Olee Ihe Ị Ga-aza?
Olee Ihe Ị Ga-aza?
Olee Ihe Na-adịghị n’Ihe Osise A?
Gụọ Ọrụ 5:1-5. Lezie anya n’ihe osise ahụ. Olee ihe ndị na-adịghị na ya? Dee ihe ị chọpụtara n’okpuru ebe a, senyezie ihe ndị na-adịghị na ya, ma tee ha kreyọn.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị ka i chere mere Ananayas ji ghaa ụgha? Olee ihe ị mụtara n’akụkọ a?
Site na Magazin A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.
PEEJI NKE 27 Gịnị na-eme mkpụrụ obi nke na-emehie? Ezikiel 18:․․․
PEEJI NKE 27 Gịnị ka ndị nwụrụ anwụ na-amaghị? Ekliziastis 9:․․․
PEEJI NKE 19 Gịnị ka anyị niile na-eme ọtụtụ ugboro? Jems 3:․․․
PEEJI NKE 19 Gịnị ka i kwesịrị iwepụ n’obi gị? Ndị Efesọs 4:․․․
Olee Ihe Ị Maara Banyere Onyeikpe Berak?
Gụọ Ndị Ikpe 4:1-24. Zazie ajụjụ ndị a.
3. ․․․․․
Olee onye amụma nwaanyị nke nyeere ya aka?
4. ․․․․․
Olee eze ndị Kenan ọ napụtara Izrel n’aka ya?
5. ․․․․․
Eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha? Onyeikpe Berak dịrị ndụ mgbe Jọshụa nwụrụla.
IHE A GA-EKWURỊTA:
Olee otú ụmụ nwaanyị si nye aka ná mmeri ndị Izrel meriri ndị Kenan? Olee ọrụ dị mkpa ụmụ nwaanyị na-arụ taa n’ozi Chineke?
AZỊZA
1. Ananayas ejighị akpa ego n’aka ya.
2. Pita onyeozi anọghị na ya.
3. Debora.—Ndị Ikpe 4:4-9.
4. Jebin.—Ndị Ikpe 4:2.
5. Eziokwu.