Ekpebisiri M Ike Ijere Chineke Ozi n’Agbanyeghị Nkwarụ
Ekpebisiri M Ike Ijere Chineke Ozi n’Agbanyeghị Nkwarụ
Dị ka Kouamé NʹGuessan si kọọ
Mụ na onye mụ na ya so taara ahụhụ kpụrụ ígwè anyị n’aka na-arịkwa ugwu ọzọ. Ọ bụ na November 2002, a nọkwa na-alụ agha na Ivory Coast, nke dị n’Africa. N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ihe ize ndụ n’okporo ụzọ ahụ kụrụ owu. N’ihu anyị, e nwere ebe ndị agha nọ na-eche nche. N’ihi gịnị ka m ji na-eme njem dị ize ndụ otú a n’oge a agha nọ na-akpọtụ?
A MỤRỤ m n’afọ 1978. Ebu m ọrịa ji nwayọọ nwayọọ na-ejichi m pụta ụwa. Ọ malitere site n’ime ka m ghara ịdị na-anụ ihe nke ọma ma na-egbujisị m ụkwụ. Ka m nọ na-etolite, ndị ezinụlọ m na-adị akọ m ọnụ, na-asị na m nwere ‘ụkwụ na-enweghị isi na ọdụ na ntị kpọchiri akpọchi.’ Ndị tọrọ m na-eleda m anya, ụmụaka na-adị eji oké olu agwa m na m dara ngwụrọ nakwa na ụkwụ gbajisịrị m.
Amalitere m akwụkwọ mgbe m dị afọ asatọ. Ozugbo ahụ kwa, ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị nkụzi malitere imesi m ike. Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị m ka ala meghee ka m dakpuo. Ndị mmadụ chọpụta na ụjọ na-atụ m, ha ana-eji ya ama m njakịrị. Nanị mgbe m na-esi n’ụlọ anyị apụ bụ mgbe m na-aga akwụkwọ.
M na-adị na-ajụ onwe m, sị, ‘N’ihi gịnị ka m ji na-arịa ọrịa a?’ Mama m gwara m na ihe kpatara ya bụ ọgwụ mmadụ kọrọ m. Mgbe ụfọdụ, ana m ahụ ndị nwere nkwarụ dị ka nke m ma na-echekwa, sị, ‘Ọ̀ pụtara na a kọkwara ha onwe ha ọgwụ?’
N’afọ 1992, ikpere aka m abụọ bịara na-egbu m mgbu nke ukwuu. Mgbe mgbu ahụ belatara, apụghịzi m ịgbatị aka m abụọ. Ka afọ abụọ gasịrị, anya m nke aka ekpe kpọrọ. Ndị mụrụ m kpọọrọ m gaa na nke ọtụtụ ndị sị na ha na-agwọ ọrịa ma ọ dịghị nke nwere isi. Ọrịa m bịara na-aka njọ, n’ihi ya kwa, akwụsịrị m ịga akwụkwọ.
Ịchọ Ihe Kpatara Ya
Otu nwa klas m nke ji okpukpe kpọrọ ihe gwara m ka m soro ya gaa chọọchị ha. A zụlitere m ikpe okpukpe ọdịnala; ma agara m chọọchị ruo otu afọ. * Ọ dịghị oké ihe m mụtara banyere Bible n’ebe ahụ, n’ihi ya, amalitere m ịjụ onwe m ma ènwedịkwara uru dị n’okpukpe.
Ụfọdụ ozizi a na-ezi na chọọchị tụrụ m ụjọ, karịsịa ozizi ọkụ ala mmụọ. Echeghị m na m na-eme oké mmehie nke na m ga-aga ọkụ ala mmụọ. N’otu mgbe ahụ kwa, echeghị m na m na-eme ihe ọma ruo n’ókè nke ịga eluigwe. Ebe m na-enwetaghị azịza nye ajụjụ ndị m na-ajụ, mmasị m nwere n’okpukpe malitere ịjụ oyi.
N’afọ na-esonụ, a kpọrọ m ka m bịa n’otu ebe a na-agwọ ndị mmadụ n’Abidjan, nke bụ́ isi obodo Ivory Coast. Ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita 150 site n’obodo nta anyị bụ́ Vavoua. Tupu anyị agawa, agwara m ndị welitere isi na chọọchị anyị na ejighị m ego ga-ezuru m iji banye ebe ahụ na nke m ga-eji rie ihe. Ihe ha kwuru mere ka m chewe na a ga-elekọta m anya nke ọma n’Abidjan, ma ka m ruru ebe ahụ, ihe m hụrụ abụghị ihe m tụrụ anya ya. Ọ bụ ezie na anọ m n’etiti ìgwè mmadụ dị n’agbata puku iri anọ na puku iri ise, ọ dị m ka m nọ nanị m, enwekwara m nkụda mmụọ. Ọ dịghị onye nwere mmasị n’ebe m nọ.
