Ụzọ Ị Ga-esi Bụrụ Ezi Nna
Ụzọ Ị Ga-esi Bụrụ Ezi Nna
OTU isiokwu gbara na magazin bụ́ Economist bụ́ nke na-ekwu banyere ndakpọ nke ndụ ezinụlọ, ji okwu a na-adọrọ mmasị malite: “Ọ dị mfe ịmụ ụmụ, ọ dịghị mfe ịbụ ezi nna.”
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ihe siri ike omume ná ndụ, otu n’ime ihe ndị kasị sie ike—nke kasịkwa dị mkpa—bụ ịbụ ezi nna. Nna ọ bụla kwesịrị ịchọ ịbụ ezi nna, ebe ọ bụ na nke a metụtara ọdịmma na obi ụtọ nke ezinụlọ ya.
Ihe Mere Ọ Na-ejighị Adị Mfe
N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, otu isi ihe mere ịbụ ezi nna na-ejighị dị mfe bụ ezughị okè e ketara eketa—ma nke nne na nna ma nke ụmụ ha. “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” ka Bible na-ekwu. (Jenesis 8:21) N’ihi ya, otu onye so dee Bible kwetara, sị: “Ná mmehie ka nne m tụụrụ ime m.” (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ọchịchọ nke ime ihe ọjọọ n’ihi mmehie e ketara eketa bụ nanị otu n’ime ihe mgbochi ndị na-eme ka ịbụ ezi nna sie ike.
Ụwa a, ma ọ bụ usoro ihe a, bụkwa ihe mgbochi dị ukwuu. N’ihi gịnị? N’ihi na, dị ka Bible na-akọwa, “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” bụ́ onye a kọwara dị ka “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” Bible na-akpọkwa Setan “chi nke usoro ihe a.” Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo na, dị nnọọ ka ya onwe ya, ụmụazụ ya ekwesịghị ịbụ “akụkụ nke ụwa”!—1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9; 2 Ndị Kọrint 4:4; Jọn 17:16.
Otu ihe dị oké mkpa iji bụrụ ezi nna bụ ịmara mgbe nile banyere ezughị okè anyị ketara eketa, Setan bụ́ Ekwensu, na ụwa a nke ọ na-achịkwa. Ihe mgbochi ndị a abụghị ihe e chepụtara echepụta. Ha dị adị n’ezie! Ma olee ebe mmadụ pụrụ ịga iji mụta ụzọ ọ pụrụ isi merie ha nakwa ụzọ ọ pụrụ isi ghọọ ezi nna?
Ihe Nlereanya Ndị Chineke Setịpụrụ
Iji nweta enyemaka n’imeri ihe mgbochi ndị ahụ e kwuru banyere ha n’elu, onye bụ́ nna pụrụ ịga na Bible. E nyere ihe atụ ndị magburu onwe ha n’ebe ahụ. Jizọs mere ka a mata nke kasị mma n’ime ha mgbe ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe.” N’ịkọwa Nna anyị nke eluigwe, Bible kwuru n’ụzọ dị mfe, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Olee otú nna nke bụ́ mmadụ kwesịrị isi meghachi omume banyere ihe nlereanya a e ji ịhụnanya gosipụta? “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke,” ka Pọl onyeozi Matiu 6:9, 10; 1 Jọn 4:8; Ndị Efesọs 5:1, 2.
gbara n’ume, “nọgidekwanụ na-eje ije n’ịhụnanya.”—Ọ bụrụ na ị bụ nna, tụlee ihe ị pụrụ ịmụta site nanị n’otu ihe atụ nke oge Chineke mesoro Jizọs, bụ́ Ọkpara ya, ihe. Matiu 3:17 na-agwa anyị na n’oge e mere Jizọs baptizim n’ime mmiri, a nụrụ olu Chineke sitere n’eluigwe, ka ọ na-asị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
Nke mbụ, chee banyere mmetụta ọ na-enwe n’ebe nwatakịrị nọ mgbe nna ya ji nganga gwa onye ọzọ, sị, ‘Nke a bụ nwa m nwoke,’ ma ọ bụ ‘Nke a bụ nwa m nwanyị.’ Ụmụaka na-aka eme nke ọma mgbe ndị mụrụ ha na-elebara ha anya, karịsịa mgbe ha na-aja ha mma maka ihe ndị ha meziri emezi. O yikarịrị ka nwatakịrị ọ̀ ga-abụ onye a kpaliri ịgbalịsikwu ike iji gosi na mma a na-aja ya abụghị na nkịtị.
Nke abụọ, Chineke kwupụtara mmetụta o nwere n’ebe Jizọs nọ, na-ezo ya aka dị ka “onye m hụrụ n’anya.” Okwu ịhụnanya ahụ nke sitere n’ọnụ Nna ya aghaghị inyewo Jizọs obi ụtọ. Ụmụ gị kwa ga-abụ ndị a gbara ume ma ọ bụrụ na ị na-egosi site n’okwu ọnụ gị—nakwa site n’oge ị na-enye ha, otú i si elekọta ha, na nchegbu ị na-enwe banyere ha—na ị hụrụ ha n’anya nke ukwuu.
Nke atọ, Chineke gwara Ọkpara ya, sị: “Anwapụtawo m gị.” (Mak 1:11) Nke ahụ kwa bụ ihe dị mkpa ka nna na-eme, ya bụ, ịgwa ụmụ ya na ya nwere obi ụtọ n’ebe ha nọ. N’eziokwu, nwatakịrị ga-emehie ihe mgbe mgbe. Anyị nile na-emehie ihe mgbe mgbe. Ma, dị ka nna, ị̀ na-eme mgbalị iji chọta ohere ndị ị ga-eji kwuo okwu na-egosi na i nwere obi ụtọ maka ihe ndị dị mma ụmụ gị mere ma ọ bụ kwuo?
Jizọs mụtara ihe nke ọma n’aka Nna ya nke eluigwe. N’oge ọ nọ n’ụwa, o ji okwu ọnụ na omume ya gosipụta nnọọ mmetụta Nna ya na-enwe banyere ụmụ Ya nọ n’elu ala. (Jọn 14:9) Ọbụna mgbe Jizọs ji ọrụ n’aka na mgbe o nwere nrụgide, o wepụtara oge iji soro ụmụaka nọrịa. “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m,” ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “unu anwala igbochi ha.” (Mak 10:14) Unu ndị bụ́ nna, ùnu pụrụ ịgbaso ihe nlereanya Jehova Chineke na nke Ọkpara ya n’ụzọ chiri anya karị?
Ezi Ihe Nlereanya Dị Oké Mkpa
Isetịpụrụ ụmụ unu ezi ihe nlereanya dị nnọọ mkpa. Mgbalị unu na-eme ‘ịnọgide na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova’ nwere ike ghara inwe ezigbo mmetụta ma ọ bụrụ na unu onwe unu adịghị anabata ịdọ aka ná ntị Chineke ma na-ekwe ka ọ na-achịkwa ndụ unu. (Ndị Efesọs 6:4) Otú ọ dị, site n’enyemaka Chineke, unu pụrụ imeri ihe ọ bụla ga-egbochi unu imezu iwu ya bụ́ ilekọta ụmụ unu.
Tụlee banyere ihe nlereanya Viktor Gutshmidt, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ n’ebe bụbu Soviet Union. N’October 1957, a mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ iri n’ihi ikwupụta nkwenkwe ya. Ọ hapụrụ ụmụaka nwanyị abụọ na nwunye ya, bụ́ Polina. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, e kwere ka ọ na-edegara ezinụlọ ya akwụkwọ ozi, ma a machibidoro ya iwu ikwu ihe ọ bụla banyere Chineke ma ọ bụ ihe ọ bụla metụtara okpukpe. Ọbụna ka o chere ihe isi ike a ihu, Viktor kpebisiri ike ịbụ ezi nna, ọ makwaara na ịkụziri ụmụ ya banyere Chineke dị oké mkpa. N’ihi ya, gịnị ka o mere?
“Enwetara m ihe na magazin ndị Soviet bụ́ Young Naturalist nakwa Nature,” ka Viktor na-akọ. “Ana m ese ụmụ anụmanụ na ndị mmadụ ná mpempe akwụkwọ ozi ma dee otu akụkọ ma ọ bụ ahụmahụ banyere ihe ndị e kere eke na ya.”
“Ngwa ngwa anyị nwetara mpempe akwụkwọ ozi ndị a,” ka Polina na-ekwu, “anyị na-ejikọta ha na ihe ndị e kwuru na Bible ozugbo. Dị ka ihe atụ, mgbe ha gụnyere ịma mma nke okike, oké ọhịa, ma ọ bụ osimiri, ana m agụ Aịsaịa isi nke 65,” bụ́ nke na-ekwu banyere nkwa ndị Chineke kwere ime ka ụwa bụrụ paradaịs.
