Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Obi Ụtọ!
Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Obi Ụtọ!
O YIRI ka ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa hà kweere na ụzọ bụ́ isi e si achọta obi ụtọ bụ site n’inwe ụgbọala ndị kasị ọhụrụ ma dị oké ọnụ, inwe nnukwu ego, ịnọ n’ọkwá dị elu, inwe nnukwu ụlọ, na inwe ngwá electronic ndị ọgbara ọhụrụ, nakwa ịma mma elu ahụ́. Otú ọ dị, ihe onwunwe na ọdịdị elu ahụ́ hà bụ ihe ndị na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ n’ezie?
Otu akụkọ pụrụ iche nke gbara na magazin bụ́ Time kwuru na ‘a nọwo na-eme ọtụtụ nnyocha banyere obi ụtọ, nchekwube, obi iru ala, na àgwà ọma.’ Ihe ndị a chọpụtara ná nnyocha ndị ahụ na-eju ọtụtụ ndị anya. Ihe àmà na-egosi mgbe nile na ndị na-eche na ego, ịbụ onye a ma ama, ma ọ bụ mma elu ahụ́ ga-eme ka ha nwee obi ụtọ na-aghọgbu onwe ha. N’ezie, ha na-eme ka ndụ ha hiwe isi n’ihe ndị pụrụ ịkpatara ha nchekasị, ọbụna mee ka ha daa mbà n’obi.
Na United States, ọtụtụ mmadụ bara ọgaranya ugbu a karịa ka ha batụrụla. “Ma nke ahụ adịghị eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ,” ka Time na-ekwu. N’ezie, a pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ndị bi ná mba ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ndị China na-akawanye mma, ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị obi ụtọ ná mba ahụ na-amụbakwa n’ike n’ike. Otu magazin a na-ebipụta ugboro anọ n’afọ nke aha ya bụ Access Asia na-ekwu na n’obodo China, mmadụ igbu onwe ya aghọọla “ihe kasị akpata ọnwụ nke ndị nọ n’agbata afọ 15 na afọ 34.” Otu ihe so akpata nke a yiri ka ọ̀ bụ na a na-arụgide ndị na-eto eto inwe ihe ịga nke ọma n’ụwa a nke siri ike obibi, nke e jikwa ndụ tigbuo zọgbuo mara.
O doro anya na mmadụ inwe akụ̀ na ụba adịghị eme ka nchekasị ọ na-enwe belata; ihe ọ na-emedị bụ ime ka ha ka njọ. Ná nnyocha otu mahadum mere, ha chọpụtara na “ụzọ anyị si ebi ndụ aghọọla isi ihe na-akpatara anyị obi erughị ala na uche mkpasasị.” Dị ka Van Wishard, bụ́ onye na-enyocha ihe ndị na-ewuru ọhaneze, si kwuo, “a bịa n’ụgwọ inshọransị ọtụtụ ụlọ ọrụ na-akwụ maka ahụ́ ike nke ndị ọrụ ha, ebe ha na-aka emefu ego bụ n’ịkwụrụ ha ụgwọ inshọransị maka ọrịa ụbụrụ na nke mmetụta uche.”
Mgbanwe ụwa anyị a na-agbanwe n’ike n’ike na-emetụta ọbụna ụmụaka. Wishard na-ekwu na e nweela akwụkwọ ndị e bipụtara maka ụmụaka ndị dị afọ asatọ, bụ́ ndị na-agwa ha “otú ha ga-esi ama na ha na-enwe nchekasị na ihe ndị ha ga-eme iji chụọ ya.” Dịkwa ka otu akwụkwọ na-ekwu banyere ịda mbà n’obi si kwuo, ná mba ụfọdụ ndị dị na Europe nakwa n’America, ụmụaka ole a na-achọpụta na ha dara mbà n’obi na-eji pasent 23 arị elu kwa afọ. Ọzọkwa, “ụmụ akwụkwọ ọta akara bụ ndị a kasị azụtara ọgwụ ndị na-akwụsị ịda mbà n’obi.”
Ọnụ ọgụgụ ndị ụjọ na-atụ na-amụbakwa—ọ bụghịkwa nanị n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka. N’ihi otú ndị na-anụbigara ọchịchị na okpukpe ọkụ n’obi ókè si na-amụba n’ike n’ike, ọtụtụ mmadụ na-achịzi obi n’aka n’ihi amaghị ihe echi ga-abụ. Ma, ajụjụ bụ, enyemaka ọ̀ dị?
Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jizọs Kraịst kụziri banyere ụzọ ndụ dị iche bụ́ nke na-enye ume ọhụrụ ma na-ebelata nchekasị. Otu n’ime ihe ndị kasị gbaa ọkpụrụkpụ ọ kụziri bụ otu eziokwu dị mfe. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ee, Jizọs gbara ndị na-ege ya ntị ume ilekwasị anya n’ihe kasị dịrị ụmụ mmadụ mkpa—mkpa nke ịmata eziokwu banyere Onye Okike anyị na nzube Ya maka anyị.
Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu ndị na-esonụ, eziokwu ahụ pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe dị mkpa n’ezie. Nke a ga-emekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ, ndụ anyị abụrụkwa nke nwekwuru nzube. Eziokwu banyere Chineke na nzube ya ga-emekwa ka anyị nwee olileanya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ọ̀ bụ ego na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ?