Jizọs Ọ̀ Bụ Ọkpara Chineke n’Eziokwu?
Echiche Nke Bible
Jizọs Ọ̀ Bụ Ọkpara Chineke n’Eziokwu?
PITA onyeozi kwenyesiri ike na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. N’ihi ya, ọ gwara Jizọs, sị: “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ebe e kwuru na Jizọs bụ Ọkpara Chineke n’ime Bible. Ndị ji okpukpe kpọrọ ihe ekwuokwala ọtụtụ ihe banyere okwu a bụ́ Ọkpara Chineke.
Ọ na-esiri ọtụtụ ndị kweere na Jizọs Kraịst bụ Chineke ike ịkọwa ihe mere e ji kpọọ ya Ọkpara Chineke. Mmadụ chee echiche nke ọma, ọ ga-aghọta na Jizọs apụghị ịbụ Chineke, bụrụkwa Ọkpara Chineke. Ndị ọzọ na-ewere ya na ọ dịghị ihe ọzọ Jizọs bụ ma ọ́ bụghị onye a ma ama, onye maara ihe, ma ọ bụkwanụ ikekwe ezigbo onye amụma Chineke. Gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi? Ihe i kweere banyere ya ọ̀ dị ihe o mere?
Onye Chineke Buru Ụzọ Mụọ
Bible na-egosi na o nwere mgbe nanị Chineke nọ. N’ihi ịhụnanya o nwere, o kpebiri inye onye ọzọ onyinye nke ndụ. Nke a mere ka ọ ghọọ nna—ma ọ bụghị n’ụzọ ụmụ mmadụ si aghọ nna. Kama nke ahụ, Jehova ji ike na-enweghị atụ o nwere n’ike ihe kee otu mmụọ nwere ọgụgụ isi—“mmalite nke ihe Chineke kere,” bụ́ onye anyị maara ugbu a dị ka Jizọs Kraịst. (Mkpughe 3:14; Ilu 8:22) Ebe ọ bụ na Chineke ji aka ya kee Jizọs mgbe nanị Chineke ka nọ, ọ dabara adaba na a kpọrọ Jizọs “ọkpara a mụrụ nanị ya” na “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.”—Jọn 1:14; Ndị Kọlọsi 1:15.
N’ihi ya, ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye mbụ n’ime ihe nile Chineke kere eke, o doziri anya na ọ pụghị ịbụ ya bụ Onye Okike, “onye nanị ya bụ Chineke.” (1 Timoti 1:17) N’aka nke ọzọ, Chineke nyere Ọkpara ya ọtụtụ ihe ùgwù. Dị ka ihe atụ, Chineke sitere n’aka Jizọs kee “ihe ndị ọzọ nile,” gụnyere ndị mmụọ ozi. A na-akpọ ndị mmụọ ozi a “ụmụ Chineke”—Jehova bụkwa Onye na-enye ha ndụ.—Ndị Kọlọsi 1:16; Job 1:6; 38:7.
Jenesis 1:26; Ilu 8:22-31) N’ụzọ dị otu a, Jehova si n’aka mmụọ ahụ o kere, nke ga-emesị bụrụ Jizọs, kee Adam, bụ́ nwa mbụ Ya bụ́ mmadụ.—Luk 3:38.
Mgbe Chineke kwadebechara ụwa ịbụ ebe obibi ụmụ mmadụ, o doro anya na ọ bụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka ọ gwara, sị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jizọs Aghọọ Ọkpara Chineke nke A Mụrụ Dị Ka Mmadụ
Jọn onyeozi mere ka a mara na n’oge a kara aka, Ọkpara Chineke bụ́ mmụọ “ghọrọ anụ ahụ́ ma bie n’etiti anyị.” (Jọn 1:14) Iji mee nke a, Chineke si n’eluigwe jiri ụzọ ọrụ ebube bufee ndụ Jizọs n’akpa nwa Meri, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke bụ́ onye Juu. N’ụzọ dị otú ahụ, Jizọs nọgidere bụrụ Ọkpara Chineke, n’agbanyeghị na ọ bụ mmadụ. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ọ bụ Chineke, ọ bụghị mmadụ ọ bụla, nyere Jizọs ndụ, Jizọs zuru okè mgbe a mụrụ ya, o ketaghịkwa mmehie. Mmụọ ozi Gabriel gwara Meri, sị: “A ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.”—Luk 1:35; Ndị Hibru 7:26.
