Nnwere Onwe Pụọ N’ụjọ Ò Kwere Omume?
Nnwere Onwe Pụọ N’ụjọ Ò Kwere Omume?
Ọ̀ DỊ onye bi n’ụwa a dị ize ndụ nke pụrụ ịnọ n’enweghị ụjọ ọ bụla ọ na-atụ? Mbanụ. Ọbụna ndị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ na-anọ n’ihe ize ndụ ndị na-akpata nchegbu. Dị ka ihe atụ, na narị afọ mbụ nke O.A., Pọl onyeozi, bụ́ onye mere njem nke ukwuu, kwuru na ụgbọ ya nọ n’ime ya kpuru, na ya nọrọ n’ihe ize ndụ n’osimiri, n’ihe ize ndụ n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe n’okporo ụzọ, na n’ihe ize ndụ n’obodo ukwu. (2 Ndị Kọrint 11:25-28) N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ n’ime anyị aghaghị iche ọnọdụ ndị dị ize ndụ ihu.
Otú ọ dị, anyị pụrụ ịgbaso ịdọ aka ná ntị ndị amamihe dị na ha. Sitekwa n’ibelata ihe ize ndụ ndị anyị na-anọ na ha, anyị pụrụ ime ka nchegbu anyị na-enwe belata. Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.” (Ilu 22:3) Olee ihe ụfọdụ ndị dị mma e kwesịrị ime?
Na-akpachapụ Anya
Ọ bụ ezie na Bible etewo aka e dere ya, ọ dị mma ịmara na o nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị ka bara uru taa ma a bịa n’izere ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Onye maara ihe, anya ya abụọ dị n’isi ya, ma onye nzuzu na-ejegharị n’ọchịchịrị.” (Eklisiastis 2:14) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịmara ndị nọ gị gburugburu na izere ebe ndị gbara ọchịchịrị mgbe o kwere mee. Ikekwe, ị pụrụ ịdị na-esi n’ụzọ okporo ámá ya kasị nwee ọkụ na-ala, ọbụna ma a sị na ụzọ ahụ ka ogologo. Bible kwukwara, sị: “Abụọ dị mma karịa otu . . . Ọ bụrụkwa na mmadụ enwee ike n’ahụ́ otu onye nanị ya dị, ma otú ọ dị, mmadụ abụọ ga-eguzo imegide ya.” (Eklisiastis 4:9, 12) Ọ bụrụ na i bi ebe dị ize ndụ, ị̀ pụrụ ime ndokwa ka gị na mmadụ na-eso ala?
Ọ bụrụ na onye na-apụnara mmadụ ihe a wakpo gị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya icheta na ndụ ka akụ̀. (Matiu 16:26) Ọ dịkwa mma icheta na mgbe ìgwè mmadụ na-eme ngagharị iwe, ha na-adị ize ndụ, a pụghịkwa ịma ihe ha pụrụ ime.—Ọpụpụ 23:2.
Jenesis 39:12) Ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe gị omume isi ebe ahụ pụọ, ị pụrụ ịgwa ya, sị: “Kwụsị ya!” ma ọ bụ “Emetụkwala m aka!” ma ọ bụ “Achọghị m ụdị okwu ahụ.” Ọ bụrụ na ọ pụrụ ikwe gị omume, zere ebe ndị a na-enyekarị mmadụ nsogbu.
Ọ bụrụ na o nwere onye na-enye gị nsogbu site n’ịchọ imeso gị omume rụrụ arụ, site n’ịgwa gị okwu rụrụ arụ, ma ọ bụ site n’ịnwa imetụ gị aka, ọ kasị mma ịgwa ya hoo haa na ị chọghị ya. Ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga-esi ebe ahụ pụọ dị ka Josef mere mgbe otu nwanyị na-eme omume rụrụ arụ jidere ya. Ọ ‘gbalagara, pụọ n’èzí.’ (Ịnagide Ụjọ A Na-atụ n’Ebe Obibi
Olee ihe ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị na-atụ di gị na-eme ihe ike ụjọ? Ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ime atụmatụ otú ị ga-esi agbapụ, a dịghị ama ama ma omume ya gbanwee na mberede ma tinye ndụ gị ma ọ bụ nke ụmụ gị n’ihe ize ndụ. * Bible kọrọ otú Jekọb si jiri nnọọ nlezianya mee atụmatụ otú o ga-esi gbapụ ma ọ bụrụ na nwanne ya nwoke bụ́ Ịsọ emeso ya ihe ike. Dị ka ihe sizi gaa, atụmatụ ahụ adịghịzi ya mkpa, ma ọ bụ atụmatụ amamihe dị na ya. (Jenesis 32:6-8) Atụmatụ mgbapụ a pụrụ ịgụnye ịchọta onye ga-anabata gị n’ụlọ ya mgbe e nwere ọnọdụ mberede n’ụlọ unu. Tupu ihe ọ bụla emee, ị pụrụ iso onye ahụ kwurịta ihe ndị pụrụ ịbụ mkpa gị. Ọ pụrụ ịdị mma idebe akwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa n’ebe aka gị ga-eru ha ngwa ngwa.
