Otú Ị Ga-esi Nọgide n’Ọrụ Gị
Otú Ị Ga-esi Nọgide n’Ọrụ Gị
“Ị̀ hụwo mmadụ nke na-eme ngwa n’ije ozi ya [“nke nwere nkà n’ọrụ ya,” NW]? n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo onwe ya; ọ gaghị eguzo onwe ya n’ihu ndị a na-amaghị aha ha.”—Ilu 22:29.
DỊ KA amaokwu Bible ahụ dị n’elu na-egosi, a na-ejikarị ndị ọrụ nwere nkà akpọrọ ihe nke ukwuu. Olee ụfọdụ nkà na àgwà ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-ejikarị akpọrọ ihe n’ebe ndị ọrụ ha nọ? George, bụ́ onyeisi nke ngalaba na-ahụ maka ndị e were n’ọrụ n’otu ụlọ ọrụ were narị mmadụ asaa n’ọrụ, gwara Teta!, sị: “Ihe anyị na-eji akpọrọ ihe n’ebe onye ọrụ nọ bụ ya inwe ike iso ndị ọzọ ekwurịta okwu nke ọma na iso ha arụkọ ọrụ n’udo.” Bible nwere ndụmọdụ bara uru bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka imekwu nke ọma n’àgwà ndị a, si otú ahụ mee ka i nwekwuo ohere ịnọgide n’ọrụ gị. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Na-ekwurịta Okwu nke Ọma
Onye so dee Bible bụ́ Jems na-egosi na ọrụ onye maara okwu ekwu na-ebido tupu o mepee ọnụ ya. Jems dere na mmadụ kwesịrị “ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.” (Jems 1:19) N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ezigbo ndụmọdụ? Solomọn dere, sị: “Onye na-azaghachi okwu tupu ọ nụ, uche gbagọrọ agbagọ na ọnọdụ ihere ka ọ bụụrụ ya.” (Ilu 18:13) N’ezie, ige onye were gị n’ọrụ na ndị ọrụ ibe gị ntị nke ọma pụrụ ime ka unu ghara ịdị na-enwe nghọtahie, meekwa ka ị ghara ime ihe nzuzu.
I kwuwe okwu ekwu, otú i si kwuo ya dịkwa mkpa. Ọ bụrụ na i jiri ụda olu kwesịrị ekwesị kwuo okwu n’ụzọ doro anya, o yiri ka à ga-aka aghọta ihe i kwuru. Nke a ga-emekwa ka onye na-ege gị ntị jiri okwu gị kpọrọ ihe. Brian, bụ́ onye na-enye ndụmọdụ maka ịchọta ọrụ, nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, kwuru, sị: “Ọ ga-eju
gị anya ma ị mara mmadụ ole a na-achụ n’ọrụ, ọ bụghị n’ihi amaghị ọrụ, kama n’ihi amaghị ka e si ekwu okwu.”Soro Ndị Ọzọ Na-arụkọ Ọrụ nke Ọma
Ọ bụrụ na a tụlee oge gị na ndị ọrụ ibe ji arụkọ ọrụ ọnụ, obi abụọ adịghị ya na ị ga-ama ha nke ọma. N’ihi ya, ị pụrụ ịbụ onye a nwara iji ha na-agba asịrị, na-ekwukarị banyere amaghị eme ha na ihe ndị ha mehiere. Ma, ndụmọdụ Bible na-enye bụ ka i ‘mee ka ọ bụrụ nzube gị ibi ndụ n’ụzọ dị nwayọọ na ilekwasị anya n’ihe ị na-eme.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:11) Site n’ime nke a, ị ga-ezere ịbụ onye a maara dị ka “onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ.” (1 Pita 4:15) Ọzọkwa, ị ga-ezere ịbụ onye na-egbu oge ma na-akpata esemokwu n’enweghị isi n’etiti gị na ndị ọrụ ibe gị.