Ebukwa m ọrịa m lọghachi Vavoua, ma ugbu a, abịaziri m dakwuo mbà n’obi. Ndị isi chọọchị anyị gwara m na ihe mere na Chineke agwọghị m bụ n’ihi na enweghị m okwukwe. Mgbe nke ahụ gasịrị, esepụrụ m aka n’okpukpe.
Enweta M Nkasi Obi Ime Mmụọ n’Ikpeazụ
N’afọ 1996, otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. Mụ na Onyeàmà ekwurịtatụbeghị okwu, ma egere m ntị n’ezigbo mkparịta ụka nwanne m nwoke na onye ahụ bịaranụ nwere. Nwanne m nwoke enweghị mmasị, ma enwere m. Ihe ọ bụla Onyeàmà ahụ kwuru ruru m nnọọ n’obi.
Onyeàmà ahụ kọwara na ọ bụ n’ihi nnupụisi nke mmadụ mbụ ka mmehie ji ruo mmadụ nile nọ n’ụwa aka. Nnupụisi ahụ wetaara mmadụ nile ezughị okè na ọnwụ. Otú ọ dị, Jizọs nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta ka e wee nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị, anyị enweekwa ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 3:23; 5:12, 17-19) Ọzọkwa, Onyeàmà ahụ ji Bible gosi m na n’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke site n’Alaeze ya, ga-agbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs ma kpochapụ mmehie na nsogbu nile ọ na-akpata.—Aịsaịa 33:24; Daniel 2:44; Mkpughe 21:3, 4.
Amamihe dị n’ozizi Bible nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe m nọ. Onyeàmà ahụ, bụ́ onye m mesịrị mata na aha ya bụ Robert, mere ndokwa ka mụ na ya na-amụ Bible ugbo abụọ n’izu. N’ime ọnwa ole na ole, n’ihi ihe ọmụma ọhụrụ ndị m nwetara na Bible, abịara m ruo eru iso Ndịàmà na-aga ozi ụlọ n’ụlọ ha. Nke a siiri m ike omume, ebe ọ bụ na aghaghị m ibu ụzọ kwụsị ịtụ ụjọ iso ndị mmadụ nọkọọ.
Amalite M Inwe Ihe Mgbochi
Obi adịghị ndị ezinụlọ m mma na m na-amụ Bible. Iji kpasuo m iwe, nwanne m nwoke nke tọrọ m na-abịa nọrọ n’ọnụ ụlọ ebe m na-arahụ see siga n’abalị. N’ụtụtụ ya, isi na-abịa wawa m, ana m amalitekwa ịrịa ọrịa. Ihe isi ike ọzọ m nwetara bụ n’ihe anyị na-eri. Papa m bụ ezigbo dinta, anụ ọ na-egbu sokwa n’ihe anyị na-erikarị. Akọwaara m ya na Bible megidere iri anụ a na-egbupụghị ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere jụ igbupụ anụ ndị ahụ ọbara. Mgbe ụfọdụ, mama m na-ekunyere m osikapa a na-ekunyeghị stuu, ma ọtụtụ mgbe, m na-anọ n’erijughị afọ.
Ọ bụ ezie na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Vavoua dị n’akụkụ nke ọzọ nke obodo ahụ, ọ dịghị mgbe m kwere ka ịdị anya ya ma ọ bụ mmiri ozuzo gbochie m ije nzukọ. E mere m baptizim na Ivory Coast na September 1997 ná Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke.” Ka e mesịrị, abịara m gachiwekwuo ozi Ndị Kraịst anya ruo n’ókè nke iru eru ịbụ ọsụ ụzọ oge nile, bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị ozi oge nile ha.
Ihe Ịma Aka Ndị Ọzọ
Nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ e nwere n’obodo anyị mere ka agha daa na September 2002. N’ime izu ole na ole, usuu ndị agha mba ahụ nọ na-erute Vavoua. Ndị mmadụ, tinyere ọtụtụ Ndịàmà Jehova, bidoro gbapụsịwa n’obodo ahụ maka ndụ ha. Ụbọchị ise ka ha gbapụsịrị, ndị agha ahụ weghaara obodo ahụ, ozugbo ahụkwa,
ha enye iwu ka a kwụsị ihe omume nile ọhaneze na-eme n’obodo. Ọ bụ nke a mere ka ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na Vavoua gbapụsịa, tinyekwara Ndịàmà fọdụrụnụ.Ebe ọ bụ na ụgbọ njem ọha adịghịzi agba, ndị mmadụ na-eji ụkwụ ha aga ọtụtụ kilomita iji ruo n’obodo ndị dịdewere obodo anyị. Apụghị m ịga ogologo ije dị otú ahụ, n’ihi ya, abụ m nanị Onyeàmà fọdụrụ na Vavoua. Anọgidere m na-ezi ozi ọma, ana m eduzikwa nzukọ ọgbakọ bụ́ nke ụfọdụ ndị bi n’ógbè ahụ na-abịa.