Nwa Viktor bụ́ Yulia na-akọ, sị: “Mama anyị na-esorozi anyị kpee ekpere, anyị ebeekwa ákwá. Mpempe akwụkwọ ozi ndị ahụ keere òkè dị ukwuu ná nzụlite anyị.” Polina na-ekwu na n’ihi nke ahụ, “ụmụ anyị nwanyị bịara hụ Chineke n’anya hie nne malite n’oge ha bụ ụmụaka.” Olee ọnọdụ e nwere n’ezinụlọ ahụ ugbu a?
Viktor na-akọwa, sị, “Ugbu a ụmụ m abụọ alụchaala Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, ha abụọ nwechakwara ezinụlọ gbasiri ike n’ụzọ ime mmụọ nakwa ụmụ ndị na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.”
Isetịpụ ezi ihe nlereanya na-achọkarị ọ bụghị nanị ichepụta ihe kamakwa itinye mgbalị dị ukwuu. O yiri ka obi ụmụaka ọ̀ ga-abụ nke a kpaliri mgbe ha hụrụ ka nna ha na-eme mgbalị n’ezie. Otu nwa nwoke nke jere ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ ji ekele kwuo banyere nna ya, sị, “Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụcha nnọọ papa m nke na ụra anaghị ekwe ya ekwe, ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị ga-enwekwarị ọmụmụ Bible anyị, nke a nyekwaara anyị aka ịghọta mkpa ọ dị.”
N’ụzọ doro anya, isetịpụ ezi ihe nlereanya—ma n’okwu ọnụ ma n’omume—dị oké mkpa n’ịbụ ezi nna. Ọ dị mkpa ka ị na-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ eziokwu dị n’ilu Bible ahụ nke na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—Ilu 22:6.
Ya mere, cheta na ọ bụghị nanị ihe i kwuru bụ ihe dị mkpa; ọ bụ kpọmkwem ihe ị na-eme—ihe nlereanya ị na-esetịpụ. Otu onye Canada nke bụ́ ọkachamara n’ihe banyere inye ọzụzụ n’oge a bụ nwata dere, sị: “Ụzọ kasị mma isi mee ka ụmụ anyị na-akpa àgwà [otú anyị ga-achọ] bụ igosipụta àgwà ọma ahụ n’onwe anyị.” N’ezie, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ọ dị oké mkpa ka gị onwe gị mee otú ahụ.
Na-ewepụta Oge Maka Ha!
Ụmụ gị aghaghị ịhụ ezi ihe nlereanya gị. Nke ahụ pụtara na ọ dị gị mkpa ịdị na-ewepụta oge iji soro ha nọkọọ—nnukwu oge, ọ bụghị nanị obere obere. Jiri amamihe ṅaa ntị na ndụmọdụ Bible ahụ bụ́ ka ị ‘zụpụta oge,’ ya bụ, hapụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa iji nwee ike iso ha nọrịa. (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’ezie, olee ihe dị mkpa karịa ụmụ gị? Ọ̀ bụ ikiri TV nke ukwuu, inwe ntụrụndụ, ụlọ mara mma, ọrụ gị?
E nwere otu ilu a maara nke ọma bụ́ nke na-asị, ‘Oké ókpòrò gbachaa ọsọ ụtụtụ, ntụ ụtụtụ na-eche ya.’ Ndị nna bụ́ ndị ụmụ ha kpafuworo site n’itinye aka n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ ibi ndụ nke ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, na-akwakarị ụta nke ukwuu. Ha na-akwa arịrị na ha esoghị ụmụ ha na-anọkọ otú kwesịrịnụ n’oge nna dị ha mkpa n’ezie.
Chetakwa, ọ bụ mgbe ụmụ gị dị obere ka i kwesịrị ichewa banyere ihe ga-esi ná nhọrọ gị pụta. Bible na-akpọ ụmụ gị “ihe nketa nke [si] n’aka Jehova,” ihe Chineke n’onwe ya nyefeworo gị ilekọta. (Abụ Ọma 127:3) Ya mere, echefula na ị ga-aza Chineke ajụjụ maka ha!