Mgbe Jizọs bụ mmadụ, Nna ya ji ọnụ ya kwupụta na Jizọs bụ Ọkpara Ya. Mgbe e mere Jizọs baptizim, Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ ka eluigwe meghere, nụkwa olu si n’eluigwe daa, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:16, 17) Ka a sịkwa ihe mere Jọn ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ahụwokwa m ya, agbawokwa àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.”—Jọn 1:34.
N’oge Jizọs jere ozi n’ụwa, ọ bịaghị gwawa ụwa nile na ya bụ Mezaịa ahụ, bụ́ Ọkpara Chineke. (Mak 8:29, 30) Mgbe mgbe, ọ na-enye ndị mmadụ ohere iji ọnụ ha kwuo ya mgbe ha na-ege ntị n’ozizi ya, mgbe ha na-ahụ otú o si ebi ndụ, nakwa mgbe ha na-ahụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ, bụ́ ndị ọ rụrụ ọtụtụ n’ime ha n’ihu ọha mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwọrọ “ndị nile ahụ́ na-adịghị mma, ndị ọrịa na mmekpa ahụ́ dị iche iche na-esogbu.” (Matiu 4:24, 25; 7:28, 29; 12:15) Ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ngwụrọ, na ndị ọrịa bịakwutechara Jizọs, ọ gwọkwara ha. Ọ kpọlitedịrị ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ! (Matiu 11:4-6) Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ka o ji ụzọ ọrụ ebube jee ije n’elu mmiri ma mee ka oké ifufe na ebili mmiri dajụọ. Ụzọ a o si gosipụta ike ya kpaliri ndị na-eso ụzọ ya ikwu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.”—Matiu 14:24-33.
Ụzọ Ọkpara Chineke Pụrụ Isi Baara Gị Uru
Gịnị mere Chineke ji zite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka ọ bịa bie ndụ n’ụwa, nakwa ka o mesịa nwụọ ọnwụ ike n’ebe ahụ? Ọ bụ “ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ee, ka Jizọs wee nwee ike ‘inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,’ ọ ga-anwụrịrị. (Matiu 20:28) N’eziokwu, kemgbe ụwa, o nwebeghị onye gosirila ịhụnanya karịrị nke Jehova na Ọkpara o buru ụzọ mụọ gosiri ụmụ mmadụ.—Ndị Rom 8:32.
Mgbe ọnwụ Jizọs gasịrị, a kpọrọ ya “Ọkpara Chineke” n’ụzọ pụrụ nnọọ iche ma sie ike, “site n’ime ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie” ma maliteghachi ibi ndụ dị ka Ọkpara Chineke bụ́ mmụọ. (Ndị Rom 1:4; 1 Pita 3:18) E mesịa, ka Jizọs jisịrị ndidi chere n’akụkụ Nna ya ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ 19, e chiri ya echichi ịbụ Eze nke Alaeze Chineke—ọchịchị eluigwe nke ga-achị ụwa dum n’oge na-adịghị anya.—Abụ Ọma 2:7, 8; Daniel 7:13, 14.
Ị̀ chọrọ ka gị na Ọkpara Chineke a dị ike dị ná mma? Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-agba gị ume ka i nyochaa ozizi Ya nke ọma ma tinye ha n’ọrụ ná ndụ gị. Jizọs n’onwe ya sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’ezie, ihe mmadụ kweere banyere Ọkpara Chineke dị ihe o mere!—Jọn 3:18; 14:6; 1 Timoti 6:19.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Olee otú Jizọs si bụrụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya?—Jọn 1:3, 14; Mkpughe 3:14.
▪ Olee ihe mere ị pụrụ iji kwere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?—Matiu 3:16, 17.
▪ Olee uru ị pụrụ irite site n’ikwere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?—Jọn 3:16; Jọn 14:6; 17:3
[Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]
Ihe amamihe dị na ya Jizọs kụziri na ọrụ ebube ndị dị ike ọ rụrụ gosiri na ọ bụghị mmadụ nkịtị