Egbugbere Ọnụ Gị Ọ̀ Bụ “Arịa Dị Oké Ọnụ Ahịa”?
Egbugbere Ọnụ Gị Ọ̀ Bụ “Arịa Dị Oké Ọnụ Ahịa”?
● Eze Izrel oge ochie bụ́ Sọlọmọn dere, sị: “Ọlaedo dị, nkume kọral dịkwa n’ụba; ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ arịa dị oké ọnụ ahịa.” (Ilu 20:15) Kemgbe ụwa, e ji ọlaedo kpọrọ oké ihe, n’oge Sọlọmọn na-achị, e jikwa nkume kọral kpọrọ ihe. Ma, egbugbere ọnụ anyị nwere ike ịdị oké ọnụ ahịa karịa ha abụọ. N’otú ole? Ọ bụghị otú ọ dị ma a na-ele ya anya ga-eme ka ọ dị oké ọnụ ahịa, kama, ọ bụ ihe ọ na-ekwu.
Egbugbere ọnụ dị oké ọnụ ahịa na-ekwu ihe dị mma, ihe ga-eme mmadụ obiọma na ihe ga-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. “Egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma” na-ekwu eziokwu banyere Chineke, eziokwu ndị ahụ dịkwa na Baịbụl. N’eziokwu, Baịbụl na-eme ka anyị nwee amamihe, ọ na-agwakwa anyị eziokwu banyere Onye kere anyị. Baịbụl nwekwara ndụmọdụ ndị magburu onwe ha, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ná ndụ.—Jọn 17:17.
Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị anaghị eji egbugbere ọnụ ha ekwu ihe bara uru, kama, ha na-eji ya ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-ekwu na ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata n’ụwa taa si Chineke n’aka. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime ha si ụmụ mmadụ n’aka. Ilu 19:3 kwuru, sị: “Ụfọdụ mmadụ na-emerụ onwe ha arụ site n’omume nzuzu ha; ha mesịa, ha malite ịta Yawe ụta.”—Bible Nsọ Ọhụụ.
Otú ndị ọzọ si eme ka egbugbere ọnụ ha ghara ịdị oké ọnụ ahịa bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu, ịgba asịrị, ma ọ bụkwanụ ikwutọ ndị ọzọ. Ilu 26:23 ji ihe atụ dabara adaba kọwaa ihe ha na-eme. Ọ sịrị: “Ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie ibe eju yiri okwu ire ụtọ nke onye na-ekwu ya nwere.” “Okwu ire ụtọ,” ya bụ mmadụ ime ka ọ̀ bụ onye olu ọma na onye na-ekwu eziokwu, nwere ike ikpuchi “obi ọjọọ” otú ahụ “ọlaọcha a gbazere agbaze” si amachi ibe eju.—Ilu 26:24-26.
Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke na-ahụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi. Ọ maruru anyị ala! Ọ bụ ya mere Jizọs Kraịst ji sị: “Burunụ ụzọ mee ka ime iko na ime efere dị ọcha, ka azụ ya wee dị ọcha.” (Matiu 23:26) Ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na obi anyị dị ọcha, ọ bụrụkwa na ihe juru anyị n’obi bụ eziokwu Baịbụl na-akụzi, anyị ga na-ekwu okwu ọma. Nke a ga-eme ka egbugbere ọnụ anyị bụrụ “arịa dị oké ọnụ ahịa” n’anya Chineke.
[Foto dị na peeji nke 19]
Egbugbere ọnụ onye maara ihe bụ “arịa dị oké ọnụ ahịa”