Enyemaka Dị
Ezi nna na-enwe mmasị dị ukwuu inweta enyemaka nke ga-abara ụmụ ya uru. Mgbe otu mmụọ ozi gwasịrị nwunye Manoa na ọ gaje ịmụ nwa, Manoa kpekuru Chineke ekpere, sị: “Ka [ọ] bịaghachikwute anyị ọzọ, arịọ m Gị, ka o zikwa anyị ihe anyị ga-eme nwata ahụ nke a ga-amụ.” (Ndị Ikpe 13:8, 9) Dị nnọọ ka ọ dị ndị nne na nna taa, olee ụdị enyemaka dịịrị Manoa mkpa? Ka anyị hụ.
Brent Burgoyne, bụ́ onye nkụzi nọ na Mahadum nke Cape Town, South Africa, kwuru, sị: “Otu n’ime onyinye ndị kasịnụ mmadụ pụrụ inye nwata bụ ịkụziri ya ụkpụrụ ọ ga na-agbaso.” A pụrụ ịhụ eziokwu ahụ bụ́ na ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka ụkpụrụ dị otú ahụ n’otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ Japan bụ́ Daily Yomiuri, bụ́ nke kwuru, sị: “[Otu] nnyocha e mere na-egosi na pasent 71 nke ụmụaka ndị Japan bụ ndị nna ha na-agwatụbeghị ka ha ghara ịgha ụgha.” Nke ahụ ọ́ bụghị ọnọdụ dị mwute?
Ònye pụrụ isetịpụ ụkpụrụ a pụrụ ịdabere na ya? Ọ bụ otu onye ahụ nyeere Manoa aka—Chineke n’onwe ya! Iji nye aka, Chineke zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs, dị ka Onye Ozizi—aha a nọ na-akpọkarị ya. Ugbu a, akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, bụ́ nke nwere ihe ọmụmụ ndị dabeere n’ozizi Jizọs, dị n’ọtụtụ asụsụ maka iji kụziere ụmụ gị ihe.
Ọ bụghị nanị na akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na-akọwa ụkpụrụ ndị dabeere n’Okwu Chineke, kamakwa o ji ihe osise karịrị 160, nke nwere ajụjụ gara n’ihe kpọmkwem, akọwa ihe ndị e dere ede. Dị ka ihe atụ, isi nke 22, nke isiokwu ya bụ “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha,” nwere ihe osise nke na-egosi otu nwata nwoke na nna ya. Ihe e dere na peeji ebe foto a dị na-ekwu, sị: “Ikekwe, otu nwatakịrị nwoke gwara nna ya, sị: ‘Ee e, agbaghị m bọl n’ime ụlọ.’ Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ n’ezie na ọ gbara bọl n’ime ụlọ? Ọ̀ dị njọ ma ọ sị na ya agbaghị?”
A kụzikwara ihe ndị na-akpali akpali n’isiakwụkwọ ndị isiokwu ha bụ “Nrubeisi Na-echebe Gị,” “Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa,” “Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma,” “Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!,” “Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?,” “Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ,” na “Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ,” ndị bụ́ nanị ole na ole n’ime isiakwụkwọ 48 e nwere n’akwụkwọ ahụ.
Okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ mechiri site n’ịsị: “Ọ dị mkpa karịsịa ka a dọrọ uche ụmụaka gaa n’ebe Isi Iyi nke amamihe nile nọ, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, Jehova Chineke. Nke a bụ ihe Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, mere mgbe nile. Anyị na-enwe olileanya n’ezie na akwụkwọ a ga-enyere gị na ezinụlọ gị aka ịkpụzi ndụ unu iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, n’ụzọ ga-ewetara unu ngọzi ebighị ebi.” *
N’ụzọ doro anya, ịbụ ezi nna na-agụnye isetịpụrụ ụmụ gị ezi ihe nlereanya, na-ewepụta oge buru ibu iji soro ha na-anọkọ, na ịdị na-enyere ha aka ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke dị ka o kpugheworo ha na Bible.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 35 Akwukwọm nke Akukọ Bible, Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara iji nyere ezinụlọ dị iche iche aka.
[Foto dị na peeji nke 18]
N’agbanyeghị na ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Viktor Gutschmidt gbalịrị ịbụ ezi nna
[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]
N’oge a tụrụ ya mkpọrọ maka okwukwe ya, Viktor sere ihe ndị a iji kụziere ụmụ ya ihe
[Foto dị na peeji nke 19]
Ụmụ Viktor n’afọ 1965
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị nna kwesịrị ikerechi òkè anya n’ịkụziri ụmụ ha ihe