“O Nwere Ike Bụrụ Abụ Nkịtị”
“O Nwere Ike Bụrụ Abụ Nkịtị”
● E nwere otu nwaanyị merela agadi aha ya bụ Juliana. Ọ bụ Onyeàmà Jehova bi na Filipinz, ọ na-arịakwa ọrịa a na-akpọ Alzheimer. Ọrịa a mere ka nwaanyị a gharadị ịna-amata ụmụ ya ma ọ hụ ha. Ma, mgbe ọ bụla m gara n’ógbè nwaanyị a bi, ana m aga ahụ ya.
Juliana anaghị esili ebe o dina ebili, naanị ihe ọ na-eme bụ isi na windo na-elepụ anya. Mgbe ọ bụla m bịara ileta ya, ọ na-esiri m ike mụ na ya ịnọ n’ihi na ọ naghịzi echeta onye m bụ. Naanị ihe ọ na-eme bụ ile m shii, ma o nweghị ihe na-egosi na ọ ma onye ọ na-ahụ. Ajụrụ m ya, sị: “Ị̀ ka na-echetakwa Jehova?” Akọọrọ m ya otu ihe mere mgbe m gara ozi ọma ma jụọ ya ajụjụ ụfọdụ, ma o nweghị ihe gosiri na ọ ghọtara ihe m na-ekwu. Ihe m meziri bụ ịgụwa abụ. Ihe mere ozugbo ahụ m gụwara abụ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́!
Juliana tụgharịrị isi ya, lee m anya ma soro m gụwa abụ! Emechara m kwụsị ịgụ n’ihi na ebughị m ihe niile e dere n’abụ ahụ n’isi n’asụsụ Tigalọg. Ma Juliana akwụsịghị. O chetachara abụ ahụ niile. Ozugbo ahụ, agwara m onye mụ na ya so ka ọ gaa natara m otu Onyeàmà Jehova bi nso ebe ahụ akwụkwọ abụ ya. Ọ dịghị anya ya eweta ya. Amaghị m nọmba abụ ahụ ọ na-agụ, ma, ozugbo m mepere akwụkwọ abụ ahụ, ya abụrụ ebe ahụ ka m sapetara. Anyị niile gụkọziri abụ ahụ ọnụ! Mgbe m jụrụ Juliana ma è nwere abụ ọzọ o chetara, ọ malitere ịgụ otu egwú ịhụnanya ndị Filipinz na-agụ n’oge ochie.
Mụ asị ya, “Ee e, ọ bụghị abụ a na-agụ na redio ka m sị gị gụọ, kama, nke a na-agụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” * Amaliteziri m ịgụ abụ ọzọ dị n’akwụkwọ abụ anyị, ya esorokwa m gụwa ya ozugbo. Ugbu a, otú anya ya si na-egbuke gosiri na obi dị ya ụtọ. Ọ naghị elezi anya shii, ọ nọkwa na-amụmụ ezigbo ọnụ ọchị.
Mgbe ihe a nọ na-eme, ụfọdụ ndị agbata obi Juliana bịara ka ha mara ndị na-agụ abụ ha na-anụ. Ha si na windo na-ele anyị ma na-ege abụ anyị na-abụ. Ọ tọgburu m atọgbu ịhụ otú abụ ndị ahụ si ruo Juliana n’obi! O meela ka o cheta ihe ndị abụ ahụ na-ekwu.
Ihe a merenụ kụziiri m otu ihe dị mkpa, nke bụ́ na o nweghị onye ma ihe nwere ike iru n’obi ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ekwe ka ha na ndị ọzọ kparịta ụka. O nwere ike bụrụ abụ nkịtị.
Obere oge ihe a mechara, Juliana anwụọ. Echetara m ihe a merenụ n’ụbọchị m nọ na-ege abụ ọhụrụ, nke na-eru n’obi, Ndịàmà Jehova wepụtara n’afọ 2009. I nwere ike jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ka ha gwa gị otú ị ga-esi enweta ọmarịcha abụ ndị a dị na siidi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ọ bụ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ebe ha na-anọ amụ ihe.