Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jikere Maka Nsogbu Ndị Ị Ga-enwe

Jikere Maka Nsogbu Ndị Ị Ga-enwe

Jikere Maka Nsogbu Ndị Ị Ga-enwe

“Ihe mere m ji kpebie na m ga-akwụsị ịṅụ sịga bụ maka nwa ọhụrụ anyị. N’ihi ya, eji m akwụkwọ dee ‘Aṅụla Sịga’ mapawa ya n’ụlọ anyị. Ma naanị ka otu awa gachara, sịga gụwara m ka à na-anwụ anwụ. Ozugbo ahụ mụ amụnye otu sịga ọkụ.”—Yoshimitsu, onye bi na Japan.

IHE a mere Yoshimitsu na-egosi na ọ naghị adịrị onye kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga mfe ịkwụsị ya. Nchọpụta ndị e mere na-egosikwa na ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla o siiri ike ịkwụsị na-alaghachi ṅụwakwa sịga. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwụsị, o yiri ka ị̀ ga-aka eme nke ọma ma i jikere maka nsogbu ndị ị ga-enwe. Olee nsogbu ndị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwekarị?

Agụụ ịṅụ sịga: Agụụ a na-akachakarị njọ n’ime ụbọchị atọ onye ahụ kwụsịrị ịṅụ sịga, ọ na-ebelatakwa ma ihe dị ka izu abụọ gafee. Otu onye na-aṅụbu sịga kwuru na n’oge mmadụ na-akwụsị ịṅụ sịga, “sịga gụsitụ onye ahụ ike, e meekwa ya akwụsị.” Ya bụrụdị na o meela ọtụtụ afọ mmadụ kwụsịrị ịṅụ sịga, onye ahụ nwere ike ịnọkata otu ụbọchị sịga agụsiwe ya ike. Ọ bụrụ na ọ gụọ gị otú ahụ, jide onwe gị, aṅụkwala sịga. Gbatụ nkịtị ka ihe dị ka nkeji ise gafee, agụụ sịga ahụ ga-akwụsị.

Nsogbu ndị ọzọ i nwere ike inwe: Ndị ka kwụsịrị ịṅụ sịga na-achọpụta na ụra na-atụkarị ha, ma ọ bụ na uche ha anaghị adịkarị n’ihe ha na-eme, nakwa na ha na-ebukwu ibu. Ha nwekwara ike ịchọpụta na ahụ́ na-egbukarị ha mgbu, na-akọkarị ha ọkọ, ọsụsọ ana-agbakarị ha, ha ana-akwakarịkwa ụkwara. Ha na-achọpụtakwa na iwe na-ewekarị ha, ha anaghịkwa enwere ndị ọzọ ndidi, ma ọ bụdị na ha na-adakarị mbà n’obi. Ma, ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-akwụsị n’ime izu anọ ma ọ bụ izu isii.

N’oge nsogbu a, e nwere ihe ụfọdụ ị ga-eme ga-enyere gị aka. Dị ka ihe atụ:

● Na-ewepụtakwu oge na-ehi ụra.

● Na-aṅụ mmiri ma ọ bụ juus mgbe niile. Na-eri nri na-enye ihe n’ahụ́.

● Na-emega ahụ́ otú kwesịrịnụ.

● Na-eku ume nke ọma, ma were ya na ikuku ị na-ekuru dị ezigbo ọcha.

Ihe ndị nwere ike ime ka sịga gụwa gị: Ihe ndị a bụ ihe ndị ọ na-abụ i mewe ma ọ bụ i cheta, ha emee ka sịga gụwa gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-abụ ị ṅụwahaala mmanya gị aṅụwa sịga? Ya bụrụ otú ahụ, ugbu a ị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga, egbula oge ma ị ṅụwa mmanya. Ka oge na-aga, ị ga-enwe ike imeda obi ṅụwakwa mmanya gị otú i si chọọ.

Ihe a e kwuru gosiri na ọtụtụ afọ gachagodị, e nwere ihe ụfọdụ ọ ga-abụ i mewe, ịṅụ sịga agụwa gị. Torben, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “O ruola afọ iri na itoolu m kwụsịrị ịṅụ sịga, ma ọ ka na-abụ m ṅụwahaala kọfị n’oge anyị ji ezu ike n’ebe m na-arụ ọrụ, ịṅụ sịga agụwa m.” Ma dị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị, ka oge na-aga, otú ahụ sịga na-esi agụ gị ma i mewe ihe ụfọdụ ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị.

Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ na-adị ma a bịa ná mmanya na-aba n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga, o nwere ike ịdị mkpa na ị ga-akwụsịcha ịṅụ mmanya ma zere ebe ndị e nwere ike inye gị ya, n’ihi na ọtụtụ ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga na-ebidokwa ṅụwa ya ma ha ṅụwa mmanya. Gịnị mere o ji adị otú ahụ?

● Obere mmanya na-emedị ka ịṅụ sịga tọwakwuo onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga ụtọ.

● A na-aṅụkarị sịga n’ebe a na-aṅụ mmanya.

