Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Dọkịta Na-enwe Nchegbu

Ndị Dọkịta Na-enwe Nchegbu

Ndị Dọkịta Na-enwe Nchegbu

“Otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ bịakwutere m, na-enwe nnọọ olileanya na m ga-enwe ike ịgwọ nwa ọhụrụ ha. Ka m nọ na-ele nwa ahụ ahụ́, obi mapụrụ m. Ọrịa ya enweghị ngwọta. Chegodị echiche otú obi dị m mgbe m gwara di na nwunye a na nwa ha ga-ekpu ìsì! Ka ha si n’ọfịs m pụọ, ọnọdụ ha wutere m nke ukwuu. Obere oge, onye ọrịa ọzọ batara ma na-atụ anya ka m jiri ihu ọchị nabata ya! Ihe a bụ ihe na-agwụ m ike n’ọrụ a.”—Onye dọkịta na-ahụ maka ịwa anya n’Ebe Ndịda America.

NDỊ ọrịa adịkebeghị ebu nsogbu dọkịta n’uche mgbe ha na-aga ịhụ ya. Ihe na-adị onye ọrịa n’obi bụ otú dọkịta ga-esi nyere ya aka n’ọrịa ya. N’ihi ya, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọta ókè nchegbu ndị dọkịta na-enwe na-aharu.

N’ezie, onye ọ bụla aghaghị ịmụta ịchịkwa nchegbu, ọ bụghịkwa nanị ndị dọkịta ka ọrụ ha na-akpatara nchegbu. Ma, ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-eso ndị dọkịta enwe mmekọrịta n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ịghọta nchegbu ndị dọkịta na-enwe na mmetụta ọ pụrụ inwe n’ahụ́ ha bụ ihe kwesịrị ekwesị.

Ndị dọkịta na-amalite ịmụ otú e si achịkwa nchegbu n’oge ha ka na-adọga ịbanye mahadum iji gụọ banyere ịgwọ ọrịa. Ma, mgbe a malitere inye ha ọzụzụ n’ịgwọ ọrịa, ha na-enwekarị mmetụta ọjọọ ndị ha na-adịghị echefu echefu. Nke a na-abụ nke mbụ n’ime ọtụtụ ihe ndị pụrụ ịgbanwe echiche na àgwà ha.

Ọzụzụ Iji Bụrụ Dọkịta—Ahụmahụ Na-awụ Akpata Oyi n’Ahụ́

Ọ pụrụ ịbụ n’izu mbụ mmadụ malitere ịnara ọzụzụ iji bụrụ dọkịta ka ọ ga-ahụ ihe ndị ga-awụ ya akpata oyi n’ahụ́ n’ọnụ ụlọ a na-anọ abọkasị ahụ́. Ma eleghị anya, ọtụtụ n’ime ndị a na-enye ọzụzụ ahụtụbeghị ozu. Anya mbụ ha ga-ahụ ozu ndị gba ọtọ, a gbasichara agbasi, bụ́ ndị a bọkasịrị n’ụzọ dịgasị iche iche iji mee ka a hụ otú ime ahụ́ mmadụ dị, pụrụ ịsọ ha oyi. Ha aghaghị ịmụta ụzọ ha ga-esi na-achịkwa mmetụta ha na-enwe. Ọtụtụ mgbe, ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị iwere ya dị ka ihe ọchị, na-enye ozu nke ọ bụla aha na-atọ ọchị. Ihe onye ọzọ ga-ewere dị ka obi ịta mmiri na ịka anya bụ ihe ụmụ akwụkwọ ndị a na-ewere dị ka ihe dị mkpa ime. Nke a bụ n’ihi na ha na-agbalị ịghara ichewe otú onye ahụ dịịrị mgbe ọ nọ ndụ.

Nke a gasịa, a malitezie inye ha ọzụzụ n’ụlọ ọgwụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịghị eche banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ ruo mgbe ha katara ahụ́. Ma, ndị a na-azụ ịbụ dọkịta, malite n’oge ntorobịa ha, na-ejikarị anya ha ahụ ndị na-arịa ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ na ndị na-anwụ anwụ. Otu onye kọwara ahụmahụ mbụ o nwere n’ụlọ ọgwụ dị ka “ihe sọbigara ya oyi ókè.” Ọ pụkwara nnọọ ịwụ ma ụmụ akwụkwọ ndị nọ ná mba ndị bara ọgaranya ma ndị nke nọ ná mba ndị na-abaghị ọgaranya akpata oyi n’ahụ́ mgbe mbụ ha chọpụtara ugboro ole a na-agwọghị ndị ọrịa nke ọma n’ihi na ego ha ezughị.

Olee otú ndị dọkịta ka malitere ọrụ amalite pụrụ isi mụta ịchịkwa nchegbu ọrụ a na-akpata? Ọtụtụ mgbe, ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ na-akpọchi obi ha site n’inye ndị ọrịa aha na-agaghị egosi na ha bụ mmadụ. Kama ikwu na e nwere onye chọrọ nlebara anya, onye na-arụ n’ụlọ ọgwụ pụrụ ịsị, “Dọkịta, e nwere ụkwụ gbajiri agbaji nọ n’ọnụ ụlọ nke abụọ.” Nke a pụrụ ịtọ gị ọchị ma ọ bụrụ na ị ghọtaghị ihe mere e ji kọwaa onye ahụ otú ahụ.

Ike Ọgwụgwụ Obi Ọmịiko Na-akpata

A na-enye ndị dọkịta ọzụzụ ịbụ ndị ọkà mmụta sayensị, ma ọrụ ihe ka ọtụtụ n’ime ha kasị arụ bụ iso ndị ọrịa ekwurịta okwu. Ọ na-adị ụfọdụ ndị dọkịta ka ha adịbeghị njikere iwepụta obi ha iso ndị ọrịa bụrụ enyi. Dị ka e kwuru ná mmalite, otu n’ime ihe ndị kasị esiri ndị dọkịta ike bụ ịgwa mmadụ ihe ọjọọ mere ya. Ụfọdụ ndị dọkịta na-eme nke a kwa ụbọchị. Ọ na-adịkarị ndị na-arịa ọrịa mkpa ikwupụta nsogbu ha, a na-atụkwa anya ka ndị dọkịta gee ha ntị. Iso ndị ọrịa obi na-erughị ala, bụ́kwa ndị ụjọ na-atụ, emekọ ihe, pụrụ ịbụ ihe na-agwụ nnọọ ike nke na ụfọdụ ndị dọkịta na-enwe ụdị ike ọgwụgwụ obi ọmịiko na-akpatara ha.

Otu dọkịta nọ na Canada nke na-adịghị agwọ nanị otu ụdị ọrịa dere banyere oge ọ ka malitere ọrụ amalite, sị: “Ọrụ karịrị m akarị n’ahụ́: ndị nọ ná mkpa nọ na-achọ ka m lebara ha anya; ndị na-ahụsi anya nọ na-achọ ka ha kọsara m nsogbu ha; ndị ọrịa nọ na-achọ ka m gwọọ ha; ndị nrigbu nọ na-achọsi ike inweta ihe ha na-achọ; ndị mmadụ nọ na-abịa ịhụ m; ndị mmadụ nọ na-arịọsi m ike ka m bịa hụ ha; ndị mmadụ nọ na-akpọ m na fon mgbe m nọ n’ụlọ m—ọbụnakwa mgbe m nọ n’ọnụ ụlọ m na-anọ ehi ụra. Ebe ọ bụla m tinyere isi, ndị mmadụ. Achọkwaranụ m inyere ha aka, ma nke a gafere ókè.”—A Doctor’s Dilemma, nke John W. Holland dere.

Nchegbu ndị dọkịta na-enwe hà na-akwụsịlata ka oge na-aga? Dị ka ọ na-adịkarị, ka mmadụ na-anọtekwu aka n’ọrụ ya, otú ahụ ka ibu ọrụ ya na-ehikwu nne. Ọtụtụ mgbe, a na-eme mkpebi ndị metụtara ọnwụ na ndụ n’otu ntabi anya, ikekwe n’enwetaghị ihe ọmụma zuru ezu. Otu dọkịta nọ na Britain kwuru, sị, “Mgbe m malitere ọrụ ọhụrụ, o nyeghị m nsogbu n’obi, dị nnọọ ka ọ na-adịghị enye ndị na-eto eto nsogbu n’obi ịkwọ ụgbọala ọnwụ ọnwụ. Ma ka mmadụ na-akata ahụ́, ọ na-abịa jiri ndụ kpọrọ ihe. Ana m enwe nchegbu ugbu a karịa ka m nwetụrụla ma m na-ekpebi ụzọ m ga-esi gwọọ mmadụ.”

Olee otú nchegbu si emetụta ndị dọkịta? Ha pụrụ iburu àgwà nke ịkpọchi obi ha bata n’ime ezinụlọ ha. Izere àgwà a pụrụ isiri ha ike. A ma ụfọdụ ndị dọkịta ama maka iji ọmịiko enyere ndị ọrịa aka ná nchegbu ha na-enwe. Ma, ókè há aṅaa ka ha ga-enweru ọmịiko a ya aghara ịgwụ ha onwe ha ike? Nke a bụ ọnọdụ tara akpụ ndị dọkịta nọ na ya.

Ịnagide Ndị Ọrịa Na-enye Nsogbu

Mgbe a jụrụ ndị dọkịta banyere nchegbu mmekọrịta ha na ndị ọrịa na-akpatara ha, ha na-amalitekarị site n’ịkọwa ndị ọrịa bụ́ ndị na-enye nsogbu. Ikekwe, ị maara ụfọdụ n’ime ndị na-esonụ.

Nke mbụ bụ ndị ọrịa na-egbu dọkịta oge site n’ịgba okwu gburugburu, n’ekwughị kpọmkwem ihe bụ́ nsogbu ha. E nwekwara ndị ọrịa na-achọkarị ka e lebara ha anya. Ha na-akpọ dọkịta n’abalị ma ọ bụ ná ngwụsị izu n’ihi ọrịa na-ejisighị ha ike ma ọ bụ na-achọ ka dọkịta nye ha ọgwụ ndị ọ na-agaghị achọ inye ha. Ọzọkwa, e nwere ndị ọrịa na-adịghị atụkwasị dọkịta obi. Ụfọdụ mmadụ na-eme nnyocha, ikekwe, n’Intanet iji ghọta ọrịa ha nke ọma. Nke a pụrụ ịba uru. Ma, nnyocha dị otú ahụ pụrụ ime ka ha ghara ịtụkwasị dọkịta ha bịara ịhụ obi. Dọkịta nwere ike ọ gaghị enwe oge iso ha kwurịta banyere uru na ọghọm dị n’ihe ha chọpụtara ná nnyocha ha mere. Ọ na-agwụ dọkịta ike mgbe onye ọrịa ji n’ihi atụkwasịghị ya obi ghara ime ihe ọ sị ya mee. N’ikpeazụ, e nwere ndị ọrịa na-adịghị enwe ndidi. Ha na-akwụsị ịṅụ ọgwụ e nyere ha mgbe ọgwụ ahụ na-amalitebeghị ịrụ ọrụ, ikekwe chọrọ dọkịta ọzọ gawa.

Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ n’ụwa, ndị kasị akpatara ndị dọkịta nchegbu abụghị ndị ọrịa kama ọ bụ ndị ọkàiwu.

Ịgwọ Ọrịa n’Ụzọ Ga-eme Ka E Zere Ịbụ Onye A Gbara Akwụkwọ

Ọtụtụ mba na-akọ banyere ịrị elu nke akwụkwọ a na-agba ndị dọkịta n’ụlọikpe n’ihi ịgwọjọ ọrịa. Ụfọdụ ndị ọkàiwu na-ebo ha ebubo na-erijughị afọ iji nweta akụ̀ na ụba. “Ha na-eme ka ego inshọransị ndị dọkịta na-akwụ maka ịgwọjọ ọrịa na-arị elu,” ka onyeisi nke Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America na-ekwu. “Akwụkwọ ndị a a na-agba na-akpatakwa nsogbu ndị ọzọ. Ịgba onye dọkịta akwụkwọ n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ ịkpatara ya nsogbu dị ukwuu—mmechuihu, igbu ya oge, . . . nchegbu na nchekasị.” Ọbụna ụfọdụ ndị dọkịta abụrụwo ndị nke a metụtara ruo n’ókè nke ha igbu onwe ha.

N’ihi ya, ọtụtụ ndị dọkịta na-eche na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị ime mkpebi n’ụzọ ga-eme ka ha nwee ike ịzara ọnụ ha ma a gbaa ha akwụkwọ, kama ime mkpebi n’ụzọ ga-akasị abara onye ọrịa uru. Magazin bụ́ Physician’s News Digest kwuru, sị, “Ọ marala ndị dọkịta ahụ́ ịgwọ mmadụ n’ụzọ na-eme ka ha nwee ike ịzara ọnụ ha.”