Mgbalị Ndị M Mere Ịga Mgbakọ
E mere ndokwa na a ga-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke Ndịàmà Jehova na November, n’obodo Daloa. Ekpekuru m Jehova ekpere, na-agwa ya na m chọrọ ịga mgbakọ a. Otu Onyeàmà sibu n’obodo anyị gbapụ lọghachitere mgbe m na-atụghị anya ya. Ajụrụ m ya ma ọ̀ ga-eburu m n’ígwè ya gaa ala mgbakọ ahụ, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ebe anyị bi. O kwetara ozugbo, n’agbanyeghị na ya onwe ya na-arịakwa ọrịa.
Ọgba aghara dị ebe nile, n’ihi ya, ihe ahụ abụghị oge ime ụdị nje ahụ. A machibidoro ụgbọala isi Vavoua aga Daloa. Ndị agha nke òtù abụọ ahụ na-alụ agha pụrụ inyo onye ha na-amaghị enyo ma gbagbuo ya. Ka o sina dị, n’ụtụtụ Saturday, November 9, 2002, anyị ji ígwè hapụ Vavoua gawa Daloa, dị ka m kọwara ná mmalite.
Ọ dịghị anya, anyị erute na nke mbụ n’ime ọtụtụ ebe ndị agha na-eche nche. Ha nyochasịrị anyị nke ọma ma kwe ka anyị gawakwa. Njem ahụ dị anya ma na-agwụ ike. Anyị na-eji ụkwụ rịa ugwu. Mgbe anyị ruru n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ, anyị abụọ anọkwasị n’ígwè ahụ ma gbara ya gbadaa.
Ka oge na-aga, otu onye ji ígwè gwara anyị ka o nyere anyị aka. Anọkwasịrị m n’azụ ígwè ya. Ka onye a nwere obiọma m na-amaghị bu m n’ígwè na-aga, eji m ohere ahụ kọọrọ ya banyere Alaeze Chineke. Akọwaara m ya na ọchịchị Chineke dị n’eluigwe nakwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eweta udo na-adịgide adịgide n’ụwa. Ihe ndị m gwara ya tụrụ ya n’anya, ọ jụkwara m ọtụtụ ajụjụ. Mgbe anyị ruru Daloa, ọ zụtaara anyị nri ma kwe nkwa na ọ ga-abịa ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’ụtụtụ echi ya.
Anyị rutere Daloa n’oge abalị, ike gwụrụ anyị ma anyị nwere obi ụtọ na anyị erutela ebe anyị na-aga. Njem a were anyị awa itoolu adịghị mfe. Otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà nabatara anyị nke ọma ma tụọrọ anyị arọ ka anyị birizie na nke ha ruo mgbe agha ahụ ga-akwụsịlatatụ. Ọ dị mwute ikwu na a kagburu mgbakọ ahụ n’ihi agha ahụ a na-alụ. Otú ọ dị, njem ahụ efughị ọhịa. O mere ka m nwetakwuo ihe ùgwù nke ijere Ndị Kraịst ibe m ozi n’obodo Daloa.
Mkpebi Siri Ike M Mere Ewetaworo M Ngọzi
Ugbu a ana m eje ozi dị ka ohu na-eje ozi na ọsụ ụzọ oge nile n’otu ọgbakọ dị na Daloa. Ana m enyekwa aka n’ilekọta Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Daloa. Iji na-akpata ego m ji egbo mkpa m, ana m eji osisi atụ urukurubụba e ji achọ ụlọ mma, ana m edekwa saịn bọọdụ.
Ruo ọtụtụ afọ, nanị mgbe m ji esi n’ụlọ anyị apụ na-abụ mgbe m na-aga akwụkwọ, ma ugbu a, ana m aga ọtụtụ kilomita na-achọta ndị akpịrị na-akpọ nkụ ịmata eziokwu banyere ihe mere ọrịa na nhụjuanya ji dị. Ka m nọ na-echere oge Alaeze Chineke ga-ekpochapụ ọrịa nile, anọgidewo m na-ezi ndị nọ na Ivory Coast ozi ọma banyere nzube Chineke bụ́ nke na-enye nkasi obi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ihe e ji mara ụdị okpukpe ọdịnala m kpere bụ nkwenkwe bụ́ na ndị mmụọ na-anọ n’ahụ́ ụmụ anụmanụ, n’osisi, nakwa n’ihe ndị ọzọ e kere eke.
[Foto dị na peeji nke 23]
Mgbe anyị na-aga Daloa maka mgbakọ ahụ
[Foto dị na peeji nke 23]
Ebe m na-enye aka n’ilekọta Ụlọ Mgbakọ anyị dị na Daloa
[Foto dị na peeji nke 23]
Iji na-enyere onwe m aka, ana m eji osisi atụ urukurubụba e ji achọ ụlọ mma