● Mmanya na-eme ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma ma mewe ihe ọ na-agaraghị eme mgbe anya doro ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ‘mmanya na-anapụ ezi uche.’—Hosia 4:11.

Ndị gị na ha na-anọ: Na-ahọ ndị gị na ha ga na-akpa na ndị gị na ha na-anọ. Dị ka ihe atụ, hụ na gị na ndị na-aṅụ sịga ma ọ bụ ndị ga-enye gị sịga ka ị ṅụọ anaghị anọkarị. Na-agbara ndị na-achị gị ọchị ọsọ ma ọ bụ ndị na-ama gị njakịrị maka na ị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga.

Otú obi na-adị gị: Otu nchọpụta e mere gosiri na mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla, bụ́ ndị ṅụrụ sịga mgbe ha na-agbalị ịkwụsị ya, ṅụrụ ya mgbe iwe ji ha ma ọ bụ mgbe otu ihe na-echegbu ha. Ọ bụrụ na iwe ma ọ bụ ihe ọzọ mere ka sịga gụwa gị, chọọ ihe ọzọ ị ga-eme ka obi gị pụọ na sịga. I nwere ike ṅụọ mmiri, taa chịngọm, ma ọ bụ gagharịtụ. Gbalịa ka i cheta ihe ndị ga-eme gị obi ụtọ, i nwedịrị ike ịrịọ Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka ma ọ bụ chọta otu ebe na Baịbụl gụọ.—Abụ Ọma 19:14.

Ihe Ndị Ị Na-ekwesịghị Ịgwa Onwe Gị

Ka m kpụrụtụ anwụrụ ọkụ ya naanị otu ugboro.

Nke bụ́ eziokwu: Naanị otu ugboro ahụ ị kpụrụtụụrụ ya nwere ike ime ka ụfọdụ ihe dị n’ụbụrụ gị, nke na-eme ka sịga na-agụ gị, rụwakwa ọrụ ruo awa atọ. Nke a na-emekarị ka mmadụ bidokwa ṅụwa sịga.

Ịṅụ sịga na-enyere m aka idi nsogbu ndị m nwere.

Nke bụ́ eziokwu: Nchọpụta ndị e mere na-egosi na sịga na-emedị ka mmadụ bido chegbuwekwuo onwe ya mgbe o nwere nsogbu. Ihe mere o ji adị ka ịṅụ sịga ọ̀ na-enyere gị aka idi nsogbu gị nwere ike ịbụ n’ihi na ọ na-ebelata nsogbu ụfọdụ ịkwụsị ịṅụ sịga na-akpatara gị.

Ọ dịla anya m ṅụwara sịga, agaghị m akwụsịli ya.

Nke bụ́ eziokwu: Mmadụ ịgwa onwe ya na ya agaghị emeli ihe ọ chọrọ ime na-eme ka ike gwụ onye ahụ ime ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) N’ihi ya, echekwala na ị gaghị akwụsịli ya. Onye ọ bụla chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga n’eziokwu ma mee ihe ndị a tụụrụ ya aro ka o mee, dị ka ihe ndị a kọwara na magazin a, ga-akwụsịli ịṅụ sịga.

Nsogbu ịkwụsị ịṅụ sịga na-akpatara m karịrị akarị.

Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ nsogbu onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwe, ma nsogbu ndị ahụ na-ebelata ma izu ole na ole gafee. N’ihi ya, nọgide n’ihe i kpebiri ime! Ọ bụrụ na sịga agụwa gị ma ọnwa ụfọdụ ma ọ bụ afọ ụfọdụ gachaa, gba nkịtị ka nkeji ole na ole gafee, ọ ga-emecha kwụsị—ma ọ bụrụ na ị kpaghị sịga aka.

Isi anaghị akpakọ m ọnụ.

Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụrụ na e nwere ọrịa mere na isi anaghị akpakọ gị ọnụ, ya abụrụkwa na ị na-anara ọgwụ maka ya, gwa dọkịta gị ka o nyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga. Obi ga-adị ya mma inyere gị aka. O nwere ike ileba anya n’ọgwụ ndị ị na-aṅụ na mgbe i ji aṅụ ha iji hụ na ị kwụsịrị ịṅụ sịga.

Ọ bụrụ na m kwụsị ịṅụ sịga mechaa ṅụọ ya, ọ ga-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya.

Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụrụ na i mechaa ṅụọ sịga ka ị na-agbalị ịkwụsị ya, otú ọ na-emekwa ọtụtụ ndị, echela na ị gaghị akwụsịli ya. Ike agwụla gị ná mbọ ị na-agba. Na i mechara ṅụọ sịga apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ya. Ọ bụ mgbe ị kwụsịrị ịgba mbọ ka a ga-asị na o nweghị ihe ị dị mma ya. N’ihi ya, nọgide na-agba mbọ, ị ga-emecha kwụsị ya!

