Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ụmụaka towe, ọ na-esiri ọtụtụ ndị nne na nna ike ịzụ ha. Otú ihe na-eme ha n’oge ahụ si agba ndị mụrụ ha gharịị ka o sikwa agba hanwa gharịị. Ma, olee otú ị ga-esi akụziri nwa gị ka ọ na-akpa ezigbo àgwà ugbu a ọ na-eto eto? Legodị ihe ndị nne na nna ụfọdụ kwuru.

ÀGWÀ HA

“Mgbe nwa m nwoke dị obere, ọ na-ege ntị na ndụmọdụ ọ bụla m nyere ya, ọ naghịkwa agbagha ya. Ma, mgbe ọ gafere afọ iri na abụọ, o bidoro na-agbagha ihe m na-agwa ya. M gwazie ya ihe, ya ajụpagide m ajụjụ, m kwusiekwa ike, ya asị m na otú m si gwa ya okwu adịghị mma.”—Frank, Kanada.

“Nwa m nwoke anaghịzi akọrọ m nsogbu ya otú o sibu akọrọ m. Ọ gwụkwala ma m̀ mepere ọnụ jụọ ya tupu ọ kọọrọ m ya. Ọ na-ara ya ahụ́ imepe ọnụ kwuo nsogbu ya. Ma, ọ ga-emecha kwuo ya, kama ọ ga-adị ka ihe e siri n’ọkụ.”—Francis, onye bi n’Ọstrelia.

“Ọ dị ezigbo mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na-enwere ụmụ ha ndidi. Mgbe ụfọdụ, ụmụ anyị mee ihe na-adịghị mma, anyị na-abara ha ezigbo mba. Ma, ọ na-aka mma imeda obi ala gwa ha okwu.”—Felicia, onye bi n’Amerịka.

IKWURỊTA OKWU

“O nwere mgbe ọ na-abụ m na-agwa nwa m nwaanyị ihe na-adịghị mma o mere, ya agwawa m ihe mere o ji mee ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-emecha ka à ga-asị na m na-achọkarị ihe m ga-asị na o mejọrọ. Ya mewe otú ahụ, ihe m na-emezi bụ ịgwa ya na m hụrụ ya n’anya nakwa na m na-achọ ka ihe gaziere ya.”—Lisa, onye bi n’Amerịka.

“Mgbe ụmụ m dị obere, ha na-akọrọ m ihe ọ bụla na-enye ha nsogbu n’obi. Ọ naghị esiri m ike ịma ihe dị ha n’obi. Ma, ugbu a, ihe m na-eme ka ha nwee ike ịgwa m ihe dị ha n’obi bụ ịkwanyere ha ùgwù na imesi ha obi ike na m ghọtara ihe ha na ya na-alụ.”—Nan-hi, onye bi na Koria.

“Ihe ndị nne na nna kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa ụmụ ha ihe ndị ha na-achọghị ka ha na-eme, kama, ha na ha kwesịrị ịnọdụ ala kwurịta ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha na-akọrọ anyị ihe dị ha n’obi, anyị kwesịrị ịna-ege ha ntị ma ha na-ekwu okwu, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ihe ha na-ekwu adịghị anyị mma.”—Dalila, onye bi na Brazil.

“M chọọ ịgwa nwa m na ihe o mere adịghị mma, m na-agwa ya ya ebe ndị ọzọ na-agaghị anụ ya.”—Edna, onye bi na Naịjirịa.

“Mgbe ụfọdụ, nwa m nwoke kọwara m ihe, mụ emere ihe ọzọ tinye isi, uche m agaghịzi adịcha n’ihe ọ na-ekwu. Echere m na ọ bụ ya mere ọ naghị achọcha ịkọrọ m ihe. M ga-agbalị na-ege ya ntị nke ọma mgbe ọ bụla ọ na-agwa m okwu, ka o nwee ike ịna-akọrọ m ihe dị ya n’obi.”—Miriam, onye bi na Meksiko.

ỊNỌRỌ ONWE HA

“Obi anaghị aka m ịhapụ ụmụ m ka ha na-eme ihe ha chọrọ ime. Nke a emeekwala ka mụ na ha na-ese okwu. E nwere mgbe m kpọrọ ha ka mụ na ha kwurịta ya. M gwara ha ihe mere obi anaghị aka m, hanwa agwakwa m ihe mere ha ji chọọ ka m na-enyetụ ha ohere. Mụ na ha kwekọrịtara na e nwere ihe ndị m ga-ahapụ ha ka ha na-ekpebiri onwe ha, nweekwa ndị nke ha agaghị na-ekpebiri onwe ha.”—Edwin, onye bi na Gana.