Ị pụkwara ime ka ndị ọchịchị mara banyere mmegbu ahụ di gị na-emegbu gị ma rịọ ha ka ha chebe gị. * Bible na-ekwu na onye ọ bụla aghaghị iche aka ghọrọ ihe ga-esi n’omume ya pụta. (Ndị Galeshịa 6:7) Bible na-ekwu banyere ndị ọchịchị, sị: “Ọ bụụrụ gị onye na-ejere Chineke ozi maka ọdịmma gị. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, na-atụ egwu.” (Ndị Rom 13:4) Mmadụ ịkụ gị ihe n’ebe obibi bụ mpụ otú ya ịkụ gị ihe n’okporo ámá si bụrụ mpụ. Mmadụ isogharị ibe ya ma na-eyi ya egwu bụkwa mpụ n’ọtụtụ mba.
Ime ihe ndị ahụ anyị tụleworo pụrụ ime ka ụjọ ị na-atụ belatatụ. Ma Bible na-enye ihe karịrị ndụmọdụ bara uru. Ọ bụghị akwụkwọ nkịtị mmadụ na-agụrụ onwe ya iji nweta enyemaka. Ọ bụ akwụkwọ bú amụma ndị na-adịghị agha agha, bụ́ ndị na-ekpughe ihe Chineke na-eme ugbu a na ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu. Gịnị bụ olileanya Bible na-enye ndị a manyere ịnọ n’ụjọ?
Ihe Ụjọ Ndị Mmadụ Nọ na Ya Na-egosi
N’ụzọ dị ịrịba ama, Pọl onyeozi dere, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe 2 Timoti 3:1-3) Lee nnọọ ụdị oge dị egwu e ji okwu ndị ahụ na-akọwa!
onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.” (Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “ngwụsị nke usoro ihe a,” o kwuru, sị: “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze; a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe na ụkọ nri ga-adịkwa site n’otu ebe ruo ebe ọzọ; a ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe ịrịba ama dị iche iche site n’eluigwe.” (Matiu 24:3, 7, 8; Luk 21:10, 11) N’ihi ya, ‘ihe ndị ahụ na-atụ egwu’ nke anyị hụworo, nke sokwa eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ụjọ ugbu a, ekwesịghị iju anyị anya. Ma gịnị ka ha na-egosi?
Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-ewere ọnọdụ, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) N’oge anyị a, anyị pụrụ ịtụ anya ka ọchịchị nke dị n’aka Chineke si n’eluigwe chịwa ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Daniel 2:44) Olee ihe ndụ ga-adị ka ya mgbe ahụ?
Nnwere Onwe Pụọ n’Ụjọ!
Bible kọwara banyere oge a ga-enwe udo n’ọdịnihu, bụ́ mgbe agha nile ga-akwụsị, mgbe ndị ajọ omume na-agaghị adị, mgbe ndị hụrụ Chineke n’anya ga-ejupụtakwa n’ụwa. Pita, bụ́ onyeozi Jizọs, dere banyere “ụbọchị ikpe na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” bụ́ nke ka dị n’ihu. Ọ dịghị onye ajọ omume a ga-atụ egwu ya n’ihi na ‘ezi omume gaje ibi’ n’ụwa. (2 Pita 3:7, 9, 13) Chegodị echiche banyere ahụ́ efe a ga-enwe n’ihi ibi n’etiti ndị a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ezie! Olileanya a na-enyere anyị aka ile oge a dị ize ndụ anya n’ụzọ dị iche. Ọ gaghị adịgide ruo ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:9-11.
Maka abamuru nke ndị na-enwe nchegbu, a gwara onye amụma Jehova, sị: “Sịnụ ndị obi ha na-eme ngwa, Dịnụ ike, unu atụla egwu: lee, Chineke unu! ịbọ ọ́bọ̀ na-abịa, bụ́ nkwụghachi nke Chineke; Ya onwe ya ga-abịa zọpụta unu.” (Aịsaịa 35:4) Ya mere, ndị ohu nke ezi Chineke ahụ pụrụ iji obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Nye ndị nọ n’ụjọ, ọ bụ ihe na-akasi nnọọ obi ịmara na Jehova ahapụbeghị nzube mbụ ya nke bụ́ ime ka ụwa jupụta na mmadụ ndị maara ya ma na-egosipụta àgwà ịhụnanya ya.—Jenesis 1:26-28; Aịsaịa 11:9.
Anyị maara na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Jehova imezu ihe ndị o ji ịhụnanya zubere ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 55:10, 11; Ndị Rom 8:35-39) Mgbe anyị ghọtara nke a, anyị ga-aghọtakwu ihe okwu ndị ahụ dị n’otu abụ ọma a ma nnọọ ama pụtara. N’ebe ahụ, anyị na-agụ, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ. . . . Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m. Ọ na-edu m n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya. Ọzọ, a sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m.” (Abụ Ọma 23:1-4) Ọ bụ ezie na oge ndị a dị egwu pụrụ ịkakwu njọ, ụwa nke ụmụ mmadụ na-agaghị anọ n’ụjọ dị nso, e jikwa n’aka na ọ ga-abịarịrị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Banyere ọnọdụ ndị di ma ọ bụ nwunye ịhapụ onye òtù ọlụlụ ya pụrụ ịbụ ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, lee Teta! nke February 8, 2002, peeji nke 10.
^ par. 10 Banyere ụmụ nwanyị ndị di ha na-emeso ihe ike n’ezinụlọ, lee Teta! November 8, 2001, peeji nke 3-12, na Teta! nke June 8, 1993, peeji nke 3-14.
[Foto ndị dị na peeji nke 8-10]
N’isi nso, Chineke ga-eweta ụwa nke ndị mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’ụjọ