Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ?
Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ?
DỊ KA ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ya si kwuo, a mụrụ otu nwoke aha ya bụ Jizọs n’ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga na Betlehem, bụ́ otu obodo nta dị n’ala Judia. Herọd Onye Ukwu bụ eze na-achị Jeruselem n’oge ahụ, Siza Ọgọstọs bụkwa eze ukwu na Rom. (Matiu 2:1; Luk 2:1-7) Ndị Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ na nke abụọ zeere ide ihe ọ bụla banyere Jizọs, n’ihi na ndị ọchịchị Rom nke oge ahụ nọ na-agbalị ịkwụsị Iso Ụzọ Kraịst.
N’aka nke ọzọ, akwụkwọ bụ́ The Historians’ History of the World kwuru, sị: “Mmetụta ọrụ [Jizọs] nwere n’akụkọ ihe mere eme dị mkpa karịa nke onye ọ bụla ọzọ dịtụworo ndụ n’ụwa, ọbụna ma e lee ya anya nanị n’ụzọ na-agbasaghị okpukpe. Oge ọhụrụ, bụ́ nke mba ndị kasị mepee emepe n’ụwa nakweere, malitere ịgụ site n’oge a mụrụ [Jizọs].”
Magazin bụ́ Time kọrọ na akwụkwọ e derela banyere Jizọs dị ọtụtụ karịa nke e derela banyere onye ọ bụla ọzọ dịworo ndụ n’ụwa. Ihe ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị a lekwasịrị anya na ya bụ banyere onye Jizọs bụ n’ezie. Ikekwe, a rụrịtawo ụka banyere onye Jizọs bụ n’ezie karịa ka a rụrịtaworo banyere onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
Ajụjụ Ndị A Jụrụ n’Oge Gboo Banyere Onye Ọ Bụ
Mgbe a gwara Meri na ọ ga-amụ nwa nakwa na ọ ga-akpọ aha ya Jizọs, ọ jụrụ, sị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe mụ na nwoke ọ bụla na-adịghị enwe mmekọahụ?” Mmụọ ozi Chineke bụ́ Gebriel zara ya, sị: “Ike nke Onye Kasị Elu [ga-ekpuchi] gị. N’ihi nke ahụkwa, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.”—Luk 1:30-35.
Mgbe e mesịrị, Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị tụrụ ndịozi ya n’anya. Mgbe oké ifufe kpaliri ebili mmiri nke mere ka ụgbọ ha chọọ ikpu n’Oké Osimiri Galili, Jizọs mere ka mmiri ahụ dajụọ site n’ịbara ifufe ahụ mba, sị, “Shịị! Daa jụụ!” Nke a wụrụ ndịozi ya ibobo n’ahụ́, ha wee jụọ, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ?”—Mak 4:35-41; Matiu 8:23-27.
N’oge Jizọs, ọtụtụ mmadụ jụrụ ajụjụ banyere onye ọ bụ n’ezie. N’ihi ya, Jizọs jụrụ ndịozi ya onye ndị mmadụ na-asị na ya bụ. Ndịozi ya azaa ya na “ụfọdụ na-asị Jọn Onye Na-eme Baptizim, ndị ọzọ na-asị Ịlaịja, ndị ọzọkwa na-asị Jeremaịa ma ọ bụ otu Matiu 16:13-16; Luk 4:41.
n’ime ndị amụma”—ndị a nile anwụchaala n’oge ahụ. E mesịa, Jizọs ajụọ ha sị: “‘Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?’ Ná nzaghachi Saịmọn Pita sịrị: ‘Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.’” Ọbụna ndị mmụọ ọjọọ kwuru banyere Jizọs, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.”—Onye Jizọs Sị na Ya Bụ
Ọ bụ ezie na Jizọs adịkarịghị ekwu na ya bụ Ọkpara Chineke, o kwetara na ya bụ. (Mak 14:61, 62; Jọn 3:18; 5:25, 26; 11:4) Ma, ọtụtụ mgbe, o kwuru na ya bụ “Nwa nke mmadụ.” Site n’ịkọwa onwe ya otú ahụ, o mere ka ọmụmụ a mụrụ ya dị ka mmadụ pụta ìhè—eziokwu ahụ nke bụ́ na ya bụ mmadụ n’ezie. N’ụzọ dị otú a, o kpughekwara na ya bụ “nwa nke mmadụ” ahụ Daniel hụrụla n’ọhụụ ka ọ na-abịakwute Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile—“Onye ochie ahụ.”—Matiu 20:28; Daniel 7:13.