“O nwere mgbe nwa m nwoke kwuru na ya chọrọ ịzụ ọgba tum tum. Ebe ọ bụ na achọghị m ka ọ zụọ ya, ebidoro m ịbara ya mba, na-agwa ya ihe niile na-adịghị mma banyere ọgba tum tum, ekweghịkwa m ka o tinye ọnụ. Ihe ahụ m mere kpasuru ya iwe, ya agbazie isi akwara na ya ga-azụrịrị ọgba tum tum. Ekpebiri m iji ụzọ ọzọ gwa ya ihe mere o kwesịghị ịzụ ya. Agwara m ya ka ọ chọpụta ihe niile gbasara ọgba tum tum, ma nsogbu inwe ya nwere ike ịkpatara mmadụ ma ego ọ na-efu onye nwe ya ma ihe ọ ga-ewe onye ahụ ịgbata akwụkwọ niile iwu kwuru ka ndị nwere ọgba tum tum gbata. Agwakwara m ya ka ọ kọọrọ ụfọdụ ndị dimkpa nọ n’ọgbakọ anyị ihe ahụ ọ chọrọ ime. Ihe a mere ka m mata na kama ịbachi nwa m ọnụ, ọ ka mma ịgwa ya ka o kwuo ihe dị ya n’obi. Ọ bụrụ na m na-eme otú ahụ, ọ ga-adịrị ya mfe ịghọta ihe m na-agwa ya.”—Hye-young, onye bi na Koria.

“Anyị na-agwa ụmụ anyị ihe ndị ha na-agaghị eme. Ma, ka ha na-eto, anyị na-ahapụ ha ka ha na-eme ihe ụfọdụ. Ọ bụrụ na ha anaghị eji ohere ahụ anyị nyere ha eme otú o si masị ha, anyị na-enyekwu ha ohere. Anyị anaghị akpa ha ahụ́, anyị na-emekwa ka ha mara na anyị atụghị ha mkpọrọ. Ma, ha jiri ohere anyị nyere ha gwurie egwu, ha na-eri ihe ya na ya so ala.”—Dorothée, onye bi na Frans.

“Anaghị m eme m gwa ụmụ m ihe ha na-ekwesịghị ime, mụ emechaa hapụ ha ka ha mee ihe ahụ. Ma, ọ bụrụ na ha na-eme ihe m gwara ha, m na-ahapụ ha ka ha mee ihe ụfọdụ ha chọrọ ime. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe m na-ahapụ ha ka ha nọtụkwuo ebe ha gara karịa otú ha na-anọbu. Ma, ha jiri ohere m nyere ha gwurie egwu ihe karịrị otu ugbo, ha erie ihe ya na ya so ala.”—Il-hyun, onye bi na Koria.

“Ọ bụrụ na onye were mmadụ n’ọrụ achọpụta na onye o were n’ọrụ na-erubere ya isi ma na-adị uchu n’ọrụ, ọ ga na-enyekwu ya ohere ime ihe ụfọdụ. Otú ahụ ka anyị na-emekwa nwa anyị nwoke. Ọ bụrụ na ọ na-erubere anyị isi ma ghara iji ohere ndị anyị na-enye ya na-egwuri egwu, anyị ga-enyekwu ya ohere ka ọ na-eme ihe ndị ọ chọrọ ime. Ọ makwa na o jiri ohere anyị nyere ya gwurie egwu, anyị agaghịzi ahapụ ya ka ọ na-eme ihe ndị anyị na-ahapụbu ya ka ọ na-eme otú ahụ onye were mmadụ n’ọrụ ga-eme ma onye o were n’ọrụ jiri ohere o nyere ya gwurie egwu.”—Ramón, onye bi na Meksiko.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

“Zulite nwatakịrị n’ụzọ ziri ezi ọ ga-eso, mgbe o tolitere ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

IHE NDỊ MERE N’EZINỤLỌ ỤFỌDỤ

“Ịzụ Ụmụ Na-eto Eto Na-atọ Ezigbo Ụtọ”

Joseph: Ada m nwaanyị na osote ya ka na-eto eto, amakwa m na ọ dị ezigbo mkpa ịna-ege ha ntị n’olu. Ihe na-eme ka mụ na ha na-ekwurịta okwu n’enweghị nsogbu bụ na m na-akwanyere ha ùgwù mgbe m na-agwa ha okwu, na-ekwetakwa ebe m mejọrọ. Aga m asị na ihe Baịbụl na-akụziri anyị mere ka ịzụ ụmụ na-eto eto na-atọ ezigbo ụtọ.

