Ihe Ndị Ọzọ Kwuru
Ihe Ndị Ọzọ Kwuru
Fransị “Ndịàmà Jehova bụ ụmụ amaala na-erubere iwu obodo Fransị isi. . . . Ha anaghị akpa aghara n’obodo. Ha na-arụ ọrụ, na-atụ ụtụ isi ha, na-akwado mmepe obodo ma na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ọ na-atọ ụtọ ịhụ otú ndị a si anọkọ na-amụ ihe n’udo n’agbanyeghị mba na agbụrụ onye si. . . . Ọ bụrụ na mmadụ niile bụ Ndịàmà Jehova, anyịnwa bụ́ ndị uwe ojii agaghị enwe ọrụ.”—Onye na-ekwuchite ọnụ otu òtù ndị uwe ojii nọ na Fransị.
Yukren “Ndịàmà Jehova na-eji Baịbụl akụziri ụmụ ha àgwà ọma. Ha na-akụziri ụmụ ha ka ha ghara ịkpa àgwà ndị nwere ike ịkpatara ha ma ọ bụ ndị ọzọ nsogbu [n’agbanyeghị] na ọtụtụ ndị taa na-ele àgwà ndị ahụ anya ka ihe na-adịghị njọ. N’ihi ya, ha na-adọ ụmụ ha aka ná ntị ka ha ghara ịṅụ ọgwụ ọjọọ, sịga na oké mmanya. Ha ma na ịkwụwa aka ọtọ na ịrụsi ọrụ ike bara uru. . . . Ndịàmà Jehova na-akụziri ụmụ ha àgwà ọma, irubere ndị ọchịchị isi, ịkwanyere ndị ọzọ na ihe ndị ha nwere ùgwù, na irubere iwu obodo isi.”—Akwụkwọ bụ́ The History of Religion in Ukraine, nke Prọfesọ Petro Yarotskyi dezigharịrị.
Ịtali “Puku mmadụ iri atọ nọ jụụ n’Ámá Egwuregwu Olimpik . . . O nweghị ihe a tụsasịrị aghara aghara, o nweghị onye na-eme mkpọtụ, o nweghị onye na-eti mkpu. Otú ahụ ka Ámá Egwuregwu Olimpik dị ụnyaahụ . . . O nweghị onye ya na ibe ya na-ese okwu, o nweghị onye na-aṅụ sịga, ị gaghịkwa ahụ mkpọ [mmanya] n’ala. Naanị ihe ị ga-ahụ bụ Baịbụl a sapere asape, ndị na-edetu ihe, na ụmụaka ndị nọ jụụ.”—Ihe a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ L’Unità banyere otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e nwere na Rom.
Briten “Achịdikin nke Cheltenham kwuru na [Chọọchị Ingland] chọrọ ndị ga-eji obi ha niile na-agagharị dị ka Ndịàmà Jehova.”—Akwụkwọ ịma ọkwa bụ́ The Gazette, nke Dayọsis Gloucester na-ebipụta.
Nedalandz Ndị bi n’akụkụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’obodo Levaden detaara Ndịàmà na-amụ ihe ebe ahụ akwụkwọ ozi, sị: “Anyị chọrọ ikele unu maka otú unu si eme ka Okporo Ụzọ Nọda na-ama mma pụrụ iche. Ndị òtù unu na-ejike nke ọma mgbe niile, ha na-akpakwa ezigbo àgwà. Ụmụaka unu anaghị akpa aghara, ndị nwere ụgbọala anaghị adọwa ụgbọala ha ebe e kwuru ka a ghara ịdọwa ụgbọala, unu anaghị atụsasị ihe n’okporo ámá, gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze unu na-adịkwa ọcha mgbe niile. Obi dị anyị ụtọ na unu bụ ndị agbata obi anyị, ọ ga-amasịkwa anyị ka unu nọgide bụrụ ndị agbata obi anyị.”
Meksiko Elio Masferrer, onye bụ́ ọka mmụta na onye nchọpụta n’otu mahadum dị ná mba ahụ, nke a na-akpọ National School of Anthropology and History, kwuru na Ndịàmà enyerela ndị nwere “nsogbu n’ezinụlọ ha aka, dị ka ndị e dinara n’ike, ndị ndị ezinụlọ ha mekpọrọ ọnụ, ndị ịṅụ mmanya riri ahụ́, na ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ́.” O kwuru na ihe Ndịàmà na-akụziri ndị mmadụ “na-eme ka ndị chere na ha abaghị uru mara na ha bara uru,” ọ na-emekwa ka ndị ahụ nwee ike “ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, si otú ahụ ghara inwe ọtụtụ nsogbu ná ndụ.”—Akwụkwọ akụkọ bụ́ Excélsior.
Brazil Otu akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “Otú Ndịàmà Jehova si eme ihe dị egwu. Ebe ndị ha na-anọ efe ofufe na-adị ọcha mgbe niile. Ihe niile na-aga n’usoro n’usoro . . . Ha nwechaa mgbakọ ọ bụla ha na-enwe, ha na-edebe ebe ha nọ mee ya ọcha karịa otú ọ dị tupu ha abịa. Mgbe a na-ekwu okwuchukwu, ebe niile na-adị nnọọ jụụ. E nweghị onye na-enu ibe ya aka. Ha niile na-akpa àgwà ọma. . . . N’eziokwu, ha bụ ndị na-eme ihe n’usoro. Ha maara nnọọ ihe bụ́ ife Chineke.”—Magazin bụ́ Comércio da Franca.
Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na Onye kere anyị kacha mara ihe ọ ga-abụ ụmụ mmadụ o kere eke na-eme, ya abaara ha uru. (Aịzaya 48:17, 18) N’ihi ya, Ndịàmà na-enye Chineke otuto mgbe ọ bụla ndị mmadụ kwuru okwu ọma maka àgwà ọma ha. Jizọs sịrị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—Matiu 5:16.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
‘Ndịàmà Jehova na-akụziri ụmụ ha àgwà ọma, na-akụzikwara ha irubere iwu obodo isi’
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
‘Ndị si ná mba na agbụrụ dị iche iche na-anọkọ amụ ihe n’udo’