Kama iji ọnụ ya na-ekwu na ya bụ Ọkpara Chineke, Jizọs hapụrụ ndị mmadụ ka ha jiri ọnụ ha kwuo ya. Ọbụnakwa ndị na-abụghị ndịozi ya, dị ka Jọn Onye Na-eme Baptizim na enyi Jizọs bụ́ Mata, kwukwara na ọ bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 1:29-34; 11:27) Ndị a kweere na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ha matara na o biwo n’eluigwe dị ka mmụọ dị ike nakwa na Chineke ji ụzọ ọrụ ebube bufee ndụ ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri.—Aịsaịa 7:14; Matiu 1:20-23.
O Yiri Nwoke Mbụ ahụ, Bụ́ Adam
Jizọs na nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam yiri n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ha abụọ zuchara okè, ha enweghịkwa nna bụ́ mmadụ. (Jenesis 2:7, 15) N’ihi ya, Bible na-akpọ Jizọs “Adam ikpeazụ”—nwoke zuru okè, nke pụrụ ịbụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ.” Ndụ Jizọs na ndụ “nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam,” onye Chineke kere dị ka mmadụ zuru okè, kwekọrọ.—1 Ndị Kọrint 15:45; 1 Timoti 2:5, 6.
N’ime Bible, a kpọrọ Adam mbụ ahụ “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Otú ọ dị, Adam a tụfuru mmekọrịta ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ịbụ nwa Chineke site n’ilezi anya nupụrụ Chineke isi. N’aka nke ọzọ, Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi mgbe nile nye Nna ya nke eluigwe, ọ nọgidekwara na-abụ Ọkpara Chineke nwapụtara. (Matiu 3:17; 17:5) Bible na-ekwu na ndị nile na-egosipụta okwukwe na Jizọs, na-ewerekwa ya dị ka Onye Nzọpụta ha, pụrụ inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16, 36; Ọrụ 5:31; Ndị Rom 5:12, 17-19.
Ma, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụghị nanị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, kama na ọ bụ Chineke n’onwe ya. Ha na-ekwu na ma Jizọs ma Nna ya bụcha Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. Hà kwuru eziokwu? Ò nwere ụzọ Jizọs si bụrụ Chineke? Ọ̀ bụ ihe Jizọs, ma ọ bụ otu n’ime ndị so dee Bible, kwuru? N’ezie, ònye bụ nanị ezi Chineke ahụ? Ònye ka Jizọs kwuru na ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ? Ka anyị hụ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]
Ọ Dịghị Onye A Maara Karịa Ya
Mmadụ anọ n’ime ndị ha na Jizọs dịkọrọ ndụ—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—dere akụkọ ndụ ya. Ya na abụọ n’ime ha kpachikwara anya. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ akwụkwọ ndị a ha dere, bụ́ ndị a kpọkwasịrị aha ha, Oziọma. A sụgharịwokwa ha gaa n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ. Akwụkwọ nta ndị a na-esokarị n’akwụkwọ ndị mejupụtara Bible. A bịa n’akwụkwọ Bible ndị a kọrọ banyere Jizọs, ọnụ ọgụgụ e kesaworo—ma ndị nke e kesara otu otu ma ndị nke e kesakọrọ ha na akwụkwọ Bible ndị ọzọ—dị nnọọ ọtụtụ karịa nke akwụkwọ ọ bụla ọzọ e nwetụrụla n’ụwa. Ka a sịkwa ihe mere e ji mara Jizọs ama karịa mmadụ ọ bụla ọzọ dịtụrụla ndụ n’ụwa!
[Foto dị na peeji nke 15]
“Ònye n’ezie ka onye a bụ?” ka ndịozi ya jụrụ