ọ ga-anọ na-azụ ehi, ọ gara mee ihe niile iwu kwuru. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara agakwuru ndị ọrụ gọọmenti nye ha aka azụ, ha ahapụ ya ka ọ na-atụbata ihe ndị o ji azụ ehi. Ọ garaghịkwa na-akwụ ụgwọ a na-akwụ maka ịtụbata ihe n’obodo. Ma, o meghị otú ahụ. Nwoke a kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-azụ ehi n’obodo anyị na-enye ndị ọrụ gọọmenti aka azụ. O were anyịnwa afọ iri tupu anyị emechaa ihe niile iwu obodo kwuru na a ga-eme ma mmadụ chọọ imepe ebe a na-anọ azụ ehi. Mbọ niile a anyị gbara baara anyị uru n’ihi na ndị ahụ a na-enye aka azụ ekweghị ahapụ ndị niile na-enye ha aka azụ. Ha nọ na-enye ha nsogbu ka ha na-ewetekwu ego.”
Ọ Ga-abara Gị Uru ma Ihe Siwere Gị Ike
Ọ bụrụ na ị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ị na-eme, ihe abịa siwere gị ike, o nwere ike ịdị gị ka igwu wayo ọ̀ ga-akara gị mma. Ma, buru n’obi na ọ bụ mgbe ahụ ihe siwere ike ka ndị na-akwụwa aka ọtọ na-ejikarị ahụ uru àgwà ọma ha bara.
Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwoke bi n’Amerịka aha ya bụ Bill. Ọ na-arụrụ ndị mmadụ ụlọ. Mgbe ihe siwere ike, nke na ego adịghị ndị mmadụ ji ewu ụlọ, nwoke a enweghịzi ọrụ. O kwuru, sị: “Ihe siiri ọtụtụ ndị na-enyekarị anyị ọrụ ike. Ọtụtụ n’ime ha jidekwara anyị ezigbote ụgwọ. Mgbe ihe bịara kpọchie nke a na-amaghị otú a ga-eme
ya, agakwuuru m otu n’ime ndị na-arụ ụdị ọrụ anyị na-arụ, gwa ya ka o wee ụfọdụ n’ime anyị n’ọrụ. Ọ raghị ahụ́, ya ewee mụ na ọtụtụ ụmụ ọrụ m n’ọrụ. Ọ gwara m na ụwa niile ma na m na-arụ ọrụ nke ọma, na-akwụwakwa aka ọtọ.”Ndị niile a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a bụcha Ndịàmà Jehova. N’ihe niile ha na-eme ná ndụ, ha na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru. Ị̀ chọpụtara na ihe mere ihe ji gaziere ha bụ maka na ha na-akwụwa aka ọtọ? Ịkwụwa aka ọtọ emeghị ka ụwa siere ha ike.
Akụkọ ndị a emeghịnụ ka igwu wayo na inye aka azụ ghara ịna-enye ndị mmadụ ego. Ma, ihe e ji ama onye ihe gaziiri ọ̀ bụ naanị ego ọ kpatara?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ọ bụrụ na ndị mmadụ ma na ị na-akwụwa aka ọtọ, ihe ọ bụla ị na-eme ga na-aga nke ọma
[Foto dị na peeji nke 7]
“Ọ gwara m na ụwa niile ma na m na-arụ ọrụ nke ọma, na-akwụwakwa aka ọtọ.”—Bill, o bi n’Amerịka