Chebagodịrị ihe mere otu nwoke aha ya bụ Romualdo echiche. Nwoke a ṅụrụ sịga ruo afọ iri abụọ na isii, o ruokwala afọ iri atọ ọ kwụsịrịla ya. O dere sị: “O nwere mgbe m na-enweghịzi ike ịgụta ugboro ole m mechara ṅụọ sịga n’oge ahụ m na-agbalị ịkwụsị ya. Mgbe ọ bụla m ṅụrụ ya, ọ na-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya. Ma, ozugbo m kpebisiri ike ime ka mụ na Jehova Chineke dị ná mma ma rịọ ya ugboro ugboro ka o nyere m aka, emechara m kwụsị ya kpamkpam.”

N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ole na ole ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga ma mee ka i nwee obi ụtọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

ỤDỊ YA Ọ BỤLA NA-EGBU MMADỤ

A na-eji ahịhịa anwụrụ eme ọtụtụ ihe. Ná mba ụfọdụ, a na-eredị ihe ụfọdụ e tinyere ahịhịa a n’ebe a na-ere nri ndị a na-ewere na ha na-edozi ahụ́, na-erekwa ha n’ebe a na-ere ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ. Ma dị ka Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike si kwuo, “ụdị ọ bụla ahịhịa a dị na-egbu mmadụ.” Ọrịa ndị ahịhịa anwụrụ na-akpata, dị ka ọrịa kansa na ọrịa obi, nwere ike igbu mmadụ. Ọ bụrụ na nwaanyị dị ime na-aṅụ sịga, o nwere ike imerụ nwa o bu n’afọ ahụ́. Olee ihe dị iche iche a na-ejikarị ahịhịa anwụrụ emepụta?

Bidi: A na-ahụkarị ụdị sịga a ná mba ndị dị n’Eshia. Ọ na-adị obere, a na-ejikwa aka afụkọta ya. Ụdị sịga a nwedịrị ihe ndị na-egbu mmadụ karịa sịga nkịtị.

Nke e gwere egwe: Otú e si eme ụdị nke a bụ igweri ahịhịa anwụrụ ma jiri nke a na-egwerighị egweri ma ọ bụ akwụkwọ e ji ahịhịa a mee fụkọta ya. E nwedịrị ike ịṅụ ụdị a na-amụnyeghị ya ọkụ.

Kritek: A na-ahụkarị ụdị sịga a ná mba Indonisha. Ihe abụọ e ji eme ụdị sịga a bụ ahịhịa anwụrụ na ihe ndị na-esi ísì ụtọ. Ụdị sịga a nwere ihe ndị na-egbu mmadụ karịa sịga nkịtị.

Ọkpọkọ: Ịṅụ ọkpọkọ akaghị ịṅụ sịga mma, n’ihi na nke ọ bụla mmadụ ṅụrụ nwere ike ịkpatara onye ahụ ọrịa kansa ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ.

Ndị nke na-enweghị anwụrụ ọkụ: Ụdị ndị so na ha bụ ahịhịa anwụrụ a na-ata ata, ụtaba, na ụdị nke a na-akpọ gutkha bụ́ nke a na-ahụ n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. Nikotin dị n’ihe ndị a na-esi n’ọnụ abanye mmadụ n’ọbara. Ụtaba na ihe ndị yiri ya na-egbu mmadụ otú ahụ ihe ndị ọzọ e ji ahịhịa anwụrụ mee si egbu.

Ọkpọkọ ndị a na-etinye mmiri (ndị a na-akpọ bong, hookah, narghile, shisha): Ndị na-aṅụ ụdị ọkpọkọ a na-etinye ya mmiri ka anwụrụ ọkụ ha ga-ekuru bu ụzọ si ná mmiri ahụ gafee tupu ha ekuru ya. Ma nke ahụ agaghị eme ka ihe na-egbu mmadụ dị na ọkpọkọ ahụ ghara ịkpatara onye na-aṅụ ya ọrịa kansa ma o ruo n’akpa ume ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

INYERE ONYE NA-AGBALỊ ỊKWỤSỊ ỊṄỤ SỊGA AKA

Akatọla ya. Ịja ya mma na inye ya onyinye maka oge ndị ọ na-aṅụghị sịga ga-aka aba uru karịa ịbara ya mba na ịgwakasị ya okwu ahụ́. Ọ ka mma ikwu ihe dị ka, “Ama m na ị ga-emecha kwụsị ya ma ị gbalịkwuo” karịa ịsị “Ị̀ ṅụwakwala ya ọzọ?”

Na-agbaghara ya. Hụ na ị naghị ewe iwe ma onye ahụ wesa gị iwe ma ọ bụ baara gị mba. Jiri olu ọma gwa ya ihe dị ka, “Ama m na o siri ike omume, ma obi dị m ụtọ na ị na-eme ya.” Ya enwekwala mgbe ị ga-asị ya, “Achọpụtara m na obi na-aka adị gị mma oge ahụ ị na-aṅụkarị sịga!”

Bụrụ ezigbo enyi. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) N’ihi ya, gbalịa na-enwere onye ahụ ndidi ma na-egosi ya na ị hụrụ ya n’anya “mgbe niile,” oge ọ sọkwara ya ya bụrụ ma ọ bụ otú ọ sọkwara obi dịrị ya.