Ka nrụgide ndị dọkịta na-enwe nọgidere na-aka njọ, ọtụtụ n’ime ha na-eche ihe ọdịnihu ga-abụrụ ha. Ọtụtụ ndị ọrịa na-ajụkwa otu ajụjụ ahụ, ebe ha na-ahụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ụdị ọrịa ụfọdụ nọgidere na-amụba n’agbanyeghị ọganihu e nwere n’ịgwọ ọrịa. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe ọdịnihu ga-abụrụ ma ndị dọkịta ma ndị ọrịa.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

INYERE DỌKỊTA GỊ AKA

1. Jiri oge gị na dọkịta nọ mee ihe n’ụzọ kasị mma site n’ịkwadebe otú ị ga-esi kọwaara ya ihe nile na-eme gị n’ụzọ dị mkpirikpi, na-ebido ná ndị nke kasị enye gị nsogbu

2. Zere ịdị na-akpọ dọkịta gị mgbe ụfọdụ n’oge o mechirila ọrụ n’ihi ọrịa ndị na-ejisighị gị ike

3. Na-enwe ndidi. Ọ na-ewe oge iji chọpụtachaa ihe na-arịa mmadụ ma gwọọ ya

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

‘ỌBỤNA ỌRỊA NDỊ A NA-AGWỌ SITE N’OGE RUO N’OGE PỤRỤ IWETA AFỌ OJUJU’

“Otú e si agwọ ọrịa n’ebe a dị nnọọ iche n’otú e si agwọ ya n’obodo ndị ka mepee emepe. N’ebe a, a na-ele inwe aka ọrụ anya dị ka ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịda ogbenye, n’ihi ya kwa, ọtụtụ mmadụ na-anara ọzụzụ iji bụrụ dọkịta. E nwere ọtụtụ ndị dọkịta, ma ọrụ dị ole na ole. N’ihi ya, a naghị akwụpụta ndị dọkịta ụgwọ. Ọ bụ mmadụ ole na ole ga-akwụli dọkịta ụgwọ ka ọ bịa n’ụlọ ha gwọọ ha. Ana m arụ ọrụ n’otu ụlọ ọgwụ ochie nke elu ya na-ehi mmiri, nke nwere nanị ngwá ọrụ ndị bụ́ isi. Anyị nwere ndị dọkịta abụọ na ndị nọọsụ ise. Anyị nwere ndị ọrịa 14,000 anyị na-agwọ.

“Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ndị ọrịa ka adịghị m ele ha ahụ́ nke ọma. Ma, ebe e nwere mmadụ iri abụọ na ise na-eche m, agaghị m anọli ogologo oge n’ile otu onye ahụ́. Na-agbanyeghị nke ahụ, ịgwọ ọrịa, ọbụna ndị nke m na-agwọ site n’oge ruo n’oge, na-ewetara m afọ ojuju. Dị ka ihe atụ, ndị nne na-akpọtakarịrị m ụmụ ha afọ na-asa bụ́ ndị na-adịghị eri ezigbo nri, ndị mmiri gwụkwara n’ahụ́. Anya ha na-alakpu n’ime, ihu ha eyie nke onye na-enwe nchegbu. Nanị ihe m na-eme bụ ịgwa nne nwa ahụ otú ọ ga-esi na-enye ya mmiri e tinyere nnu na shuga nakwa ọgwụ nje. Ozugbo ọgwụ ndị a malitere ọrụ, nwa ahụ na-amaliteghachi iri nri. Otu izu gasịa, ị gaghị amatakwa nwa ahụ ọzọ—ihu ya na-egbukepụ, bụrụ sọ ọchị, ya ana-egwurikwa egwu. Atụmanya nke inweta ahụmahụ ndị a mere m ji nwe mmasị ịbụ dọkịta.

“Malite n’oge m dị obere, enwere m ọchịchọ ịgwọ ndị ọrịa. Ma, ọzụzụ m natara iji bụrụ dọkịta gbanwere m otú m na-atụghị anya ya. Ahụrụ m ebe ndị mmadụ nwụrụ n’ihi akwụlighị ọbụna obere ego a chọrọ ka ha kwụọ iji gwọọ ha. N’ihi ya, akpọchiri m obi m ka ọnọdụ ahụ dị mwute ghara imetụta m. Ọ bụ nanị mgbe e ji Bible gosi m ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ ka m bịara ghọta ụdị onye ọmịiko Chineke bụ ma maliteghachi inwe mmetụta banyere ndị ọzọ. Mgbe ahụ, abịara m nwee ike ibeli ákwá ọzọ.”

[Foto]

Dr. Marco Villegas na-arụ ọrụ n’otu obodo dịpụrụ adịpụ n’Amazonia, bụ́ nke dị na Bolivia