Mgbe e nyere gị ọrụ, buru ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Jizọs nyere n’uche, nke bụ́: “Ọ bụrụkwa na onye ikike dị n’aka amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” (Matiu 5:41) Jizọs na-ekwu banyere ndị ọchịchị n’ebe a, ma a pụrụ iji okwu ya mee ihe n’ezie n’ebe ọrụ. Ọ bụrụ na a mata gị dị ka onye na-arụsi ọrụ ike—onye na-arụ ihe karịrị ọrụ e nyere ya—o yiri ka ị ga-aka enwe ohere nke ịnọgide n’ọrụ gị. N’eziokwu, e nwere ókè onye were gị n’ọrụ ga-achọru ihe n’aka gị. Jizọs kwuru na mmadụ kwesịrị ịkwụghachi ‘Siza ihe nke Siza, ma kwụghachi Chineke ihe nke Chineke.’ (Matiu 22:21) N’ikwu ya n’ozuzu, Jizọs gosiri n’ebe a na mmadụ ekwesịghị ikwe ka ndị nọ n’isi gbochie ya ime ihe ndị ka mkpa, dị ka ofufe ọ na-efe Chineke.
Na-eme Ihe n’Eziokwu
Otu nnyocha e ji ụlọ ọrụ karịrị otu puku na narị anọ mee gosiri na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ “weere ime ihe n’eziokwu na iguzosi ike n’ezi ihe dị ka àgwà ndị ha kasị achọ n’aka ndị na-achọ ọrụ.” O doro anya na ime ihe n’eziokwu na-agụnye ịghara izuru ego ma ọ bụ ngwá ọrụ nke onye were gị n’ọrụ. Ọ pụtakwara ịghara izuru oge ya. N’otu nnyocha otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịchọta ọrụ mere, ha chọpụtara na, ná nkezi, onye ọrụ ọ bụla zuru awa 4 na minit 15 n’ohi kwa izu. Tụkwasị n’ihe ndị ọzọ, ndị a na-ezu oge n’ohi na-abịakarị ọrụ n’azụ oge, na-ala n’oge, ma jiri oge ọrụ eso ndị ọrụ ibe ha akpa nkata.
Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma.” (Ndị Efesọs 4:28) Ọzọkwa, Okwu Chineke na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ịrụsi ọrụ ike, ọbụnadị mgbe ndị isi ha na-adịghị ele ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Na-eruberenụ ndị bụ́ nna ukwu unu n’echiche anụ ahụ́ isi n’ihe ọ bụla, ọ bụghị n’omume ije ozi ka e wee hụ unu, dị ka ndị na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama n’izi ezi nke obi, n’ịtụ egwu Jehova.” (Ndị Kọlọsị 3:22) Ọ bụrụ na a ma gị ama dị ka onye na-arụsị ọrụ ike—ọbụna mgbe a na-adịghị ele gị—ị bụ onye ọrụ a pụrụ ịtụkwasị obi.
Jiri Ezi Uche Na-eme Ihe
Bible buru n’amụma n’ụzọ ziri ezi na oge anyị ga-apụ iche ma sie ike obibi. (2 Timoti 3:1) Ọgba aghara a na-enwe n’ọchịchị nakwa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ihi ọnọdụ ụwa, ga-emerịrị ka ọnọdụ akụ̀ na ụba bụrụ nke a na-ejighị n’aka. (Matiu 24:3-8) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na i tinye aro ndị ahụ a tụrụ n’elu n’ọrụ, a ka pụkwara ịchụ gị n’ọrụ.
Ma, iji ụkpụrụ Bible na-eme ihe pụrụ inye aka belatatụ nchegbu enweghị ọrụ na-akpata. Jizọs kwuru, sị: “Ma, ọ bụrụ na Chineke na-eyikwasị ihe ọkụkụ nke ubi uwe, nke dị ebe a taa ma echi atụba ya n’ekwú ọkụ, ọ́ gaghị eyikwasị unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta? Ya mere, ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ . . . “N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa.”—Matiu 6:30-32.
Dị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ nọ gburugburu ụwa, Ericka, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, achọpụtawo na okwu ndị ahụ e hotara n’elu bụ eziokwu. Ọ chịkọtara mmetụta ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Ọrụ m na-arụ ugbu a na-atọ m ụtọ nke ukwuu. Ma, amara m site n’ahụmahụ m nwere, na ihe na-agbanwe. Ma, site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na site n’ịtụkwasị Jehova obi, amụtala m otú m ga-esi na-eme ka nchegbu m na-enwe mgbe m na-enweghị ọrụ kwụsịlata na otú m pụrụ isi nwekwuo afọ ojuju n’ọrụ m ji.”
[Foto dị na peeji nke 10]
Aṅaghị ntị nke ọma ná nzukọ pụrụ ime ka a chụọ gị n’ọrụ