Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Ka Nwere Ndị Nwere Ọmịiko Taa

A Ka Nwere Ndị Nwere Ọmịiko Taa

A Ka Nwere Ndị Nwere Ọmịiko Taa

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MEXICO

N’ime Bible, a kọrọ otu akụkọ banyere otu nwoke Sameria nke nwere ọmịiko. (Luk 10:29-37) N’ilu a, Jizọs Kraịst gosiri ókè otu nwoke Sameria ruru nnọọ n’igosi ịhụnanya n’ebe onye agbata obi ya nke nọ ná mkpa nọ. À ka nwere ndị dị otú ahụ taa? Tụlee akụkọ na-esonụ si Mexico.

Ka ha na-alọta na njem ha mere, Betuel na ezinụlọ ya hụrụ otu ajọ ihe mberede ụgbọala mere n’okporo ụzọ awara awara n’ihe fọrọ kilomita ole na ole tupu ha eruo ebe obibi ha. Ha kwụsịrị ụgbọala ha iji nyere ndị mmadụ aka. Otu dọkịta, nke bụ́ otu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala so n’ihe mberede ahụ, gwara ha ka ha buru nwunye ya dị ime na obere ụmụ ya nwanyị abụọ gaa n’ụlọ ọgwụ kasị nso maka ọgwụgwọ. Ha mere otú ahụ, mgbe ahụ Betuel lọghachiri ebe ahụ ihe mberede ahụ mere iji mara ma ọ̀ dị enyemaka ọ pụrụ inyekwu.

Betuel na-akọ, sị: “Ndị uwe ojii na-anọ n’okporo ụzọ awara awara bịarutere, ha jidekwara dọkịta ahụ iji mee nchọpụta ụfọdụ ebe ọ bụ na mmadụ nwụrụ n’ihe mberede ahụ. Mgbe dọkịta ahụ jụrụ m ihe mere m ji na-enyere ya aka, akọwaara m ya na anyị bụ Ndịàmà Jehova, nakwa na anyị mụtara na Bible na anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. Agwakwara m ya na ọ dịghị ya mkpa ichegbuwe onwe ya banyere nwunye ya na ụmụ ya, n’ihi na anyị ga-elekọta ha anya nke ọma. N’ịbụ onye anya mmiri nke obi ekele gbara, o nyefere m ihe onwunwe ya ka m chebere ya.”

Betuel na ezinụlọ ya buuru ezinụlọ nwoke ahụ laa n’ebe obibi ha ma lekọta ha anya nke ọma ruo ọtụtụ ụbọchị. Betuel ji ohere ahụ malitere ha ọmụmụ Bible. Mgbe a tọhapụrụ dọkịta ahụ, o kwupụtara ekele ya, kwuokwa na ihe Ndịàmà Jehova na-amasị ya. O kwere nkwa ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ahụ n’obodo ya, ma kwuo na ọ bụrụ na nwunye ya amụọ nwa nwoke, na a ga-agụ ya Betuel. Betuel gara n’ihu ikwu, sị: “Ugbu a, mgbe afọ abụọ gasịrị, anyị gara leta ha. N’ụzọ tụrụ m n’anya, ha na-amụ Bible, ha gụkwara obere nwa ha nwoke Betuel!”

[Foto dị na peeji nke 30]

Betuel