Lisa: Mgbe ada m nwaanyị gafere afọ iri na abụọ, achọpụtara m na m kwesịrị ịnọ ya nso karịa mgbe mbụ. N’oge ahụ, mụ na ya na-anọ ọtụtụ mgbe kpaa nkata, m na-egekwa ya ntị ma na-agwa ya na m hụrụ ya n’anya. Mụ na di m gwakwara ụmụ anyị ka ha ghara ịtụ ụjọ ịgwa anyị ihe ọ bụla na-enye ha nsogbu n’obi nakwa na anyị ga-echebara ihe ha kwuru echiche. M na-agbalị ime ihe e kwuru na Jems 1:19, bụ́ ebe kwuru na anyị kwesịrị ịbụ ‘ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, ndị na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’

Victoria: Mama anyị bụ ezigbote enyi m. Ahụtụbeghị m onye dị ka ya n’ụwa. Otú o si eme anyị ka o sikwa eme ndị ọzọ. Mama anyị bụ nnọọ ọpụrụiche.

Olivia: Papa anyị anaghị eji anyị egwu egwu, ọ bụghịkwa onye aka ntagide. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka, ma mgbe anyị nwere ma mgbe anyị na-enweghị. Papa anyị na-eji ihe akpọrọ ihe, ma, ọ na-ewepụta oge ka anyị na ya tụrụtụ ndụ. Ọ bụ nnọọ ọpụrụiche.

“E Nwere Ọtụtụ Ihe Ndị Anyị Na-eme Na-eme Anyị Obi Ụtọ”

Sonny: Ụmụ m nwee ihe na-enye ha nsogbu n’obi, anyị na ha na-anọdụ ala kwurịta ya. O nweghị ihe anyị na-ezoro ibe anyị, anyị na-ejikwa ihe Baịbụl kwuru ekpebi ihe anyị ga-eme ná nsogbu nke ọ bụla. Mụ na nwunye m na-agba mbọ ịhụ na ndị ha na ụmụ anyị na-akpa bụ ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ. Ndị enyi anyị bụ ndị enyi ha, ndị enyi ha bụkwa ndị enyi anyị.

Ynez: O nweghị onye na-anọ nkịtị n’ezinụlọ anyị, anyị na-emekọkwa ihe ọnụ. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị anaghị eji ịga ozi ọma egwu egwu, ezinụlọ anyị na-amụkọ Baịbụl ọnụ, onye nke ọ bụla na-ewepụtakwa oge mụọ ihe n’onwe ya. Anyị na-agakwa enye aka rụọ ọrụ ụfọdụ ndị dị ka ịga nyere ụmụnna anyị ndị ọdachi dakwasịrị aka na ịga soro rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe Ndịàmà Jehova na-anọ amụ ihe. N’agbanyeghị na anyị anaghị anọ nkịtị, anyị na-ewepụta oge anyị ji atụrụ ndụ. E nwere ọtụtụ ihe ndị anyị na-eme na-eme anyị obi ụtọ.

Kellsie: Papa anyị na-ege mmadụ ntị nke ọma, ọ naghịkwa eme onwe ya onwe ya. Mama anyị na-ege m ntị mgbe ọ bụla m ji nsogbu m bịakwute ya ma ọ bụkwanụ mgbe ọ bụla m chọrọ onye mụ na ya ga-akpa nkata.

Samantha: Mama anyị na-eme m ka àkwá ugo, ọ hụrụ m n’anya, o jighịkwa m egwu egwu. Mgbe ụfọdụ, ọ naghịdị ama na ọ bụ otú o si eme m. Ọ na-ege m ntị ma m gwawa ya okwu, ọ na-echebakwara mkpa m echiche. Agaghị m achọ ka ihe ọ bụla mebie adịm ná mma mụ na ya.

[Foto]

Ezinụlọ Camera: Joseph, Lisa, Victoria, Olivia, na Isabella

Ezinụlọ Zapata: Kellsie, Ynez, Sonny, na Samantha

[Foto dị na peeji nke 22]

Ndị nne na nna nwere ike ịhapụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe ụfọdụ, ma, ha kwesịkwara ime ka ha mata ihe ndị ha na-ekwesịghị ịna-eme